Akụkọ dị mkpa - Septemba 22, 2026
Akụkọ dị mkpa - Septemba 22, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu agbakwụnyela ụbọchị ole na ole ọzọ na njem ezumike ọ gara na mba Fransi.
- Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Mọnde ma kọwaa na nke a egbochghị Onyeisiala Bola Tinubu ilebanye anya n'ihe na-eme na Naịjirịa ma kwuo na odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa bụ George Akume ga na-anọchiteanya Onyeisiala Tinubu na mmemme ọbụla.
- Ọkaikpe Joyce Abdumalik nke ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja enyela iwu ka e nyeghachi Uche Nnaji bụbu mịnịsta na-ahụ maka nkanaụzụ akwụkwọ njem passpọt ya.
- Ọkaiwu Ogwu Onoja na-anọchiteanya Uche Nnaji, kwuru na ụlọikpe kpebiri nke a iji nye Uche Nnaji ohere ịga nweta nleta ahụike ya na mba ofesi.
- Cheta na ụlọọrụ ICPC kpụpụrụ Uche Nnaji ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka nakwa ịrụ akwụkwọ asambodo adigboroja.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






