You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye bụ Issac Idahosa Rabiu Kwankwaso họpụtara ka osote ya.
Mgbe e biputara ya
Rabiu Musa Kwankwaso ji ọkọlọtọ New Nigeria Peoples Party azọ ọkwa onyeisiala ahọpụtala Bishop Isaac Idahosa dịka osote ya na ntụliaka 2023.
NNPP wepụtara ozi n'ụbọchị Tụzde were kpọpụta Issac Idahosa dịka osote Kwankwaso maka ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023
Onye bụ Issac Idahosa
- Isaac Idahosa bụ onye Edo Steeti.
- A mụrụ ya na Niger Steeti ma bụrụ nwa nke atọ nee na nna ya mụrụ.
- Ọ gara akwụkwọ na mahadum nke Nger Steeti.
- Ọ lụọla nwaanyị ma mụọ ụmụ abụọ.
- Dịka onye na-ezisa oziọma, Idahosa ritere ntụtụugo nke United Nations dịka onye nnọchịteanya udo maka ọrụ ọ rụrụ ịkwalite ndị mmadụ na ọchụchọ udo.
- Ọ wepụtala efere egwu atọ.
- Ọ bụ ya bụ onyeisi ụka God First Ministry nke eji illumination Assembly were mara dị na Lekkie Ajah, Legọs steeti.
- O ruola afọ 25 Idahosai hiwere ya bụ ụka.
- Idahosa bụ injinịa banyere izịsa oziọma Kraịst.
Etu e si bụrụ osote Rabiu Kwankwaso
A na-eche ka amara onyi otu NNPP ga-ahọpụta dịka osote Kwankwaso dịka atụmatụ ijikọta ha na otu pati Labour Pati kụrụ afọ n'ala.
Kwankwaso bu ụzọ tinyeọkaiwu Ladipo Johnson dịka osote tupu ọ meecha wepụ ya were tinye Idahosa.