NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. Agbanweela Onyeisiala Ethiopia dịka ya na Prime Minister nwechara nghọtahie

    Taye Astike Selassie bụụrụ minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ na Ethiopia

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị omeiwu Itiopịa akwadoola nhọpụta onyeisiala ọhụrụ ga-anọchi anya nwaanyị mbụ bụụrụ onyeisiala mba ahụ bụ Sahle-Work Zewde.

    Taye Astike Selassie bụụrụ minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ kemgbe ọnwa Febụwarị ewerela ọkwa ahụ .

    Na mba Itiopịa, ọ bụ Praịm Minista ka ikikere ọchịchị dị n’aka. Onye ji ọkwa Praịm Minista mba ahụ ka ọ dị ugbua bụ Abiy Ahmed.

    Sahle-Work na Abiy nwere nghọtahie na nso nso a.

    Nkwado Praịm Minista ahụ nyere ka a họpụta Sahle-Work dịka onyeisiala n’afọ 2018 bụ nke ọhanaeze weliiri aka dịka agamnịihu maka ịdị nhatanha nwoke na nwaanyị na ndọrọndọrọ ọchịchị Itiopịa.

  2. Pope Francis ahọpụtala 'Cardinal' ọhụrụ 21

    Pope Francis na foto ndị kadịnal ụlọụka katọlik

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Pope Francis na foto ndị kadịnal ụlọụka katọlik

    Onyeisi ụlọụka katọlik bụ Pope Francis ekwuola ahụpụtala kadịnal 21 ọhụrụ. Nhọpụta pụtara na Pope Francis ahọpụta kardinal dị pasenti 80 ndị ga-ekwuputa onye ga-anochi ya dịka onyeisi ụlọụka katọlik.

    Pope Francis kwuru nke a n’ogige ụlọụka St Peter’s Square. Akụkọ kwụrụ na a ga-ahọpụta ma doo ndị kardinal asọ ụbọchị Sọnde 8 Disemba 2024 n’ogige Vatican n’emume ‘Solemnity of the Immaculate Conception’.

    Ndị ga-ahọpụta kadịnal ndị a si na kọntinent isii, gụnyere Australia, Kanada, Indoneshia na Iran.

    N’ime kadịnal 21 ọhụrụ ahụ, 20 erubeghi afọ iri asato (80) ma bụrụ ndị ga-esonye na ntụliaka ịhụpụta onye ga-anọchiteanya Pope Francis. Nhọpụta kadịnal ọhụrụ ndị a ga-ebugo ọnụọgụ kadịnal ụlọụka katọlik 140, nke gafere ọnụọgụ 120 nke Pope Paul VI hibere n’afọ 1975.

    Aha kadịnal 21 ọhụrụ ahụ gụnyere:

    Archbishọpụ Angelo Acerbi, Apostolic Nuncio;

    Archbishọpụ Carlos Gustavo Castillo Mattasoglio nke Lima, Peru;

    Archbishọpụ Vicente Bokalic Iglic Cm, Archbishop nke Santiago Del Estero (Primate mba Argentina).

    Archbishọpụ Luis Gerardo Cabrera Herrera, Archbishop nke Guayaquil, Ecuador.

    Archbishọpụ Fernando Natalio Chomalí Garib Archbishọpụ Santiago De Chile, Chile.

    Archbishọpụ Tarcisio Isao Kikuchi nke Tokyo, Japan;

    Bishọpụ Pablo Virgilio Siongco David nke Kalookan, Philippines.

    Archbishọpụ Ladislav Nemet nke Belgrade; Serbia.

    Archbishọpụ Jaime Spengler nke Porto Alegre, Brazil.

    Archbishọpụ Ignace Bessi Dogbo nke Abidjan, Ivory Coast.

    Archbishọpụ Jean-Paul Vesco nke Algiers, Algeria.

    Bishọpụ Paskalis Bruno Syukur nke Bogor, Indonesia;

    Archbishọpụ Dominique Joseph Mathieu nke Tehran Ispahan, Iran.

    Archbishọpụ Roberto Repole nke Turin, Italy.

    Bishọpụ Baldassare Reina, Auxiliary Bishop nke Rome na Vicar General Diocese Rome.

    Archbishọpụ Francis Leo nke Toronto, Canada.

