Ntuliaka Osun steeti: Gọvanọ Ademola Adeleke akpọọla oku udo

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Facebook
Gọvanọ Ademola Adeleke na-achị Osun steeti akpọkuola onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Olatunji Disu ka ọ hụ na e mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ụzọ iwu kwadoro.
Gọvanọ Adeleke nke pati Accord kpọrọ oku a oge ọ tụrụ vootu ya na na wọọdụ 2 dị n'okpuru ọchịchị Ede Nọt n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst 2026.
O kwuru na ndị Osun steeti achọghị ọgbaaghara ọbụla na ntuliaka a ma kwuo ka ndị uweojii rube isi nye iwu banyere etu e si ebuga akwụkwọ e ji mee ntuliaka ahụ.
Gọvanọ Adeleke kwuru na akwụkwọ ntuliaka a ga-ebu ụzọ gaa wọọdụ, gaa okpuru ọchịchị tupu e buru ya gaa n'isiobodo steeti.
Najeem Salam nke pati ADC atụọla vootu ya

Najeem Salam ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa gọvanọ n'Osun steeti atụọla vootu ya na wọọdụ 04 n'okpuru ọchịchị Ejigbo na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti na-aga n'ihu na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst, 2026.
Onyeisiala Bola Tinubu agwala Inec ka ha ghara ime chandum

Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu agwala ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) na ndị ọrụ nchekwa ka ha ghara ime chandum n'ụdịrị ọbụla na ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti a na-eme n'ụbọchị Satọde 15 Ọgọst 2026.
Onyeisiala Tinubu kwuru nke a n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga wepụtara ma kpọọ oku ka Inec hụ na ntuliaka a gara n'ụzọ iwu kwadoro.
Gọvanọ Ademola Adeleke atụọla vootu ya

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Facebook
Gọvanọ Osun Steeti bụ Ademola Adeleke atụọla vootu ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ na-aga n'ihu na steeti ahụ.
Gọvanọ Ademola Adeleke na nwunye ya tụrụ vootu ha n'obodo ya dị n'Ede.
A malitela ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
A malitela ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti n'okpuru ọchịchị iri atọ (30) dị na steeti ahụ taa bụ Satọde 15 Ọgọst, 2026.
Ụlọọrụ Inec kwuru na ha e ji igwe Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) dị 5,130 eme ntuliaka a. Nke a dị iche na ntuliaka ikpeazụ e mere na steeti ahụ nke ọ bụ igwe BVAS dị 4,427 ka e ji mee ya
Ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha ịtụ vootu bụ 2,339,233 n'ogige 3,763 dị na wọọdụ 332 nke steeti ahụ.
Ihe mere e ji eme ntuliaka a ugbua bụ maka na n'afọ 2007, ụlọikpe kagburu ntuliaka họpụtara Gọvanọ Olagunsoye Oyinlola n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọkwa afọ atọ ma tinye Rauf Aregbesola dịka Gọvanọ.
Ha malitere ịgụ oge Gọvanọ steeti ahụ n'ụbọchị Rauf Aregbesola banyere n'ọkwa.
Ọ bụ nke a mere oge e ji eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ ji dị iche na steeti ndị ọzọ.
Pati ndọrọndọrọ ọchịchị 14 wepụtara mmadụ 14 ga-azọrọ ha ọkwa na ntuliaka a.
Onye ji ọkwa Gọvanọ bụ Ademola Adeleke nke Accord pati, Bola Oyebamiji nke pati All Progressive Congress (APC) na Najeem Folasayo Salaam nke pati di African Democratic Congress (ADC) nakwa ndị ọzọ.
































