Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari
Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa
Buhari akụpụla Atiku eze na Bauchi na Legọs
Ebe foto si, Getty Images
Bauchi Steeti
AAC - 183
ANN - 46
APC - 798,428
PDP - 209,313
YPP - 112
Ndị denyere aha: 2, 453, 512
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 1,075,330
Lagos steeti
AAC - 8,910
ANN - 6,946
APC - 580,825
PDP - 448,015
YPP - 5,733
Ndị denyere aha - 6,313,507
Ndị a nabatara ịtụ vootu - 1,196,490
A ga-atụgharị vootu n'Imo North - INEC, Cheta na ọ bụ ebe a ka a gbara ụlọọrụ Inec ọkụ na Febrụwarị 24, 2019.
Ụlọorụ Inec ekwuola na a ga-atụgharị vootu na mpaghara Imo Nọt maka mmerụaka dịka ntọrọ ndị ụlọorụ Inec, iburu igbe ntuliaka na wuruwuru dapụtara ebe ahụ.
Onye ụlọọrụ Inec bụ Emmanuella Opara kwuru na a ga-emegharị ya bụ ntuliaka n'ime okpuruọchịchị obodo isii gụnyere Isiala Mbano, Ihitte Uboma na Obowo.
O kwukwara na a ga-atụ vootu n'ọgbọ ntuliaka isii dị n'Ọkigwe nakwa Ọnụimo.
Ekwuputabeghi ụbọchị a ga-atụgharị ya bụ vootu.
Atiku azaala aha nna ya n'Adamawa
Adamawa steeti
AAC: 282
ACPN: 138
ANN: 1620
APC: 378,078
PDP: 410,266
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 874,920
Vootu a tụrụ dị mma: 811,534
Saraki achịliela aka elu 'ekwela m, unu emeriela m', Bukola Saraki bunyere ndị meriri na ntuliaka chụpụrụ ya n'oche ọchịchị ụlọomeiwu ukwu.
Saraki kwukwara na ọ ka kwụ ndị na-azọ ọchịchị n'okpuru PDP na Kwara steeti n'azụ, ọkachasị ndị nke ga-eso mee ntuliaka nke ụbọchị Maachị 9.
Ọ kpọkukwara ndị Kwara steeti ka ha pụta n'igwe nye ha nkwado.
PDP ekurula obere ume ndụ n'Oyo steeti
Oyo state
AAC: 4,014
ANN: 1,896
APC: 365,229
PDP: 366,690
YPP: 1608
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 905,007
Vootu a tụrụ dị mma: 836,531
Sowore na-azọ ọkwa onyeisiala sị na ntuliaka a ezighi ezi, Imo steeti ga-alaghachịta n'elekere itoolu nke ụtụtụ Monde.
Omoyele Sowore kwuru na ntuliaka a agaghị n'anya ya maka na ndị "meriri anaghị aṅụrịnwu."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ọrụ ka na-aga n'ihu n'ụlọomeiwu n'agbanyeghi, Bukola Saraki na Ike Ekweremadu gara ọrụ taa n'agbanyeghi na Saraki agaghị alọghachi.
APC akụpịala PDP na ndị ọzọ anya na Kaduna
Kaduna steeti
AAC - 243
ANN - 261
APC - 993,445
PDP - 649,612
YPP - 196
Ndị denyere aha: 3,861,033
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 1,757,868
APC meriri na Jigawa
Jigawa Steeti
AAC - 226
ANN - 66
APC - 794,738
PDP - 289,895
YPP - 67
Ndị denyere aha: 2,104,889
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 1,171,801
Ihe a tụtara na Niger steeti
Niger State
AAC - 324
ANN - 145
APC - 612,371
PDP - 218,052
YPP - 113
Ndị denyere aha: 2,375,568
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 911,964
E jirila Niger steeti malite mkpọpụta mpụtara n'Abuja, Sonye ebe a
'Naịjirịa kwesịrị ime karịa etu a na ntuliaka'
Ndị si ngalaba Commonwealth na-ele ka ntuliaka si aga na Naịjirịa, ekwuola na Naịjirịa kwesịrị ime karịa etu ha mere.
Ha kwukwara na enwere ebe ọgbaghara, ọkachasị nke butere ọnwụ ndị mmadụ, dapụtara.
N'ozi ha zisara, ha kwuru sị "mwakpo na mmegbu enweghi ọnọdụ n'ọchịchị onyekwuoucheya."
Ha kwukwara sị na ha hụrụ ihe ndị dịka ebuteghi ngwaọrụ ntuliaka n'oge, igwe ntuliaka arụghị ọrụ ọfụma nakwa etu ndị ụlọorụ Inec si ghara ikwusa ozi ọfụma maka mgbanwe oge e ji atụ vootu n'ụfọdụ ebe.