    Archbishọpụ Rolandas Makrickas, coadjutor Archpriest nke Papal Basilica, Saint Mary Major.

    Bishọpụ Mykola Bychok nke Yukrenu Eparchy Saints Peter na Paul nke Melbourne, Australia.

    Dominican Fr. Timothy Peter Joseph Radcliffe, onye bụbu masta nke Dominican Order.

    Fr. Fabio Baggio.

    Msgr.George Jacob Koovakad,

  3. Ọrịa otoro egbuola mmadụ 350 na Naịjirịa – Ụlọọrụ NCDC

    Ndị na-ekute mmiri n'ime obodo

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị na-ekute mmiri n'ime obodo

    Ụlọọrụ na-arụ ọrụ maka mgbochi na mfesa ọrịa NA NaỊjirịa bụ National Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ ruru 350 anwụọla site n’orịa otoro na Naịjirịa n’ime ọnwa itoolu, nke gosiri na e nweela mbelata pasenti 239 n’ọnụọgụgụ nke afọ 2023.

    Dịka ụlọọrụ NCDC siri kwu, ọrị otoro bụ nke na-efesa site na mmriri abụghị ihe ọhụrụ na Naịjirịa mana ndị ọrụ ahụike na-ekwu na ọrịa a na-aga n’efesa n’ihi enweghị mmiri dị ọcha.

    Ozi NCDC wepụtara kwuru na mmadụ 359 nwụrụ kemgbe ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Septemba afọ 2024 ebe mmadụ 106 nwụrụ n’afọ 2023.

    Ha gara n’ihu kwuo na ọ bụ ụmụaka bụ ndị kachasị ebute ọrịa a ebe Legọs steeti bụ ebe ndị kacha bute ọrịa otoro nọ.

    Akụkọ kwuru na ndị a na-eyo eyo na ha bu ọrịa otoro na Naịjirịa eruola 10,837 site na 3,387 enwere n’afọ 2023.

  4. Ndị uweojii emepeela isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị 23 dị na Riva Steeti

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa Kayode Egbetokun

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa Kayode Egbetokun

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun enyela iwu ka e mepee isi ụlọọrụ okpuruọchịchị 23 dị na Riva Steeti.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Riva steeti bụ Grace Iringe-Koko mere ka a mata na kọmishọna ndị uweojii ọhụrụ steeti ahụ bụ Mustapha Bala nyere iwu mmepe isi ụlọọrụ okpuruọchịchị ndị ahụ n’aha Kayode Egbetokun.

    Cheta na ndị uweojii machiri isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Riva steeti n’ọnwa Juun dịka e nwere esemokwu dị n’etiti Gọvanọ Siminalayi Fubara na ndị bụbu ndị isioche okpuru ọchịchị steeti n’eruwere Nyesom Wike isi.

    Mmepe isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị ndị a na-abịa dịka Gọvanọ Rivas steeti Siminalayi Fubara duru ndị isioche okpuru ọchịọchị 23 turu ugo na ntụliaka okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde 5 Ọktoba 2024 n’iyi ọrụ.

    Gọvanọ Fubara duru ha n’iyi ọrụ ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba, 2024 n’ọbị ochịchị steeti ahụ dị na Port Harcourt, isi obodo Riva steeti.

  5. Fubara eduola ndị isioche Okpuru ọchịchị 23 n’iyi ọrụ na Rivers steeti

    Siminalayi Fubara

    Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Instagram

    Aka na-achị Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara eduola ndị isioche Okpuru ọchịchị iri abụọ na atọ (23) ahọpụtara ọhụrụ na steeti ahụ n’iyi ọrụ.

    Fubara haziri mmemme ahụ n’ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba 2024 n’ụlọ ezumeezu Executive Council Chambers dị n’obi ọchịchị Rivas steeti.

    Cheta na ụlọọrụ Rivers State Independent Electoral Commission (RSIEC) haziri ntụliaka Okpuru ọchịchị na Rivas steeti n’ụbọchị Satọde 5 Ọktoba 2024.

    Oge ọ na-akpọpụta mpụtara ntụliaka ahụ n’ụbọchị Sọnde, Onyeisi ụlọọrụ RSIEC bụ Justice Adolphus Enebeli kwupụtara ndị pati Action Peoples Party iri abụọ na abụọ (22) na otu onye paty Action Alliance (AA) dịka ndị nwetara mmeri.

