Ndị Ugwu agaghị atụnyere Peter Obi maka ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ- Kwankwaso

Mgbe e biputara ya

Onye hiwere otu Pati New Nigeria Peoples Party bụ Rabiu Kwamkwaso ekwuola na ọ bụ mmere ka ya na-emere Peter Obi nke Labour Party site n'ịkpọ ya ka ọ bịa bụrụ osote ya na ntụlịaka onyeisiala nke 2023.

Ọ sị na Pati ga-enyere ndị Igbo aka ịnweta ọkwa onyeisiala mgbe ọzọ, ọ bụghị ugbua.

Ọ sị na “ndị Igbo ma maka azụmahịa na ịchụntaego, mana ha amaghị azụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị”.

Kwamkwaso sị na ihe ji mkparịtaụka ya na Labour Party bụ onye ga-anọ n’isi na onye ga-anọ n’ọdụ.

Ọ sị na ya ga-akụziri ndị Igbo ka e si eti epele ndọrọndọrọ ọchịchị ma Peter Obi kwete nọrọ n’okpuru ya.

Kwamkwaso kwuru nke a mgbe ha gara ịmepe isiụlọọrụ NNPP ụbọchị Satọde na Gombe steeti.

Ọ na-akọwa na ọ hara ya bụ oke ịbụ Osote Onyeisiala na ya bụ njikọ ya na Labour Party na-akpa maka ya, na Pati ya bụ NNPP ga-adakpọ, na ọ gaghị adị mma ịhapụ ahụhụ ha tara kemgbe afọ iri atọ ka ọ laa n’iyi.

Ọ sị na ya anaghị ekwu sị enyela ndị agbụrụ ọbụla ọchịchị mana e kwesiri ịme ya otu ọ ga-esi nwetere ha mmeri.

O kwukwara na ndị nkwado Peter Obi agaghị ekwe ya bịa sowe ya, “mana na ndị Igbo nwere ohere ugbua ịbata n’ihe a na-eme. Ọ bụrụ na ọchaa ha ugbua, mara na ọ ga-enye ha nsogbu”.

Ọ sị na “NNPP ka nwere ohere ịchọta ezigbo onye osote nke gụnyere Peter Obi nke Labour Party a na-ekwu maka ya”.

Ọ sị na "nke bụ eziokwu bụ na o nweghị mgbe naanị otu mpaghara ga-atụrụ mmadụ vootu ịbanye dịka onyeisiala. Labour Party enweghị ike imeri ntụlịaka onyeisiala maka na ha enweghị ndị otimkpu na steeti dị icheiche."

O kwukwara na "n'uche m, ahụla m ohere ndị Ọwụwa Anyanwụ nwere iji sonye n’ihe a na-ekwu na n’ọchịchị Naijiria, ma ọbụrụ Peter bịa sonyere anyị".

 

Ihe Labour Party sara

Odeakwụkwọ ugwu otu Labour Party bụ Umaru Faruk azaghachile Rabiu Kwankwaso n'ihe o kwuru gbasara Peter Obi ịbụ Osote ya na pati ya bụ New Nigeria Peoples Party.

Umaru kwetere na ọ bụ eziokwu na Peter Obi na Kwankwaso na-enwe mkparịta ụka maka ijiko ọnụ mana ọ bụrụ na onweghị isi na Peter Obi ga-ama ihe ọ ga-eme.

O kwuru na ọbụghị naanị kwankwaso na Peter Obi na-enwe ya bụ mkparịta ụka, o kwuru na Obi na otu dị iche iche na-akpakwa.

Ọ sị "Peter Obi abụbụla osote onyeisiala mgbe nke Atiku. Ọ bụ onye a ma ama. O sokwa n'otu ndị Gọvanọ mgbe gboo. Ya bụ, ọ nwere ọtụtụ ndị ya na ha na-enwe mkparịtaụka maka inye Peter Obi ezigbo onye ga-eso ya merie ntuliaka 2023".

Kwankwaso kwuru ụbọchị Satọde na ọ kaara peter Obi mma ịbịa soro ya iji nye ndị Igbo ezigbo ohere mgbe ọzọ.

Mana Faruk sị na " ọ bụ nrọ ka Kwankwaso na-arọ", na nke ahụ agaghị eme ma ncha.

Ọ sị na ọ bụrụ na Kwankwaso ekweghị e so Peter, na ndị Ugwu ga-achọnye Peter ezigbo onye Osote ya na ya ga-arụ.