Gọọmenti Enugwu Steeti ekwuputala ntiwapụ ọrịa Otoro na steeti ahụ

Ebe foto si, Getty Images
Kọmishọna na-ahụ maka ahụike n’Enugwu steeti bụ Ọkammụta Emmanuel Obi, ekwuputala ntiwapụ ọrịa otoro na steeti ahụ ma kpọọ oku ka onye ọbụla kee nkwụcha iji gbochi nfesa ọrịa a.
Ọrịa otoro bụ ọrịa na-eme afọ ọsịsa nke maọbụrụ na e lebanyereghi ya anya, o nwereike igbu onye bu ya. Ọ bụ ọrịa e nwereike ibute site na mmiri maọbụ nri n’adịghị ọcha.
Ọkammụta Emmanuel Obi kwuru na mịnịstrị ya ụfọdụ ndị ọrụ ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ iji chepụta atụmatụ iji gbochie nfesa ọrịa ahụ dịka ntụziaka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ 'Nigeria Centre for Disease Control and Prevention(NCDC) si kwuo.
Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka ọhanaeze jiri mmiri na-agba agba na ncha kwọọ aka ha nke ọma maọbụ jiri nke bekee kpọrọ sanitizers, ṅụọ mmiri dị ọcha ma hụ na nri ha na-eri dị ọcha.
Ọzọ bụ iji ihe bekee kpọrọ 'Face Mask' kpuchie iru ha ma ha na-eleta onye ahụ na-adịghị.
A gwara ndị maọbụ onye ọbụla nwere afọ ọsịsa ka ọ ga n’ụlọọgwụ ma nweta nleta maọbụrụ kpọtụrụ mịnịstrị ahụike na ekwenti ndị a 08037431577, 08033375344, 08037817982.




















