NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. Gọọmenti Enugwu Steeti ekwuputala ntiwapụ ọrịa Otoro na steeti ahụ

    Ndị na-echu mmiri n'adịghị ọcha

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị na-echu mmiri n'adịghị ọcha

    Kọmishọna na-ahụ maka ahụike n’Enugwu steeti bụ Ọkammụta Emmanuel Obi, ekwuputala ntiwapụ ọrịa otoro na steeti ahụ ma kpọọ oku ka onye ọbụla kee nkwụcha iji gbochi nfesa ọrịa a.

    Ọrịa otoro bụ ọrịa na-eme afọ ọsịsa nke maọbụrụ na e lebanyereghi ya anya, o nwereike igbu onye bu ya. Ọ bụ ọrịa e nwereike ibute site na mmiri maọbụ nri n’adịghị ọcha.

    Ọkammụta Emmanuel Obi kwuru na mịnịstrị ya ụfọdụ ndị ọrụ ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ iji chepụta atụmatụ iji gbochie nfesa ọrịa ahụ dịka ntụziaka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ 'Nigeria Centre for Disease Control and Prevention(NCDC) si kwuo.

    Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka ọhanaeze jiri mmiri na-agba agba na ncha kwọọ aka ha nke ọma maọbụ jiri nke bekee kpọrọ sanitizers, ṅụọ mmiri dị ọcha ma hụ na nri ha na-eri dị ọcha.

    Ọzọ bụ iji ihe bekee kpọrọ 'Face Mask' kpuchie iru ha ma ha na-eleta onye ahụ na-adịghị.

    A gwara ndị maọbụ onye ọbụla nwere afọ ọsịsa ka ọ ga n’ụlọọgwụ ma nweta nleta maọbụrụ kpọtụrụ mịnịstrị ahụike na ekwenti ndị a 08037431577, 08033375344, 08037817982.

  2. Otu egwu bọọlụ Kano Pillars U-19 enweela ihe mberede okporo uzo

    Otu egwu bọọlụ Kano Pillars U-19 enweela ihe mberede okporo uzo

    Ebe foto si, Kano Pillars FC/Facebook

    Ndị otu egwu bọọlụ Kano Pillars U-19 enweela ihe mberede okporo uzo ka ha na-aga asọmpị bọọlụ izute ndị ogbo ha bụ Plateau United na Jos n’asọmpị nke ise.

    Dika ozi ngalaba mgbasaozi Kano Pillar zipụrụ kọwara na enweghị onye nwụrụ n’ihe mberede ahụ.

    N’okwu ha “Ọtụtụ ndị ọgbabọọlụ merụrụ ahụ n’ihe mberede okporoụzọ ahụ, mana ekele diri Chukwu na mmadụ anwụghị na ya”.

    “Ndị na-ahụ maka ahụike n’otu egwu bọọlụ anyị na-ahụ ka ọnọdụ ndị niile merụrụ ahụ”.

    “Anyi na-eziga ozi iti aka n’obi nye ndị niile ihe mberede ahụ metutara ma na-ekwe ọhanaeze nkwa na anyị ga na-ekwupụta ka ọnọdụ sị dị”.

    Ndi Kano Pillars gara n’ihu kele ndị niile na nyere ha nkwado n’oge ihe mgbere ahụ.

  3. Ụlọikpe atụọla mmadụ 43 nga n'Anambra steeti maka mpụ ịntaneti

    Ụfọdụ ndị EFCC nwụchiri

    Ebe foto si, EFCC/X

    Ụlọikpe dị elu nke Ọkaikpe ya bụ Evelyn Anyadike atụọla mmadụ ịrị anọ na atọ nga maka ịgwụ ndị mmadụ wayo n’igwe ịntaneti.

    Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) mere ka a mata nke a n’ozi ha zipuru n’akara X ọbaozi X ha.

    Ozi ahụ kwuru na ebubo e boro mmadụ 43 ahụ bụ nke ụlọikpe jiri tụọ ha nga gụnyere iji aghụghọ napụ mmadụ ihe, ijide ego e nwetere na mpụ nakwa inwe akwụkwọ adịgboroja dị icheiche.

