Ọkaikpe Ayo Salami enyela onyeisiala Muhammadu Buhari ndụmọdụ ka o belata ndị uweojii so ndị ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC arụ ọrụ.
Salami kwukwara ka Buhari si n'otu ọrụ nchekwa ọzọ na-abụghị ndị uweojii wee họpụta onye isi ọzọ ga-achị EFCC.
Cheta na Ọkaikpe Salami bụ onyeisi otu Buhari hibere ka ha nyochaa Ibrahim Magu bụbu onyeisi EFCC maka ebubo nrụrụaka e boro ya.
Ọkaikpe ahụ kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde n'Abuja, oge kọmiti ya hafere onyeisiala Buhari mpụtara nnyocha ahu ha mere gbasara Ibrahim Magu.
Salami gwara Buhari sị: "Mmadụ anọ bụrụla ndị isi EFCC n'oge gara aga bụcha ndị uweojii."
"Ya mere, ọ bụrụ na ị chọọ ịhọpụta onyeisi ọzọ maka EFCC, ọ ga-adị mma ma i lee anya n'otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ dịka iwu hibere EFCC si kwadoo."
Salami kwuru na ọtụtụ ndị uweojii nọ na EFCC na-akpata nghọtahie n'etiti ndị ọrụ EFCC na ndị uweojii.
Gbasara ebubo e boro Ibrahim Magu, Salami kwuru na ha gbara Magu nakwa ndị akaebe ruru otu narị na iri na atọ ajụjụọnụ.
N'okwu ya, Buhari sị na ọ bụ ihe mwute na nrụrụaka karịrị akarị na Naịjirịa ọkachasị n'ime ọchịchị.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina, onyeisiala gara n'ihu kwuo na ebumnobi ya bụ ime ka Naịjirịa bụrụ mba a ma ama na-anaghị anabata nrụrụaka.
Buhari kwuru sị: "Ọ dị mkpa ka onye ọbụla mata na agha anyị na-ebuso mpụ na nrụrụaka anaghị ele anya n'ihu. Onweghị otu onye karịrị Naịjirịa niile."