Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari

Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa

  1. A na-emegide ndị Igbo na Legọs?

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị amabeghị ndị ha bụ na-achụgharị ndị mmadụ na mpaghara Aguda dị na Legọs.

    Ha kwuru na a na-achụpụ ndị Igbo makana ụjọ na-atụ ha na ha agaghị atụnyere APC.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

  2. Moghalu atụọla vootu, Ohuabunwa atụbeghi

    Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa Onyeisiala emechaala tụọ vootu.

    Mana Sinetọ Mao Ohuabunwa na-anọchite anya ndị Abịa Nọt n'ụlọomeiwu ukwu, ekwuola na ọ tụbeghi vootu.

    Ohuabunwa kwuru na ebutebeghi ngwaọrụ e ji atụ vootu n'ọgbọ ntuliaka ya n'Arọchukwu.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Ndị uweojii na ndị Inec ezipula akara enyemaka ha

  4. Fela Durotoye atụọla vootu, Durotoye na-azọ ọkwa onyeisiala.

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

  5. Fashola atụọla vootu

    Babatunde Fashola chịburu Legọs steeti ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka ọkụ ugbua, na nwunye ya bụ Abimbola bịara tụọ vootu na wọọdụ ya bụ G3, Unit E002, na 'State Junior Grammar School" nke dị n'ltolo dị na Surulere na Legọs.

    Fashola
    Nkọwa foto, Fashola chịrị Legọs afọ asatọ
  6. T.A Orji abịala itụ vootu mana rịkọm dị na ya

    Aka chịburu Abịa steeti na onye na-azọ oche n'ụlọomeiwu ukwu bụ T.A Orji, rutere ebe o kwesịrị ịtụ vootu mana isi apụtaghị.

    Ndị ọrụ Inec ebutebeghi ngwaọrụ a ga-eji tụọ vootu.

    T.A Orji
    Nkọwa foto, T.A. Orji kwesịrị ịtụ vootu n'Ugba Praịmarị School
    T.A Orji
    Nkọwa foto, T.A Orji tụgharịrị banye n'ụgbọala ya, mana ọ sị na ọ ga-abịaghachị tụọ vootu
  7. Anyị ga-anabata onye ọbụla meriri na ntuliaka a - Osinbajo

    Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo na nwunye ya bụ Dolapo atụọla vootu ha na Legọs.

    O kwuru na ọ ma na ndị Naijiria ga-enye Buhari ikike ịchị ọzọ.

    Osinbajo
    Nkọwa foto, Osinbajo kwuru na ntuliaka na-aga nke ọma ebe ọ nọ.
    Osinbajo
    Nkọwa foto, Osinbajo tụrụ vootu ya na Victoria Garden City na Legọs
    BBC
    Nkọwa foto, Osinbajo na ndị otu ya
    BBC
    Nkọwa foto, Osinbajo kwukwara na obi dị ya ụtọ ka ntuliaka a sị aga
  8. Okorocha atụọla vootu n'Ekenta, Ogboko

    Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo steeti atụọla vootu na wọodụ ya bụ Ekenta "polling unit 2" n'obodo ya bụ Ogboko.

    O kwuru na obi kwụsịrịya ike na ọ ga-emeri na ntuliaka a.

    Okorocha
    Nkọwa foto, Okorocha na-azọ ọkwa sinetọ nke Ọdịda Anyanwụ n'Imo steeti.
    Okorocha
    Nkọwa foto, Okorocha na-azọ ọkwa a n'okpuru APC
  9. Ndigbo bi n'Ajao Estate,Oshodi,Surulere, Ajegunle,Orile-Iganmu na Legọs pụtara n'igwe

      • Onye dere ya, Uche Akolisa
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
    Ndị na-ebinye aka n'Amuwo Odofin Na Legos
    Nkọwa foto, Otụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Igbo apụtala n'Ajao Estate, Oshodi,Surulere, Ajegunle,Orile-Iganmu sị na Legos ebe ha na-achọpụta aha ha n'akwụkwọ Inec.
    Ndị chọrọ ịtụ vootu
    Nkọwa foto, Igwe mmadụ pụtara maka ntuliaka a n'Ajao Estate bụ ebe ọtụ ndị Igbo bi

    N'ebe ehihie, ndị agboro bidoro ọgbaghara n'ebe ụfọdụ Ndigbo bị na Legọs dịka Alafia Street dị n'Orile-Iganmu, baba-Ewe dị n'Ọkọta, ebe ha chụsasịrị ndị mmadụ buru igbe vootu a tụrụ atụ wụnye n'ọwa mmiri, ebe ha suru ụfọdụ ọkụ.

