Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari
Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa
Ude Buhari ga-ede na Naijiria afo anọ ọzọ
Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ ekwuola na ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala maka afọ 2019.
Buhari nke APC nwere vootu kachasị dịka o ji vootu dị 15,191,847 tipụ Atiku nke PDP onye nwetara vootu dị 11,262,978 anyammiri n'anya.
Ndị niile denyere aha: 82,344,107
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 29,364,209
Vootu niile a tụrụ: 28,614,190
Vootu niile dị mma: 27,324583

Ebe foto si, @OfficialAPCnigeria
Tinubu azọziela isoro onyeisiala Muhammadu Buhari chịa
Dịka Inec na-akpọpụtaa mpụtara ntuliaka onyeisiala e mere n'ụbọchị Satode, onye ndu pati ha bụ Bola Tinubu agala obi gọọmenti etiti isoro ya nụrịa.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ndị PDP anaghị achịkwa
Mana ọ bụghị mmadụ niile na-enwe obi aṅụrị gbasara mpụtara a.
Peter Obi kwuru na ụfọdụ ndị mmadụ enweghi ohere mee ntuliaka n'ụbọchị Satọde n'ihi nsogbu 'card reader.'
Aha onyonyo, Presidential Election: A napụrụ ọtụtụ n'ọwụwa anyanwụ ohere itu vootu-Peter Obi PDP kwusiri ike na ọ bụghị vootu atụkọtara ka a kpọpụtara.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
E mebeghị eme, ndị APC aṅụrịwala

Ebe foto si, APCUK
Inec akpọbeghị onye meriri mana ndị otu APC na ndị na-akwado ebidola na-enwe anụrị.
N'Ugwu Naijiria dịka abuja, Kano, Suleja nakwa Pọtakọt agba egwu na-eme mkpọtụ ọnụ.
Ka ọ dị ugbua, Muhammadu Buhari nke APC nwere vootu kachasị na ntuliaka ebe o nwere vootu dị 15,191,847 ebe Atiku Abubakar nke PDP nwetara vootu dị 11,262,978.https://twitter.com/ayumen3k/status/1100567837394067456
Aha onyonyo, Ndị APC agbawala egwu mmeri Skip X post, 1Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Skip X post, 2Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
A na-agbagha mpụtara Rivers
Ndị o metụtara na-agbagha mpụtara si Rivas steeti.
APC: 150,710
PDP 473,971
Onye 'collation officer' nke steeti ahụ kwuru na e gbochiri ụfọdụ ndị ọrụ atụmvootu (electoral officers) ibuga ngwaọrụ ntuliaka na wọọdụ. O kwuru na ọgbaghara butere ogbochi n'ebe ụfọdụ. O kwukwara na n'okpuru Ọchịchị Emoha, na ndị 'electoral officers sị na o nweghị mpụtara ha nyere onye collation officer'. Ọ kọwara na ndị 'collation officer' detara mkpesa.
A kagburu ntuliaka n' okpuru ọchịchị isii, ebe a chịkọtara mpụtara nke e mere n'okpuru ọchịchị asaa.
Ọnọdụ atụmvootu o metụtara dị 151,ebe vootu o metụtara dị 942,368.
Festus Keyamo bụ ọnụ na-ekwuru ndị mgbasaozi achụmta vootu APC kpọrọ oku ka elebanye anya na vootu akagbulu n'ihi na ọ bụ vootu a tụrụ ndị APC ka ọ metụtakarịrị.
Onye nnochite PCP kpọrọ oku ka akagbuo ntuliaka e mere na Rivas n'ihi na ihe karịrị otu nde bụ ndị anapụrụ ikike itụ vootu dịka iwu siri dị.

Ebe foto si, @officialpdp/Facebook/GettyImages
Kebbi na Zamfara ekwuola uche ha
Steeti abụọ ndị a dị na mpaghara ugwu Naịjirịa ahọrọla APC dịka otu ndọrondọrọ masịrị ha
na Kebbi
APC- 581,552
PDP - 154,282
YPP - 276
AAC - 130
ACP - 99
na Zamfara
APC: 438,682
PDP: 125,423
AAC: 186
ADC: 186
ADP: 102
A kagburu ụfọdụ ebe na Sokoto maka na vootu karịrị ndị denyere aha.

Ebe foto si, Atiku/Buhari on Twitter
Onye ọrụ Inec na-achịkọta vootu na Sokoto kwuru na ọkpụrụọchịchị Sokoto-South e nweghị isi n'ihi na mgbe a na-eme mgbakọ, a chọpụtara na ọnụọgụgụ vootu karịrị ndị denyere aha ịtụ vootu nke Bekee kpọrọ "over-voting"
N'agbanyeghị mkpesa a, APC jiri ihe karịrị otu puku narị vootu gafe PDP iji zọta steeti ahụ.
APC: 490,333
PDP: 361,604
Bayelsa na Delta kwụ gịdigba n'azụ PDP
Bayelsa na Delta bụ steeti abụọ gbara onwe ha gbataobi hara PDP na ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Ọ dị ka ha enwere otu obi dịka ha si họrọ otu PDP na ntulika e mere
Lee ọnụgụgụ ntuliaka ha ebe a
Delta
APC: 221,292
PDP: 594,068
Bayelsa:
APC: 118 821
PDP: 197933
Ndị denyere aha ha: 923,182
Vootu niile a tụrụ: 344,237
E nwere nsogbu n' ọnọdụ atụm vootu ise. Ndị o metụtara dị 3369.
Na Borno, APC nwe isioche.
Borno bụ steeti ama ama na-enwe nsogbu Boko Haram mana ha pụtara họrọ Muhammadu Buhari dịka onye ha chọrọ n'agba anọ n'abịa.
Lee ihe ọnụọgụgụ na-ekwu
AAC: 269
ADC: 301
ADP: 75
APC: 836,496
PDP: 71,788
SDP: 322

