Ndị ntọrọbịa awakpoola ụlọahịa nwoke a hụrụ ozu nwaodibo ya n'olulu nsị n'Amawbia'

Igwwe mmadụ gbaakọrọoro ọdọahịa ọga Sunday
Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ n'ebe a chọpụtara ozu nwa okorobịa n'ime olulu nsị n'Amaọbịa, Ọka
Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe gburu nwa okorobịa a hụrụ ozu ya n'ime olulu nsị (soakaway) n'Amaọbịa, Ọka, Anambara steeti.

Toochukwu Ikenganya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara gwara BBC Igbo nke a site n'ozi ekwentị.

Ajụjụ ọtụtụ ndị bi nso n'Eke Amawbia, Anambra steeti kpụ n'ọnụ bụ "kedụ ihe mere Sunday na-agba bọyị?" dịka a chọpụtara ozu nwaokorobịa n'ime olulummiri n'ụtụtụ Tọzde. Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na Sunday, gbara afọ 21, bụ onye e kwuru na ọ bụ onye Enugwu Steeti, na-amu ka e si akpụ isi n'ọdọahịa dị n'ihu ụlọ ebe ya bụ olulu mmiri dị.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara kọwara na e bidoro ịchọ Sunday achọ n'ụbọchị ụka bụ mgbe a hụrụ ya anya ikpeazụ mana a hụrụ ozu ya taa.

Igwe mmadụ gbakọrọ ihe mere
Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ n'ebe a chọpụtara ozu nwa okorobịa n'ime olulu nsị n'Amaọbịa, Ọka

Nke a butere ọgbaghara dịka ụmụokorobịa bara ma mebie ụlọọru oga dịka ha na-egosi iwe ha na o nweghị ihe o mere gbasara ya bụ nwatakịrị na-arụrụ ya ọrụ maọbụ gbaa mbọ mgbe a chọpụtara ozu ya.

Oge onye ntaakụkọ anyị rutere ebe ahụ, ọ hụrụ ka ndị uweojii bịara nwuchie oga Sunday a ma dịka Maazi Innocent.

Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ onye na-arụ 'plumber' a kpọrọ ka ọ rụọ ọrụ ebe ahụ chọpụtara ozu Sunday.