Vincent Obianodo: Ihe ị kwesịrị ịma maka onye nwe 'Young Shall Grow Motors'

Vincent Obianodo: Ihe ị kwesịrị ịma maka onye nwe 'Young Shall Grow Motors'

Ebe foto si, Young Shall Grow Motors/facebook

Nkọwa foto, Vincent Obianodo: Ihe ị kwesịrị ịma maka onye nwe 'Young Shall Grow Motors'
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ichie Vincent Obianodo bụ onye Igbo a ma ama ritere nzere mba Naịjirịa bụ Member Order of the Niger (MON), ihe e ji anụ ụda aha ya na Naịjirịa na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka niile bụ na ọ bụ ya nwe ụlọọrụ ndị njem na-ewu ewu nke a kpọrọ "Young Shall Grow Motors".

A mara Vincent Obianọdo dịka onye nwe ụgbọala a ma ama bụ 'Young Shall Grow Motors'

Ebe foto si, YSG/FACEBBOK

Nkọwa foto, Chief Vincent Obianodo

Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Ichie Vincent Obianodo

  • Chief Vincent Obianodo bụ onye obodo Ụmụeze dị n'obodo Neni n'okpuruọchịchị Anaọcha, dị n'Anambra steeti.
  • A mụrụ ya n'afọ 1948.
  • Ọ gara Kano steeti, bie ebe ahụ, ebe ọ nọrọ mụta ka e si edozi taya ụgbọala mebiri emebi nke akpọrọ ọrụ "vulcaniser".
  • O sitere na ya bụ ọrụ 'vulcaniser' banye n'ọrụ "ịma kọndọktọ" ọ makatara kọndọktọ ruo afọ 1972 oge o nwetara ego izụta otu ụgbọala bọọsụ nke aka ya.
  • Ọ malitere ụlọọrụ ya bụ ụgbọala ndị njem n"afọ I972, o ji naani otu ụgbọala were bido na-agba Enugwu-Onitsha.
  • Na 1973 ka ọ gara guzobe ngalaba Legọs, wee zụta ogologo ụgbọala Mercedes 911 arụrụ na Naijirịa.
Ụgbọala Young Shall Grow

Ebe foto si, YSG/FACEBOOK

Nkọwa foto, Ụgbọala Young Shall Grow

Mmubawanye azụmahịa Ichie Vincent Obianodo

  • Ọ malitere na-agba gburu gburu mpaghara ọwụwa anyanwụ ruo mgbe ụgbọala ya buru ibu.
  • N'afọ 1980, ọ malitere na-azụ ọtụtụ ụgbọala nke o ji bido ibu ndi njem site na steeti niile dị na Naijiria.
  • Taata aha 'Young Shall Grow Motors' na-agba na steeti niile dị na Naijiria tinyekwara obodo ndị ọzọ n'Afrịka dịka Gana, Mali, Bọkina Faso, mba Benin na Aivori Kost.
  • Ụlọọrụ ahụ o ji otu ụgbọala bido, nwere ụgbọala ndị njem a na-akpọ 'luxurious' bọọsụ, nakwa ụgbọala dị ichiche ndị ọzọ karịrị puku n'ọnụ ọgụ ugbua.
  • Young Shall Grow taata so na ụlọ ọrụ ndị njem kachasị nnukwu n'ọnụ ọgụ na Naịjirịa.
  • Mazi Vincent Obianodo abasaala ụlọọrụ ya wee banye na mmanụ agbịdị, gaasi, ụlọ ezumike na orire ụlọ obibi, nakwa azụmahịa ndị ọzọ.
Ụgbọala Young Shall Grow

Ebe foto si, YSG/FACEBOOK

Nkọwa foto, Ụgbọala Young Shall Grow

Lee ụlọọrụ ndị onwegasi

*Young Shall Grow Motors LTD

*Venee Gas Ltd

* ⁠Rock View Hotels

* ⁠YSG Courier Services

* ⁠YSD Properties

* ⁠Global Energy

* ⁠YSG Entertainment.

Kedụ maka ezinaụlọ Ichie Vincent Obianodo?

Agbanyeghị na nwunye Ichie Vincent Obianodo bụ Ifeoma Obianodo, alaala mmụọ, ha mụtara ụmụ ise nke gụnyere ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị.

Aha ha bụ Obiora Obianodo, Nnadozie Obianodo, Cynthia Obi-Uchendu (nee Obianodo) Chiedozie Obianodo na Chuka Obianodo.

N'agbanyeghị na ọ malitere ndụ ya dịka nwa ogbenye, site na ịrụsi ọrụ ike na iji agụgụ isi ya echepụta ihe ọma, Chief Vincent Obianodo so na ndị kachasị baa ụba n'ala Igbo taata.