Bad Breath: Ihe ise ị ga-eme iji belata eze ure na ọnụ isi

Mgbe e biputara ya

Kemgbe ndị mmadụ dị na nwata ka ha na-anụ ndụmọdụ gbasara ịsa eze ha ugboro abụọ kwa ụbọchị iji debe ya ọcha.

Mana ugbua ndị dọkịnta na-elekwa eze enyela ozi ndị ọzọ ga-enyere ndị mmadụ aka gbahapụ eze ure, ọrị aṅị eze nakwa ihe ndị ọzọ.

Dịka ha si kwuo, ndọmọdụ ndị a bu iji mee ka atịtị dị n'eze kwụsị ịtọ n'ime ọnụ ma butekwa nsogbu n'ebe ahụ.

Ngalaba ahụike nke mba Briten bụ NHS n'ịchafụ ewepụtala ụfọdụ ndụmọdụ ọhụrụ gbasara ịchekwa eze gị ọfụma. Ha gụnyere:

Agbụchana ọnụ gị ma ịtachaa atụ

Ngalaba ahụike kwuru na ọ dịghị mm aịsachapụ eze gị maọbụ iji mmiri gbụchaa ọnụ ozugbo ịsara eze gị.

Ha kwuru na ọ bụ n'ihi na ịme nke a na-ewepụ 'flouride' dị mkpa ma na-akwụsịkwa ọrụ ọ na-arụ n'eze.

Ejila 'toothpick' ewepu ihe fanyere gị n'eze

Dịka Ngalaba ahụike ahụ si kwuo, ọ dịghị mma iji obere osisi akpọrọ 'toothpick ewepu nri fanyere gị n'eze.

Ha kwuru na o nwereike ị metụta anyụrụ mmadụ n'ụzọ ọjọọ ma bute ọrịa.

Ha kwuru na ọ ka mma iji eriri floss ehicha etiti eze maọbụrụ na eze gị anọkọghị ọnụ.

Ime ihe Bekee kpọrọ 'flossing' na-ebelata isi ọnụ

Flossing bụ iji obere eriri akpọrọ 'dental floss ehicha etiti eze gị.

Ọ na-ewepụ nri ọbụla fanyere mmadụ n'etiti eze ahụ.

NHS kọwara na nke a dị mma n'ihi na ọ na-ebelata ọrịa aṅị eze nakwa isi ọnụ site n'ịwepụ atịtị dị n'eze.

Ejina 'Mouthwashi' agbụcha ọnụ gị ma ịtachaa atụ

NHS kwuru na ọ dịghị mma iji mmiri eze akpọrọ 'Mouthwash' agbụcha ọnụ ma ị tachaa atụ.

Ha kwuru na ọ bụ n'ihi na mmiri a na-asachapụ flouride dị mkpa nke si na ncha eze bụ 'Toothpaste'

Ha sị na ị tachaa atụ ịchere rịe nri ukori tupu i jiri mmiri ahụ gbụchaa ọnụ gị.

Nyere ụmụaka erubeghi afọ asaa aka n'ịhicha eze ha

Dịka NHS si kwukwaa, ịkwesiri ịnyere ụmụaka erubeghi afọ asaa aka ịtaa atụ.

Ọ bụrụ na ịnyeghị ya aka, ịkwesiri ị nọ ya nso mgbe ọbụla ọ na-asa eze ya.