Femi Fani-Kayode: Precious Chikwendu ebola otu ụkọchukwu ịkụnye ọgbaghara n'etiti ya na di ya

Mgbe e biputara ya

Precious Chikwendu bụbu nwunye Femi Fani Kayode bụbụ mịnịsta njem ụgbọelu ebola otu ụkọchukwu a kpọrọ Pastọ Emmanuel Olorunmagba ebubo na aka ya dị n'esemokwu ya na di ya.

Mana Olorunmagba nke ụka nke Total Liberation Mission n'onwe ya na-akatọ Precious maka ihe ọ kpọrọ 'okpotokpo asị' ọ na-atụgide di ya na soshal midia.

N'ozi o depụtara n'Instagram, Precious,boro ebubo na ọ bụ Pastọ Olorunmagba kpatara esemokwu ya na di ya site na ị na-akụnye ya mkpụrụ ọjọọ n'ime megide ya.

O kwuru na ụkọchukwu ahụ kusuru 'ọtụtụ ọgụ' dara n' etiti ya na di ya ma na-abịa n'ụlọikpe iji gbara FFK ama ihe pụtara n'ụlọikpe.

Precious onye gara n'ihu boo ebubo na Pastọ Olorunmagba kpọrọ ya 'Delilah na Vashti' kwukwara na ụkọchụkwu ahụ nwere ụfọdụ ụmụnwaanyị ọ kwadoro ka ha nọchie anya ya n'ụlọ di ya FFK.

Cheta na Precious na di ya bụ Fani-Kayode nwere okwu n'ụlọikpe banyere onye n'ime ha abụọ ga-akpọ ụmụ anọ ha mụkọrọ.

Gịnị kpatara ebubo a?

Ụkọchukwu Olorunmagba dere n'akara Facebook ya sị na ebere ya na-emere ụmụaka anọ Precious na FFK mụrụ ma gwa Precious ka o meere ha ebere na ha nwere ike ịgụta ihe ndị ọ na-ede na soshal midia banyere di ya.

Ọ sị na "nwaanyị gwara ụmụagbọghọ na-arụrụ ha ọrụ ka ha bo FFK ebubo idina ha n'ike, pụta ziri sị na nwoke anaghị eme ọfụma n'elu agwa?"

Ọ gara n'ihu kwuo na Precious nwere ekworo nke mere na ọ naghị achọ ka nwaanyị ọzọ rute FFK nso bịaziri kwuo na FFK na-ada mba n'elu akwa.

Ụkọchukwu Olorunmagba kwuru "nwaanyị wetuo belata asị ị na-atụgide nna mụrụ ụmụ anọ gị, mgbe ụmụaka ahụ ga-eto ha ga-amata nke bụ eziokwu".

Ihe sere Precious na Fani Kayode

Esemokwu dị n'etiti Femi Fani-Kayode na nwunye ya Precious Chikwendu malitere n'ọnwa Sepụtemba afọ 2020 mgbe akụkọ fesara na haa abasaala.

E ruru n'afọ 2021 Chikwendu gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo Kayode ebubo na ọ na-eti ya ihe ma sị ka e kewaa agbamakwụkwọ ha.