NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. Etu nwoke si gbuo ụmụnwaanyị abụọ nye ezi ozu ha ka o rie

    Maria Makgato

    Ebe foto si, Ezinaụlọ Makgato

    Maria Makgato dị afọ 45 na Lucia Ndlovu dị afọ 34 ka e kwuru na ha abụọ nwụrụ oge ha na-achọ nri n’ugbo dị na Polokwane na mba Saụt Afrịka.

    A gbagburu ha abụọ n’onwa Ọgọst ma nwere ozu ha nye ezi ka ọ rie.

    Makgato bụ otu nwaanyị n'ime ndị nwụrụ bụ nne nwere ụmụ anọ si afọ ise rue afọ iri abụo na abụọ.

    A na-ekpe onye nwe ugbo ahụ bụ Zachariah Johannes Olivier dị afọ 60 bụ onye ọcha na ndị ọrụ ya bụ Adrian de Wet, dị afọ 19, nakwa William Musora, dị afọ 50 ikpe igbu ọchụ.

    Ugbua ụlọikpe na-atule ka ha mara na ha a ga-atụghapụ ha atọ na mkpọrọ ka ikpe na-aga n’iru ma ọ bụ jide ha dịka ikpe ha na-aga n’iru.

    Ndị na-eme ngagharị iwe na-agwa ụlọikpe ka ha ghara ịkwe ka a tọghapụ mmadụ atọ ndị ahụ.

    Walter Mathole bụ nwanne Makagatho gwara BBC na ajọ agwa ahụ akpalitela ọzọ ọgbaaghara dị na-etiti ndị ọcha nakwa ndị ojii na mba ahụ.

    Nke a bụ esemuokwu dịwara kemgbe afọ iri atọ garaaga na-agbanyeghị na a machiri ọchịchị ikpa oke.

    Mmadụ atọ ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ugbo na-azakwara ọnụ ha n’ebubo e boro ha na ha chọrọ ịgbagbu dị Ndlovu bụ onye so nọrọ ogbe a gbara ha egbe ahụ.

    Mabutho Ncube zọtara isi onwe ya mgbe mkpamkpa ahụ na-akpa ma jịsịike kpọọ ndị dọkịnta bụ ndị bịara ma nyere ya aka.

    O kwuru na ya kpesara n'aka ndị uweoji bụ ndị mechere chọpụta ozu nwunye ya n’ebe a na-akpa ezi n’ime ugbo ahụ, nke na-egosi na ọ dị ka ha nyere ezi ozu ya.

    Ezinaụlọ Makgato kọwara ọnwụ nne ha dịka ihe mgbanwa obi nke tisara ndụ ha.

    Ụmụ ya ndị nwoke dị mmadụ anọ nọ na-agbata afọ iri abụọ nakwa afọ ise.

  2. Izrel amachiela Odeakwụkwọ otu UN ibata n’obodo ahụ

    Antonio Guterres na-ekwu okwu n'ọgbakọ UNGA afọ 2024

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Antonio Guterres na-ekwu okwu n'ọgbakọ UNGA afọ 2024

    Mịnịsta mba Izrel na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Israel Karts ekwuola na mba Izrel agahị anabata Odeakwụkwọ otu United Nations bụ Antonio Guterres ibata na mba Izrel.

    Israel Kartz kwuru na ha kpebiri nke a maka na Antonio Guterres akatọghị mwakpo mba Iran wakporo mba Izrel n'ụbọchị Tuzde 1 Ọktoba, 2024.

    Ọ gara n’ihu bo Guterres ebubo ịkpọ mba Izrel asị ma na-akwado ndị na-eyi ndụ egwu, imetọ ụmụnwaanyị nakwa igbu mmadụ.

    N’aka nke ọzọ, Izrel ekwuola na otu onye agha ha aha ya bụ Eitan Yitzhak Oster anwụọla na mba Lebanon.

    Oster gbara afọ iri abụọ na abụọ (22) nwụrụ n'ụbọchị Wenezde 2 Ọktoba, 2024 dịka ọ na-edu otu ndịagha ‘Egoz Unit’ ndị ọgụ guerrilla warfare doro anya.