    Mmadụ 43 ahụ ụlọikpe tụrụ nga gunyere:

    Momoh Victor Abdulkareem, Paul Emmanuel, Adibe Henry, Okoroafor Abuchi Gospel, Ikechukwu Ezra, Oduu Emmanuel Eyinna, Obasi Chibuike, Chimaobi Ogbonna, Nwankwo Emmanuel Ikechukwu, Aluma Chetachukwu Israel, Emeka Umendu, Ebuka Uka, Chikaodili Michael, Oramulu Nwabufor Michael, Obiajulu Philip Sorpuluchukwu, Iwu Ikedichukwu Emmanuel, Akachukwu Temple Odo, Ifeanyi Samuel, Kyrian Chikodili Ugwu and Nathaniel Oforbuike Nwoba, Chimezie Stephen Obianaso, Kingsley Chukwuebuka Mmadu, Ebuka Eric Uka, Simon Uchenna, Godswill Francis Blessed, Donatus Chinwendu Anya, Aluma Ogochukwu Michael, Nwankwo Stephen Chijioke, Emmanuel Chijioke Okogwu, Ariwodo Ezemdi Lucious, Chidiebere Uwa, Okeke Joshua Okechukwu, Chinemelu Clinton Ugwu, Tochukwu Sunday Ewa, Iburu Nelson Onyeoma, Nwoko Samuel, Nwokwu Victor Izuchukwu, Benjamin Obiajulu, Kelechi John, Moses Chukwuka Ugwueke, Obinna Christian, Ubagu Daniel Chukwuebuka AndChukwu Emmanuel Nnamdi.

    EFCC kwuru na ndị a niile gwara ụlọikpe na ọ bụ eziokwu na ha mere mpụ ahụ nke mere ka Ọkaiwu ha bụ Michael Ikechukwu Ani gwa ụlọikpe ka onye ha ntaramahụhụ ka iwu si kwuo.

    Mana ndị Ọkaiwu nọchitere anya ọtụtụ n’ime ndị ahụ ụlọikpe tụrụ nga bụ Ifeanyi Michael Odoh, James Nwatarali, Bernard Okeke na O. C. Abalu gwara Ọkaikpe ka ọ nwee obi ebere gbasara ụdịrị ntaramaahụhụ ọ ga-enye ha.

    Ka Ọkaikpe Evelyn Anyadike gechere ndị ọkaiwu ntị ka ọ nyere ndị ahụ mere mpụ ntaramahụhụ ịga nga ọnwa asatọ n’otu n’otu ma kwụọ otu nde naira.

    EFCC kwuru na ha nwụchiri mmadụ 43 ahụ n'Abakiliki dị n’Ebonyi Steeti nakwa Awka dị n’Anambra steeti.

  4. A na-atụ egwu na ndị Russia anwụọla n’ụgbọelu a gbaturu na Sudan

    A na-atụ egwu na ndị Russia anwụọla n’ụgbọelu a gbaturu na Sudan

    Ebe foto si, RSF

    Ụlọnnọchiteanya Rọshịa dị na Sụdan ekwuola na ha na-eme nnyocha gbasara ụgbọelu ndị Rọshịa a gbaturu na Dafur.

    Mpaghara Dafur bụ ebe agha dị n’etiti ndịagha Sụdan na otu Rapid Support Forces (RSF) kachasị njọ.

    Ndịagha gwara ndị mgbasaozi Sụdan na ụgbọelu ahụ a matara dịka lyushin Il-76 bụ nke na-aga ibuga ọgwụ na ngwaọrụ n’obodo el-Fasher tupu agbatuo ya.

    N’ụbọchị Mọnde, otu Rapid Support Forces kwuru na ha gbaturu ụgbọelu e mepụtara na Rọshịa nke ndị na-agba ya bụ ndịagha Ijipt ha na-ebo ebubo ịtụgbu ụmụ mmadụ nkịtị.

    Ijipt gọpụrụ onwe ha n’ebubo e boro ha na ha na-enyere ndịagha Sụdan aka n’ọgbaaghara ahụ rurula ọnwa iri na asatọ (18).