    Nwa afọ Igbo bụ Rita Orji onye banyere n’afọ 2015 ịnọchite Ajeromi-Ifelodun n’Ụlọomeiwu Nta meriri na ward ya na 3 Swamp Street dị n’Ajegunle.

    Rita Orji

    Ebe foto si, Rita Orji

    Nkọwa foto, Ajeromi-Ifelodun n’Ụlọomeiwu Nta
  10. Ike Ekweremadu atụọla vootu ya na Mpu

    Ike Ekweremadu
    Nkọwa foto, Ekweremadu na-azọ ọkwa Sinetọ n'Ọdịda Anyanwụ nke Enugu steeti
    Ike Ekweremadu
    Nkọwa foto, Ike Ekweremadu na-azọ ọkwa n'okpuru PDP
  11. Ewo! Mmadụ ole nọ n'ime ụgbọala a?, N'Abia steeti, ndị na-efe ala nna karịrị iri si n'ime azụ otu ụgbọala na-arịpụta.

    Ndị NYSC
    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị na-efe ala nna ha so n'ime ndị ọrụ INEC na ntuliaka a
    Ndị ntorobia NYSC
    Nkọwa foto, Ndị ntorobia NYSC
  12. 'Inec meenu ihe unu kwere nkwa ya' - Moghalu, Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa onyeisiala atụbeghi vootu maka ndị Inec

    Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa onyeisiala atụbeghi vootu makana ọ sị na ndị Inec abịaghị n'oge.

    O dere na Twitter na ọ tụbeghi vootu na wọọdụ ya dị na Nnewi Nọt makana igwe e ji eme ntuliaka bụ "card reader", anaghị arụ ọrụ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Onye ọzọ nọ n'Abagana dịkwa n'Anambara steeti, kwuru na a gwara ha na igwe ntuliaka anaghị arụ ọrụ.

    O kwuru na ihe a akpasuola ndị pụtara isonye na ntuliaka iwe.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  13. Atiku ebinyela aka n'akwụkwọ

    Atiku Abubakar ebinyela aka n'akwukwọ n'Ajiya n'ime Yola Nọt.

    O kwuru na ọ ga-anabata onyeọbụla nwere mmeri na ntuliaka a; ma ọ bụ ya ma ọ bụghị ya.

    Atiku ndị otu ya
    Nkọwa foto, Atiku na ndị otu eruola ebe
    Nwunye Atiku bụ Titi
    Nkọwa foto, Nwunye Atiku bụ Titi, so ya bịa mee ntuliaka
  14. 'Ndi ntaakụkọ cheretụnụ' - Ndị agha n'Ebonyi steeti, 'Ekweteghị na anyị bụ ndị ntaakụkọ n'ezie' - Onye ntaakụkọ BBC

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu ugbua na ndị uweojii na ndị agha Naịjịrịa egbochiela ụzọ ndị ntaakụkọ na-arụ ọrụ n'Uburu dị n'Abakaliki.

    Ndị nche a na-ekwu na onweghị onye ọbụla n'ime ha ga-arụ ọrụ ebe ahụ makana ha chọrọ ịma n'ezie ma ha bụ ndị ntaakụkọ INEC nyere ikike ịrụ ọrụ n'ebe ahụ n'ezie.

    Ha na-ekwu nke a n'agbanyeghị na onye ntaakụkọ BBC gosiri ha akwụkwọ ikike ya dịka onye ọrụ ntaakụkọ.

    Ndị ntaakụkọ
    Nkọwa foto, Edi a jiri ndị ntaakukọ
  15. Si n'ọnụ ndị ntaakụkọ BBC nụrụ ihe na-eme na mpaghara ọwụwa-anyanwụ ebe a, Mkparịtaụka na-aga n'etiti ndị ntaakụkọ BBC na onye ọnụ na-eru n'okwu.

    Sonye anyị na Facebook anyị bụ BBC News Igbo.

  16. Ihe ise a nwere ike ịkpọga gị mkpọrọ taa, Ị ma ihe ị na-ekwesịghị ime ma i ruo ebe a na-eme ntuliaka?

    Ntụliaka a nwere ike ịbụ nke mbụ ị na-esonye maọbụ ọ bụrụ na i meela ya ugboro ugboro, mana ị ma ihe ndị nwere ike ibutere gị nsogbu ebe ahụ?

