You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Otu ndị dọkịta Naịjirịa akwụsịtụla abụbụ ọrụha malitere kamgbe ụbọchị iri

Otu jịkọtara ndị dọkịta na Naịjirịa akpọrọ 'National Association of Resident Doctors' na bekee akwụsịla abụbọ ọrụ ha ha malitere kamgbe ụbọchị iri.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị dọkịta Naịjirịa ga-agba abụbụ ọrụ ọzọ maọbụru na...

    Otu jịkọtara ndị dọkịta Naịjirịa niile akpọrọ National Association of Resident Doctors (NARD) agwaala gọọmenti etiti ka ha mezuo nkwekọrịta ha na otu nwere ọhụrụ a.

    Ha dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ na gọọmenti emezughị ya nkwekọrịta ọhụrụ a ruo izu ụka anọ , na ha ga-agba abụbụ ọrụ ebiebi.

    Onyeisi otu ahụ bụ Uyilawa Okhuaihesuyi mgbe ọ nọ n'onyonyo ụlọ ọrụ Channelstv.

    Cheta na otu ndị dọkịta ka akwụsịrị abụbọ ọrụ ha mere ruo ụbọchị iri na April 11,2021.

  2. Ụtụtụọma ụmụ Igbo!

    Nọnyere anyị taa makana anyị ga-ewetara akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ n'ala Igbo nakwa ụwa nile.

  3. Ndị ntọ atọrọla ụkọchukwu Katọlik n'Imo steeti

    Ndị ntọrị tọrọla Rev. Fr. Marcel Izu Onyeocha bụ ụkọchukwu ụka Mother theresa of Golgotha Catholic Church, dị na World Bank, Owere, Imo steeti, n'abalị Satọde bụ ụbọchị iri nke ọnwa Epreelụ.

    Akụkọ kwuru na ndị ntọ a tọrọla Fada Onyeocha ebe Ihube dị n'Okpuruọchịchị Ọkigwe, mgbe ha rituru ilele ihe na-enye nsogbu n'ụgbọala ha ji eme njem.

    Bissong Isa Atugu bụ onye ya na Fada Onyeocha so n'ụgbọala ahụ, gwara ndị uweojii na ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchị ehi si n'ọhịa pụta, wakpoo ha ma jiri mma gbukasịa ya ahụ tupu ha atọrọ ụkọchukwu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Godson Orlando Ikokwu, gwara ndị ntaakụkọ na Nasiru Mohammed bụ kọmishọna uweojii na steeti ahụ enyela iwu ka a maa imi n'ala ma hụ na a gbapụtara ụkọchukwu ahụ ma nwụchikwaa ndị kpara mkpamkpa a.

  4. Mba Benin Republic na-atụ vootu taa maka ịhọpụta onyeisiala taa

    Ndi bi na mba Benin Republic ga-atụ vootu taa bụ April iri na otu na ntụliaka nke onyeisiala a na-atụ anya na onyeisiala Patrice Talon na-achị mba ahu ugbua ga-emeri agba nke abụọ.

    Ndị ya na ya na-ama aka ekwuola na ọ chọrọ o webata nrụrụaka na ntụliaka a.

    Naanị mmadụ ka e kwere ka ya na Talon zọọ ọkwa ọnyeisiala , aha ha gụnyere Allasane Soumanou and Corentin Kohoué.bụbụ ndị ụlọomeiwu na-adịghị ewu ewu na mba ahụ.

    Ndị niile ama ama na-azọ ọkwa onyeisiala na Benin gbara ọsọ makana egwu e yiri ha ị ga nga.

    Talon kwuburu naọ bụ naanị otu agba ka ọ ga-achị mana ụgbụa ọ bụ ya ka ọtụtụ ndị Benin chọrọ ka ọ chịa ha ryo afọ ise ọzọ.

    Ụfọdụ ndị mmadụ na-eme ngagharịwe kamgbe izu ụka gara aga.

  5. Ọkụ latrik nyụrụ nakwa mmiri kwụsịrị igba maka ala nsụgharị mere na Carribean

    Ala nsụgharị abaala agba nke abụọ ya na Caribeean Island nke st Vincentdịka ọkụ latrịk ogbe ahụ nyụrụ anyụ nakwa mmiri kwụsiri ịgba.

