You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị 'unknown gunmen' si tọrọ nwoke,gbaa nwa ya egbe n'Ukpor,Anambra steeti
Ndị uweojii n'Anambra steeti ekwuola na ha anụbeghị maka akụkọ nwoke a sị a tọọrọ n'Ukpor nke Anamrba steeti n'ụbọchị Satọdee.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga kwuru "Anyị anụbeghị ozi akụkọ a dịka ntị anyị nọ n'ala"
Akụkọ pụtara n'ụbọchị ụka na ndị omekome bu egbe tọọrọ otu nwoke n'obodo Ukpor, nke okpuruọchịchị Nnewi-South, Anambra steeti.
Ka akụkọ si kwuo, ndị omekataraihepụọụjọ ahụ gbakwara nwa nwoke ahụ egbe.
A tọọrọ Chukwujekwu Uzozie, onye bụ onye ọrụ ugbo nakwa onye ndụmọdụ onye bụbu onyeisioche okpuru ọchịchị ahụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Satode.
Akụkọ kwuru na ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ụlọ ya gbalie egbe elu ọtụtụ mgbe tupu ha kpụrụ ya n'ike.
Otu onye nọ ezinaụlọ ahụ nso achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na, "a tọọrọ ya n'ụzụ ụtụtụ ụnyahụ (Mee 21,2022)".
"Ha gbara otu nwa nwoke o nwere egbe n'afọ. ọ nọ n'ụlọọgwụ ugbua. Ekpere m bụ ka ọ gbakee."
Nke a na-abịa dịka ndị uweojii kwuru na egburu onyeomeiwu na-anọchite anya mpaghara Aguata II n'ụlọomeiwu Anambara steeti bụ Okechukwu Okoye n'ụbọchị Satọdee.
A tọọrọ Okoye, onye Isuofia ma bụrụkwa onye na-anọchite mpaghara ebe Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambara. Egbukwara onye enyemaka ya bụ Cyril Chiegboka.
Cheta na a tọọrọ Okoye na onye enyemaka ya n'abalị 15 nke Ọnwa Mee dịka ha nọ n'ụzọ njem na steeti ahụ.
Ndị omekatara ihe daa ụjọ nwụchiri ya gburu ya, hapụ ahụ ya ebughị isi n'okporoụzọ Nnobi gawa Ideani n'abalị iri na otu nke ọnwa Mee, dịka ndị uweojii steeti ahụ si kwuo.