    Bala Mohammed bụ aka na-achị Bauchi steeti na Onyeisioche otu jikọtara ndị gọvanọ PDP hụrụ ka mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ siri gaa.

  6. Anwụchiela nwaanyị Canada bubatara ọgwụike na Lagos

    Adrienne Munju

    Ebe foto si, NDLEA

    Ụlọọrụ National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA, anwụchiela Adrienne Munju bụ nwaanyị mba Canada bubatara ọgwụike na Legọs steeti.

    NDLEA mere ka a mata nke n’akwụkwọ ozi onyeisi ha na ngalaba mgbasaozi bụ Femi Babafemi binyere aka ma kesaa n’akara mgbasaozi ha n’ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba, 2024.

    Femi Babafemi kwuru na “NDLEA nwụchiri Adrienne Munju dị afọ iri anọ na otu (41) n’ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport dị na Legos”.

    “Ọgwụike a hụrụ n’akpa ya gụnyere nke a na-akpọ “Canadian Loud”. O kwukwara na ha chọpụtara na Adrienne Munju bu ọgwụike n’akpa ya oge ụgbọelu ha sị Canada were daa na Legọs n’ụbọchị Tọzde 3 Ọktoba 2024.

    Ọ gbakwunyere na nke a bụ nke mbụ Adrienne na-abata na Naịjirịa.

    Adrienne Munju

    Ebe foto si, NDLEA

    Adrienne Munju

    Ebe foto si, NDLEA

  7. APP ekpokọrọla mmeri n’Okpuru ọchịchị 22 na Rivers State

    APP ekpokọrọla mmeri n’Okpuru ọchịchị 22 na Rivers State

    Ebe foto si, Action Peoples Party (APP)/Facebook

    Otu Action Peoples Party (APP) enwetala mmeri ndị isiọche Okpuru ọchịchị iri abụọ na abụọ (22) n’ime iri abụọ na atọ (23) na ntụliaka a haziri na Rivas steeti.

    Onyeisi ụlọọrụ Rivers State Independent Electoral Commission (RSIEC) bụ Justice Adolphus Enebeli kpọpụtara mpụtara ntụliaka ahụ n’ụbọchị Satọde 5 Ọktoba 2024 na Pọtakọt.

    Ihe a bụ nke mbụ pati anọghị n’ọkwa na-enweta mmeri na ntụliaka Okpuru ọchịchị Rivas steeti kemgbe afọ 1999.

    Enebeli kwuru na ọ bụ mpụtara ntụliaka Okpuru ọchịchị Etche ka akpọpụtabeghị n’ihi na a ka na-agụkọ vootu ndị mmadụ.

    Ọ kọwara na ụlọọrụ RSIEC ga-akpọpụta mpụtara ntụliaka Okpuru ọchịchị Etche nakwa nke ndị nnọchiteanya Councillor narị atọ na iri na itoli (319) oge agụkọchara vootu niile.

    APP ekpokọrọla mmeri n’Okpuru ọchịchị 22 na Rivers State

    Ebe foto si, Action Peoples Party (APP)/Facebook

  8. Etu nwoke si sugbo nwunye ya dị ime ma gbaa ya ọkụ maka...

    Nwaanyị dị ime

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke e nyere aha ya dịka Motunrayo Olaniyi maka igbu nwunye ya ọhụrụ n'ebe ha bi n'Ikorodu dị na Legọs.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legos bụ Benjamin Hundeyin wepụtara, ọ sị na nwoke ahụ mara nwunye ọhụrụ ya bụ Olajumoke mma ọtụtụ oge, kpọchie ya n'ime ụlọ ma mụnye ebe ahụ ọkụ dịka ha na-ese okwu.

    O kwukwara na nwoke aha merụrụ onwe ya ahụ dịka o mechara nke ahụ.

    Kepu kepu na-ekwu na ihe butere esemokwu n'etiti nwoke ahụ na nwunye ya bụ nwoke ahụ ịbo nwaanyị ebubo ịgba n'ezi ma kwuo na afọ ime o bu abụghị nke ya.

    "Mgbe ndị uweojii ruru ebe ahụ, ha menyụrụ ọkụ na-agba were chọpụta ozu nwaanyị ahụ n'ime ụlọ" bụ ihe ozi ya kwuru.