    Nke mbụ mere n’ụbọchị Fraide gara aga ji ike chụpụ mmadụ puku iri isii na ebe obibi ha.

    A rịokwara ndị niile bi na Barbados ha nọrọcha n'ụlọ.

    Ndị ọkammụta na sayensi na-ekwu na ya bụ mgbawa na nsụgharị ala nwerike ị na-aga n'ihu n'ụbọchị ndị na-abịanụ.

  6. Otu ndị dọkịta Naịjirịa akwụsịtụla abụbụ ọrụ ọrụ ha malitere kamgbe ụbọchị iri

    Otu jịkọtara ndị dọkịta na Naịjirịa akpọrọ National Association of Resident Doctors na bekee akwụsịla abụbọ ọrụ ha ha malitere kamgbe ụbọchị iri.

    Dọkịta Uyilawa Okhuaihesuyi bụ onyeisi otu ahu gwara ndị ntaakụkọ nke a ụbọchị Saturday gara aga.

    O kwuru na ya ndị otu ya kpebiri ka akwụsịtụ abụbụ ọrụ dịka ha mechara nzụkọ ha mere ruo awa iri na ise makana na gọọmenti etiti nabatara itinye n'ụchụ nkwekọrịta niile ha na ha nwere.

    Otu a malitere abụbụ ọrụ ha n'ụbọchị April 1. 2021.

    Minista na-ahụ maka ọrụ bụ dọkịta Chris Ngige kwuru na mgbe gọọmenti etiti na ndị otu NARD nwechara nzụkọ ha ruo otu awa n'ụbọchi Satọde (April 10,2021) , ha kwetere ịkwụsị ya bụ abụbụ ọrụ.

    Otu NARD chọrọ ka gọọmenti kwụzuo ndị ọrụ ha niile nụgwọ niile ha ji ha ma nye ha ego mgbachahụ covid 19 ga-abụ ọkara ego ha na-anata n'ugwọ ọnwa.

  7. Ụbọchị ụka ọma nụ o!

    Sonyere anyị taa ka ịmata akụkọ akpụ n'ọnụ ugbua n'ala Igbo nakwa mba ụwa niile.

  8. BBC Igbo nke ehihie

    Gere akụkọ ụwa BBC Igbo n'otu nkeji.

  9. Ụfọdụ ụmụafọ Anambra ebunyela ndị uweojii steetị ha ụgbọala ha ji arụ ọrụ

    Ndị uweojii Anambra Steetị nọọrọ n'ụbọchị 8 nke ọnwa Eprelụ, afọ 2021 nata onyinye ụgbọala Hilux, Sienna na ọgbatumtum ise site n'aka ụfọdụ ndị Anambra iji nyere ha aka rụọ ọrụ.

    Onyeisis ndị uweojii n'Ihiala bụ Christopher Bassey natara onyinye ndị a n'aha kọmishọna uweojii bụ Bala Kuryas n'ụbọchị Mọnde.

    Ndị uweojii kelere ndị nyere onyinye a ma sị na ọ bịara n'oge ndị uweojii chọrọ nke ukwuu iji hụ na e chekwara Ihiala na gburugburu ya megide mpụ na ohi.

    Nke so nabata onyinye ndị a gụnyere onye gbara arụkwaghịm n'ọrụ uweojii bụ Val Ntomchukwu, Eze Thomas Obidiegwu na CSP Prince Ezejiofor.

  10. Ndị agha Naịjirịa sị na e gburu ndị otu ha mmadụ 11 na Benue Steetị

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na a wakporo ndị otu ha mmadụ nọ n'ọrụ na Benue Steetị.

    Ha sị na ndị otu ha gụnyere otu onye ndu ndịagha na ndịagha iri mmadụ iri bụ ndị a malitere na-achọ achọ n'oge ha gara ọrụ.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Mohammed Yerima wepụtara.

    Nke a mere ha ji zipu ndị ọrụ a kpọrọ 'Operation Whirl Stroke' ka ha gaa chọọ ndị otu ha mmadụ iri na otu ahụ.

