NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. A chụpụla Rigathi Gachagua dịka Osote Onyeisiala mba Kenya

    Rigathi Gachagua

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Rigathi Gachagua

    Ụlọomeiwu Sịneti mba Kenya ewepụla osote onyeisiala mba Kenya bụ Rigathi Gachagua n’ọkwa.

    Cheta na ndị ụlọomeiwu ahụ boro Rigathi Gachagua ebubo iri na otu nke gụnyere nrụrụaka, ịkwado nkewa nakwa igbochi agamn’ihu gọọmenti.

    Rigathi Gachagua kwesịrị ịbịa zara ọnu ya n’ebubo ndị ahụ ụbọchị Tọzde mana ọkaiwu gwara ndị omeiwu na Gachagua onye a maara dịka Riggy G nọ n’ụlọọgwụ maka ọrịa obi mgbu ma rịọ ndị omeiwu ka ha ghazigharịa nyocha ahụ.

    N’agbanyeghi arịrịọ ya, ụlọomeiwu ahụ kpebiri ma chụpụ Rigathi Gachagua n’ọkwa dịka osote onyeisiala.

    Ndị omeiwu ahụ kwuru na ha achọghị ka okwu Rigathi Gachagua ruo ụbọchị Satọde nke gosịrị mkpebi ha ịchụpụ ya kemgbe ọnwa ole na ole ya na Onyeisiala William nwere esemokwu

    Cheta na ndị ụlọomeiwu nta Kenya nọrọ n’izu ụka gara aga kpebiri ma binye aka ka a chụpụ Rigathi n’ọkwa.

    ụbọchị Tọzde 17 Ọktoba, ndị omeiwu Sịneti 67 binyere aka ma kwado ebubo ndị ahụ e boro Gachagua.

    Rigathi Gachagua onye ji ego achụ ego si na mpaghara Mount Kenya kọwara ọchụchụ ya dịka mkpagbu ndọrọndọrọ ọchịchị.

  2. Ihe butere ọkụ tanka gbagburu karịa mmadụ 150 na Jigawa steeti

    Ebe ọkụ tanka gbkpara mkpamkpa na Jigawa Steeti

    Kemgbe ọkụ tanka gbagburu ọtụtụ mmadụ ọnụ ọgụgụ ha karịrị 153 na Jigawa steeti ndị mmadụ na-ajụ ọ bụ gịnị mere udiri mkpamkpa a ji-akpa na Naịjirịa kwamgbe-kwamgbe.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na steeti ahụ bụ Shiisu Adam gwara BBC na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n’ọkụ tanka ahụ ruru 153 ebe ndị ọzọ ruru mmadụ 100 meruru ahụ ma na-enwete ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ Aminu Kano, Jahun, Nguru, Hadejia nakwa ụlọọgwụ Gumel.

    E meela olili ozu ndị nwụrụ anwụ n’akụkụ ebe mkpamkpa ahụ nọ kpaa.

    Cheta na ihe ọdachị ahụ mere n’ụbọchị Tuzde n’ihe dịka elekere 11:30 nke abalị oge tanka bu mmanụ sị Kano steeti na-aga Yobe steeti dara na okpuruọchịchị Taura dị na Jigawa Steeti.

    Oge Tanka ahụ dara, mmanụ ụgbọala ọ bu kwafuru nke mere ndị mmadụ ji ga na-ekulu mmanụ ahụ tupuu tanka agbaọkụ ma gbagbuo ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ.

    Gịnị mere udiri mkpamkpa a ji akpa na Naịjirịa?

    N’ọnwa Seputemba afọ a ka tanka bu mmanụ ụgbọala na nnukwu ụgbọala bu ehi nwere ihe mgberede okporo ụzọ nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

    Onye mara ihe ekwe na-akụ gbasara nchekwa onwe bụ Emmanuel John gwara BBC na ọ bụ ọtụtụ ihe nwereike ịkpata ụdịrị ihe mgberede okporoụzọ ahụ.

    “Nke mbụ bụ ọnọdọ tanka nọ nakwa ka ọnọdụ ụzọ ha na-agba dị”.

    Ndeko ndị ụlọọrụ FRSC kwuru na ọtụtụ ụgbọala tanka dị na Naịjirịa eluola afọ karịrị afọ iri atọ ebe ọtụtụ n’ime nọ n’ọnọdụ adaghị emezi ya ma ọ nwe nsogbu.

    Ọtụtụ bụ ndị ụkwọ taya ụgbọala ha mebiri na ihe ndị ọzọ.

    Ọ kwuru na ihe ọzọ na-ebute nnukwa ọdachị bụ ndị mmadụ nwere anya ukwu bụ ndị na-aga ekulu mmanụ ụgbọala oge tanka dara.

    “Ọ bụrụ na tanka daa, ị ga ebe ahụ pụtara na gị chọrọ ịwụ.

    Ndị ọzọ kwuru okwu rụtụrụ aka na ọ bụrụ na gọmenti dozie ụzọ mebiriemebi na nke ahụ ga-enyereaka beleta ụdịrị ọdachị ahụ.

    Ha kwuru na ọ dị njọ tanka ibu mmanụ ụgbọala n’uhuruchi na ọ bụ n’abalị ka ha kwesiri ị na-ebugharị mmanụ ụgbọala.