    Ọ bụ onye agha mba Izrel mbụ na-anwụ kemgbe mwakpo mba Lebanon malitere.

    Captain Eitan Yitzhak Oster gbara afọ iri abụọ na abụọ (22)

    Ebe foto si, IDF

    Nkọwa foto, Captain Eitan Yitzhak Oster gbara afọ iri abụọ na abụọ (22)
  3. Benjamin Netanyahu ekwuola na Iran ga-ata ahụhụ maka ogbunigwe ha tụrụ Izrel

    Praịm Mịnịsta mba Izrel Benjamin Netanyahu

    Ebe foto si, Benjamin Netanyahu/X

    Nkọwa foto, Praịm Mịnịsta mba Izrel Benjamin Netanyahu

    Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na mba Iran ga-anụ ụda ya maka ọtụtụ ogbunigwe ahụ ha tụrụ mba Izrel ụbọchị Tuzde.

    Nke bụ eziokwu bụ na a wuchiri ọtụtụ ogbunigwe ahụ mba Iran tụrụ mana akụkọ kwuru na otu onye mba Palestine nọ na mpaghara West Bank nwụrụ ebe ogbunigwe ahụ metụtara ụlọakwụkwọ dị na mpaghara central Izrel nakwa ụlọ oriri dị na Tel Avivi.

    Mba Iran kwuru na ogbunigwe ahụ bụ nzaghachi maka mwakpo Izrel wakporo Lebanon nakwa ogbugbu onyeisi Hezbollah Hassan Nasrallah.

    Izrel kwuru na ha na-eziga ndịagha n’ogige ndịagha ha dị na Lebanon nke ha malitere ime n’izu ụka a ma gwa ndị niile bi n’obodo iri abụọ na ise (25) dị na mpaghara ọdịda Lebanon ka ha kwapụ.

    Hezbollah kwuru na ha gbochiri mwakpo ndịagha mba Izrel mere n’ụtụ Wenezde 2 Ọktoba, 2024 n’obod dị na ndịda Lebanon, ma kwuo na ha na-aga n’ihu ịgba mba Izrel ogbunigwe

    Otu nwaanyị nọ n'ogige ogbunigwe ahụ mebiri

    Ebe foto si, shutterstock

    Nkọwa foto, Otu nwaanyị nọ n'ogige ogbunigwe ahụ mebiri
    Anwụrụ juputara n'ụlọ ogbunigwe ahụ metụtara

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Anwụrụ juputara n'ụlọ ogbunigwe ahụ metụtara
    Anwụrụ ọkụ juputara n'ụlọ ogbunigwe ahụ metụtara

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Anwụrụ ọkụ juputara n'ụlọ ogbunigwe ahụ metụtara
    Ogbunigwe a gbara na Lebanon n'ụtụtụ Wenezde 2 Ọktoba, 2024

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ogbunigwe a gbara na Lebanon n'ụtụtụ Wenezde 2 Ọktoba, 2024
  4. Iran atụọla Izrel nnukwu ogbuniigwe

    Iran atụọla Izrel nnukwu ogbuniigwe

    Ebe foto si, Reuters

    Iran atụọla Izrel nnukwu ogbuniigwe bụ “ballistic missile”.

    Ulọ mgbasaozi nke mba Iran kwuru na ọ bụ eziokwu na Tehran amalitela ịtụ ogbunigwe n’ime Izrel.

    Ngalaba na-ahụ maka nchekwa n’Izrel agwala ndị mba ahụ ka ha zoo ma uche ha dịrị ya maka na Iran atụọla ogbunigwe nwereike ịda na mba ahụ.

    “Ọ bụrụ na unu nụ ụda okpị, onye ọbụla gaa zoo onwe ya ngwangwa ma nọrọ ebe ahụ rụọ oge a ga-agwa unu pụta”.

    Ugbua agbapụla ogbuniigwe abụọ bụ nke na-aga Izrel ka ndị agha Izrel kwuchara na Iran tụrụ ha ogbunigwe.

