Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari

Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa

  1. Buhari atụọla vootu nke ya, M ga-enwe mmeri - Buhari

    Buhari atụọla vootu ya ugbua na obodo ya na Daura. Ọ na-ekwu na obi dị ụtọ ka ntuliaka a sị aga. Ọ bụ ya na nwunye ya bụ ndị mbụ turu vootu na ebe ahụ.

    Buhari
    Nkọwa foto, Buhari ekwuola na obi ya kwụrụ chim! na ọ bụ ya ga-enwe mmeri
  2. Ndị ọrụ ngo na-achọ 'way' ha

    Ụfọdụ ndị ọrụ ngo Inec a na-akpọ "ad-hoc staff" na bekee malitere ịzọpụ ije ụla na Neni dị n'okpuruọchịchị Anaọcha dị n'Anambara steeti.

    Iwe ha bụ na Inec ezigabeghi ha ebe ha ga-anọ arụ ọrụ.

    Ndị ọrụ ngo
  3. N'Imo ụgbọala na-agba, ụfọdụ mepere ahịa

    N'Owere ụgbọala pụtara karịa ndị pụtara n'Satode gara aga.

    Ụfọdụ ndị ahịa mepekwara n'ụzọ ụtụtụ taa.

    Owere n'ụtụtụ a
    Nkọwa foto, Owere n'ụtụtụ a
    Okporoụzọ n'Owere
    Nkọwa foto, Owere n'ụtụtụ
    Ahịa Akpakuma
    Nkọwa foto, Mmadụ ole na ole nọ n'Ahịa Akpakuma n'ụtụtụ a
    'Akpakuma Girls Secondary School dị n'Imo steeti
    Nkọwa foto, Ọ nwebeghị ndị ọrụ Inec a hụrụ na ụlọakwụkwọ, 'Akpakuma Girls Secondary School dị n'Imo steeti ebe e nwere ọnọdụ Atụmvootu atọ. Naanị onye ọrụ 'civil defence' na onye 'Road safety' bụ ndị ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ
  4. Gere akụkọ na-eme n'akụkụ gị n'otu nkeji

    Akụkọ mere na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, mbaụwa nakwa n'ụwa egwuregwu dị n'ime ya.

  5. Ndị Agụlụ nọ n'ahịa be ha

    Dịka ndị mmadụ n'ọnọdụ ebe atụmvootu, ndị Agụlụ, obodo Peter Obi na-azụrụ onwe ha ahịa n'ụtụtụ a.

    Ndị Agụlụ na-azụrụ onwe ha ahịa n'ụtụtụ a
    Nkọwa foto, Ndị Agụlụ na-azụrụ onwe ha ahịa n'ụtụtụ a
  6. Ihe emewela n'ọnọdụ Atiku, mana nke Obi ka tọgbọ chakoo

    N'ebe Peter obi nke PDP kwesiri ịtụ vootu, mmadụ anọbeghị ya.

    Mana n'Adamawa ebe Atiku Abubakar ga-atụ nke ya, ọtụtụ mara ụzọ pụta n'ọgbọ.

    Ọnọdụ ebe obi kwesịị itu vootu
    Nkọwa foto, Ọnọdụ ebe obi kwesịị itu vootu
    Ihu ụlọ Peter Obi n'ụtụtụ a
    Nkọwa foto, Ihu ụlọ Peter Obi n'ụtụtụ a
    Ọnọdụ ebe Atiku kwesịrị ịtụ vootu
    Nkọwa foto, Ọnọdụ ebe Atiku kwesịrị ịtụ vootu
    Ọnọdụ ebe Atiku kwesịrị ịtụ vootu
    Nkọwa foto, Ọnọdụ ebe Atiku kwesịrị ịtụ vootu
  7. Ndị mmadụ mara ụzọ zochie n'ọnọdụ atụmvootu

    N'akụkụ Naijiria dị iche iche, Ndị mmadụ mara ụzọ wuchie n'ebe ha ga-atụ vootu.

    N'Asaba, Taraba nakwa ebe ndị ọzọ, ụfọdụ achọghị ka a kọrọ ha akọrọ banyere ntuliaka taa.

    Ndị pụtara ịtụ Vootu n'Asaba, Delta steeti ebe Elekere isii nke ụtụtụ
    Nkọwa foto, Ndị pụtara ịtụ Vootu n'Asaba, Delta steeti ebe Elekere isii nke ụtụtụ
    Ndị na-efe ala na ha na-arụ ọrụ ngo Inec wuchiri n'ụzọ ụtụtụ, ebe ELekere isii
    Nkọwa foto, Ndị na-efe ala na ha na-arụ ọrụ ngo Inec wuchiri n'ụzọ ụtụtụ, ebe Elekere Isii
    Ndị pụtara ịtụ vootu na Taraba steeti
    Nkọwa foto, Na Taraba, ndị na-atụ vootu dịka ka ha arahụghị n'ụlọ dịka ha mara ụzọ pụta were ọnọdụ ebe ha ga-atụ vootu
  8. Ndewoonu! Ụnụ asaala chi?

    I jikerela maka ịtụ vootu gị? Bia soro anyị dịka anyị na-enye gị ihe na-eme ebe nile taa dịka o siri gbasa ntuliaka ọkwa onyeisiala.