Femi Fani-Kayode: Precious Chikwendu ebola otu ụkọchukwu ịkụnye ọgbaghara n'etiti ya na di ya

Precious Chinwendu, Emmanuel Olorunmagba na Femi Fani Kayode

Ebe foto si, Precious Chinwendu, Emma Olorunmagba FFK/Facebook

Mgbe e biputara ya

Precious Chikwendu bụbu nwunye Femi Fani Kayode bụbụ mịnịsta njem ụgbọelu ebola otu ụkọchukwu a kpọrọ Pastọ Emmanuel Olorunmagba ebubo na aka ya dị n'esemokwu ya na di ya.

Mana Olorunmagba nke ụka nke Total Liberation Mission n'onwe ya na-akatọ Precious maka ihe ọ kpọrọ 'okpotokpo asị' ọ na-atụgide di ya na soshal midia.

N'ozi o depụtara n'Instagram, Precious,boro ebubo na ọ bụ Pastọ Olorunmagba kpatara esemokwu ya na di ya site na ị na-akụnye ya mkpụrụ ọjọọ n'ime megide ya.

O kwuru na ụkọchukwu ahụ kusuru 'ọtụtụ ọgụ' dara n' etiti ya na di ya ma na-abịa n'ụlọikpe iji gbara FFK ama ihe pụtara n'ụlọikpe.

Precious onye gara n'ihu boo ebubo na Pastọ Olorunmagba kpọrọ ya 'Delilah na Vashti' kwukwara na ụkọchụkwu ahụ nwere ụfọdụ ụmụnwaanyị ọ kwadoro ka ha nọchie anya ya n'ụlọ di ya FFK.

Cheta na Precious na di ya bụ Fani-Kayode nwere okwu n'ụlọikpe banyere onye n'ime ha abụọ ga-akpọ ụmụ anọ ha mụkọrọ.

Gịnị kpatara ebubo a?

Ebubo Precious na ụkọchukwu Emmanuel na-ebo onwe ha

Ebe foto si, Screen grab

Ụkọchukwu Olorunmagba dere n'akara Facebook ya sị na ebere ya na-emere ụmụaka anọ Precious na FFK mụrụ ma gwa Precious ka o meere ha ebere na ha nwere ike ịgụta ihe ndị ọ na-ede na soshal midia banyere di ya.

Ọ sị na "nwaanyị gwara ụmụagbọghọ na-arụrụ ha ọrụ ka ha bo FFK ebubo idina ha n'ike, pụta ziri sị na nwoke anaghị eme ọfụma n'elu agwa?"

Ihe ụkọchukwu kwuru maka Precious na FFK

Ebe foto si, Screen grab

Ọ gara n'ihu kwuo na Precious nwere ekworo nke mere na ọ naghị achọ ka nwaanyị ọzọ rute FFK nso bịaziri kwuo na FFK na-ada mba n'elu akwa.

Ụkọchukwu Olorunmagba kwuru "nwaanyị wetuo belata asị ị na-atụgide nna mụrụ ụmụ anọ gị, mgbe ụmụaka ahụ ga-eto ha ga-amata nke bụ eziokwu".

Ihe ụkọchukwu kwuru maka Precious na FFK

Ebe foto si, Screen grab

Ihe sere Precious na Fani Kayode

Fani Kayode na Precious Chikwendu

Ebe foto si, Fani Kayode

Esemokwu dị n'etiti Femi Fani-Kayode na nwunye ya Precious Chikwendu malitere n'ọnwa Sepụtemba afọ 2020 mgbe akụkọ fesara na haa abasaala.

E ruru n'afọ 2021 Chikwendu gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo Kayode ebubo na ọ na-eti ya ihe ma sị ka e kewaa agbamakwụkwọ ha.