Ndekọ ihe otu egwu bọọlụ ndị si mpaghara Afrịka nwetere n'asọmpi Iko Mbaụwa

    • Onye dere ya, Henry Okonkwo
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ka Iko Mbaụwa 2026 na-aga n'ihu, ọtụtụ ndị na-ele anya ịmata otu egwu bọọlụ maọbụ ọgbabọọlụ si mpaghara Afrịka ga-emebi ụfọdụ ndekọ ndị e debere kemgbe ọtụtụ afọ asọmpi ahụ bidoro.

Ndị a bụ ụfọdụ n'ime ndekọ kachasị mkpa otu egwu bọọlụ ndị Afrịka nwetere n'akụkọ asọmpi Iko Mbaụwa:

Moroko: Otu egwu bọọlụ Afrịka kachasị ruo n'ogogo dị elu

Moroko mere ihe akụkọ n'afọ 2022 mgbe ha ghọrọ otu egwu bọọlụ Afrịka na Arab mbụ rutere n'agba nke anọ n'asọmpi Iko Mbaụwa. Ha gbachara asọmpi ahụ n'ogogo nke anọ, nke ka bụ ndekọ kachasị mma otu Afrịka nweterela.

Roger Milla: Onye Afrịka kachasị nye goolu mgbe o mere agadị

Onye a ma ama na Kameruun bụ Roger Milla bụ ọgbabọọlụ kachasị mee agadị sụnyere goolu n'akụkọ asompi Iko Mbaụwa. Ọ sụnyere goolu ahụ megide mba Rọshịa n'asọmpi USA 1994 mgbe ọ dị afọ iri anọ na abụọ.

Essam El-Hadary: Ọgbabọọlụ Afrịka kachasị mee okenye

Onye ochegoolu Ijipt bụ Essam El-Hadary, ghọrọ Ọgbabọọlụ kachasi mee okenye pụtara n'asọmpi Iko Mbaụwa mgbe ọ dị afọ iri anọ na ise n'asọmpi Saudi Arabia 2018.

Samuel Eto'o: Onye Afrịka kachasị buru nwata pụtara n'Iko Mbaụwa.

Samuel Eto'o gbara asọmpi Iko Mbaụwa mbụ ya n'afọ 1998 mgbe ọ dị naanị afọ iri na asaa.

Kameruun: Otu egwu bọọlụ Afrịka kachasị pụta n'Iko Mbaụwa

Kameruun eruola Iko Mbaụwa ugboro asatọ, karịa mba Afrịka ndị ọzọ. Moroko na Tunisia sochiri ya dịka ugboro asaa, ebe Naịjirịa eruola ugboro isii.

Ijipt: Otu egwu bọọlụ Afrịka mbụ sonyere n'Iko Mbaụwa

Ijipt bụ mba Afrịka mbụ sonyere n'asọmpi Iko Mbaụwa mgbe ha pụtara n'asọmpi nke afọ 1934 e mere n'Italy.

Naịjirịa: Otu egwu bọọlụ Afrịka kachasị nweta mmeri nakwa goolu

Dịka otu na-achịkọta egwu bọọlụ na mbaụwa bụ FIFA si kwuo, Naịjirịa bụ otu egwu bọọlụ dị n'Afrịka nwere mmeri kachasị ukwuu n'akụkọ Iko Mbaụwa, ma bụrụkwa otu egwu bọọlụ si n'Afrịka nyekarịsịrị goolu, nke ruru iri abụọ na atọ.

Kameruun: Kaadị odo na uhie

Kameruun nwere kaadị odo kachasị ọtụtụ n'ime ndị otu egwu bọọlụ si na mpaghara Afrịka n'Iko Mbaụwa, ruru iri isii na otu. Ha nwekwara kaadị uhie itoolu, nke mere ka ha bụrụ otu n'ime otu egwu bọọlụ kachasị nweta kaadị uhie n'akụkọ asọmpi ahụ.

Ndị Afrịka kachasị sụnye goolu n'Iko Mbaụwa:

  • Asamoah Gyan (Gana) – goolu
  • Roger Milla (Kameruun) – goolu 5
  • Ahmed Musa (Naịjirịa) – goolu 4

Ajụjụ ugbua bụ ma ndekọ ndị a ha ga-adịgide, ka ndị ọgbabọọlụ si Afrịka ha ga-emebi ụfọdụ n'ime ha n'Iko Mbaụwa nke afọ a na-aga n'ihu na mba Amerịka, Meziko nakwa Kanada.