Ebe foto si, @OFFICIALAPCNG
Cross River na Akwa Ibom jisiri Atiku ike
Na Cross River, dịka onye 'collation officer ha siri kwuo, atụghị vootu n’ọnọdụ atụmvootu iri abụọ na isii.
Na Bakassi, ndị mmadụ ekweghị ka e were card reader mee ntuliaka.
Ndị nke a metụtara dị 132,189. E nweghi ntuliaka na ọgbọ iri abụọ n'isii na Krọs Riva
Ihe ruru mmadụ puku ise enweghi ike ịme ntuliaka.
Lee ọnụọgụgụ ya ebe a:
PDP: 295,737APC:117,302

Ebe foto si, @MrUdomEmmanuel
Akwa Ibom Steeti
N'agbanyeghị nsogbu dapụtara n' Akwa Ibom ebe anwụchiri otu onye ọru Inec tie ya ihe, PDP ka meriri ebe ahụ site n'ọnụọgụgụ a:
PDP 395832APC 175,429
Ndị agha Naijiria ghara ụgha - Wike

Gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas agọọla ebubo ndị agha Naijiria boro ya na ya mere wuruwuru na ntukliaka e mere na Febụwarị 23, na steeti ahụ.
Wike kwukwara na ebubo na ya nyere ndị agha aka azụ iji gbuchie ha ọnụ banyere ndị Inec adigboroja ha na-ekwu na ha nwụchiri bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ.
Ọ siri na ebubo niile ahụ bụ iji maja ha maka ntuliaka gọvanọ ka na-abịa abịa.
N'ehihie taa bụ Tuzde, ndị agha Naijiria ngalaba nke 6 Division kwuru na ha nwuchiri ndị sị na ha bụ ndị Inec adgboroja ka ha bu akwụkwọ ntuliaka ọkwa onyeisiala na Pọtakọt.
Ụmụ Naijiria jụnụ mpụtara Inec kpọpụtara ma ha ewepụta ngụkọ nke card reader - PDP

Ebe foto si, PDP/Facebook
Otu PDP akpọọla oku ka-eme nyocha banyere ihe wuruwuru mere na ntuliaka ụbọchị satode.
Ha kwuru na ha ji ihe akaebe igosi na ndị APC mere nrụrụaka dị iche iche na ntuliaka a nke gụnyere ịkagbu vootu PDP, emeghi ntuliaka ma nwee ọnụọgụgụ, ọnụọgụgụ ndị mere ntuliaka karịrị ndị debanyere aha na ndị ọzọ.
Ha kwuru na ihe ndị a metụtara gụnyere Zamfara, Borno, Platu, Nassarawa nakwa na Kebbi.
Otu PDP na-ekwu na ha chọrọ mmegharị ntuliaka ọzọ n'ụzọ ziri ezi.
PDP kwechiri aka na Taraba
Dịka ohere dị n'etiti PDP na APC na-agbalite, PDP emeriela na Taraba iji mechinata ohere ahụ.
AAC - 116
ANN - 35
APC - 324,906
PDP - 374,743
YPP - 80
Ndị denyere aha - 1,777,105
Ndị tozuru ịtụ vootu - 756,111

Ebe foto si, @Atiku
APC echiela PDP ọnụ n'ala na Kano na Katsina

Lee ihe ọnụọgụgụ na-egosi na Kano
APC - 1,464,768
PDP - 391,593
YPP - 200
Nke Katsina
APC - 1,232,133
PDP - 308,056
YPP - 61
Platu aharala otu PDP
Na Platu steeti ndị pụtara ịtụ vootu egosila na ha kwụ chịm n'azụ Atiku.
Lee ihe mpụtara si ebe ahụ na-egosi.
AAC - 268
ANN - 796
APC - 468,555
PDP - 578,665
Ndị denyere aha 2,423,381
Ndị tozuru ịtụ vootu 1,074,042
Ndị Benue siri Buhari na o zuola

Ebe foto si, Getty
Nkọwa foto, Atiku meriri Buhari na Benue Na Benue steeti ,Ndi ala ahụ jiri vootu ha kwuo na ha achọzịghị Buhari dịka Atiku nke PDP jiri vootu 9,149 merie Buhari.
APC: 347,668
PDP: 356,817
Ndị denyere aha 2,391,276
Vootu niile a tụrụ: 34,960
Vootu a tụrụ dị mma : 728,912
Vootu a kagburu : 763,872 172
Ndịagha Naijiria na-ebo Wike ebubo wuruwuru na Rivas steeti
Ndịagha Naijiria ngalaba nke '6 Division Nigeria Army dị na Pọthakọt ebola Gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas ebubo iji ndị Inec adịgboroja arụ ọrụ na ntuliaka 2019.
Nke a mere oge ha kpọrọ ndị ntaakụkọ ọgbakọ n'ogige ha dị na Pọtakọt nke ha gosiri ụbọchị Tuzde n'ihe onyonyo televishọn dịka ọ na-eme.
Aha onyonyo, 6 Division Nigeria Army: Ndị a na-ebo na ha bụ Inec Adịgboroja etiela mkpu Buhari meriri n'Ogun ebe Atiku meriri n'Edo

Ogun steeti
AAC - 3,196
ANN - 1,509
ACPN - 914
APC - 281,762
PDP - 194,655
Ndị denyere aha: 613,397
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 564,256
Edo steeti
AAC - 3,106
ANN - 273
APC - 267,842
PDP - 275,691
YPP - 531
Ndị denyere aha - 604,915
Ndị a nabatara ịtụ vootu - 560,711
Inec agụwala vootu ọzọ