  3. Etu ego karịrị N500,000 nwere ike ịkpọba onye POS n’ụlọ nga

    Igwe ego POS

    Ndị uweoji enyela ụmụamala Naịjirịa na-eme POS ndụmọdụ gbasara ịnata ego karịrị Narị naira ise (N500,000) ma ọ bụ izupu udiri ego ahụ.

    Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na Delta steeti mere ka a mata nke a na- ihe onyonyo ọ meputara na X soshal mịdịa ya.

    Edafe kwuru na ndị mmadụ nwereike ibanye n’ọnwụwa maka iji POS ha nwere nyere ndị ntọ aka nata ego ma ọ bụ zipu ego.

    N’okwu ya “ozi m na-enye ndị na-eme POS bụ ka ha hara ịtụ mgbere ego karịrị N500,000 maka ibanye na nsogbu”.

    “Ekwela ka ndị ntọ nwere gị mere akụrụngwa maka na a chọwa ego ahụ a ga-achọta ya n’aka gị”. Edafe gara n’ihu gosi nwanyị ha jidere maka na ọ jị POS ya nata N4,000,000 bụ ego ndị ntọ.

    Ọ kwuru na ego nwanyị POS ahụ ritere bụ naanị N40,000 mana ụgbua, ọ nọzị n’aka ndị uweoji na-azara ọnụ ya maka ya.

    Ọ sị na mmadụ nwere ike ikwu na ya na-eme azụmahịa maọbụ na ọkaiwu ya ga-agbapụta ya mana nke bụ eziokwu bụ na “tupu onye ahụ apụta na nsogbu ahụ, ọ ga-ewe ya ọtụtụ oge ma ọ bụrụ na o nweteghị onwe ya n’ụlọ nga”.

    Bright Edafe

    Ebe foto si, Bright Edafe/X

  4. O dobeghi anya na ọ bụ ndị uweojii gburu nwoke nwụrụ n'Enuwgu taa

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Supplied

    Kọmishọna ndị uweoji n’Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu ekwuola na nyocha ha merela ugbua egosibeghị na ọ bụ onye uweoji ma ọ bụ ndị uweoji gbagburu otu nwoke aha ya bụ Smith Odinaka.

    Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii gbagburu nwoke ahụ si ebe ọ gara mmemme alọghachite mana ndị uweojii ekwetabeghi nke a

    Uzuegbu bụ onye mere ka amata nke a site n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe bịpụtara taata bụ Ọktoba 16, 2024.

    O kwuru na agbanyịghị ihe ndị mmadụ na-ekwu na ha enwetebeghị ihe a ga-ejide aka were sị na ọ bụ ndị gbagburu Odinaka ma ga n’ihu kwuo na ha ga-eme nyocha tọrọatọ ma chọpụta ihe mere.

    Dịka ọkwụkwọ ozi Daniel Ndukwe sị “Uzuegbu kwere ohanaeze nkwa na ya ga-eme ihe niile ya nwereike ime ka a chọpụta ndị gbagburu nwa amadị ahụ ma kpụpụ ha ụlọikpe”.

    Ndukwe kwuru na chọpụtara na “Odinaka bu ụgbọala Mercedes-Benz, ya na ndị enyi ya abụọ so oge ndị a na-enyoenyo na ha bụ ndị ọrụ nchekwa gbara ya egbe, gbagbuo ya ma gbalaga”.

    Ọ kwuru na e bugara Odinaka ụlọọgwụ bụ ebe dọkịnta nọ kwuo na ọ wụọla tupuu e buru ozu ya tinye n’ụlọ ọbaozu.

    Cheta na a gbagburu Odinaka n’abalị iri na atọ nke ọnwa ọktoba n’ihe dịka otu elekere n’isi ụtụtụ n’akụkụ ọdụ ụgbọala Mercedes-Benz dị na okporo ụzọ Enugu/Port Harcourt”.

  5. Ọkụ tanka agbagbuola ihe ruru mmadụ 94 na Jigawa steeti

    Tanka bu mmanụ agbịdị

    Ihe ruru mmadụ 94 anwụọla na mpaghara ugwu Naịjirịa mgbe tanka bu mmanụ agbịdị gbara ọkụ na Jigawa steeti.

    Akụko kwuru na mmadụ 50 ọzọ merụrụ ahụ na ya bụ ọdachi mere na mgbede ụbọchị Tuusde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Jigawa steeti bụ Shiisu Lawan Adam sị na tanka dahapụrụ ọkwọụgbọala ahụ n'aka nke mere ka Tanka ahụ daa n'ala.

    BBC ghọtara na ndị uweojii hibere mgbochi na nso tanka ahụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ịbịa nso mana igwe mmadụ nupytere ebe ahụ ma chụpụ ndị uweojii ebe ha na-achọ ịkupute mmanụ ụgbọala na-awufu ebe ahụ.

    Dịka ihe si kwụrụ ugbua ebugala ndị merụrụ ahụ n'ụlọogwụ Ringin nakwa Hadeja dị na steeti ahụ.

    BBC ghọtakwara na ụgbọala ahụ si Kano a ga Yobe steeti mgbe ọdachi ahụ mere n'obodo Majia dị n'okpuruọchịchị Taura dị na steeti ahụ.

    A na-atụ anya na ụfọdụ mmadụ ka nwereike ịnwụ site n'ụdịrị ahụ ha merụrụ na ya bụ ọkụ gbara.

