You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Igbo festival: lee ihe ị kwesiri ịma maka ịgba Ọfala n’ala Igbo
Nchọpụta gosiri na Ọfala bụ mkpuruọkwụ abụọ jikọrọ ọnụ; "ọfọ" na "ala".
Ọ bụ emume e jiri mara ndị Eze n'ala Igbo.
Mana ọbụghị Eze Igbo niile na-agba ọfala.
Ọbaọzi Wikipedia gụnyere Onitsha, Umueri, Umuoji na obodo ọzọ gbara ha gburugburu dịka Aguleri, Nnewi na Ukpo dịka ndị na-agba Ọfala.
Mana Odumobi n'Aguleri ezigbo aha ya bụ Odumegwu Obudigwe sị na Igba Ọfala abụghị ihe e jiri mara Aguleri maka na Ọfala bịara abịa dika ya bụ ọbaozi kwuru.
Ọ sị na "Ihe e jiri mara Aguleri bụ ịme Oriri Obịbịa Eri" a kpọrọ Eri Festival na Bekee.\
Odumobi sịkwa na ụfọdụ mmadụ bụ akajiakụ na mpaghara ahụ na-agbaziri onwe ha Ọfala, ịme ka emume ha daa ụda.
O kwuru na obodo dị iche iche n'ala Igbo nwere emume e jiri mara ha.
Akụkọ na-ekwu na Igbo malitere ịgba ọfala kamgbe nna anyị ha gbaọtọ.
Ụfọdụ na-ekwu na ịgba Ọfala malitere n'Onitsha mgbe ha si Benin gbaa ọsọ ndụ na 16 sentụrị.
Ya bụ nchọpụta sị na Igba Ọfala yitewere emume ndị Eze Benin na-eme kwa mgbe a kpọrọ Igue.
BBC enweghiike ịchọpụ nke a.
Mana nke anyi ma bụ na Ọfala bụ emume ndị Eze ji nabata ọhaneze mgbe ha pụtara n'ekpere n'ụlọnsọ ha na-edowe onwe ha nso kwa afọ.
Mgbe dị otu a ka Eze ji agọ ọfọ maka ọdịmma obodo ya na ndị ọ na-achị.
Ha na-edowe onwe ha asọ otu izuụka maọbụ karịa.
Ha na-eji emume Ọfala apụta n'ọha, anabata ndị obodo ma gọzie ha ma gọọrọ ha ọfọ ọma puruiche maka afọ n'abịanụ.
Onye Nze bụ Obimdike Chukwuma onye Otolo Nnewi na-akọwa na Ọfala bụ emume Obi na-eme kwa afọ iji gosi na ya ka dị ndụ.
Ọ bụ mgbe ndị enyi na ikwu n'ibe ji enye ya ihe onyinye dị iche iche.
Ọ sị na ya bụ ịgba ọfala na-amalite n'afọ nke mbụ e chichara ya Igwe maọbụ Obi, dịka ndị si akpọ ya.
Ya bụ Obi ga-eme ya bụ emume kwa afọ ruo n'ọnwụ.
Mgbe ọ nwụrụ, ọ bụ ndị ọ na-achị ga-emere ya Ọfala nke ikpeazu n'aha ya.
Mana ha na-asị na Obi maọbụ Igwe ha na-agba Ọfala nke Ikpeazụ, makana Eze anaghị anwụ anwụ.
Mana ya bụ Ọfala nke Ikpeazụ gosiri na ọ lakwuru ndị nna ya ochie.
Ofala so na oriri isii ndị Onitsha na-eri kwa afọ.
Ndị Onitsha na-eri oriri a n'ọnwa ọktoba n'afọ iji kwado Obi (Eze) n'ime mmuo maka ọrụ obodo chere ya n'ihu.