Amerịka ga-akwụsị nkwado ha na-enye Saụt Afrịka maka ọrịa HIV

Ebe foto si, Hoberman Collection/Universal Images Group via Getty Images
- Onye dere ya, Damian Zane
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Gọọmenti Amerịka ekwuola na ha ga-akwụsị enyemaka ego maka iji buo agha megide ọrịa HIV na Aids na mba Saụt Afrịka.
Ihe karịrị nde mmadụ asatọ nwere ọrịa HIV na mba Saụt Afrịka, nke bụ ọnụọgụ ndị nwere ọrịa ahụ kachasị a na-ahụta na mba ọbụla dị n'ụwa.
Ọ bịara dị ka ngalaba mba Amerịka na-ahụ maka mba ndị ọzọ nwere mkpebi ahụ n'ihi ebubo na Saụt Afrịka dara mba ichekwa ndị ọcha na-ebuchaghị ibu a kpọrọ Afrịkana bi na mba ahụ.
Mana Gọọmenti Saụt Afrịka agọọla aka na ụkwụ ha ugboro ugboro gbasara ebubo a.
Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Saụt Afrịka azaghachila nke a ma kwuo na "o teela ha malitere ịgba mbọ maka atụmatụ nkwụrụ na nke onwe" n'agbanyeghị na mba Amerịka emebeghị ka ha mata maka mkpebi a.
Tupu afọ 2025, mba Amerịka nọọrọ na-akwado mbọ ndị Saụt Afrịka na-agba iji buo agha megide nje HIV.
Amerịka mefuru ihe ruru narị nde dọla anọ ($400m) kwa afọ site n'atụmatụ a kpọrọ President's Emergency Fund for Aids Relief (Pepfar).
Mana kemgbe e duru Onyeisiala Donald Trump n'iyi ọrụ, mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ agaala n'ihi na-agba ụka.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ime obere oge ọ batara n'ọkwa, Trump nyere iwu ọchịchị ma boo ebubo na ọtụtụ atụmatụ mba Saụt Afrịka kụsasịrị ohere nhatanha ma kwanye ọkụ na tigbuo zọgbuo "megide ndị nwe obodo agbụrụ ha na-anaghị amasị ndị mmadụ".
Gọọmenti Saụt Afrịka kwuru na nke a abụghị eziokwu, dịka ha kwuru na atụmatụ ha kpọrọ Black Economic Empowerment bụ nke a chọrọ iji dozie adịghị nhatanha malitere n'oge a na-akpagbu ndị isiojii.
Iwu ọchịchị ahụ rụtụkwara aka n'ikpe Saụt Afrịka nwere megide mba Izrel n'Ụlọikpe Mbaụwa bụ International Court of Justice nakwa njikọ ha na mba Ịran.
Obi ọchịchị White House ekwuola sị "n'ihi omume ndị a na-ezighị ezi", a gaghị arọpụtara Saụt Afrịka enyemaka ọzọ.
Trump anọrọla boo ebubo ụgha na "a na-ekpochapụ agbụrụ ndị ọzọ" na Saụt Afrịka, nke mere ọchịchị ya jiri hiwe ihe omume ndị gbara ọsọ ndụ maka ndị Afrịkana, nke bụ agbụrụ ndị Ọdịda Anyanwụ Yurop gara biri na Ndịda Afrịka na senchuri nke iri na asaa.
Ọ dịzi ka ọ bụ naanị ha bụ ndị gbara ọsọ ndụ a na-enye ohere ka ha bata na mba Amerịka ugbua.
A katọọla ebubo mkpochapụ agbụrụ ahụ n'ogogo dị elu, ma kọwaa ya dịka nke na-abụghị eziokwu.

Ebe foto si, Getty Images
Nkwado Pepfar, nke na-arọpụtara Saụt Afrịka ihe ruru ọkara ise nke ego niile ha na-emefu n'ihe omume HIV, bụ nke a kwụsịtụrụ n'ọnwa Ọktoba 2025 site n'ihe a kpọrọ "atụmatụ nchereoge".
Mana onye ọrụ na ngalaba Amerịka na-ahụ maka mba ndị ọzọ kwuru na a ga-amalite ịkwụsị ihe omume Pepfar na nkeji na nkeji.
Nke a bụ "maka ịda mba Saụt Afrịka igosipụta ọganihu a hụrụ anya n'atụmatụ ndị ọchịchị a rịọrọ ha," ka onye ọrụ ahụ kwuru.
Atụmatụ Gọọmenti Amerịka bụ "ịkwalite nkwụrụ na nke onwe" ma belata ndabere na nkwado Amerịka, ka ha gbakwunyere.
Ha rụtụkwara aka na Saụt Afrịka bụ mba ihe o nwere na-ezuru, dịka ha karịrị ịkwado atụmatụ ahụike nke onwe ha.
Mịnịstrị Ahụike na Saụt Afrịka ekwuola na ọ bụ eziokwu na Pepfar enyerela mba ahụ aka n'ihe omume HIV, mana nrọpụta ọgwụ nchekwa ndụ a maara dịka 'antiretroviral' bụ nke nkwado ya dị iche, dịka ọtụtụ n'ime ya si n'aka gọọmenti.
Mbọ ndị a gbarala idozi esemokwu Amerịka na Saụt Afrịka akụọla afọ n'ala. Nke a gụnyere nzukọ ndị isi kara aka a haziri n'obi ọchịchị White House n'etiti Donald Trump na Cyril Ramaphosa n'ihe karịrị otu afọ ugbua.
Mba Amerịka wezugakwara onwe ha na nzukọ G20, nke bụ ọgbakọ mba ndị akụnaụba ha gbapụtara ihe na mbaụwa, nke a haziri na Saụt Afrịka n'ọnwa Nọvemba 2025.




























