You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị ntọrọbịa awakpoola ụlọahịa nwoke a hụrụ ozu nwaodibo ya n'olulu nsị n'Amawbia'
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe gburu nwa okorobịa a hụrụ ozu ya n'ime olulu nsị (soakaway) n'Amaọbịa, Ọka, Anambara steeti.
Toochukwu Ikenganya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara gwara BBC Igbo nke a site n'ozi ekwentị.
Ajụjụ ọtụtụ ndị bi nso n'Eke Amawbia, Anambra steeti kpụ n'ọnụ bụ "kedụ ihe mere Sunday na-agba bọyị?" dịka a chọpụtara ozu nwaokorobịa n'ime olulummiri n'ụtụtụ Tọzde. Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na Sunday, gbara afọ 21, bụ onye e kwuru na ọ bụ onye Enugwu Steeti, na-amu ka e si akpụ isi n'ọdọahịa dị n'ihu ụlọ ebe ya bụ olulu mmiri dị.
Ndị nọ ebe ihe mere gwara kọwara na e bidoro ịchọ Sunday achọ n'ụbọchị ụka bụ mgbe a hụrụ ya anya ikpeazụ mana a hụrụ ozu ya taa.
Nke a butere ọgbaghara dịka ụmụokorobịa bara ma mebie ụlọọru oga dịka ha na-egosi iwe ha na o nweghị ihe o mere gbasara ya bụ nwatakịrị na-arụrụ ya ọrụ maọbụ gbaa mbọ mgbe a chọpụtara ozu ya.
Oge onye ntaakụkọ anyị rutere ebe ahụ, ọ hụrụ ka ndị uweojii bịara nwuchie oga Sunday a ma dịka Maazi Innocent.
Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ onye na-arụ 'plumber' a kpọrọ ka ọ rụọ ọrụ ebe ahụ chọpụtara ozu Sunday.