Zabarmari Massacre: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka etu e si gbu ndị ọrụ ugbo karịrị 43 na Naịjirịa

Akụkọ BBC Igbo
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyendụ ndị pati nke nta na sineti bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ọ bụ ezigbo ihe nwute na oge kwesiri ịbụ oge iwe ihe ubi abụrụla oge iru uju.

O kwuru nke a n'ozi onye mgbasa ozi ya bụ Uche Awom wepụtara taa bụ November 30.2020.

N'okwu ya, "ụjọ na-atụ anyị na ndị ọụ ugbo na-agba mbọ ihu na nri akọghị na Naịjirịa bụzi ndị oyiegwu na-edezi.

O kwuru na nke a ga-eme ka ndị mmadụ na-ajụ ma gọọmenti enwerike ikwụsị oke iyi egwu na ogbugbu na-eme na Naịjirịa tụmadị n'ogbe ndị ugwu awụsa."

N'ozi ahụ, Abaribe na-arịọ gọọmenti etiti ka ha wulite ihe ọbụla ha na-eme iji ibuso enweghị ezi nchekwa agha nke gụnyere mwakpo Boko Haram , 'banditry' nakwa itọrọ mmadụ na-eme n'akụkụ Naịjirịa niile.

O kwuru na ịkatọ ogbugbu ndị a ezughị kama gọọmenmti kwesiri ime ihe ga-eme ka ya bụ arụrụana kwụsị kpam kpam.

Akụkọ a bụ nchịkọta ihe ụmụ Naịjirịa na-ekwu maka etu ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Boko Haram si bepu isi ndị ọrụ ugbo ruru iri anọ na-atọ.

Nke na-ewu na soshal midia bụ na ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ekwu ka onyeisiala chụọ ndị isi ọrụ nchekwa na Naịjirịa maka enweghị ezi nchekwa na mba ahụ nakwa na ha akafeela ọkwa ahụ.

Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ihe ọzọ ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia bụ ka eme ngwa ngwa kwụsị oke ogbugbu a na-eme na Naịjirịa kpam kpam

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gọvanọ Borno steeti ahụ bụ Babagana Zulum tiri ndị bi ebe ahụ ihe a mere ma kwuo na a gwara ya na a ka na-achọ ụfọdụ mmadụ achọ.

O kwuru na ya ndị agha Naịjirịa na-akpa ka mara ka a ga-esi chọta ndị ọzọ a na-ahụbeghị.

Ihe ndị bi na Zabarmari kwuru maka ogbugbu a

Abubakar Yunus kwuru na e gburu ụmụ ya ndị nwoke abụọ n'ihu ya mgbe ndị omekome ahụ nwụchichara ha.

O kwuru na ndị omekome ahụ yi uwe ndịagha Naịjirịa, buru egbe ma gbaa ha okirikiri dịka onye ntakụkọ Reuben Abati si depụta.

Onye ọzọ kwuru na o bụ ndị ntoroọbịa ha ume ka dị ka ndị omekome ahụ gbutọsiri ma hapụ ndị okenye, ụmụnwaanyị na ụmụaka.

Akụkọ pụtakwara maka etu ndị omekome ahụ si gbuo ndị mbụ nwụrụ n'ọdachị a site ịkpọba ha n'ime ọhịa ma bepụ ha isi n'otu n'otu dịka ụlọrụ Daily Trust si depụta.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu tinyere ọnụ

Onyeisiala Naịjiria pụtara katọọ ya bụ ogbugbu site n'ọnụ Garba Shehu bụ onye mgbasa ozi ya nke ukwu ma na-ekwu na ọchịchị ya kwadoro ndị agha ka ha wee chekwa ndụ na ogbe nile dị na Naịjirịa.

Otu United Nations katọrọ ogbugbu e gburu ndị Boko Haram gburu ndị mmadụ ruru 110 na Borno Steetị ma merụọ ọtụtụ ahụ.

Onye nchịkọta otu a na Naịjirịa bụ Edward Kallon kwuru nke a n'ụbọchị Sọnde dịka ọ na-akatọ ogbugbu ma kpọọ oku ka a tọhapụ ọtụtụ ndị a tọọrọ ngwa ngwa.

Otu 'Northern Governor's Forum' katọrọ ogbugbu a ma na-ekwu na ya bụ ọdachị ga-ebute nnukwu ndọghachị aka na mbọ a na-agba ime ka mmepụta osikapa na Naịjirịa bawanye nakwa nchekwa nri.

Ihe mere e ji gbuo ndị ọrụ ugbo osikapa

Akụkọ pụtara na nsogbu bidoro mgbe ndị otu Bokoharam onyeisi ha bụ Abubakar Shekau gara iji mwakpo nweta nri n'aka ndị ime obodo.

Onye ọzọ hụrụ ihe merenu kwukwara na iji egbe nara ndị obodo nri bụ njirimara ndị omekome ahụ.

Mana ndị obodo nwụchiri otu onye omekome, ma nyefe ya n'aka ndị ọrụ nchekwa.

Onye ọzọ kwuru na o nwerike ịbụ ihe a kpalitere iwe ndị omekome ahụ mere ha ji dakwasa ndị ọrụ ugbo ahụ gbuwe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: