Ndị ụkọchukwu Gọọmenti Anambra Steeti boro ebubo na ha bụ ndị amụma ụgha

Ndị ụkọchukwu Gọọmenti Anambra Steeti boro ebubo na ha bụ ndị amụma ụgha
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Gọọmenti Anambra Steeti akpụpụla ndị a na-ebo ebubo na ha bụ ndị ụkọchukwu adịgboroja na ndị amụma ụgha n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Awka.

Ndị ụkọchukwu ahụ gụnyere Ndubisi Nnachukwu nke ụlọụka Omega Dominion Ministry, Ekeleme Chris Ugochukwu nke ụlọụka Cloud of Glory Prophetic Ministry, Bishop Emeka Nwamkpa nke ụlọụka Chapel of Faith Ministry, Peter Chukwu nke ụlọụka Messiah Adoration Ministry, Chinedu Egwuonwu nke ụlọụka Citadel of Grace Ministry, Ebele Nnachukwu nke ụlọụka Jehovah Mighty Than All Ministry, Miracle Iruoma nke ụlọụka City of Power Ministry, Chukwukadibia Ogwuama nke ụlọụka Land of Testimony Adoration Ministry na Maria Njoku.

Oge a gụpụtachara ebubo niile e boro mmadụ itoolu ahụ n'ụbọchị Fraịde 15 Juun 2026 nke gụnyere ịkpọrọ ndị mmadụ ma kwụọ ha ụgwọ maka ihe iribaama ịgharamịịgha, ha gọrọ aka na ụkwụ ha, ma kwuo na o nweghị ihe ọbụla ha mere.

N'okwu ya, Nnukwu Ọkaiwu Anambra Steeti nakwa Kọmịshọna ikpe ziri ezi bụ Tochukwu Nweke sịrị na a nwuchiri ndị amụma ahụ maka nkwupụta ha mere n'onyonyoo iji kweta na ha na-etinye aka n'ọrụ ebube adịgboroja. Ka o sina dị, ndị e boro ebubo kwuru na a manyere ha ime nkwupụta ahụ.

Ọkaikpe Jude Obiora mechaziri yigharịa ikpe ahụ ka ọ bụrụzie n'ụbọchị 15 Juun, ma nye iwu ka e jichie mmadụ asatọ n'ime ha n'ụlọmkpọrọ dị n'Amawbia, ebe nke nwaanyị bụ Maria Njoku ga-aga n'ụlọmkpọrọ dị n'Ọnịcha.