  5. Gọọmenti Enugwu achụpụla EEDC, nye Mainpower na Fedikore ikike ire ọkụ latrik

    Peter Mbah and EEDC

    Ebe foto si, Peter Mbah and EEDC/X

    Ka ụlọọlụ National Electricity Regulatry Commission (NERC) nyefere ikike ịbụ ndị na-ahụ maka ọkụ latrik n’aka Enugu Electricity Regulation Commission (EERC), Gọọmentị Enugwu steeti anapụla ụlọọrụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) ọrụ dịka ndị na-ekesa ọkụ latrịk na steeti ahụ.

    Dịka ozi Uche Anichukwu bụ onye ọrụ na ngalaba mgbasaozi Gọọmenti Enugwu ziputara, Enugwu bụ steeti nke mbụ na Naịjirịa nwere ikike ilekọta ka e si ekesa ọkụ latrịk na steerti ha.

    Nke a na-egosi ikike steeti niile dị na Naịjirịa nwere ikepụta ma kwalite ngalaba imepụta na ikesa ọkụ latrik na steeti ha.

    Gọọmenti Enugwu kwuru na ụlọọrụ ga-eso na-ekesa ọkụ latrịk ugbu a gunyere Mainpower Electricity Distribution Limited nke ndị EEDC. Mainpower bụ ụlọọrụ ndị EEDC ga-eji na-ere ọkụ latrịk n’Enugwu bụ nke ga-amalite ọrụ n’ụbọchị Wenesde.

    Ndị ọzọ ga na-ere ọkụ latrịk bụkwa Independent Power Project, IPP, nakwa Fedikore Limited.

    Na mmemme EERC ji malite ọrụ, onyeisi ha bụ Chijioke Okonkwo kọwara na nke a ga-eweta mmepe gbara ọkpụrụkpụ na ngalaba azụmaahịa ọkụ latrịk.

  6. Mwakpo Izrel egbuola mmadụ 13, meruo mmadụ 57 ahụ n’akụkụ ụlọọgwụ dị na Lebanon

    Mpaghara ahụ ogbunigwe ahụ dara

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mpaghara ahụ ogbunigwe ahụ dara

    Ndị ọrụ ahụike na Lebanon ekwuola na mba Izrel wakporo ma tuo ogbunigwe n’akụkụ ụlọọgwụ kachasị ibu na mba Lebanon ma gbuo mmadụ 13 ebe mmadụ 57 meruru ahụ. Akụkọ kwuru na ndị ihe ahụ metụtara bụ ụmụaka.

    Mana ndịagha mba Izrel kwuru na ọ bụghị eziokwu na ha wakporo akụkụ ụlọọgwụ ahụ kama na ọ bụ na mpaghara Beirut ebe ndị otu Hezbollah n’enwe ọgbakọ ka ha wakporo.

    Onye ntaakụkọ BBC nọ na Beirut kwuru na ọ bụ eziokwu na ọbụghị ụlọọgwụ mahadum Rafik Hariri University ka a chọrọ ịwakpo. Ọ gara ‘ihu kwuo na mwakpo ahụ mebiri ọtụtụ ihe n’ụlọọgwụ ahụ ọ kọwara dịka ebe e nwere ọtụtụ ndị Hezbollah.

    Mba Izrel emeela ọtụtụ mwakpo n’akụkụ ọdụ ụgbọelu dị na Lebanon

    Hezbollah n’aka nke ọzọ na-aga n’ihu na-atụ ogbunigwe na mpaghara ugwu mba Izrel ebe akụkọ kwuru na ọ bụ ebe akụrụngwa agha Izrel dị.

  7. Ndị mba Kamerunu ahụla Onyeisiala ha anya nke mbụ n’ime izu ụka isii

    Foto gosịrị ka ndị isi ọchịchị mba Kamerunu na-ekele onyeisiala Paul Biya

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Foto gosịrị ka ndị isi ọchịchị mba Kamerunu na-ekele onyeisiala Paul Biya

    A hụla onyeisiala mba Kamerunu bụ Paul Biya anya nke mbụ n’ime izu ụka isii dịka akụkọ banyere ọnwụ ya fesara ebe niile.