  6. Ndị uweojii ememilaala ndị ohi n'Imo steeti

    Ndị ojiegbe anwụchiri n'Imo steeti

    Ebe foto si, Imo state police command

    Ndị uweojii Imo steeti ekposaala ndị ojiegbe na-eyi ndị mmadụ egwu ma na-ezukwa ha ohi n’Okpuru ọchịchị Owerri North.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’otu ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Tuzde 15 Ọktoba 2024.

    O kwuru na ndị uweojii kpara ike ahụ site n’ọnọdụ nchekwa nke Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma kwalitere nke lekwasara anya n’ibu agha megide agwa tigbuo zọgbuo ọkachasị n’abalị.

    Dịka Okoye siri kwuo, n’abalị 15 Ọktoba 2024, ndị uweojii natara ozi gbatagbata site n’aka ndị bi na Dominion street, n’akụkụ Don Kay dị n’Okpuru ọchịchị Owerri North.

    Ọ sịrị na dịka ndị uweojii ruru ebe ahụ, ha zutere ndị ojiegbe ezu ohi bụ ndị malitere ịkwaso ha mgbọ. Mana ka o siladị, ndị uweojii guzosiri ike ma gosi ha nkarị.

    Ndị uweojii gbagburu otu n’ime ha mgbe ha na-akwarịta mgbọ, ebe mgbọ tụtara onye nke ọzọ gbara afọ iri atọ na otu (31) aha ya bụ Moses Nanzi, nwaafọ Plateau steeti nke mere ka ndị uweojii nwụchie ya.

    Ka ọ dị, ndị nke fọrọ afọ riri mbọmbọ dịka ndị uweojii weghachitere egbe ‘double-barrel' na mgbọ egbe asaa.

    Ozi ahụ kwuru na ndị uweojii nọ ugbua na-agba mbọ ịnwụchi ndị nke ahụ gbara ọzọ ebe a ga-akpụpụ onye nke ahụ anwụchiri n’ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha.

    Ngwongwo a napụtara ndị uweojii n'Imo steeti

    Ebe foto si, Imo state police command

    Ngwongwo a napụtara ndị uweojii n'Imo steeti

    Ebe foto si, Imo Police Command

  7. Enugwu: Ihe mere anyị ji wuchie n’Urban Radio, kpụrụ onye ọrụ ha – EFCC

    Ndị ọrụ EFCC

    Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC n'Enugwu steeti akọwaala ihe mere ha jiri wuchie n’Urban Radio dị n’Enugwu steeti ma kpụrụ otu onye ọrụ ha.

    EFCC mere ka a mata nke a n’ozi onyeisi ngalaba mgbasaozi ha bụ Dele Oyewale kesasa n’akara ọbaozi X ha.

    N’ozi ahụ, EFCC kọwara na ọ bụ otu onye aha ya bụ Favour Ekoh na-arụrụ ndị Urban Radio ọrụ ka ha gara kpụrụ maka ebubo mpụ gbasara ịkapụ ndị mmadụ ego ruru narị nde naịra asaa (N700million).

    EFCC kwuru na “Ekoh ka anyị na-eme nnyocha n’isi ya maka ebubo ịnapụ ndị mmadụ ego ruru narị nde naịra asaa (N700million). Ndị a napụrụ ego ha ruru madụ iri ise (50) kwuru na ọ bụ Favour Ekoh mere ka ha tinye ego ha n'ahịa ahụ ha kpọrọ “Life Trading”.

    “Life trading bụ azụmaahịa e kwere ndị tinyere ego na ya nkwa na ha ga-enwete pasenti iri (10%) dịka uru ha ritere n’ego niile ha tinyere.

    Mana ka ndị mmadụ tinyechara ego, azụmaahịa ahụ emechie ma were ego ha tinyere gbafuo”.

    Dịka EFCC si kwuo, ndị e riri ego ha kwuru na ọ bụ naanị Favour Ekoh bụ onye ha maara ma bụrụkwa onye mere ha jiri tinye ego.

    Ha gara n’ihu kwuo na ha atọhapụla Favour Ekoh ka ha kpụgachara ya n’ụlọọrụ ha bụ ebe o dere akwụkwọ ma zara ọnụ ya gbasara ebubo ahụ.

    EFCC kọwakwara na enweghị ihe ha weere n’ụlọọrụ ndị Urban Radio mana ha jidere mmadụ abụọ bụ ndị nyere ha nsogbu ma na-egbochi ha ịrụ ọrụ ha bụ ndị ha mechere tọhapụkwa.

  8. PDP agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe maka npụta ntụliaka Gọvanọ Edo Steeti

    Foto Asue Ighodalo na njirimara PDP

    Ebe foto si, Asue Ighodalo/PDP/X

    Nkọwa foto, Foto Asue Ighodalo na njirimara PDP

    Onyeisioche otu Peoples Democratic Party (PDP) n’Edo steeti bụ Anthony Aziegbemi ekwuola na ha agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe Edo State Election Tribunal maka npụta ntụliaka gọvanọ e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde 21 Septemba.

    Aziegbemi kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka na Benin City, isi obodo Edo steeti.

    N’okwu ya ‘Npụta ntụliaka ahụ bụ nke juputara na nrụrụaka ma bụrụ nke megidere usoro iwu kwadoro’.

    Ọ gara n’ihu bo ebubo na pati All Progressive Congress chọrọ igbochi ha iwu ụlọikpe nyere ka PDP nyochaa akụrụngwa e ji eme ntụliaka dị n’ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) at Aduwawa mana ha gbara mbọ gbochie atụmatụ ha ahụ.

