World Food Safety Day: Kedụ ụzọ na usoro ị kwesịrị ịgbaso iji chekwaa ihe oriri gị ma zeere ọrịa?

Aha onyonyo, Kedụ ụzọ na usoro ị kwesịrị ịgbaso iji chekwaa ihe oriri gị ma zeere ọrịa?
Mgbe e biputara ya
World Food safety Day

Ụbọchị asaa nke ọnwa June afọ ọbụla bụ ụbọchị otu mba ụwa bụ United Nations wepụtara iji dọọ aka na ntị maka mkpa ọ dị ichekwa ihe oriri, a na-akpọ ya na bekee ‘World Food Safety Day’.

Kwa afọ ọbụla, ọnụọgụgụ ọrịa nke a na-ebute site n’ihe oriri, nke bekee na-akpọ foodborne illnesses’ na-akarị nde narị isii n’ụwa niile.

Ebe ihe dịka mmadụ puku narị anọ na puku iri abụọ na-anwụ kwa afọ, n’ihi nje sitere na nri ha riri eri,pasentị iri anọ n’ime ha bụ ụmụaka na-erubeghi afọ ise.

Ya mere taa, ọ bụrụ na ị bụ onye nri na-amasị dịka m, ọ dị mkpa ịmata ụzọ nakwa usoro dị icheiche ị kwesịrị ịgbaso iji chekwaa ihe oriri gị ma zeere ọrịa, ahụ mgbu nakwa oge ụfọdụ ọnwụ, nke i nwereike iji aka gị ritere onwe gị.

Lee usoro anọ ị ga-eji chekwaa onwe gị nakwa ihe ihe oriri gị

Ịdị ọcha:

Were mmiri na ncha kwọchaa aka gị ihe ruru timkọmtimkọm iri abụọ tupu ị malite isi nri. Dịka ị na-esi nri, ọ bụrụ na ị metụchaa anụ ndụ, azụ ndụ maọbụ akwa aka, ị kwesịrị ịkwọchapụ aka gị tupu i siri gawa.

Werekwa mmiri na ncha sachaa ite na ngwa ndị ọzọ iji esi nri nakwa ndị iji ebe ihe nri tupu ị malite isi nri nakwa oge i sichara.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ṅachaa mkpụrụosisi na akwụkwọ nri gị nke ọma na mmiri na-agba agba tupu i tinye ha na nri

Dopu iche

Oge ị na-etinye ngwanri gị n’igwe njụ oyi maka nchekwa, ọ dị mkpa idopu anụ ndụ, azụ, akwa na ndị ọzọ dịka ha iche. Ekwela ka mmiri si na ha metụta na ngwanri ndị ọzọ.

I kwesịrị inwe ihe e ji ebe nri abụọ, otu maka anụ ndụ, azụ na ndị ọzọ yiri ya, nke ọzọ maka ngwanri dịka akwụkwọ nrị, achịcha na ndị ọzọ.

Sie nke ọma

Isi nri ka o ghee eghee nke ọma, ọ kachasị anụ, bụ otu ụzọ ị ga-esi gbuo nje niile dị na ya ka ha ghara inye nsogbu ọbụla ma mmadụ ribaa ha n’afọ. Ya mere ọ dị mkpa isi anụ gị nke ọma tupu i rie.

Ọ dịkwa mkpa ịdakwa nri nke ọma ma ha jụọ oyi tupu ị malite iri ha ọzọ, maka na nje dị icheiche na-amụba ngwangwa na nri ma ha jụọ oyi.

Tinye n’igwe njụoyi

Gbaa mbọ hụ na igwe njụoyi gị na nke na-akpọ nri bụ freezer na-arụ ọrụ nke ọma oge niile.

Kunye nri dị ọkụ n’obere obere efere me tinye ha n’ime njụoyi maka na ọ ga-eme ka ọ jụọ oyi ngwa ngwa.

Ngwanri ndị na-emebi emebi dịka anụ, azụ, ụfọdụ mkpụrụosisi na akwụkwọ nri, kwesịrị ka e tinye ha n’igwe njụoyi n’ime otu awa maọbụ abụọ e ji zụta ha

Ọ bụrụ na nri e rifọrọ erifọ nọkarịa abalị atọ maọbụ anọ n’igwe njuoyi gị, biko tufuo ya.

Matakwa o na ihe a Bekee na-akpọ, ‘food poisoning’ apụtaghị naanị mgbe mmadụ tinyere nsi na nri mmadụ ibe ya ga-eri.

Mmadụ nwekwara ike iji aka ya nye onwe ya nsi, n’ihi agbasoghi ezi usoro nchekwa nri.

Ndụ dị na ntị o!