    Ahụghịanya Paul Biya mere ka ọtụtụ mmadụ malite ikesa ozi maka ọnwụ ya.

    Mana ụlọ mgbasaozi TV mab Kamerunu nọrọ ụbọchị Mọnde gosi ihe onyoyo Onyeisiala Paul Biya n’ọdọ ụgbọelụ dị na Yaounde dịka o si mba Swizaland bata.

    Cheta na gọọmenti Kamerunu machiri ụlọọrụ mgabasaozi niile dị na mba ahụ inwe mkparịtaụka ọbụla banyere ọnọdụ ahụike Paul Biya, onye nọ n’ọchịchị kemgbe afọ 1982.

    Oge ikpeazụ a hụrụ Onyeisiala Paul Biya anya bụ ụbọchị Sọnde 8 Septemba, 2024 oge ọ gara ọgbakọ Chaịna-Afrịka sọmit e mere na Beijing.

    Kemgbe ahụ, e nweela ọtụtụ ajụjụ a jụrụ gọọmenti Kamerunu banyere ọnọdụ ahụike Paul Biya, mana ha zara si na onyeisiala Paul Biya nọ n’ezi ọnọdụ ahụike.

    Ha gara n’ihu kwuo na ọ gara Geneva dị na mba Swizaland maka ezumike. Akụkọ kwuru na Geneva bụ ebe Paul Biya na-aga kwa mgbe kwa mgbe.

  8. Togo na Benin Republic na-enwe ọkụ latrik oge niile site na Naịjirịa - TCN

    Transmission lines

    Ebe foto si, Getty Images

    Sule Abdulaziz bụ nnukwu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrik Naịjirịa bụ Transmission Company of Nigeria (TCN) ekwuola na mba Togo na Bene Rịpọblik na-enwe ọkụ latrik oge niile site na Naịjirịa.

    "Anyị na-enye Togo, Bene na Nijie ọkụ. Ha na-enwe ọkụ latrik oge niile, nke ha na-akwụ ụgwọ ya," ka Abdulaziz kwuru oge a na-agba ya ajụjụ n'ụlọmgbasaozi Channels.

    Oge a jụrụ ya ihe mere ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị enwe ọkụ etu ahụ, ọ sịrị na ndị Naịjirịa na-enwe ezigbo ọkụ mana ọ bụghị ebe niile.

    O kwuru na ndị nọ n'ogogo Band A na-enwe ọkụ latrik ihe ruru elekere iri abụọ maọbụ iri abụọ na abụọ kwa ụbọchị.

    Abdulaziz gbakwunyere na a ga-amalite na-enwe ezigbo ọkụ n'ime afọ ise na-abịa n'ihi na Minista ọhụrụ na-agba mbọ maka nke ahụ.

    Onyeisi TCN ahụ kọwakwara na akụrụngwa ha na-emebi kwa mgbe kwa mgbe bụ nsogbu ọzọ ha nwere, n'ihi na ọ akarịala afọ iri ise (50) a malitere iji ha eme ihe.

    Abdulaziz kwuru na ụgwọ ọkụ latrik dị ọnụ ala na Naịjirịa ọ bụrụ ma e ji ya tụnyere mba Afrịka ndị ọzọ dịka Bọkịna Faso, Senegal na Nijie Rịpọblik.

  9. Ihe anyị ma maka ọnọdụ ahụike Ọchịagha Taoreed Lagbaja

    Ọchịagha Taoreed Lagbaja

    Ebe foto si, Nigeria Army/X

    Nkọwa foto, Ọchịagha Taoreed Lagbaja

    Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na a na-akwado ịhọpụta onye ga-arụ ọrụ dịka onyeisi ndịagha Naịjirịa ma kpọọ oku ka ụmụafọ Naịjirịa ghara ige okwu ụgha ahụ nti

    Ozi onyeisi mgbasaozi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Gusau wepụtara mere ka a mata na onyeisi ndịagha bụ Ọchịagha Taoreed Lagbaja gara ezumike nke dị na ezumike ya nke afọ 2024. Ozi ahụ kwuru na enweghi ngalaba ụlọọrụ ndịagha n’eri mperi ma kwuo na ọrụ ha na-aga dịka iwu Naịjirịa si kwu.

    Tukur Gusau kwuru na onye na-ahụ maka iwu na nhazi n’ụlọọrụ ndịagha bụ Abdulsalam Bagudu Ibrahim na-enye Ọchịagha Taoreed Lagbaja ozi ka ọrụ si aga.

    N’ịga n’ihu. Tukur Gusau kwuru na Ọchịagha Taoreed Lagbaja ga-alaghachita n’ọrụ ya ngwa ngwa oge ezumike ya bịara na njedebe.

    Isi ụlọọrụ ndịagha gwara ụlọọrụ mgbasaozi ka ha kpọtụrụ ụlọọrụ maara ihe ekwe na-akụ n’okwu ọbụla ma mee nyocha tupu ha ewepụta ozi.

  10. Onyeisiala Tinubu alọghachila Naịjirịa dịka ọ gachara ezumike na mba UK

    Onyeisiala Tinubu alọghachila Naịjirịa dịka ọ gachara ezumike na mba UK

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu alọghachila Abụja dịka ọ gachara ezumike na mba United Kingdom.

    Onyeisiala wụchiri n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport n'ehihie Satọde 19 Ọktoba 2024.

    Ndị zutere ya gụnyere ndị ọkwa ha dị elu na gọọmenti dịka Onyeisioche APC bụ Abdullahi Ganduje, Onyeisi ndị ọrụ n'obi ọchịchị bụ Femi Gbajabiamila, onye ndụmọdụ nchekwa bụ Malam Nuhu Ribadu, Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu na ndị ọzọ.

    Tinubu hapụrụ Naịjirịa n'abalị 3 Ọktoba gawa UK maka ezumike izuụka abụọ ma sikwa ebe ahụ gaa mba Fransị n'abalị 11 Ọktoba maka ụfọdụ mmemme dị iche iche.

  11. Gaasị agbagbuola otu onye, merụọ itolu ahụ n'Ebonyi steeti

    Igbe gas agbagbuola otu onye, merụọ itolu ahụ n'Ebonyi steeti

    Otu onye anwụọla ebe mmadụ ise ndị ọzọ nọ n'ụlọọgwụ n'ihi igbe gaasị tiwara n'Ebonyi steeti.

    Njinji ahụ jiri n'useekwu Good Shepherd Catering School Mile 50, Amikeaba dị n'Okpuru ọchịchị Ebonyi.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kọwara akụkọ a dịka eziokwu ma kwuo na mmadụ niile ọnọdụ ahụ metụtara bụcha ụmụntakịrị ndị nwaanyị na-anara ọzụzụ n'ogige ọmụmụ ihe ahụ.

    Ọ kwuru na ụmụntakịrị ndị nwaanyị ahụ nọ n'agbata afọ iri na abụọ (12) na afọ iri na itolu (19) nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche.

    Ọ kọwara na otu n'ime ụmụntakịrị ahụ na-esi nri ma na-azakwa oku ekwentị tupu igbe gaasị ọ ji esi nri agbaa.

    Mmadụ ise n'ime itolu ndị ahụ merụrụ ahụ nọ n'igwe na-enyere ndụ aka n'ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital Abakaliki ebe ndị nke ọzọ na-enweta onwe ha.

  12. Ndị mmadụ pụtara na LekkiToll Gate ịme mkpọtụ maka ndị nwụrụ n'End SARA n'afọ 2020

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Michael Adenola

    Taa mere ya afọ anọ kemgbe ndị ntọrọbịa mere ngagharịiwe imegide mmegbu na mkpagbu n'aka ndị uweojii pụrụiche a kpọrọ SARS.

    Iji cheta ụbọchị ahụ, ụfọdụ mmadụ gbakọrọ na Lekki Toll Gate bụ ọgbọ esemokwu n'etiti ndị mmadụ na gọọmentị ịme mkpọtụ.

    Ihe Toll Gate ji bụrụ ọgbọ esemokwu bụ na ndị ntorọbịa na-ekwusi ike na gọọmentị nyere iwu ka agbagbuo ndị ogbo ha ebe ahụ n'abalị ụbọchị 20 Ọktoba mana ndị dị icheiche na gọọmentị agọọla na ndị mmadụ nwụrụ n'ebe ahụ.