    Aziegbemi kwuru na ha nwere ihe akabe nke gosịrị na bụ ndị meriri na ntụliaka ahụ ma kwuo na ha nwere ntụkwasịobi na ha ga-enweta mmeri n’ụlọikpe ahụ.

  9. Super Eagles awụchiela Naịjirịa

    Otu egwu bọọlụ Super Eagles

    Ebe foto si, NFF

    Otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles alọghachila Naịjirịa dịka ha gabigachara ọnọdụ ekwesịghị ekwesị n’ọdọụgbọelu mba Libya ebe ha nọrọ ihe karrịrị awa iri na abụọ na-ahụghị nrị maọbụ mmiri ọṅụṅụ.

    Onyeisi ndị otu ahụ bụ William Troost-Ekong kwupụtara nke a dịka ọ sịrị na ha “alọghachila ụlọ n’udo.”

    O kwuru na kemgbe afọ iri ọ malitere ịgbara otu egwu bọọlụ ahụ, anya ya ahụtụbeghị ụdị ihe a mbụ mana ọ sịrị na ọnọdụ ahụ mere ka ha matakwuo onwe ha nke ọma.

    Ọ depụtara n’akara ọbaozi X ya sị “ana m atụ anya na anyị ga-aga n’ihu na njem asọmpi AFCON 2025 etu kwesịrị ekwesị n’ọnwa na-abịa abịa bụ Nọvemba”.

    Ebumnoobi anyị imere Naịjirịa ihe kachasị mma agaghị agbanwe. Ụgbụa ka m rie ihe olulo m ma zuo ike,” ka ọ depụtara.

  10. Sit at home: Ndị Anambra enupụla isi n’iwu Gọvanọ Soludo

    Ndị Anambra erubeghị isi n'iwu gọvanọ nyere

    Ndị Anambra steeti ajụla ịnabata ntụziaka gọọmenti steeti ahụ nyere ka ha malite ịgbape ụlọahịa ha kwa ụbọchị Mọnde niile.

    Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Charles Soludo nọọrọ n’ụbọchị Tuzde 8 Ọktoba 2024 nye iwu ka amalite ịgbape ahịa niile dị na steeti ahụ kwa ụbọchị Mọnde niile oge ọ gara njem n’ụfọdụ ahịa dị na steeti ahụ.

    N’otu aka ahụ, onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ Soludo n’ihe gbasara ahịa na ịtụ mgbereahịa bụ Evarist Uba wepụtara ozi n’ụbọchị Tọzde 10 Ọktoba 2024 iji dọọ ndị nwere ụlọahịa aka na ntị ka ha malite ịgbape ụlọahịa ha n’ụbọchị Mọnde niile karịa irube isi n’iwu onye apụtala ezi.

    Ozi ahụ yiri egwu na gọọmenti ga-akpọchi ụlọahịa ọbụla na-emepeghị malite n’ụbọchị taa bụ Mọnde 14 Ọktoba 2024.

    Mana oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara Anambra dị iche iche, ọ chọpụtara na ndị mmadụ erubeghị isi na ntụziaka ahụ dịka ọtụtụ ahịa na ụlọakwụkwọ kpọchịrị akpọchi.

    Cheta na aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah gbara mbọ ime ụdị ihe ahụ na steeti ya n’oge ọ malitere ọchịchị mana ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị erube isi.

    Ndị Anambra erubeghị isi n'iwu gọvanọ nyere
    Ndị Anambra erubeghị isi n'iwu gọvanọ nyere
    Iwu Gọọmenti Anambra steeti nyere gbasara ịgbape ụlọahịa

    Ebe foto si, Anambra state government

  11. Otu egwu Super Eagles ahapụla Libya

    Otu egwu bọọlụ Super Eagles ka ha na-aba ụgbọelu ịlọghachita Naịjirịa

    Ebe foto si, Pooja Media/Instagram

    Nkọwa foto, Otu egwu bọọlụ Super Eagles ka ha na-aba ụgbọelu ịlọghachita Naịjirịa

    Otu egwu bọọlụ Super Eagles Naịjirịa na ndị nkụzi ha ahapụla Libya lọtawa Naịjirịa ka ha nọrọ ihe ruru awa 14 n’ọdọ ụgbọelu Al Abraq International Airport dị na mba Libya.

    Nke a na-abịa dịka gọọmenti mba Libya nyere iwu ka e resị ụgbọelu otu egwu bọọlụ Super Eagles mmanụ ụgbọelu ma nye ha ohere ka ha o fepụ.

    Cheta na ndị isi mba Libya nyere iwu ka a kpọchie otu egwu bọọlụ Super Eagles n’ọdọ ụgbọelu ahụ ka ha bịara maka asọmpi ntozu n’asọmpi ịkọ mba Afrịka.

  12. Ndị uweojii awuchiela nwoke ji egbe na mmeme achụmntavootu Donald Trump

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Donald Trump

    Ndị uweojii mba Amerịka awuchiela otu nwoke ji egbe na mmeme achụmntavootu Donald Trump mere na Coachella dị na steei California.

    A chọpụtara egbe abụọ ahụ na mgbọ egbe n’ime ụgbọala Vem Miller gbara afọ 49. Ndị uweojii Riverside County wuchiri ya ma debanye aha maka ibu egebe nwere mgbọ.

    Ka ndị uweojii cechara nyocha ha, Vem Miller kwụrụ puku dọla ise ($5,000) maka ntọhapụ beelu ya.