    Dịka ihe si kwụrụ ugbua, ha kpọgara nwoke ahụ ụlọọgwụ ebe ọ natara ọgwụgwọ tupu ha anwụchie ya.

    He ebugala ozu nwaanyị nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu dịka nyocha banyere ihe mere ka na-aga ihu.

  9. Idemmiri na-achọ iri anyị - Trinitarian Foundation for Orphans and the Helpless Ebonyi

    Trinitarian Foundation for Orphans and the Helpless Ebonyi

    Ndị isi na ndị nlekọta ụlọ ụmụ enweghị nne na nna bụ Trinitarian Foundation for Orphans and the Helpless arịọla Gọọmenti Ebonyi steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaaka n’ihi nsogbu oke idemmiri.

    Ọ bụ ụlọụka Katọlik hiwere ụlọ ahụ n’okporoụzọ Oterufie Ugwuachara dị n’Abakaliki bụ isi obodo Ebonyi steeti.

    Oge ha na-ekwu okwu gbasara ya bụ ọnọdụ ọjọọ, ndị na-elekọta ụlọ ahụ bụ Rev. Sister Rosepurisima Nwosu, Rev. Sister Mary Agnes Onyejeli na Rev. Sister Lucy Anekwe kwara arịrị maka ọnọdụ ọjọọ oke idemmiri na-etinye ha kwa mgbe kwa mgbe.

    Nwosu kwuru na oge ụfọdụ ha na-amụ anya abalị iji nwee ike kupusịa mmiri ndị gbabatara n’ime ụlọ ha.

    Ọ kọwakwara na ha enweghị ọnụụlọ zuru oke maka ụmụaka ndị ha na-elekọta, bụ ndị nọ n’ogogo agụmaakwụkwọ dị iche iche.

    Ha kpọkụrụ Gọọmenti Ebonyi steeti na mmadụ ndị nwere obi ebere ka ha gbatara ha ọsọ enyemaaka tupu oke idemmiri erie ụlọ ha.

    Trinitarian Foundation for Orphans and the Helpless Ebonyi
    Trinitarian Foundation for Orphans and the Helpless Ebonyi
  10. Ntụliaka Okpuru ọchịchị amalitela na Rivas steeti

    Ntụliaka Okpuru ọchịchị amalitela na Rivas steeti

    Ụlọorụ Rivers State Independent Electoral Commission (RSIEC) amalitela ịhazi ntụliaka Okpuru ọchịchị n’ime Okpuru ọchịchị iri abụọ na atọ (23) e nwere na Rivas steeti.

    Ọ bụ n’ime wọọdụ narị atọ na iri na itolu (319) tinyere ogige ntụliaka puku isii, narị atọ na iri isii na isii (6366) dị na steeti ahụ ka a ga-ahazi ya bụ ntụliaka.

    Dịka ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka na Naịjirịa bụ INEC siri kwuo, Rivas steeti nwere mmadụ karịrị nde atọ debanyere aha ha maka ịtụ vootu n’afọ 2023.

    Pati iri na asatọ (18) n’ime iri na itolu (19) e nwere na Naịjirịa ga-esonye na ntụliaka ahụ. Pati na-agaghị esonye na ya bụ ntụliaka bụ pati ji ọkwa ọchịchị steeti ahụ bụ Peoples Democratic Party (PDP).

    N’oge gara aga, ọ bụ PDP na-enwetekarị mmeri na ntụliaka Okpuru ọchịchị Rivas steeti mana nke ugbua edoola ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ pati ndị ọzọ ga-anọ n’isi Okpuru ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ, nke mbụ ya kemgbe afọ 1999.

  11. Ikpe amaala otu nwaamadị na-edina ụmụnwaanyị n’ike

    Nkosinathi Phakathi

    Ebe foto si, NPA

    Nwaafọ Saụt Afrịka na-edina mmadụ n’ike ugboro ugboro, onye dinara obere nwata gbara afọ itolu n’ike anatala amamịikpe iri anọ na abụọ (42).

    Nkosinathi Phakathi bụ onye e boro ebubo iri itoli (90) maka idina ndị mmadụ n’ike site n’afọ 2012 ruo 2021.

    Oge ụfọdụ, nwoke ahụ gbara afọ iri anọ (40) na-agwa ụmụaka ka ha na-ekiri ya oge ọ na-edina mmadụ n’ike.