  5. Anyị ga-anwụchi ndị gbara ụlọ Sịnetọ Frank Ibezim ọkụ - Ndị uweojii Imo steeti

    Senator Frank Ibezim and his torched house

    Ebe foto si, Screenshot

    Ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti akatọọla ọkụ amụnyere mahadum National Open University of Nigeria (NOUN) dị n’Ezeoke Nsu, Okpuru ọchịchị Ehime Mbano nke steeti ahụ.

    Ha katọkwara ụlọ onye bụbu sịnetọ nọchitere anya Imo North n’ụlọ omeiwu sịnetị bụ Frank Ibezim ndị ekperima bibiri n’abalị 30 Septemba 2024.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye zipụrụ n’aha kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma, ọ kọwara njinji ahụ dịka omume na-ebute ndọghachiazụ na nchekwa obodo.

    Ozi ahụ kwuru na Danjuma ezipụla ndị uweojii ka ha chọpụta ma nwụchie ndị kpara mkpamkpa ahụ ma nyekwa iwu ka osote kọmịshọna ndị uweojii na-elekọta ngalaba na-enyocha ndị omekome mee nyocha miri emi iji chọpụta ihe butere ọdachi ahụ.

    Ka o siladị, ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha ga-eme ihe niile iji hụ na e kpere ndị omekome kpara arụ ahụ ikpe.

    Cheta na ndị ekperima mụnyere ụlọ Sịnetọ Frank Ibezim na mahadum National Open University of Nigeria (NOUN) dị n’Ezeoke Nsu, Okpuru ọchịchị Ehime Mbano n'Imo steeti ọkụ ka ọ pụtara kọwaa na e nweghị atụmatụ ọbụla ihiwe ogige ndị gbara ọsọ ndụ na mahadum ahụ.

  6. Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'okwu Onyeisiala Tinubu taa

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Onyeisiala Bola Tinubu nọrọ n'ụtụtụ taa bụ Ọktoba 1, 2024 zigara ụmụafọ Naịjirịa ozi ma kwuputa ọtụtụ ihe gọọmenti ya na-eme iji hụ na ụmụafọ Naịjirịa nwetara uru ọchịchị onyekwuouche ya.

    Lee ufọdụ ihe o kwuru

    A bịa n’ihe gbasara ọnọdụ chekwa, Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na ndịagha na-enweta mmeri n’ọgụ ha na-alụso ndị na-eyi ọha ewgu na mpaghara Naịjirịa niile ọkachasị na mgbago ugwu Naịjirịa.

    O kwuru na e gbuola ndị isi ndị na-eyi ọha egwu ruru 300 ma nwechita udo na mgbago ugwu Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọtụtụ ndị gbara ọsọ maka mwakpo, alaghachila n’ụlọ ha ugbua. Ide mmiri.

    Ozi onyeisiala kwuru na gọọmenti na-agba mbọ inweta enyemaka nye ndị ide mmiri metụtara na Borno steeti.

    O kwuru na gọọmenti etiti amapụtala ọkpụrụkpụ ego iji hụ na e nyere ndị nọ n’ọnọdụ gbatagbata enyemaka ngwangwa.

    Ọnọdụ Akụnaụba Onyeisiala Bola Tinubu kọwara na gọọmenti ya na-eme nhazi na ngalaba akụnaụba Naịjirịa iji hụ na o guzoro etu o kwsịrị.

    O kwuru na e nwere ọtụtụ atụmatụ e wepụtara iji mee ka Naịjirịa nwee ezi akụnaụba nke ga-eme ka ọtụtụ ụlọọrụ si mba ofesi bia hibe ụlọọrụ ha na Naịjirịa.

    Ozi ya mere ka a mata na ụlọakụ etiti na-aga n’ihu ịkwụ ụgwọ Naịjirịa ji iji. Maka ọrụ ugbo O kelere Gọvanọ Kebbi, Niger, Jigawa, Kwara, Nasarawa steeti nakwa Gọvanọ ndị steeti dị na ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa maka etu ha si nabata atụmatụ gọọmeti wepụtara banyere mmepụta ihe oriri.

    Onyeisiala kpọrọ oku ka steeti ndị ọzọ jikọọ aka ọnụ ma nye ndị ọrụ ugbo nkwado.

    Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmenti ga-enye ndị ọrụ ugbo akụrụngwa nakwa fatịlaịza ha ga-eji na-akọpụta ihe oriri.

    Maka ndị ntorobia Onyeisiala Bola Tinubu kwuputara na a ga-enwe ọgbakọ ‘National Youth Conference’ iji nye ndị ntorobịa a ga-ahụpụta na steeti niile dị Naịjirịa ihere inwe mkparịtaụka banyere ihe ha chọrọ ka gọọmenti mee iji nweta ezi ndụ nye ha.

    O kwuru na ‘National Youth Conference’ bụ nke ga-enwee otu ọnwa.

    Maka agụmakwụkwọ O kwuru na Gọọmenti ga-ebinye ụmụakwụkwọ ego iji kwụọ ụgwọ agụmakwụkwọ ha.

    Ọ gara n’ihu kwpụta na gọọmenti ga-amalite atụmatụ The Renewed Hope Labour Employment and Empowerment Programme (LEEP) nke ga-emepụta ọrụ ruru nde abụọ ma karịa (2.5million jobs) maka ndị ntorobịa.

  7. Ndị uweojii gbara ndị na-eme ngagharịiwe n'Abuja anwụrụ anya mmiri

    Ndị uweojii ahụ gbara ndị na-eme ngagharịwie anwụrụ anya mmiri
    Nkọwa foto, Ndị uweojii ahụ gbara ndị na-eme ngagharịwie anwụrụ anya mmiri

    Ndị uweojii agbaala ndị na-eme ngagharịiwe n'Abuja anwụrụ any mmiri dịka ha na-akpọ oku ka gọọmenti belata oke agụụ dị n'obodo.

    Ihe oyoyo BBC Igbo nwetara gosiri ka ndị ngagharịiwe ahụ zukọrọ na mpaghara Arab Junction dị n'Utako ma na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa tupu ndị uweojii gbaa anwụrụ anya mmiri ma chụsasia ha.

    Agbanyeghi na Naijiria na-eme ncheta afọ 64 kemgbe ha ji nweta nnwere onwe ha taa bụ Ọktoba 1, 2024, ọtụtụ otu na ụmụafọ Naịjirịa na-eme ngagharịiwe maka ajọ ọnọdụ akụnaụba, ihe isiike na oke agụụ.

    Ndị ahụ na-eme ngagharịwie
    Nkọwa foto, Ndị ahụ na-eme ngagharịwie
  8. Gọvanọ Enugwu Steeti eduola ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ n’iyi ọrụ

    Gọvanọ Peter Mbah na ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge a na-edu ha n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook

    Nkọwa foto, Gọvanọ Peter Mbah na ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge a na-edu ha n'iyi ọrụ

    Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu Steeti eduola ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ na osote ha turu ugo na ntụliaka e mere ụbọchị Satọde 21 Septemba 2024 n’iyi ọrụ ma kpọọ oku ka ha malite ọrụ ngwangwa.

    Gọvanọ Mba gwara ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ ahụ ka ha ga-biri n’opuru ọchịchị ha ma malite ọrụ iji nyere aka chụọ ọnọdụ enweghị nchekwa n’okpuru ọchịchị ọzọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

    O kwuru na ọ bụrụ na e nwee nchekwa n’obodo, ọ ga-enyereaka kwalite mmepe nakwa agam n’ihu.

    Gọvanọ Mbah gwara ha ka gbaa mbọ iji nweta ezi ndụ nye ndị okpuru ọchịchị ha dị iche iche ma mee ka ọchịchị onyekwuouche ya ruo ndị okpuru ọchịchị ha aka.

    Ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge a na-edu ha n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook

    Nkọwa foto, Ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge a na-edu ha n'iyi ọrụ
    Ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge a na-edu ha n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook

    Nkọwa foto, Ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge a na-edu ha n'iyi ọrụ
    Gọvanọ Peter Mbah na ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge e duchara ha n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook

    Nkọwa foto, Gọvanọ Peter Mbah na ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ oge e duchara ha n'iyi ọrụ