    Ndị uweojii kwuru na nchọpụta nyocha ha mere gosịrị na enweghị ihe nsogbu ọbụla nchọpụta egbe ahụ nyere ha n’emume achụmntavootu Danald Trump

  13. NFF na-akwado ịkpọghachita otu egwu bọọlụ Super Eagle site na mba Libya

    Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles nọ n'ọdọ ụgbọelu arahụ ụra maka mkpọchi mba Libya kpọchiri

    Ebe foto si, William Troost Ekong/Instagram

    Nkọwa foto, Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles nọ n'ọdọ ụgbọelu arahụ ụra maka mkpọchi mba Libya kpọchiri

    Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) akatọọla ma kagbuo ajọ ọnọdụ mba Libya tinyere otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa n’ọdọ ụgbọelu Al-Abraq Airport dịka ha bịara maka asọmpi ntozu n’asọmpi ịkọ mba Afrịka.

    Cheta na ndị isi mba Libya nyere iwu ka a kpọchie otu egwu bọọlụ Super Eagles n’ọdọ ụgbọelu ahụ ihe ruru awa iri na abụọ. NFF kwuru na agwa ahụ bụ nke jubguru onwe ya.

    Akụkụ anyị nwetara n’aka ngalaba NFF na-ahụ maka mgbasa ozi kwuru na ọ bụ n’ọdọ ụgbọelu Benghazi Airport ka ụgbọelu otu Super Eagles kwesịrị ịda na ya mana ha amaghị ihe mere e ji ziga ụgbọelu ahụ n’ọdọ ụgbọelu Al-Abraq nke akụkọ kwuru na ọ bụ naanị ndị na-eje ala nsọ na-eji ọdọ ụgbọelu Al-Abraq eme njem maka na o perempe.

    NFF kwuru na nke metutara atụmatụ na mbọ ha gbara iji buru otu egwu Super Eagles ma buga ha n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ha kwesịrị ị nọ na ya.

    Ka ọ dị ugbua, ndi otu egwu bọọlụ Super Eagles nke onyeisi ha bụ William Troost Ekong ekwuola na ha agaghị asọ mpi ahụ n’ihi ajọ ọnọdụ mba Libya tinyere ha na ya. Ekong gara n'ihu gosi foto ajọ ọnọdụ ha ọ n'ime ya n'ọdọ ụgbọelu ahụ.

    Otu NFF ekwuola na ha amalitela atụmatụ ibughchita otu bọọlụ Super Eagles na Naịjirịa.

    N’aka nke ọzọ mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa bụ John Owan Enoh akagbuola ajọ omume mba Libya mezsoro otu egwu bọọlụ Super Eagles.

    John Owan Enoh katọrọ ajọ omume ndị isi egwuregwu na mba Libya ma kpọọ oku ka ha rube isi nye iwu na-akwado egwuregwu bọọlụ na mbaụwa niile gbaa gburugburu.

    O kwuru na mịnịstri ya na-agba mbọ iji hụ na ha kpọpụrụ otu Super Eagles n’ọdọ ụgbọelu Al-Abraq ebe ha nọgoro karịa awa 12 na ụma.

    Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles nọ n'ọdọ ụgbọelu maka mkpọchi mba Libya kpọchiri

    Ebe foto si, NFF TV

    Nkọwa foto, Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles nọ n'ọdọ ụgbọelu maka mkpọchi mba Libya kpọchiri
    Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles nọ n'ọdọ ụgbọelu maka mkpọchi mba Libya kpọchiri

    Ebe foto si, NFF TV

    Nkọwa foto, Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles nọ n'ọdọ ụgbọelu maka mkpọchi mba Libya kpọchiri
  14. NFF na Peter Obi eruola uju ndị ntaakụkọ atọ e gburu n’Anambra

    Njirimara NFF na Peter Obi

    Ebe foto si, NFF and Peter Obi/X

    Otu na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) akwaala arịrị maka ndị ntaakụkọ atọ e gburu n’Anambra steeti.

    Ndị ojiegbe wakporo ụgbọala bu ndị ntaakụkọ ahụ n’ụzọ sị Ihiala gawa Orlu n'ụbọchị Tuzde 8 Ọktoba, 2024

    Dịka ozi ngalaba mgbasaozi otu NFF zipuru “onyeisi NFF bụ Alhaji Ibrahim Musa Gusau kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obị kemgbe ụbọchị Tuzde abalị 8 nke ọnwa Ọktoba, afọ 2024 bụ ụbọchị ndị ejiegbe gbagburu ndị ntaakụkọ mmadụ atọ ahụ”.

    “Ndị egwuregwu na Naịjirịa na ụlọọrụ Supersports nwere ezigbo mmeko na adịmnamma. Supersports na-enye aka eme ka ndị Naịjirịa na-enwe obiụtọ.

    "Ekpere anyị bụ ka Chineke gbaa ezinaụlọ ndị e gburu ume, ma gbakwa ụlọọrụ Supersports ume”.

    “Ugbua anyị ka na-ekpe ekpere ka otu onye so n’ụgbọala ahụ lọghachịta. Ka ọ lọta ma lakwuru ezinaụlọ ya.”

    NFF gara n’ihu kelee ndị ọrụ nchekwa maka mbọ niile ha na-agba kemgbe mkpamkpa ahụ kpara.

    Oge anyị kpọtụụrụ Gọọmenti Anambra steeti, ọnụ na-ekwuru ha bụ Christian Aburime gwara onye ntaakụkọ anyị ka ọ kpọtụrụ ndị uweojii maka akụkọ ahụ.