    Ụlọorụ National Prosecuting Authority (NPA) nke mba Saụt Afrịka kwuru na nwaamadị ahụ na-amanye ụmụaka ndị nwoke ka ha dinaa ndị enyi ha nwaanyị n’ike.

    Ebe Phakathi nọọrọ na-eme arụ ndị ahụ bụ na mpaghara Ekurhuleni dị n’ọwụwa anyanwụ Johannesburg.

    N’ụbọchị Fraịde 4 Ọktoba 2024, Ụlọikpe ukwu Johannesburg nụrụ na Phakathi na-anata amamịikpe iri anọ na abụọ (42) n’ihi ebubo e boro ya maka idina mmadụ n’ike, ntọrị, izu ohi na mmetọ.

    NPA sịrị na Ọkaikpe kwetara na Phakathi egosighị “mwute dịka ọnọdụ ya bụ nke ekweghị mmeta”.

    Dịka NPA siri kwuo, ọtụtụ n’ime ndị o dinara n’ike bụ ụmụakwụkwọ dịka nke obere n’ime ha gbara naanị afọ itolu ebe onye nke kachasị okenye gbara afọ iri anọ na anọ (44).

    NPA kwuru na Phakathi na-emesokarị ha omume ahụ oge ha na-aga maọbụ na-alọta akwụkwọ ebe oge ụfọdụ ọ na-aga n’ụlọ mmadụ ndị ahụ kụrụ na ya bụ onye na-edozi ọkụ latrik, naanị iji nwee ohere ịbanye ma rịa ha elu n’ike.

  12. Ndị nchekwa awakpoola ogige IPOB dị n’Imo steeti, napụta ndị e ji eji

    Ndị nchekwa na ụgbọala ha

    Ngalaba ụlọorụ ndị uweojii Imo steeti na-ebu agha megide ntọrị awakpọọla ogige a na-enyo enyo ịbụ nke ndị otu ESN na IPOB dị n’okeọhịa Ezioha, Okpuru ọchịchị Mbaitoli nke steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kpuhere nke a n’ụbọchị Fraịde 4 Ọktoba 2024 oge ya na onye ntaakụkọ BBC Igbo nwere mkparịtaụka n’ekwentị.

    Okoye kpuhere na ndị uweojii kpara ike ahụ na njikọaka ha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị n’Imo steeti.

    Ọ sịrị na ndị ọrụ nchekwa napụtara mmadụ anọ ndị ekperima ahụ tọọrọ n'okporoụzọ siri Owerri gawa Orlu nke gụnyere Eze Okoro bụ nwaafọ Orlu, Maazị na Oriakụ Anthony Nwosu gbara afọ iri anọ na anọ (44) na iri atọ na otu (31) ma bụrụ ụmụafọ Ohii dị n'Okpuru ọchịchị Owerri West tinyekwara Maazị Bartholomew gbara afọ iri ise na isii (56) ma bụrụ nwaafọ Benue steeti.

    Okoye sịrị na ndị ekperima ahụ na ndị ọrụ nchekwa gbakọrịtara onwe ha egbe oge ha wụchiri mana ndị ọrụ nchekwa memilara onyendu ha ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe rie mbọmbọ.

    Dịka Okoye siri kwuo, ngwongwo a napụtara ndị otu ahụ gụnyere ụgbọala Toyota Highlander abụọ, otu ụgbọala Toyota Camry na-acha ntụ ntụ, otu egbe ‘pump action’, mgbọ egbe iri, ogbuniigwe anọ, otu ọkọlọtọ Biafra, otu nchemgbọ ‘bullet proof’ na ọtụmọkpọ dị iche iche.

    Ihe ndị uweojii napụtara ndị omekoome n'Imo steeti

    Ebe foto si, Imo State Police Command

  13. Ntụliaka okpuru ọchịchị ga-aga n’ihu na Rivas Steeti ụbọchị Satọde 5 Ọktoba – Gọvanọ Fubara

    Gọvanọ Siminalayi Fubara oge ọ na-agwa ndị ntaakukọ okwu
    Nkọwa foto, Gọvanọ Siminalayi Fubara oge ọ na-agwa ndị ntaakukọ okwu

    Gọvanọ Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara ekwuola na ntụliaka okpuru ọchịchị ga-aga n’ihu ụbọchị Satọde 5 Ọktoba 2024 na steeti ahụ.

