Covid 19 Vaccine Nigeria: Ihe mere m mgbe a gbachara m ọgwụ mgbochị covid-19

Ebe foto si, Ije Akunyili Facebookpage
Dọkịta Ije Akunyili na-arụ n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị na-arịa covid-19 kwuru na kamgbe ọgwụ mgbochi gbasara covid-19 pụtara , ụjọ anaghị atụ ha ma ha na-eleta ndị na-arịa ọrịa covid 19.
O kwuru na mgbe ọ gbara ọgwụ mgbochi a n'izuụka gara aga, obere ahụ ọkụ metụrụ ya mana o nweghị ihe ọzọ ya bụ ọgwụ mere ya.
O kwuru na o teela e bidoro mewe nyocha maka ọgwụ mgbochi a kpatara o ji dị mfe iwepụta ya ugbua.
O kwuru ka ndị mmadụ leghara anya izu ọjọ a na-agba maka ọgwụ mgbochi covid-19 nke Pfizer, Moderna nakwa AstraZeneca ma nabata ya iji gbanahụ maka mkpa mkpa covid na-akpa.
Dọkịta Akunyili kwuru na ụjọ ya bụ na agaghị enwe ọgwụ mgbochi ole ga-ezu ụmụ Naịjirịa. Cheta na ọ bụ naanị puku narị ọgwụ mgbochị a ka gọọmenti kwuru na ha na-ebute na Naịjirịa n'izu a.
Naịjirịa o nwereike ịwepụta ọgwụ mgbochi nke ha?
Dọkịta Ije Akunyili kwuru na dịka India, Chaịna nakwa Rọshịa si nwe ọgwụ mgbochi nke ha, Naịjirịa kwesiri inwe ọgwụ mgbochị nke ya.
O kwuru na ọ bụrụ na covid-19 a jiri ike bata na Naịjirịa , anyị enweghị ngwa ọrụ ahụike zuruoke imemina ya.
Ọ kwuru na ndị okenye niile gbaa ọgwụ a , ọ ga-amagbu onwe ya ma mee kwa ka anyị mepee ebe niile bụ ebe ọha na Naịjirịa na-atụghị ụjọ.
N'okwu ya, "Gọọmenti kwesiri inyocha etu a ga-esi kesaa ya bụ ọgwụ mgbochị, o kwesighị ịbụ naanị ndị ọchịchị kwesiri inwe ohere ị gbaa ya bụ ọgwụ.
O kwuru na gọọmenti kwesiri ịnwe onye dịka dọkịta Fauci nke Amerịka ndị Naịjirịa ga-atụkwasị obi ga na-agwa ndị mmadụ maka etu ihe niile gbasara ọgwụ mgbochi a si aga.
O kwuru na ọ bụ naanị ya nwetegoro ọgwụ mgbochi a n'ime ezinụlọ ya bi n'Ameịrịka, ebe ndị ezinaụlọ ya ka na-eche inweta nke ha.
Ọgwụ mgbochi covid 19 ọ ga-emebinarị Naịjirịa?
Dọkịta Akunyili kwuru na Naịjirịa kwesiri inweta nke AstraZeneca dịka mba na-adịgị enwekarị ọkụ makana ọgwụ mgbochi ahụ anaghị e ji ike emebi dịka nke Pfizer maọbụ Mordena.
Dọkịta Ije Akunyili kwuru na o nwere olileanya na anyị ga-apụtali n'oge covid 19 ma ọ bụrụ na anyị na-eme usoro World Health Organisation wepụtara maka igbochị ọrịa a ma narakwa ọgwụ mgbochị a.
