    Mana ka ọnọdụ dị ugbua, ndị uweojii ekwubeghị okwu gbasara ndị ntaakụkọ ahụ e gburu n'agbanyeghị mbọ niile BBC Igbo gbara ka anyị nwete ọsịsa ha.

    Oge anyị na-ebipụta akụkọ a, anyị amabeghị ọnọdụ onye nke a na-achọ achọ nakwa ọnọdụ ezinaụlọ ndị ntaakụkọ ahụ e gburu.

    Ihe Peter Obi kwuru maka ndị Supersports Tv e gburu

    Onye zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi akatọọla etu ndị ojiegbe si egbu ụmụ Naịjirịa ma na-atọrọ ha ma kọwaa ọnọdụ ahụ dịka ihe jọgburu onwe ya.

    Peter Obi, onye kwuru na ọnọdụ ahụ na-akawanye njọ katọrọ ka ndị omekoome siri wakpoo ndị ntaakụkọ na-arụrụ ndị SupersportsTV ọrụ oge ha na-aga Uyo, dị n'Akwa Ibom steeti maka asọmpi ndị Ugo Naịjirịa nwere.

    Dịka Obi siri kwuo “ndị ejiegbe gburu ụfọdụ ma tọrọ ndị ọzọ”. Ebe mkpamkpa ahụ kpara bụ n’ụzọ Ihiala dị n’Anambra nke na-aga Orlu, Imo steeti.

    Peter Obi bere akwa arịrị ma kwuo na ugbua “na Naịjirịa amaghịzi mmadụ ole na-anwụ maka ajọ ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba dị ugbua”.

    Obi jikwa ohere ahụ jụọ sị “kedu mgbe anyị ga-agwa ndị na-egbu ụmụ amaala na nke a bụ nke ikpeazu?”

    Ọ gara n’ihu tie ezinaụlọ ndị e gburu ụmụ ha ma rịọ ndị ọrụ nchekwa ka ha tinyekwuo uchu maka ichekwa ndụ na akụnụba ụmụ Naịjirịa.

  15. Pope Francis etinyela ọnụ gbasara ndịagha United Nations e merụrụ ahụ na Lebanon

    Pope Francis

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ụka Katọlịc bụ Popu Francis enyela ndụmọdụ gbasara ọnọdụ ndịagha United Nations (UN) bụ ndị mmadụ ise n’ime ha merụrụ ahụ na Lebanọn.

    Popu Francis bụ onye kpọrọ oku ahụ na Vatican kwuru “ana m agwa ndị niile ọ gbasara dịka Palestine, Izrel na Lebanọn ka ha kwanyere ndịagha UN ugwu”.

    “Na mbụ, akpọọla m oku ka ha kwụsị agha dị n'etiti ha ma sonyere ụzọ iji ọnụokwu na ịkpa ntata were chọọ udo”.

    Mana ndị Hezbollah na-ekwu na ha na ndị Izrel ka na-akwakọrịta mgbọ na mpaghara obodo ha dị n’okeala ha na ndị Izrel.

    Ndị Izrel n’aka nke ọzọ na-ekwu na ọtụtụ ndịagha merụrụ ahụ ma nọrọ n’ụlọọgwu ugbua.

    Praịm Minista Lebanọn bụ Najib Mikati katọrọ oku ogbo ya bụ Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu kpọrọ ka e wepụ ndịagha UN nọ ọrụ nchekwa n’okeala mba ahụ. Netanyahu kpọrọ oku ahụ n’ụtụtụ ụbọchị Sonde ma kwuo ka ndịagha UN si n'okeala ahụ ha nọ ọrụ pụọ ozugbo ozugbo.

    Mana Mikatị kọwara na nke ahụ bụ “ụzọ ndị iro ha ji na-enupụisi n’iwu mbaụwa”.

    Ka agha dị n'etiti Izrel na Lebanọn na-aga n’ihu, ọtụtụ ndịagha bịara ọrụnchekwa maka udo nakwa ndịọrụ gbatagbata enwetela nnukwu mmerụahụ bụ nke mba ọnụọgụ ha ruru iri na anọ katọrọ.

  16. NDLEA anwụchiela nwoke si Thailand maka ịtụbata ọgwụike ‘heroin’

    Oguejiofor Nnaemeka Simonpeter ndị ọrụ NDLEA nwụchiri maka ịtụbata ọgwụike na Naịjirịa

    Ebe foto si, National Drug Law Enforcement Agency

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ire nakwa ịṅụ ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) kwuru na ndị ọrụ ha nwụchiri otu nwaamadị si mba Thailand lọghachi.

    Ozi ụlọọrụ NDLEA wepụtara n’ụbọchị Sọnde 13 Ọktoba 2024 kwuru na nwaamadị ahụ bụ Oguejiofor Nnaemeka Simonpeter bụ onye a nwụchiri n’ọdọụgbọelu Murtala Mohammed International Airport dị na Legọs steeti.

    Ozi ahụ kwuru na a nwụchiri Oguejiofor maka ịtụbata ọgwụike heroin arụ ya dị 13.30 kilogram bụ nke ọnụego ya karịrị ijeri naịra atọ (3bn).

