A nụrụ ụda egbe n'ọdụụgbọelu nke isi obodo Nije

Ebe foto si, Getty Images
A nụrụ ụda mgbọ na-apụta site n'ọdụ ụgbọ elu dị n'isi obodo Nije, nke isiobodo ya bụ Niamey, dịka ndị bi na ya si kwuo.
Ọ malitere n'ihe dịka elekere isii nke ụtụtụ (06:00 am) oge mpaghara (05:00 GMT), ma n'ụlọọrụ mgbasaozi Reuters, nke kwukwara na e nwekwara mgbawa, kwuru na ọ gara n'ihu ruo ihe dị ka otu awa.
Ụda mgbọ ahụ na-apụta site n'ụzọ mbata n'ọdụ ụgbọelu ahụ, ka mmadụ abụọ hụrụ ya si gwa ụlọ ọrụ mgbasa ozi AFP.
Nije na-alụ ọgụ megide mmegide ndị Islamist agha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri, ma na Jenụwarị, ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị jihaad wakporo otu ọdụụgbọelu ahụ ahụ. Dịka ndị agbataobi ya bụ Burkina Faso na Mali, Nije nọ n'aka ọchịchị ndị agha jidere ọchịchị, nke bịara n'ike ọchịchị n'akụkụ n'ihi ọdịda n'ịnagide ọgụ ike a.
E nwebeghị otu ọbụla ekwupụtala na ọ bụ ha kpatara mwakpo ahụ nke mere n'ụbọchị Tọzdee, ma ndị ọchịchị ka emebeghị nkwupụta ọbụla. Ma otu metụtara Islamic State kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo nke Jenụwarị.
Gaa na BBCIgbo.com maka akụkọ mba ụwa niile ma na nke ndị Igbo.
Soro BBC Igbo n'Instagram @BBCNewsIgbo, ma na Facebook ebe a BBCNewsIgbo.

