    Gbanarị ihe ise a:

    1) Aghọgbula onye ọbụla na ị bụ onye ụlọọrụ Inec: Marakwa na aka kpara gị ka ị na-aghọgbu ndị mmadụ n'ụzọ a, ị ga-akwụ iwu otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ.

    2) Iji akwụkwọ mbinyeaka: E jide gị ka i ji akwụkwọ mbinye aka (ballot paper) nke ị na-enweghị ikike ijide, ị mara na ị nọ n'ezigbo ofe dị ọkụ.

    Igwe ntuliaka a na-akpọ card reader

    3) Iji ngwaagha bịa: ị kwesịghị iji ngwa-agha maọbụ ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ bịa.

    4) Inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntụliaka gị: Ị daala iwu ma inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntuliaka gị nke a na-akpọ "PVC" ka o were mee ntuliaka.

    5) Iburu ngwaọrụ e ji eme ntụliaka: E jide gị ebe ị pụnarịrị ngwa ọrụ e kwesịrị iji eme ntuliaka, ị dabanyela n'ezigbo nsogbu.

  17. Goodluck Jonathan atụọla vootu nke ya, Obi adịghị m mma maka ntuliaka a - Jonathan

    Goodluck Jonathan bụ onye chịburu dịka onyeisiala Naijiria atụọla vootu nke ya n'Otuoke, Bayelsa steeti.

    Jonathan kwuru na obi adighị ya ụtọ ka ntuliaka si aga.

    O kwukwara na Naijiria kwesịrị igba mbọ hụ na a turu vootu n'ụdọ, nke ga-eme ka uwa nabata onye ọbụla ga-enwe mmeri na ntuliaka a.

    Goodluck Jonathan
    Nkọwa foto, Jonathan na nwunye ya bụ Peace turu vootu ha
  18. Ka atụmvootu sị aga n'Anambra na Umuahia, Ndị mmadụ apụtala n'ọtụtụ obodo na-atụ vootu

    Ndị na-ebinye aka n'akwụkwọ
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ ebidola ibinye aka n'akwụkwọ n'Umuoramma dị n'Ọka II n'Ọka Saut.
    Ndị chọrọ ibinye aka
    Nkọwa foto, Ka o si dị ugbua, ndị mmadụ ka chị aka n'abụ n'Umuahia Nọt Abia Steeti, ebe ha na-eche ndị ọrụ INEC n'Ugba Praimarị skul.
    Ndị na-atụ vootu
    Nkọwa foto, Ntuliaka ebidola n'Umuoramma Ọka II n'Ọka Saụt ebe ọtụtụ ndị mmadụ pụtara na-ebinye aka ha.
  19. Onye ga-enyere ndị Ibeku East aka?

    Ka ọ dị ugbua, onweghị ndị ọrụ INEC ruterela na wọodụ 1 dị n'Ibeku East, n'okpuruọchịchị Umuahia Nọt nke Abia Steeti, ndị mmadụ apụtala ịtụ vootu kemgbe elekere asaa nke ụtụtụ, mana enwebeghi onye ọrụ Inec ọbụla a hụrụ anya.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu na obi agbawaala ọtụtụ ndị mmadụ pụtara n'ụtụtụ a na-eche ndị ọrụ INEC.

    Ibeku East wọọdụ 1
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ nọ ala na-eche ka ndị ọrụ INEC bịa na wọọdụ ahụ
    Oche ndị ọrụ INEC
    Nkọwa foto, Nnukwu iwe dị n'obi ndị Ibeku ugbua maka ihe a INEC na-eme
  20. Peter Obi atụọla vootu n'Agulu, Peter gwara onye ntaakụkụọ BBC Igbo okwu ka ọ tụchara vootu.

    Peter Obi
    Nkọwa foto, Peter Obi gwara BBC Igbo na o meriri ma o merighi, na ihe dị mkpa bụ ka uche Naịjirịa bịa na mmezu.
    Ụmụnwaanyị ga-atụ vootu
    Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị a pụtara ịtụ vootu na wọọdụ ebe Peter Obi ga-anọ mee ntuliaka.
    Ọgbọ ntuliaka
    Nkọwa foto, Ọgbọ ntuliaka ebe Peter Obi ga-anọ atụ vootu
    Akwụkwọ mbiny aka
    Nkọwa foto, Akwụkwọ mbinyeaka eruola Agulu bụ ebe Peter Obi ga-atụ vootu nke ya.