    Ozi ahụ ọnụ na-ekwuchitere NDLEA bụ Femi Babafemi wepụtara kwuru na a nwụchiri Oguejiofor n’ụbọchị Mọnde 7 Ọktoba 2024 oge ọ na-agba mbọ izubata ọgwụike ahụ e zoro n’ime akpa isii ma tinye n’ime nnukwu igbe abụọ.

    A sịrị na nwaamadị ahụ gụrụ ihe ọmụmụ Mechanical Engineering na mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Uli dị n’Anambra steeti hapụrụ Thailand n’abalị 3 nke ọnwa Ọktoba 2024.

    Ka o siladị, Oguejiofor kwuru na ọ bụ mmadụ ka ọ na-agara ozi ahụ. Ọ sịrị na onye ahụ kwere nkwa ịkwụ ya dọla puku asaa ($7,000) ọ bụrụ ma ọ gaa ya bụ ozi nke ọma.

    Dịka o siri kwuo, o kwesịrị ibuga akpa ọgwụike abụọ na Legọs steeti ma bugaa anọ ndị nke ọzọ n’isi obodo Ghana bụ Accra.

  17. Ihe anyị ma maka ụtụisi N40 a na-akwụrụ ozu dọrọ n’ọba ozu n’Enugwu

    Akwụkwọ Enugwu steeti dere maka okwu a

    Ebe foto si, Gọọmenti Enugwu steeti

    Nkọwa foto, Akwụkwọ Enugwu steeti dere maka okwu a

    Akụkọ gbasara ụtụisi N40 a na-akwụrụ ozu dọrọ n’ọba ozu n’Enugwu steeti na-efegharị n’ịntanet, mana BBC Igbo ghọtara n’ụtụisi ahụ abụghị ihe ọhụrụ.

    Onyeisi ụlọọrụ Enugu State Board of Internal Revenue, Emmanuel Ekene Nnamani oge onye ọrụ anyị kpọrọ ya n’ekwenti ka ọ kọwara n’iwu ahụ abụghị ihe ọhụrụ.

    Mana “Iwu kwuru na ọ bụrụ na mmadụ dọsa ozu n’ọba ozu karịa awa ịrị abụọ na anọ (otu ụbọchị) na onye ahụ ga-akwụ gọọmentị N40 naịra ụbọchị niile ozu ahụ ga-anọrọ n’ọba ozu”.

    Gịnị mere ndị mmadụ etimkpu maka ya?

    N’okwu Ekene Nnamani “ọ bụrụ na ị ele anya n’akwụkwọ ahụ ndị mmadụ na-ekesagharị, ị ga-amara na ọ bụ akwụkwọ adịgbọrọja”.

    Ekene kwuru na ọ bụ ndị chọrọ ịkpọ gọọmenti ajọ aha na-ekesaharị akụkọ ahụ ka ọ bụ ihe ọhụrụ.

    “Ị lee anya nke ọma, ị ga-ahụ na akwụkwọ ahụ bụ ihe a kpara aka ka ọ dị ka ọ bụ iwu ọhụrụ”.

    Lee nke bụ eziokwu! Ekene Nnamani kwuru na “nke bụ eziokwu bụ na ihe dị ka otu afọ garaaga ka anyị degara ndị nwere ụlọ ọba ozu akwụkwọ gbasara ego ha na-ana ndị mmadụ”.

    “Ọtụtụ ndị nwere ọba ozu na-eji maka ụtụisi ahụ anapụ ndị mmadụ nnukwu ego.

    Ma ndị ụlọọgwu nwekwara ụlọọba ozu na-anapụkwa ndị mmadụ nnukwu ego na-agbanyịghị ihe iwu kwuru na ha kwesiri ịkwụ gọọmenti”.

    Akwụkwọ Enugwu steeti dere maka okwu a

    Ebe foto si, Gọọmenti Enugwu steeti

    Nkọwa foto, Akwụkwọ Enugwu steeti dere maka okwu a

    “Nke a mere anyị jị degara ha akwụkwọ ka ha mara na ego gọọmenti na-ana bụ naanị N40 ma ọ bụrụ na ozu ahụ anọkarịa otu ụbọchị n’ụlọ ọba ozu”.

    Onwere ihe gọọmenti na-eme onye na-akwụghị ya? Ekene kwuru na enwebeghị oge gọọmenti bidoro na amanye onye ọbụla maka ụtụisi ahụ ma ọ bụ kwụsị onye ọbụla ịburu ozu maka na akwụghị ụtụisi ahụ.

    “Ndị mmadụ kwesiri ịga ụlọọkwụ mara na enwere ozu gọọmenti kwụsịrị ndị mmadụ iburu maka na ndị nwe ya akwụghị ụgwọ ahụ”.

    Ọ bụ ajọ ihe na Gọọmentị na-anara ndị nwere ụlọ ọba ozu ụtụisi?

    Ekene gara n’ihu kọwaa na ọbụghị iwu niile bụ maka iwete ego, n’iwu gbasara ịna ụtụisi maka ozu a dọsara n’ọba ozu abụghị maka na gọọmenti na-achọ ego mana ọ nwere ihe iwu ahụ chọrọ ịkwụsị. “Gọọmentị na-ana naanị N40 ma ọbụrụ na ozu nọrọ ihe dịka abalị 100, ego ndị nwe ozu ga-akwụ gọọmenti bụ N4000; ọ bụ maka ya ga-akwụsị mmadụ ịlị ozu?” “Ị tulee na ndị nwere ụlọ ọba ozu na-enwete uru ma nwere ya atụ mgbere, ọ bụzị ka gọọmenti na-ekiri ha”. Ekene kwuru na gọọmenti nwere ikike ịna ụtụisi na-ahịa ọbụla mmadụ na-azụ.

