Ric Hassani ezi aha ya bụ Ikechukwu Ahiauzu ọ bụ onye?

Ebe foto si, Waje Instagram Page
Foto otiegwu a ma ama bụ Waje na otiegwu Ric Hassani ebe ha na-eme 'love nwantịntị' pụtara na soshal midia emeela ka ụmụ Naịjirịa kwuwe na ha na-achọ ịlụ di na nwunye.
Waje wepụtara foto a n'akara instagram ya ma tinye eserese ihunanya n'akụkụ ya.
Nke a mere ka ndị mmadụ ma ndị ọyị ha bido butewere ha ozi ekele ha deme n'ihunanya dabara ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Waje dị afọ iri anọ ji a mụọla nwada dị afọ iri abụọ na otu a kpọrọ Emerald, ebe Ric Hassani dị afị iri atọ na abụọ amụtabeghị nwa.
Waje dekwara n'akụku foto ahụ o wepụtara sị na "oge eruola" mana ndị mmadụ ka na-ajụ oge ihe ole ruru.
Ọ bụ egwu ka na -akwado itipute?

Ebe foto si, Waje and Ric Instagram Page
A mabeghị nke ọ bụ, ma na ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nwereike ịbụ egwu ka ha na-akwado itiputekọ ọnụ.
Mana mgbe BBC kpọtụrụ ndị otu Waje, ha kwuru na o nwere nnukwu nkwupute ha na-akwado ime. N'okwu Waje, "agaghị m ekwupute ya ugbua, mana obi dị m ụtọ nke ukwu"
Gịnị ka Ric Hassani kwuru?
O meghị ka o nwere ihe merenụ. Ọ depụtere na twitter ya na ọtụtụ mmadụ amarala na striti ya, "nna ọgịnị na-eme?"ka onyonyo ebe na-akwa iko agbaala n'anwụ, biko gịnị na-eme n'ụtụtụ a?"
Onye bụ Ric Hassani?
Ikechukwu Eric Ahiauzu e ji Ric Hassani wee mara abụghị anụ taa.
N'afọ 2017 ka ọ chakere site n'egwu dịka 'Gentleman' , 'Believe', 'Number One' na 'Marry You' nke o tipụtara.
Ya na otiegwu dịka Falz, Olamide, Chike and Johnny Drille etikọọla egwu.
E ji iti egwu ihụnanya mara ya.
N'afọ 2019 ka ọ wepụtara egwu "Do like i say" nke ya ndị otu egwu ya akpọrọ DBYZ tiputere.




























