Ihe anyị ma maka nwaanyị e boro ebubo iji mma sụgbuo di ya mgbe ọ na-ehi ụra n'Aba, Abia Steeti
Ezinaụlọ Innocent Nwaoji bụ nwoke e boro nwunye ya ebubo iji mma sụgbuo ya ekwuola ihe ha ma banyere ọdachi ahụ mere n'obodo Ohuru Isimmiri dị n'Obingwa Abia Steeti.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC gara n'ụlọ ebe ihe a mere nakwa n'ezinaụlọ nwoke a nwụrụ anwụ dị n'Umuokereke nke Obingwa, ha kọwara ihe mere.
Ha kwuru na ha amaghị maka esemokwu ọbụla dị n'etiti nwoke a na nwunye ya tupu ihe a emee.
Ha kwuru na nwunye ya a kpọrọ Serah Innocent si n'obodo Ozu Abam dị n'okpuruọchịchị Arochukwu nke Abia Steeti.
Ha kwuru na di na nwunye a lụrụ onwe ha n'ọnwa Disemba afọ 2025, ihe dịka ọnwa asatọ gara aga.
Nwanne ya nwaanyị kwuru na a kpọrọ ya n'ekwentị sị ya na nwanne ya Innocent anwụọla, na nwunye ji mmadụ sụgbuo ya.
"N'ụbọchị Satọde n'ihe dịka elekere otu, ekwentị m kụrụ, Ugochukwu akpọọ m, sị m na Chibueze ya bụ Innocent anwụọla, m jụọ ya gịnị mere? Ọ na-arịa ọrịa? Kedụ etu o si nwụọ? Ya sị m na nwunye ya ji mma sụgbuo ya.
"A sị na mgbe ihe ahụ mere na nwaanyị a ji mma sugbuchaa di ya ma gbapụta sị na ọ chọrọ enyemaka. 'Landlord' ya apụta jụọ ya gịnị mere, ọ sị na ọ sụrụ di ya mma, na di ya anwụọla.
"Landlord abata n'ime ụlọ hụụ ebe di ya na-eku ume ịzọ ndụ, ọbara a na-asụpụta. Landlord apụọ gaa kpọọ ndị uweojii maka ha nọ nso, ndị uweojii anwuchie nwaanyị ahụ.
"Ndị uweojii ewere ụgbọala n'ime abalị ahụ buru ya gawa n'ụlọọgwụ dị n'Ogbor Hill. Ha gara n'ụlọọgwụ abụọ ndị ahụ ajụ ịnabata ya, sị ka ha gawa 'General Hospital'.
"Ndị uweojii eburukwa ya gawa 'General Hospital' bụ ebe ha nọ sị na ọ nwụọla na ha lawa".

Ebe foto si, Ejijah Udo
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ a malitere na nwaanyị a bụ Serah Innocent ji mma sụgbuo di ya bụ Innocent Nwaoji n'abalị Satọde 8 Ọgọst 2026.
Ndị agbataobi nọ mgbe ihe a mere kwuru na nwoke ahụ nọ na-ehi ụra mgbe nwunye ya wakporo ya jiri mma sụọ ya n'akụkọ obi.
Nke a tụrụ ndị obodo n'anya ka ụdịrị ọdachi a jiri mee.
Ihe onyonyo e ziteere BBC Igbo gosiri ebe ndị mmadụ gbakọtara na-achọ iburu nwamadị a gawa n'ụlọọgwụ ebe nwunye ya nọ n'akụkụ ya n'ebe akwa.
Otu onye ndu obodo ahụ bụ David Amaraizu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọdachi a mere n'ezie na o tinye nnukwu ụjọ n'ahụ ndị obodo.
O kwuru na otebeghi aka di na nwunye a ka lụrụ onwe ha, na ha gbara akwụkwọ n'ọnwa Disemba afọ 2025, n'ime ihe dịka ọnwa asatọ gara aga.
Ọ sị na ọ maghị ma nwaanyị a na di ya ọ na-enye esemokwu ezinaụlọ nke nwereike ime ka ọ kpaa ụdịrị agwa a.
Amaraizu gara n'ihu kwuo na a nwụchiela ya, nọ ọ nọ n'aka ndị uweojii ugbua, ebe e tinyela ozu di ya n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu.
Mana tupu akụkọ a apụta o nwebeghi ihe ndị uweojii Abia Steeti kwurula banyere ọdachi a.
Onye ntaakụkọ BBC zigaara ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Maureen Chinaka ozi mana ọ zabeghi ya ruo mgbe akụkọ a pụtara.
Ya mere akụkọ etu ihe a siri mee, ihere nwaanyị a jiri mee ya edochabeghi anya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Maureen Chinaka kwuru na ha natara mkpesa banyere ihe ma sị na ha anwuchiela nwaanyị ugbua.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ ha nke ngalaba 'State Criminal Investigation Department (SCID)' na-eme nnyocha banyere ya.