  18. Israel egbuola mmadụ 49 kemgbe otu ụbọchị gara aga - Mịnịstrị ahụike Gaza

    Israel egbuola mmadụ 49 kemgbe otu ụbọchị gara aga - Mịnịstrị ahụike Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

    E gbuola ihe karịrị mmadụ iri atọ (30) site na mwakpo Izrel mere na Jabalia dị na mgbago ugwu Gaza.

    Ụlọmgbasaozi AFP sịrị na ụlọorụ nchekwa ọhanaeze nke Hamas na-elekọta kwuru na Izrel mere mwakpo ahụ n’ụbọchị Fraịde 11 Ọktoba 2024.

    Ihe onyonyoo e setere gosiri na e bugaala ozu mmadụ ndị nwụrụ anwụ nakwa ndị merụrụ ahụ n’ụlọogwụ Al Alhi Baptist Hospital.

    Mịnịstrị ahụike Gaza nke Hamas na-elekọta kwuru na mmadụ iri anọ na itolu (49) anwụọla ebe narị abụọ na iri na itolu (219) ndị ọzọ merụrụ ahụ n’ụzọ mwakpo ise Izrel mere na Gaza Strip n’ime otu mkpụrụ ụbọchị.

    Ozi ahụ gbakwunyere na ọrụ nnapụta ka na-agakwa n’ihu dịka ndị mmadụ ka tọrọ n’ime ureghure.

    Mịnịstrị ahụ kwuru na e gbuola mmadụ karịrị puku iri anọ na abụọ, otu narị na iri asaa na ise (42,175) ma merụọ mmadụ karịrị puku iri itolu na asatọ, narị atọ na iri atọ na isii (98,336) ahụ kemgbe abalị 7 Ọktoba 2023.

    Israel egbuola mmadụ 49 kemgbe otu ụbọchị gara aga - Mịnịstrị ahụike Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

    Israel egbuola mmadụ 49 kemgbe otu ụbọchị gara aga - Mịnịstrị ahụike Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

  19. PDP ga-enwe nzukọ ọdụrụkụọ dịka ọgbaaghara Rivas steeti tiwara ha ụzọ abụọ

    Ndị pati PDP

    Ebe foto si, PDP/Facebook

    Otu Peoples Democratic Party (PDP) ga-akpọ nzukọ ọdụrụkụọ iji họpụta onye ga na-arụgodu ọrụ ka Onyeisioche otu ahụ tinyekwara ọkwa ndị ọzọ.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka otu ngalaba ndị isi ọrụ otu ahụ kwụsịrị onye ndụmọdụ ha n’okwu iwu bụ Kamaldeen Ajibade na Odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Debo Ologunagba ọrụ maka omume ọjọọ.

    Ebe ngalaba nke ọzọ kwụsịrị onye na-arụgodu ọrụ ka Onyeisioche ha bụ Umar Damagum na Odeakwụkwọ ha bụ Samuel Anyanwu ọrụ maka omume megidere otu ahụ.

    Otu onye a ma ama n’otu ahụ bụ Kola Ologbodiyan gwara BBC Pidgin na akụkọ ahụ bụ eziokwu ma kwuo na PDP ga-akpọ nzukọ ọdụrụkụọ iji họpụta ndị ndu nchereoge tupu ruo mgbe ha ga-enwe nzukọ ndị isi ọchịchị ha.

    Ologbodiyan bụbu Odeakwụkwọ mgbasaozi PDP kwuru na ike agwụla ọtụtụ ndị otu ahụ gbasara ọchịchị Damagum.

    Ọ sịrị na “a gwala Damagum ọtụtụ oge ka ọ hazie nnukwu ọgbakọ PDP iji nwee ike họpụta ndị ndu ọhụrụ maka otu ahụ.”

    PDP bụ pati a ma ama na-agba gọọmenti Naịjirịa ụkwụ. Ha banyere n’ọkwa n’afọ 1999 ma chịa Naịjirịa ihe fọdụrụ ntakịrị ka o ruo afọ iri abụọ (20) tupu pati All Progressives Congress (APC) achụpụ ha n’ọkwa n’afọ 2015.

  20. Onyeisiala Bola Tinubu ahapụla London gaa Paris

    Bola Tinubu na Ibrahim Kabir Masari

    Ebe foto si, @KABIRIBRAH64

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu hapụrụ Lọndọn gawa Paris n’ụbọchị Fraịde 11 Ọktoba 2024.

    Onye ndụmọdụ Onyeisiala n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Ibrahim Kabir Masari kwupụtara nke a oge ọ gachara zute Tinubu na Lọndọn.

    Kabir Masari dere n’akara ọbaozi X ya sị “Agbara m mbọ taa gaa leta Onyeisiala Bola Tinubu n’ụlọ ya dị na United Kingdom dịka anyị nwere ezigbo mkparịtaụka bara uru”.

    “Anyị gawaziri Paris dị na mba Fransị ịga rụọ ụfọdụ ọrụ dị oke mkpa.”

    N’abalị 2 Ọktoba 2024, Onyeisiala hapụrụ Naịjirịa gawa United Kingdom maka ezumiike ga-ewe izuụka abụọ mana ozi obi ọchịchị Naịjirịa wepụtara ekwughị na ọ ga-esi ebe ahụ gaa Fransị.