You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Yusuf Buhari: Etu agbamakwụkwọ nwa Onyeisiala Buhari si kpọtụọ taa
Agbamakwụkwọ nwa Buhari nke nwoke bụ Yusuf Muhammadu Buhari na nwunye ya bụ Zahra Nasir Bayero, nwa Emir nke obodo Bichi kpọtụrụ akpọtụ na Bichi dị na Kano steeti taa bụ Friade.
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi n'igwe bụ Isa Ali Pantami bụ onye gbara ha akwụkwọ n'ụlọụka Alakụba "Bichi Central Mosque".
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị welite isi dịka ndị gọvanọ na senetọ jupụtara na mmemme ahụ bụ a ghaa ọka, o koro n'elu.
Ndị dịka aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan, Osote Onyeisiala pụrụ apụ bụ Atiku Abubakar, Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, Onyeisi Ụlọmeiwu Ukwu bụ Mohammed Lawan.
Gọvanọ Kayode Fayemi nke Ekiti steeti, Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi steeti.
Ndị ojiego achụ ego a na-ahụ aha dịka Alhaji Aminu Dantata bụ onye Zahra bụ nwa nwanne ya tụkwara ebe ahụ ka mmọnwụ.
Nwunye Onyeisiala bụ Aisha Buhari nabatakwara ndị ọbịa pụrụ iche nke ya.
Ndị bịara ya agbamakwụkwọ nwa ya nwoke bụ Yusuf gụnyere nwunye onyeisiala mba Gambia bụ Oriaku Fatoumata Ban Barrow.
Igwe ndị mmadụ bịara ịgbara anya ha Ekeresimesi bịakwara ya bụ mmemme.