    Gọvanọ Fubara kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n’obi ọchịchị ya dị na Port Harcourt banyere nkwado a na-eme maka ntụliaka ahụ.

    Okwu ya na-abịa dịka ndị uweojii chọrọ ịnọchi ụlọọrụRivers State Independent Electorasl Commission (RSIEC) n’ụtụtụ Fraịde 4 Ọktoba, 2024.

    Gọvanọ Fubara mere ka a mata na o nwetara ozi na ndị uweojii wuchiri ụlọọrụ RSIEC n’agbanyeghi ntuziaka Ọkaikpe Lifu nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja gwara ndị uweojii ka ha wezuga onwe ha na ntụliaka ahụ.

    N’okwu Gọvanọ Fubara “Anyị aghọtaghị ihe ndị uweojii ahụ wuchiri ụlọrọu RSIEC bịara ime, ọ bụ ya mere anyị ji kwụsị ha, anyị chọpụtara na ha chọro izuru akụrụngwa e ji eme ntụliaka ahụ”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị uweojii achọghị isonye na ntụliaka ahụ, ọ gaghị egbochi ntụliaka ahụ ma ncha.

    N’aka nke ọzọ, onye na-ekwuru ndị uweojii Rivas steeti bụ Grace Iringe-Koko kwuru na ha nwetara akwụkwọ ozi gbochiri ha isonye na ntụliaka ahụ. Ọ gara n’ihu kwuo na e nwere iwu ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nyere ụbọchị Mọnde 30 Septemba, 2024 nke gbochiri ndị uweojii isonye na ntụliaka okpuru ọchịchị ahụ.

  14. E duola ndị isioche Okpuru Ọchịchị ọhụrụ 21 n’iyi ọrụ n’Anambra Steeti

    Ogige obi ọchịchị Anambra steeti ebe e duru ndị isioche ọhụrụ ahụ n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, Governo Chukwuma Soludo/Facebook

    Nkọwa foto, Ogige obi ọchịchị Anambra steeti ebe e duru ndị isioche ọhụrụ ahụ n'iyi ọrụ

    Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti eduola ndị isioche okpuru ọchịchị 21 steeti ahụ na osote ha n’iyi ọrụ n’ogige obi ọchịchị ya dị n’Awka, isi obodo Anambra steeti.

    Ndị isioche ọhụrụ 21 ahụ na osote ha bụ ndị turu ugo na ntụliaka okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde 28 Septemba, 2024.

    Ndị isioche ahụ Gọvanọ Soludo duru n’iyi ọrụ gụnyere Chibueze Ofobuike (Okpuru ọchịchị Aguata), Ifeanyi Chiweze (Okpuru ọchịchị Anambra East), Fidelis Nnazo (Okpuru ọchịchị Anambra West), Romanus Ibekwe (Okpuru ọchịchị Anaocha), ThankGod Anago (Okpuru ọchịchị Awka Nọt), Chinedu Okafor (Okpuru ọchịchị Awka Saụt), and Alphonsus Ofumelu (Okpuru ọchịchị Ayamelum).

    Ndị ọzọ bụ Chijioke Ozumba (Okpuru ọchịchị Dunukofia), Chimezie Obi (Okpuru ọchịchị Ekwusigo), Stanley Nkwoka (Okpuru ọchịchị Idemili Nọt), Amaka Obi (Okpuru ọchịchị Idemili Saụt), Anayo Orjiako (Okpuru ọchịchị Ihiala), Chinedu Ononiba (Okpuru ọchịchị Njikoka), Echezona Anazodo (Okpuru ọchịchị Nnewi Nọt) na Chinedu Ezeogidi (Okpuru ọchịchị Nnewi Saụt).

    Ndị ọzọ e duru n’iyi ọrụ gụnyere Franklin Nwadialu (Okpuru ọchịchị Ogbaru), Anthony Nwaora (Okpuru ọchịchị Onitsha Nọt), Emeka Orji (Okpuru ọchịchị Onitsha Saụt), Casmir Nwafor (Okpuru ọchịchị Orumba Nọt), Shedrack Azubuike (Okpuru ọchịchị Orumba Saụt) na Emma Nweke(Okpuru ọchịchị Oyi).