  13. Ihe mere ọkụ latrịk ji kopu isi ọzọ taa – NERC

    Ihe mere ọkụ latrịk ji kopu isi ọzọ taa – NERC

    Ebe foto si, NERDC

    Nkọwa foto, Ihe mere ọkụ latrịk ji kopu isi ọzọ taa – NERC

    Ụlọọrụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) ekwuola ihe mere ọkụ latrịk ji kopu isi ọzọ taa ma tinye mpaghara Naịjirịa niile n’ọchịchịrị.NERC mere ka a mata nke n’akwụkwọ ozi ha ji X soshal mịdịa ha nwere zipu taa bụ abalị iri na itoolu nke ọnwa Oktoba, 2024.N’akwụkwọ ọzị ahụ, NERC kwuru na ọ bụ igwe tansfọma dị na Jebba Transmission Station bụ ihe gbara tọọtọọ nwere mee ka ọkụ latrịk kopu isi ọzọ taa.NERC kwuru na usoro ime ka ndị nkịtị soro na-atụ mgbere ọkụ na ngaraba Trasmịshọn bụ nke na-aga n’ihu ma bụrụkwa nke ga-enyere aka mee ka ndị mmadụ rite erere ego ha tinyere na ngaraba ahụ.Ha kwukwara na steeti ruru iri atọ na atọ nakwa Abuja enwetara ọkụ latrịk ụgbua kemgbe awa 1300.

  14. Ọkụ latrik Naịjirịa ekopụla nke ugboro atọ n’ime otu izuụka

    Ọkụ latrik Naịjirịa ekopụla nke ugboro atọ n’ime otu izuụka

    Ebe foto si, Getty Images

    E nweela ụkọ ọkụ latrik ọzọ na Naịjirịa n’ihi mbibi a hụtara n’eriri ọkụ mba ahụ n’ụtụtụ Satọde 19 Ọktoba 2024.

    Ya bụ ọnọdụ etinyela nde kwuru nde mmadụ bi na mba ahụ n’ọchịchịrị.

    Nke ugbua bụ ugboro atọ a na-ahụta mbibi n’eriri ọkụ ahụ n’ime otu izuụka ma bụrụ nke asatọ kemgbe mmalite afọ 2024.

    Nnyocha e mere gosiri na e nweghị otu megawat ọkụ latrik dị n’eriri ọkụ ahụ n’ụtụtụ Satọde.

    Ndị ọkachamara na ngalaba ikikere ọkụ akpọọla oku ka gọọmenti tinye akụrụngwa ọlọrọ ọhụrụ n’igwe ọkụ kachasị na mba ahụ.

    Ha kwuru na ogogo eriri ọkụ ahụ ji ekopụ na-egosi ịdamba gọọmenti ịgbanwe akụrụngwa ndị na-enye Naịjirịa ọkụ.

  15. Ọtụtụ mmadụ anwụọla n’ihi ogbuniigwe Izrel turu na Gaza – ndị ọchịchị Hamas

    Ọtụtụ mmadụ anwụọla n’ihi ogbuniigwe Izrel turu na Gaza – ndị ọchịchị Hamas

    Opekatampe mmadụ iri atọ na atọ (33) anwụọla ebe iri asatọ na ise (85) ndị ọzọ merụrụ ahụ oge Izrel si n’elu tụọ ogbuniigwe n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Jabalịa nke mgbago ugwu Gaza.

    Ndị Hamas na-elekọta mpaghara ahụ kwuru na ogbuniigwe ahụ Izrel tụrụ n’ụbọchị Fraịde gburu opekatampe mmadụ iri atọ na atọ (33) nke iri abụọ na otu (21) n’ime ha bụ ụmụnwaanyị.

    Ozi sitere n’ụlọmgbasaozi Gọọmenti Gaza kwuru na ọnụụọgụ mmadụ niile nwụrụ nwereike ruo iri ise (50) dịka ọtụtụ mmadụ tọrọ n’okpuru ụlọ ndị dara ada.

