Onye bụ Issac Idahosa Rabiu Kwankwaso họpụtara ka osote ya.

Bishop Isaac Idahosa

Ebe foto si, Bishop Isaac Idahosa/Facebook

Mgbe e biputara ya

Rabiu Musa Kwankwaso ji ọkọlọtọ New Nigeria Peoples Party azọ ọkwa onyeisiala ahọpụtala Bishop Isaac Idahosa dịka osote ya na ntụliaka 2023.

NNPP wepụtara ozi n'ụbọchị Tụzde were kpọpụta Issac Idahosa dịka osote Kwankwaso maka ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023

Onye bụ Issac Idahosa

Bishop Isaac Idahosa

Ebe foto si, Bishop Isaac Idahosa/Facebook

  • Isaac Idahosa bụ onye Edo Steeti.
  • A mụrụ ya na Niger Steeti ma bụrụ nwa nke atọ nee na nna ya mụrụ.
  • Ọ gara akwụkwọ na mahadum nke Nger Steeti.
  • Ọ lụọla nwaanyị ma mụọ ụmụ abụọ.
  • Dịka onye na-ezisa oziọma, Idahosa ritere ntụtụugo nke United Nations dịka onye nnọchịteanya udo maka ọrụ ọ rụrụ ịkwalite ndị mmadụ na ọchụchọ udo.
Bishop Isaac Idahosa

Ebe foto si, Bishop Isaac Idahosa/Facebook

  • Ọ wepụtala efere egwu atọ.
  • Ọ bụ ya bụ onyeisi ụka God First Ministry nke eji illumination Assembly were mara dị na Lekkie Ajah, Legọs steeti.
  • O ruola afọ 25 Idahosai hiwere ya bụ ụka.
  • Idahosa bụ injinịa banyere izịsa oziọma Kraịst.
Bishop Isaac Idahosa

Ebe foto si, Bishop Isaac Idahosa/Facebook

Etu e si bụrụ osote Rabiu Kwankwaso

A na-eche ka amara onyi otu NNPP ga-ahọpụta dịka osote Kwankwaso dịka atụmatụ ijikọta ha na otu pati Labour Pati kụrụ afọ n'ala.

Kwankwaso bu ụzọ tinyeọkaiwu Ladipo Johnson dịka osote tupu ọ meecha wepụ ya were tinye Idahosa.