    Gọvanọ Soludo nyere ndị isioche Okpuru ọchịchị ọhụrụ iwu ka ha nweta ezi mmepe obodo n Okpuru ọchịchị ha dị icheiche. Ọ gara n’ihu gwa ha ka ha na gọọmenti ateeti ahụ jikọọ aka iji hụ na Anambra steeti bụ steeti e ji ama atụ na Naịjirịa gbaa gburugburu.

    A gwara ndị isioche ọhụrụ ahụ ka wepụ aka na nrụrụaka n’ụdị ọbụla ma jiri ego ọbụla ruru aka rụọ ọrụ maka mmepe na ọ dịmma ndị Okpuru ọchịchị ha.

    Foto Gọvanọ Chukwuma Soludo na dị isioche ọhụrụ steeti Anambra steeti

    Ebe foto si, Governo Chukwuma Soludo/Facebook

    Nkọwa foto, Foto Gọvanọ Chukwuma Soludo na dị isioche ọhụrụ steeti Anambra steeti
  15. Ihe ụlọakwụkwọ IMT kwuru banyere nwata akwụkwọ nwaanyị ahụ nwụrụ n’ogige ha

    Ọnụ ụzọ mahadum IMT Enugwu steeti

    Ebe foto si, IMT Website

    Nkọwa foto, Ọnụ ụzọ mahadum IMT Enugwu steeti

    Ụlọakwụkwọ mahadum Institute of Management and Technology (IMT) Enugwu steeti ewepụtala ozi banyere nwata akwụkwọ nwaanyị ahụ nwụrụ n’ogige ụlọakwụkwọ ha ụbọchị Mọnde 30 Septemba, 2024.

    Ozi ahụ kwuputara aha nwata akwụkwọ ahụ aha ya bụ Chiamaka Ozoigbondu bụ nwata akwụkwọ na mahadum Peaceland College, Emene ma kwuo na ọ bịara isionyere enyi dechara ule na IMT ṅụrịa oge njiji ahụ dakwasịrị ya.

    Akwụkwọ ozi ahụ nke onye na-arụ dịka onyeisi ụlọakwụkwọ IMT bụ Emeka Patrick Ejim binyere aka zigara ezinaụlọ Chiamaka Ozoigbondu ozi itiaka n’obi maka ọnwụ nwa ha nwaanyị.

    N’ịga n’ihu, Emeka Patrick Ejim kwuru na ụlọakwụkwọ IMT akwusịtụla ule ndị ọzọ e nwere n’ụlọakwụkwọ ahụ ahụ ruo oge a na-amaghị. Ihe ndị ọzọ ozi ahụ kpebiri gụnyere:

    • Abalị atọ iri uju na mahadum IMT nke malitere ụbọchị Wenezde 2 Ọktoba ruo ụbọchị Fraịde 4 Ọktoba, 2024.
    • Ụlọakwụkwọ IMT kwuru na ha ga-enyere ndị uweojii aka na nyocha banyere ihe kpatara njiji ahụ
    • Ụlọakwụkwọ IMT ga-achụ nwata akwụkwọ ọbụla e jidere na-eme mmeme aṅụrị ọbụla ma ha lechaa ule n’ogige ụlọakwụkwọ ahụ.
    • IMT machiri ụgbọala ịgba oke ọsọ n’ogige ụlọakwụkwọ ahụ ma kwuo na ha ga awuchi onye ọbụla dara iwu a.
    • IMT machiri ndị ọrụ nchekwa ọbụla iso nwata akwụkwọ ọbụla bata n'ogige n’ụlọakwụkwọ ahụ.
    • Ime nyocha ụmụakwụkwọ n’ọnụ ụzọ ụlọakwụkwọ ahụ.
    • Itinye mgidi aja n’ogige ụlọakwụkwọ ahụ nakwa ihe ndị ọzọ ga-ahụ maka ezi nchekwa ụmụakwụkwọ
    • Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na ụmụakwụkwọ abụọ ahụ meruru ahụ n’ihe mberede ahụ nwetara nleta n’ụlọọgwụ.
    Akwụkwọ ozi mahadum IMT na ogige njiji ahụ mere

    Ebe foto si, IMT Enugu

    Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi mahadum IMT na ogige njiji ahụ mere
  16. Ihe mere n’Enugwu oge osote onyeisiala Naịjirịa, Kashim Shettima bịara

    Kashim Shettima  na  Peter Mbah

    Kashim Shettima biara njem nleta n’Enugwu taata bụ ụbọchị atọ nke ọnwa oktoba 2024 were gbapee ọtụtụ ụlọ ọrụ na ihe dị icheiche gọmenti rụrụ.

