EFCC na Osun steeti: Ihe i kwesiri ịma maka imechi akara ọba ego ha

Foto gosiri njiri mara ụlọọrụ EFCC, Gọvanọ Oshun steeti bụ Ademola Adeleke na Onyeisiala Bola Tinubu.

Ebe foto si, Bayo Onanugu/Osun StateGovt/ Efcc/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Oshun steeti, Ademola Adeleke na Onyeisiala Bola Tinubu
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Aha onyonyo, Nkọwa banyere nsogbu dapụtara n'etiti EFCC na Gọvanọ Osun steeti

Agbanyeghị na Onyeisiala Bola Tinubu enyela ụlọọrụ na-ebu agha emegide mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) iwu ka ha mepee akara ọba ego gọọmenti Oshun steeti nke ha manyere iwu 'Post no debit order'.

Okwu a ka bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua.

Gọvanọ Oshun steeti tiri mkpu maka mmechi EFCC mechiri akara ọbaego Oshun Steeti maka ebubo mpụ. Ha sị na ha chọrọ ka ụlọọrụ EFCC kọwara ha ebe ihe ha mere gbadoro ụkwụ n'iwu Naịjirịa nakwa iwu guzobere ha.

Kedụ ka okwu a si malite? Nakwa kedụ ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ihe EFCC mere?

Gọvanọ Osun steeti, Ademola Adeleke

Ebe foto si, Osun state governemnt / facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Osun steeti, Ademola Adeleke

Kedụ ka okwu ụlọọrụ EFCC na Gọọmenti Oshun si bido?

Ụlọọrụ na-ebu agha emegide mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) manyere ihe ha kpọrọ "Post no debit Order" n'akara ọba ego ụlọakụ gọọmentị Osun steeti.

Ọtụtụ ndị mmadụ anabataghị nke a ma na-ekwu na usoro e si mee ya nakwa oge ha mere ya bụ ihe na-adịghị mma, maka na steeti ahụ ga-eme ntuliaka nhoputa ọkwa gọvanọ n'ụbọchị Satọde, Ọgọst 15, 2026.

N'akụkọ a, BBC lere anya n'ihe dị mkpa ị ga-ama gbasara ihe EFCC mere, ma tụlee mkpebi ha were imechi akara ọba ego steeti ahụ.

BBC lebakwara anya n'usoro e si emechi akara ọba ego a kpọrọ "Post No Debit Order" dịka ndị ma nke ekwe na-akụ n'ihe banyere iwu tinyere ọnụ na ya.

N'Ọgọst 5, 2026 ka ụlọọrụ EFCC kwuru na ha manyere nke ha kpọrọ "Post no Debit Order" n'akara ọbaego gọọmenti Osun steeti.

EFCC kwuru na ha mere nke a n'ozi ha kesara n'akara soshal midịa ha ma boo gọọmenti Oshun steeti ebubo mmefu ego n'usoro adịghị n'iwu obodo.

Mana Gọọmenti Oshun steeti gọrọ isi onwe ha ma kwuo na ebubo niile ndị EFCC boro ha abụghị eziokwu.

Nke a na-eme dịka Oshun steeti dị njikere ime ntuliaka nhọpụta gọvanọ steeti ahụ n'ụbọchị Satọde, Ọgọst 15, 2026.

EFCC n'aka nke ọzọ kwuru na ebubo e boro ha banyere ime ka ihe ha mere maka ntuliaka na-abịa abịa n'Oshun steeti ma kwuo na enweghị otu pati ha na-akwado.

Onyeisiala Bola Tinubu enyela iwu ka e wepu mmachi a

Onyeisiala Bola Tinubu

Ebe foto si, Bayo Onanuga / Facebook

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu enyela iwu ka ụlọọrụ EFCC kwụsị mkpachi ha kpachiri akara ụlọakụ Gọọmenti Oshun steeti.

Tinubu mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi o binyere aka ma kwuo na ihe ọbụla ngalaba gọọmenti mere ugbua bụ ihe a na-ahụ dịka ọ bụ onyeisiala mere ya.".

Tinubu kwuru na eweghị mgbe EFCC mere ka ya mara ihe ha mere tupu ha eme ya.

Gịnị bụ 'Post no debit order' dịka iwu Naịjirịa si ahụta ya?

