You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bakassi Boys: Etu igwe mmadụ si jiri iwe kugbuo ndị Bakassi boys'abụọ n'Aba, gbaa ha ọkụ
Ndị uweojii n'Abia steeti ekwuola na ha na-eme nnyocha n'akụkọ mmadụ abụọ e gburu na mpaghara 'Railway dị nso ụzọ ebe a na-akpọ Ogbonnaya Road n'Aba..
Nke a bụ dịka ọha mmadụ ji iwe na ọnụma tigbuu ndị 'Baakasssi boys' abụọ, munye ha ọkụ na nsonso.
Ndị bi ebe ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ha kọwara BBC Igbo Igbo etu ihe a mere si malite.
Dịka ha si kwuo, ihe a malitere n'ụbọchị Tuzde ebe ndị ọrụ nchekwa abụọ jidere otu nwoke a si na aha ya bụ Chisom ebe o si n'ụlọ ebe a na-aṅụ mmanya pụta.
Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa Bakkasi abụọ ahụ ji aka ike meekpa ya ahụ dịka ha boro ya ebubo na ọ bụ onye omekome na-akpa ike ebe ahụ.
Ha kwukwara si "Chisom kpọpụtara aha mmadụ abụọ a mere ya ihe a mgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ tupu ọ nwụọ.
Site n'ihe o kwuru, ha ji aka ike chọrọ inapụ ya ekwentị ya mana mgbe ọ kweghi, ọ sị ha gbara ya egbe".
Mgbe e kwuru na nwaamadị alaala mmụọ n'ụlọọgwụ n'abali Tuzde, iwe ọnwụ ya mere igwe ndị mmadụ ji gaa n'ụlọ ndị nchekwa Bakaasi abụọ ahụ a kpọrọ aha n'okwu ihe a mere, kpụpụta aha ezi ma nwere osisi gbuo ha ma gbaa ha abụo ọkụ.
E kwukwara na e ji iwe napụ ha ekwentị a si na ha napụrụ nwaamadị Chison n'ike ma napụ kwa ha egbe "Pump Action" ha.
Ugbua, amabeghi ndị ji egbe a anapụrụ ndị nchekwa abụọ ahụ.
Ozu mmadụ abụọ ahụ ka dị n'akụkụ ebe Railway dị n'okporoụzọ Ogbonnaya n'ere ma n'esi nsi dịka ndị bi ebe ahụ na-arịọ ka a bịa bupu ozu ndị a ebe ahụ.