Mana n'ime ihe niile, ha kwuru na ndị Naịjirịa nwetara ohere iji gosiputa uche obi ha site n'iji ikike ha mee ntuliaka a.
Vootu niile a tụtara n'Imo steeti
APC: 140,463
PDP: 334,923
Ndị denyere aha: 2,037,563
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 585,741
Vootu niile a tụrụ dị mma: 511,566
Vootu a kagburu: 31,191
Vootu niile a tụụ: 542,777
Ụlọọrụ nchịkọta INEC dị n'Abuja ga-amalite ọrụ n'elekere iri nke ụtụtụ a
Mahmood Yakubu bụ onyeisi ụlọorụ Inec kwuru na ha ga-eji mkpọpụta vootu a tụtara na Platu steeti malite.
O kwukwara na ha nwere olileanya na ha ga-enweta mkpokọta mpụtara si na steeti ndị ọzọ a na-akpọpụtabeghi, taa.
Onyeisiala Muhammadu Buhari gara ile etu ihe si aga, Ọ gara ebe ndị na-arụrụ ya ọrụ maka ntuliaka a nọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of Instagram post
Gere ga-amasị gị taa n'otu nkeji
Vootu niile a tụtara n'Anambara steeti, Mgbakọ vootu niile a tụtara n'Anambara
APC: 33,298
APGA: 30,034
PDP: 524,738
YPP: 4,091
Ndị denyere aha: 2,389,332
Ndị a nabatara ịtụ vootu: 675,273
Vootu niile a tụrụ: 625,035
Vootu niile a tụrụ dị mma: 605,734
Vootu a kagburu: 19,301
Mpụtara Idemili North ji aka n'osisi
Dịka a na-akwado imecha ngụkọ vootu niile a tụrụ n'Anambara steeti, nke Idemili-North ka na-enye nsogbu.
Onye nọchitere anya APC na steeti ahụ bụ Chris Ngige ka jisike a gbagha mpụtara ahụ nke a gụkọrọ.
Dịka ọ dị ugbua, a gaala ezumike obere ọzọ na ngụkọ vootu ahụ.
PDP ajụla mpụtara ntuliaka a na-akpọpụta.
Onyeisioche otu PDP bụ Uche Secondus ezipụla ozi na-ajụ mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala dịka a na-akpọpụta ya ugbua.
O si n'akara Facebook nke PDP we zipu ya bụ ozi.
Gụọ ya n'uju ebe a.
Udo alọghachila n'Oshodi, Legọs.
Nkọwa foto, Udo alọghachiela n'Ahia Oshodi,Legọs
Eze Ndígbo Oshodi-Isolo bụ Reuben Ibeakama, onye tinyere ọnụ n'iweta udo na mpaghara ahụ gwara BBC Igbo na ya na ndị ndú ndị Yoruba akpaala ha were kwe nkwa udo ma rịọ Ndígbo ka ha mepee ọdọahia ha.
Nkọwa foto, Ndị ahịa na-arụzị ihe ndị agboro kuturu n'Ahịa Oshodi n'ụtụtụ Monde
Ọtụtụ n'ime ha emeela ahịa ha oge BBC Igbo rutere mana egwu ekweghị ụfọdụ mepee,ebe ụfọdụ na-arụkwa ihe ndị e mebiri.
Cheta na ọ bụ n'ụzọ ụtụtụ Monde ka ọgbaghara dapụtara n'ahia Oshodi dịka ndị agboro na ndị ntorobia e chere na ha bu ndị Yoroba ji mma na osisi wakpọ ma chụsasia Ndigbo na- azu na-ahịa.
Ebe foto si, Reuben Ibeakama
Nkọwa foto, Eze Ndigbo, Oshodi-Isolo bụ Reuben Ibeakama agwaala Ndigbo na-azụ ahịa n'Oshodi ka ha mepee odọ ahịa ha.
Ọnụ na-ekwuru APC na Legọs bụ Joe Igbokwe gwara BBC Igbo na aka ndị ndu pati ha na Legọs adịghị na ọgbaghara ahụ.
Ọ sịrị, ”O nweghị ezigbo mmadụ ga-asị ha gaa mee ihe a ha na-eme.“
Ọ bụghị iwu na ị ga-atụ nyere otu pati. Ọ bụ ọchịchị onyekwuouche anyị ka a no na ya.”
mbọ BBC gbara inweta uche ndị uweojii Legọs amịtaghị mkpụrụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Chike Oti azaghị ekwentị ya nke ọ na-aza ozi anyị zigara ya n'ekwenti.