    Ka o siladị, Izrel ekwubeghị okwu gbasara mwakpo ahụ a sị ha mere mana kemgbe izuụka ole na ole, ndịagha Izrel agaala n’ihu na-awakpo ogige ahụ mmadụ jupụtara n’ime ya dịka ha kwuru na nke ahụ bụ iji gbochie ndịagha Hamas ihiwe otu ọhụrụ ga-ebuso ha agha.

  16. E chiela onye Igbo Imam nke ụlọ okpukperechi national mosque Abuja

    National mosque Abuja

    Ebe foto si, National mosque Abuja/website

    Ụmụ Igbo bụ ndị okpukperechi Alakụba ewerela obi aṅụrị kelee otu n’ime ha maka ịbụ imam nke ụlọ okpukperechi national mosque dị n’Abụja.

    Ndị isi nke ya bụ ụlọ okpukperechi kwupụtara Ọkankụzi Iliyas Usman dịka imam ọhụrụ nke ụlọ okpukperechi national mosque.

    Usman, onye bụ Ọkankụzi n’ihe ọmụmụ Arabic ma bụrụkwa nwaafọ Igbo esonyela na ndị ụkọchukwu nke ya bụ ụlọ okpukperechi.

    Ndị ụkọchukwu ọzọ e nwere n’ụlọ okpukperechi ahụ gụnyere Ọkankụzi Ibrahim Makarai, Ọkankụzi Muhammad Kabir na Sheikh Ahmad Onilewura bụcha ndị na-arụ ọrụ n’okpuru nlekọta Ọkankụzi Ahmad Sa’id Galadanci.

    Otu Muslim Association of the South East kelere imam ọhụrụ ahụ ma rịọ ka Chukwu nye ya ike ọ ga-eji rụọ ọrụ ya nke ọma.

  17. Ndị uweojii awakpoola ogige ndị ntọrị, memilaa abụọ n’Enugu steeti

    Ngwongwo anapụtara ndị ekperima n'Enugwu

    Ebe foto si, Enugu State Police command

    Ndị uweojii Enugwu steeti awakpoola ogige ndị ntọrị dị na Nokpa-Nike, Okpuru ọchịchị Enugu East ma gbuo abụọ n’ime ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Fraịde 18 Ọktoba 2024.

    Ọ sịrị na ndị uweojii na-ebu agha megide ntọrọmmadụ wakporo ogige ndị ntọrị ahụ n’ụbọchị Tọzde 17 Ọktoba 2024 oge ha nwetara ozi dị oke mkpa.

    Dịka o siri kwuo, oge ndị uweojii wụchiri n’ogige ahụ, ha bụ ndị ntọrị malitere ịkwa ha mgbọ, bụ nke mere ndị uweojii jiri zaso ha ma gbuo abụọ n’ime ha ebe ndị nke ọzọ buuru ogogo mmerụahụ dị iche iche rie mbọmbọ.

    Ndị uweojii napụtara otu nwoke ndị ekperima ahụ tọọrọ na Trans-Ekulu dị n’Enugu steeti n’abalị 27 Septemba 2024 ma weghachikwa otu egbe G-3, egbe AK-47 abụọ, magazin atọ na mgbọegbe otu narị na iri abụọ na ise (125).

    Nnyocha ndị uweojii mere gosiri na ndị ntọrị ahụ chọrọ ka nwoke ahụ ha tọọrọ kwụọ nde naịra iri anọ (40,000,000) dịka ego mgbapụta.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii akwatuola ụlọ ndị ekperima ahụ ji mere ogige ha ma malitekwa ịchọ ndị nke ahụ riri mbọmbọ.

  18. A họpụtala Kithure Kindiki dịka Osote Onyeisiala Kenya

    Kithure Kindiki bụzi osote onyeisiala mba Kenya dịka ụlọomeiwu Sịneti chụpụrụ Rigathi Gachagua

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Kithure Kindiki bụzi osote onyeisiala mba Kenya dịka ụlọomeiwu Sịneti chụpụrụ Rigathi Gachagua

    Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto ahọpụtala Ọkammụta Kithure Kindiki dịka osote ya.

