Election: Fayemi ka kwụ chịm n'Ekiti steeti

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe mkpegharị n'Abuja akwụnyela na azụ Fayemi site n'ikpe ha nyere.

Ha kwuru na ọ ka bụ Gọvanọ agbanyeghị na Olusola Eleka nke PDP so ya zọ ọkwa kpụpụrụ ya ụlọikpe maka mpụtara ntụliaka ahụ.

Cheta na Fayemi zọrọ ọkwa n'okpuru otu APC meriri ntuliaka e mere n'afọ 2018 n'Ekiti steeti.

Yemi Osinbajo kpụ PDP n'ọnụ ọzọ

Osote Onyeisiala Naijirịa na-ata gọọmentị oge gara aga ụta ịmefu ego mgbe Naịjirịa kachasị akapata ego

Mana ndị mmadụ na soshal midia agwaala ha hapụ ịta onye ọzọ ụta ma bido ịrụ ọrụ nwulite obodo chere ha n'ihu.

Harry Kane eritela MBE

Harry Kane onye ndu otu egwu boolụ mba England eritela ugo nke MBE nke pụtara Member of the order of the British Empire

O ritere ya maka mbọ ọ na-agba n'ihe gbasara bọọlụ na mba ha.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Lucas eriwela

Ndị otu egwu bọọlụ Bayern Munich azụọla Lucas Hernandez nke Atletico Madrid ọkpụrụkpụ ego mara abụba.

Bayern goro Lucas nde paunds iri isii na asatọ maka ịgbara ha bọọlụ afọ ise.

Lucas so mba France bute iko mba ụwa n'afọ 2018.

Mmenju ntuliaka ndị Adamawa Steeti na ugbua n'okpuruọchịchị 14 dị na steeti ahụ.

Kasim Gaidam bụ Onyeisi Inec n'steeti ahụ sị na Inec kere aju n'ume na kwado ya bụ ntuliaka ebe ha chị ndị ọrụ ruru 358.

Ebe a na-eme ntuliaka gunyere okpuruọchịọchị Yola South, Fufore, Ganye, Girei, Guyuk, Hong, Lamurde, Numan, Madagali, Michika, Mubi North, Shelleng, Song nakwa Toungo.

Onye ọrụ Presiding Officer ndị Inec gwara ndị nta akụkọ okwu sị na ihe niile na-aga werewere dịka ntuliaka malitere na elekere asatọọ nke ụtụtụ Tọzde.

Ndị ọzọ ajụla mpụtara ntuliaka onyeisiala

Otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị atọ ọzọ ewepụla mpụtara ntuliaka onyeisiala 2019 ụlọikpe na arịọ ka akagbuo ya bụ mpụtara.

Pati ndị a bụ Hope Democratic Party, Peoples Democratic Movement, Coalition For Change.

Ngagharịiwe na Port Harcourt

Otu jikọrọ ndọrọndọrọ a kpọro Inter-Party Advisory Council eburula ngaghariị iwe bugbara ndị si ọrụ nchekwa na Port Harcourt.

Ha na- arịọ Inec ka ha gụchapụ mpụtar ntuliaka e mere bụ nke a chabiri n'ike maka nrụrụaka ha sị na e mere na ya.

Gee Nkeji n'Igbo

Ihe nkiri

Akụkọ ga-amasị gị