    Mgbe ha ruru ebe ahụ ha hụrụ ozu ndị ọrụ ha mmadụ iri na otu ahụ ka ha tọgbọrọ n'okpuruọchịchị Konshisha dị na Benue Steetị.

    N'ihi nke a ndịagha ka na-esi imi n'ala ịchọpụta ndị gburu ndị otu ha.

    Ha kwuru na onyeisi ndịagha bụ Ibrahim Attahiru aṅụọla iyi ma zipu ndị ndu ndịagha ka ha sie imi n'ala ma chọpụta nke kpara arụ a.

    Ha rịọra ndị mmadụ ka e nyere ha aka n'ịgba ama ga-enyeaka ịchọpụta ndị omekome a.

  11. BBC Nkeji nke ụtụtụ

    Gere akụkọ ụwa nke BBC Igbo n'otu nkeji.

  12. Oke ụnwụ na ụkọ nri na-achọ ịdakwasị mba North Korea - Kim Jong-un

    Onyeisi mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-un adọọla ndị mba ya aka na ntị ka ha kwadoo maka oke ụnwụ na ụkọ nri nwereike ịdakwasị ha.

    Nke a na-abịa dịka otu otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye kwuru na ụkọ nri na nsogbu akụnaụba chere ha aka mgba n’ihu.

    Kim kwuru nke a na mgbasaozi o mere ma sị na nke a nwereike iji ụnwụ nke ga-adị ugbua tụnyere nke mere n’afọ 1990.

    Mba Nọt Korịa gbachiri obodo ha n’ihi mkpamkpa ọrịa coronavirus.

    Ọ kwụsịrị azụmaahịa ya na mba Chaịnabu otu azụmaahịa ji akụnaụba ha kamgbe ụwa.

    Tinyekwuoro mmachi azụmaahịa mbaụwa dị n’isi ha maka oke nrụpụta ogbunigwe nukulịa bụ nke ha na-eme nke ọma.

    Kim Jong-un kpọrọ ndịagha oku ha kee nkwụcha a kpọrọ ‘Arduoud March’ ma buo agha megide ụnwụ iji belata nsogbu ọ ga-enye ndị mba n’oge a.

  13. DMX anwụbeghị! - Onye na-ahaziri ya ọrụ

    Onye nhazi oti egwu DMX bụ Steve Rifkind awụọla mmiri oyi n'akụkọ na-efegharị na DMX anwụọla.

    Maazị Rifkind kwuru na ọ bụghị eziokwu ka ndị na-agbasa ozi maka ọnwụ ọkaibe na mbem a nọn'ụlọ ọgwụ a kpọrọ White Plain n'obodo Neu Yọk.

    DMX dị afọ 50 ji igwe eku ume dịka o nwetere ọdachị site n'ọgwụ ike ọ nwụfere oke.

    Akụkọ na ọ nwụọla na-ewu na Twitter kemgbe ụnyaahụ.

    Ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ dekwara na nwa amadị a nwụọla amalitela iwepu ihe ha dere.

    Maazị Rifkind sị: "Ọ naghị enyere onye ọbụla aka ị na-ahụ akụkọ ụgha ndị a. Ka ezinaụlọ a zuo ike otu abalị. Unu ga-anụ ozi ezinaụlọ ya echi."

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya aruọla DMX ọrụ ruo afọ atọ. "Biko sọ sọ ihe m chọrọ bụ ka ndị mmadụ kwụsị asịrị a niile. Ọ nọ ndụ ma jiri igwe eku ume. daalụ nụ.

    Lee ihe okwuru n'uju na Bekee:

  14. A tọhapụla ụmụakwụkwọ ise ọzọ a tọọrọ na mahadum Forestry dị na Kaduna

    A tọhapụla ụmụakwụkwọ ise ọzọ nke mahadum ọrụ ugbo dị na Kaduna Steetị nke mere ya mmadụ iri a tọhapụrụla ebe ọ kafọrọ mmadụ iri atọ na itoolu.

    Nke a na-abịa n’ime ụbọchị abụọ a tọhapụchara mmadụ ise nke mbụ n’ime ha.