    Onyeisi ụlọomeiwu nta mba ahụ kwuputara nnhọpụta Kindiki dịka ha mere ọgbakọ ịkwado nnhọpụta ya.

    Ọkammụta Kithure Kindiki ga-anọchị Rigathi Gachagua onye ụlọomeiwu Sịneti nọrọ ụbọchị Tọzde chụpụ n’ọkwa dịka osote onyeisiala mba Kenya.

    Rigathi Gachagua bụbu osote onyeisiala mba Kenya tupu ụlọomeiwu Sịneti achụpụ ya n'ọkwa ụbọchị Tọzde 17 Ọktoba, 2024

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Rigathi Gachagua bụbu osote onyeisiala mba Kenya tupu ụlọomeiwu Sịneti achụpụ ya n'ọkwa ụbọchị Tọzde 17 Ọktoba, 2024
  19. Onwụ onyeisi Hamas bụ Yahya Sinwar ga-enye ohere maka udo – Onyeisiala Amerịka

    Yahya Sinwar na Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Yahya Sinwar na Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ogbugbu onyeisi Hamas bụ Yahya Sinwar na mpaghara Gaza bụ nke ga-enye ohere maka udo, nkwekọrịta ma kwụsị agha ahụ gbagoro otu afọ.

    Sinwar bụ otu onye mba Izrel na-achọ achọ kemgbe maka aka ya n’ọgụ ahụ tipuru n’ọnwa Ọktoba 7, 2023.

    E ji nyocha DNA chopụta ozu Sinwar ka ndị agha Izrel na-eme ọrụ nyocha ịchọpụta ndị otu Hamas wakporo ụlọ dị na mpaghara Rafah ma gbuo ụmụnwoke atọ.

    Otu onye otu Hamas na-achọghị ikwu aha kwuru na mba Irel enweghị ike ikpochapụ ha n’agbanyeghi na gọọmenti mba Izrel na-egbu ndị isi otu ha.

    Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na ọnwụ Sinwar abụghị nke pụtara na agha dị na Gaza akwụsịla.

    Nke na-abịa dịka otu United Nations kwuru na mwakpo ikuku mba Izrel mere n’ogige ụlọakwụkwọ bụzi ebe obibi na mpaghara Jabalia gburu mmadụ 28.

    Mana Izrel kwuru na ogige ahụ bụ ebe ndị otu Hamsa na ndị agha alakụba na-agbakọ ma na-eme nzukọ, mana ebubo ahụ bụ nke ndị Hamas gọnarịrị.

  20. Ụgwọọnwa 14m naịra anaghị ezuru m ịzụta mmanụ ụgbọala ma rụọ ọrụ – Orji Uzor Kalu

    Orji Uzor Kalu

    Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/X

    Nkọwa foto, Orji Uzor Kalu na-ekwu okwu n'ụlọomeiwu

    Onye na-anọchiteanya Abia Nọt n’ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa bụ Sịnetọ Orji Uzor Kalu ekwuola na ụgwọọnwa 14m anaghị ezuru ya ịgba mmanụ ụgbọala ma rụọrọ ndị Abia Nọt ọrụ dịka onye nnọchiteanya ha.

    O kwuru na ọbụghị eziokwu na ndị omeiwu Naịjirịa n’ebi ndụ okomoko ma ihe niile ha chọrọ ebe ndị ụmụ ogbenye na-ata ahụhụ.

    Sịnetọ Kalu onye kwuru nke a oge ụlọọrụ Channels Tv gbara ya ajụjụ ọnụ, mere ka a mata na gọọmenti enyeghị ndị omeiwu ụgbọala ọbụla.

    Ọ kọwara na ọ bụ naanị otu kọmiti ụlọomeiwu ka gọọmenti bunyere ụgbọala.

    N’ihe gbasatara oke ọnụahịa mmanụ ụgbọala, ihe isi ike na ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ugbua, Sịntọ Kalu kwuru na ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu na-arụ ọrụ iji mee ka ahụhụ ndị a belata ma kwụsị.

    O gbara ama na Onyeisiala Tinubu na-agagharị n’ime abalị n\Abuja iji chọpụta ma mara ihe na-eme n’obodo.