Onye ọkaiwu a maama n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Joe Onyeabor

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

'Post no debit order' pụtara na ọ nweghị ego a ga-ekwe ka ọ pụọ n'akara ụlọakụ a manyere ya ruo mgbe e wepụrụ ya.

Onye ọkaiwu a maama n'Enugwu steeti, nakwa onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze nke otu Nigerian Bar Association n'Enugwu steeti bụ Joe Onyeabor gwara BBC na dịka iwu guzobere ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) siri kwuo, EFCC were ikike ịmanye "Post No Debit Order" n'akaụntụ ụlọakụ ọ bụla n'oge ha na-eme nnyocha.

Onyeabor kwusiri ike na e nwere usoro EFCC ga-agbaso iji mee nke ahụ, ma sị na ọ gụnyere ịnweta akwụkwọ ikike n'ụlọikpe.

O kwuru na e nwere ohere dị n'iwu Naịjirịa banyere nke a maka na enweghị mgbe iwu sị na a ga-amachi akara ụlọakụ Gọọmenti steeti.

Onyeabor na-ekwu na akara ụlọakụ iwu na-ekwu maka ya bụ akara ụlọakụ mmadụ maọbụ ụlọọrụ na ọbụghị nke gọọmenti steeti.

Ọ kọwara na ndị mere iwu ahụ enweghị mgbe ha tụrụ anya na EFCC ga-emechi akara ọbaego gọọmenti steeti.

O kwetara na ụlọọrụ EFCC nwere ike ịkọwa 'onye ahụ' e kwuru n'iwu guzobere ha dịka 'gọọmenti steeti' ma jiri ya mee ihe ha mere ma kwuo na ọ bụ ụlọ ikpe ga-enye mkpebi maka ihe mere.

Iwu akwadoro EFCC imechi akara ọbaego mmadụ?

Dịka onye na-ahụ maka mgbasa ozi EFCC bụ Dele Oyewale siri gwa BBC "ụlọọrụ anyị nwere ikike ịkwụsị ego ịpụ n'akara ọbaego ụlọakụ ọ bụla ihe ruru awa 72 ma anyị enwere maọbụ anyị enweghị iwu ụlọikpe."

Mana mgbe a jụrụ Oyewale ajụjụ ihe ga-eme mgbe awa 72 gachara ọ tụrụ ilu sị na "mgbe anyị rutere n'akwa mmiri, anyị ga-agafe ya".

Ihe kpatara anyị ji kpọchie akara ụlọakụ gọọmentị Osun steeti - EFCC

Njiri mara ụlọọrụ EFCC

Ebe foto si, EFCC

N'akwụkwọ mgbasa ozi EFCC wepụtara, ha depụtara ihe mere ha ji kwụsị akwụkwọ ndekọ ego ụlọakụ nke gọọmentị Oshun na-ekwu na ha malitere nnyocha steeti ahụ kemgbe Maachị afọ 2026.

EFCC boro gọọmenti Oshun steeti ebubo na ha ji aghụghọ emefu ego 'Ecology Funds, Intervention Funds na Federal Account Allocation Committee, FAAC' nke ha sị na o metụtara ego ruru ijeri naira iri na otu (N11, 000,000, 000 ).

EFCC na-ekwu na ha na-enyocha steeti ahụ kemgbe Ọgụst 2, 2026 ma kwuo na ha chọpụtara nnukwu ego si n'akara ụlọakụ steeti ahụ na-abanye n'ebe a na-enyo enyo na ọ bụ mpụ na nrụrụaka.

Foto njirimara Oshun steeti

Ebe foto si, Osun state government / facebook

Gọọmenti Oshun steeti kwuru na ha emefughị ego obụla

Na nzaghachi ebubo EFCC boro gọọmentị Oshun steeti, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi ọha na steeti ahụ bụ Oluomo Kolapo Alimi kwuru na ebubo EFCC boro ha bụ "mgbalị ikpuchi ihe EFCC mere nke megidere iwu Naịjirịa".

Oluomo Kolapo Alimi kwuru sị "nke bụ eziokwu bụ na EFCC kụchiri akara ụlọakụ gọọmenti Osun steeti maka na ha chọrọ ịkwụsị nkwa enyemaka gọọmenti steeti ahụ kwere ndị ọrụ ọnwa ole na ole gara aga"

Ọ gakwara n'ihu kwuo na "anyị akwụọla ndị ọrụ Oshun steeti niile ụgwọ ihe enyemaka ahụ"