    Gọọmentị Kaduna Steetị na ndị ọrụ nchekwa ekwubeghi maka ntọhapụ ha mana onye enyemaka nke onyeisi ụlọakwụkwọ ha bụ Ahmed Rufai mere ka Channels TV mata nke a.

    Rufai sị na mmadụ atọ n’ime mmadụ ise ahụ bụ ụmụnne si n’otu ezinaụlọ pụta mana o kwughi ma o nwere ego a kwụrụ n’isi ha.

    A tọhapụla ndị ụka Redeemed asatọ a tọọrọ na Kaduna

    N’otu aka ahụ ndị ụka Redeemed dị mmadụ asatọ a tọọrọ na Kaduna steetị enwerela onwe dịka onyeisi ụlọụka ha bụ Bishọp Adeboye si kwuo.

    Ngwa ngwa a tọhapụrụ ndị a , e buru ha gawa n’ụlọọgwụdịka Bishọp Adeboye gosiri obiọma ya na Twitter n’ihi nke a.

    Akụkọ sị na a tọhapụrụ mmadụ atọ n’ime ha n’ụbọchị Tusde ebe mmadụ ise ndị ọzọ pụtara n’aka ndị ntọrị a na Tọsde.

    O dobeghi anya ma o nwere ego a kwụrụ n’isi ndị a tupu a tọhapụ ha.

    Cheta na a tọọrọ ndị ụka n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Maachị, 2021 dịka ha na-aga mgbasaozi ọma n’ụzọ Kachia dị na Kaduna Steetị.

  15. Igbo ndị ọma ndewo nu

    Anyị ji aka na unu hiri ụra nke ọma.

  16. Ka chi foo

    Nọnyere anyị echi mgbe anyị ga-ewetekwara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịgụ.

    Ka chi bọọ.

  17. Akwụsịtụla ndebanye aha maka JAMB n'ihi enweghi ikike iwepụta 'pin'

    Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) bụ ngalaba na-ahụ maka ule Unified Tertiary Matriculation Examination (UTME) na Direct Entry (DE) e ji abanye mahadum agbatụla 'brake' n'ihe gbasara ndebanye aha maka ule nke 2021.

    Ha mere nke a dịka ndị tozuru ile ya bụ ule enweghi ike idebanyenwu aha ha dịka ha enweghi ike ibutunwu ebe a na-edebanye ya bụ aha na kọmputa.

    Mara na oge ndebanye aha a kwesịrị imalite n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Epreelụ ruo n'ụbọchị 15 nke ọnwa Mee, 2021.

    Cheta na Jamb oge ha na-ama ọkwa maka usoro e si ele ule nke afọ a, kwuru na onye ọbụla ga-ele ya ga-enwerịrị National Identity Number (NIN)

    N'ozi Dkta. Fabian Benjamin bụ onyeisi mgbasaozi nke Jamb zipụrụ n'Abuja, o kwuru na ọ bụ eziokwu na nsogbu a anaghị ekwe ndị mmadụ debanye aha.

    O kwuru na nkwụsịtụ a ha kwụsịturu emume a bụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha rụchara ọrụ ha na-arụ maka iwepụta 'pin' ma mmadụ debanye aha ya, tupu ha amalitekwa.

  18. Asọmpi National Sports Festival 2020 ka ga-aga n'ihu - Mịnịstrị egwuregwu

    N'egwuregwu, Mịnịstrị na-ahụ maka egwuregwu na Naịjiria ekwuola na asọmpi 'National Sports Festival' 2020 a na-eme n'Edo steeti ugbua ka ga-aga n'ihu.

    Nke a na-abịa dịka kepukepu pụtara na e nwereike ịkwụsị ya n'ihi na ego e ji emeru ya n'isi adịghị.

  19. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa n'otu nkeji

  20. Betty Akeredolu agbatụla 'brake' n'echichi 'Ada Owere' a chọrọ ichi ya

    Betty Akeredolu bụ nwunye gọvanọ Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti, agbaala 'brake' n'ihe gbasara ịnata echichi 'Ada Owere' e kwesịrị ichi ya n'Owerri, Imo steeti n'ụbọchị iri nke ọnwa a.

    O kwuru na nke a bụ maka ọnọdụ nchekwa dị n'Owerri ugbua mere o ji sị ka e cheretụ.