You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
ABSUTH: Ngalaba NLC azaghachila gọọmentị Abia steeti
Otu jikọrọ ndị ọrụ n'Abia steeti azaghachila gọọmentị steeti ahụ maka iwu ọhụrụ 'no work, no pay' ha tinyere n'ụbọchị Tuusde.
Onyeisioche otu ahụ bụ Uchenna Obigwe gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha agaghị agba nkịtị gbasara ya bụ iwu.
Obigwe kwuru na ọ bụ n'ihi na otu NLC nke gburugburu Naịjirịa gbara nkịtị mgbe gọọmentị etiti kwụrụ ndị nkuzi Mahadum ọkara ụgwọ ọnwa na Nọvemba mere ndị Abia steeti ji were chọọ ịme otu ihe ahụ.
"Mụnwa na onwe m ga-eme ka ọ nwebeghi ihe m nụrụ rue mgbe ha zitere m ozi gbasara iwu 'No work no pay' ahụ, mgbe ahụ, anyị amara ihe anyị ga-eme" ka o kwuru.
"Ọ dịghị mma maka na ihe ọ pụtara bụ na mmadụ mejọọ gị dịka onye ọrụ, ị gaghị enwe ọnụ okwu" ka o kukwara.
Cheta na gọọmentị Abia steeti ziputara ozi n'ụbọchị Tuusde na-ekwu na ha ga-amalite atụmatụ 'no work no pay' maka ndị ọbụla na-agba abụbụ ọrụ.
Ozi a nke Chris Ezem bụ Odeakwụkwọ nke steeti ahụ binyere aka kwuru sị na ịgba abụbụ ọrụ ahụ bụ nke na-ebute nsogbu ma na-eseghachi steeti ahụ azụ.
"Iji ma atụ, kemgbe gọọmentị a batara n'ọkwa, ABSUTH na-agba abụbụ ọrụ kemgbe ọnwa iri abụọ na otu ebe ndị dọkịta na-agba abụbụ ọrụ kemgbe ọnwa iri abụọ na ise" ka ozi ahụ kọwara.
"N'agbanyeghi nke a, gọọmetị jisike na-akwụ ụgwọ ọnwa ndị ABSUTH ihe ruru ọnwa iri atọ na anọ nakwa ndị Dọkịta ihe ruru ọnwa iri atọ na ise.
Nke a mere ka Gọvanọ Okezie Ikpeazụ manye iwu a na nsonso ebe niile na steeti ahụ.
N'ime otu akwụko ozi ahụ, gọọmentị Abia steeti kwere nkwa ịkwụ ndị ọrụ ndị ọzọ ụgwọ ọnwa ruru ha.
"Ọ bụghị gọomentị Abia steeti kwesiri ịkwụ ndị dọkịta ABSUTH ụgwọ"
Otu jikọrọ ndị dọkịnta ekwuola na ha ga-aga abụbụọrụ n'ebe na Naịjirịa niile maọbụrụ na gọọmentị Abia steeti akwụghị ụgwọ e ji ha.
Ha kwuru na gọọmentị steeti ahụ ji ha ụgwọ ọnwa iri abụọ na anọ putara afọ abụo ma jụ ịkwụ ha ụgwọ.
Onyeisi otu ahụ bụ Emeka Innocent Orji gwara BBC sị "Ọ bụrụ na gọọmentị Abia steeti akwụghị ụgwọ a, ya atụna onye ọbụla n'anya na anyị ga-akwụsị ọrụ ileta ahụike na Naịjirịa niile maka ya. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee otu a jikọrọ anyị, njọ e mere otu bụ njọ e mere anyị niile."
Orji kwukwara na gọọmentị ekwebuola ha nkwa ịkwụ ụgwọ ọnwa abụọ mgbe ha meburu abụbụọrụ nwa oge mana ha tụgharịrị azụ kwuo na "ego adịghị".
Gịnị ka gọọmentị na-ekwu?
N'aka nke ha, gọọmentị Abia gwara BBC na o nweghi onye ha ji ụgwọ na steeti ahụ.
Kọmịshọna mgbasaozi bụ Eze Chikamnayo sị "o nweghi onye ọrụ gọọmentị ọbụla e ji ụgwọ".
Ọ sị na ọ bụ ndị na-erụ n'okpuru ngalaba dị icheiche na-enwe nsogbu iji ụgwọ na steeti ahụ.
"Anyị nwere ndị dọkịta na-arụrụ gọọmentị ọrụ site na ngalaba ahụike, o nweghi ụgwọ e ji ndị ahụ" ka o kwuru.
Chikamnayo kwukwara na ọ bụghị ọrụ gọọmentị ịkwụ ndị ahụ nọ na ngalaba ụgwọ ọnwa n'ihi na nwere iwu ndị hibere ha ma nyekwa ha ikike ịkpata ego nke ha ịkwụ ndị ọrụ ha ụgwọ ebe gọọmentị nwereike ị na-enyere ha aka site n'inye onyinye.
Nke a pụtara na Abia state University Teaching Hospital and Health Management Board bụ ụdịrị ngalaba ahụ kwesiri ịkpata ego nke ha gụnyere ịkwụ ndị dọkịta ụgwọ.