    Ihe ndị osote onyeisiala gbapere n’Enugwu taata gụnyere, “Command Centre”, Int’l Confrence Centre, Ebe nrụpụta akwa n'Anamco, ya na ebe ọzụzụ ndị ọrụ aka akpọrọ “Expanded National MSME Clinic 2024.

    Njem nleta ahụ malitere oge ọdara n'ọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam nke Enugwu. Were ga gbapee ebe nrụpụta ihe na ANAMCO Emene Enugwu.

    O si ebe ahụ gaa n'ụlọ gọvanọ Enugwu nke ochie, ụlọ ọrụ gọmenti Enugwu nakwa Intl confrence Centre ebe ọ gbapere akụrụngwa dị iche iche.

    Sinatọ Shettima kwuputara na ndị niile nwetagoro ọzụzụ n’aka Gọmenti Enugwu site n’ụlọ ọrụ MSME ha-enweta ọkpụrụkpụ ego di otu nari puku naira na iri ise (N150,000) iji malite rụpọtawa akụrụngwa ha nwetara ọzụzụ ya.

    Shettima na Mbah ma ndị ọzọ

    O toro Gọvanọ Enugwu otito na aka ọrụ ya ihazi Enugwu mara mma.

    N’okwu ya, Gọvanọ Enugwu bụ Peter Mbah kwuru na obi juputara ya n’aṅụrị na osote Onyeisiala zara oku akpọrọ ya na agbanyeghị na oji ọrụ n’aka.

    “ Otu n’ihe n’echere ndị ọrụ-aka na ndị Ọgba-mbọ nke obere akpọrọ MSME bụ inweta ego mmalite ma ha mụchaa ọrụ. Nkea mere anyị ji akpọku ndị nọ ma agbata MSME ọkachasi ndị mtorobia ka ha zaa oku gomenti etiti Naijiria nakwa nke steeti Enugwu na-akpọ ha ugbua

    Mana na-oge Gọvanọ Peter Mba na-anabata osote onyeisiala ka ọ kwuru na “Obi dị m ụtọ na osote onyeisiala bụ onye hụrụ ndị na-agba mbọ nke akpọrọ MSME n’anya”.

    Shettima na Mbah

    Mbah kelere Shettima na o si n’ebe ọ gara nleta ndị mmịrị bụrụ na Maidugiri bia Enugwu ịgbape ihe ndị Gọmenti ya rụpụtara.

    “Mmemme akpọrọ “Expanded National MSME CLUNIC 2024” bụ nnukwu ohere ndị mmadụ nwere, ọkachasi ndị ntorobia isonye na ohere oma Gọmenti etiti wepụtara iji nyere ha aka.

    “Otu n’ime ihe na-echere ndị MSME aka mgba bụ ịhụ ebe ha ga-ebite ma ọ bụ nweta ego ha ga-eji mee ka ọrụ ha kwụrụ chim chim”

    Ọ gwara ndị ọgba mbọ nke onwe ha akpọrọ MSME ka ha sonye n’oku ahụ gọmenti n’akpọ.

  17. Ndị ojiegbe ejirila ogbunigwe tugbuo ndị uweojii abụọ n’Anambra steeti

    Ndị uweojii nọ n'ogige ndị uweojii Nnewi, Anambra

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Ndị uweojii nọ n'ogige ndị uweojii Nnewi, Anambra

    Ndị uweojii abụọ anwụọla oge ha na ndị ojiegbe kwakọrịtara mgbọ n’Uruagu, dị n'okpuru ọchịchi Nnewi Nọt nke Anambra steeti.

    Mkpamkpa a kpara n’uzọ ụtụtụ Tọzde 3 Ọktoba, 2024.

    N’akwụkwọ ozi Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweoji Anambra steeti weputara, ndị uweoji abụọ ahụ e gburu bụ ndị na-eme nyocha na mpaghara ahụ.

    N'okwu ya “Ndị omekome ahụ malitere ịgbali egbe n'elu ngwangwa ha hụrụ ndị uweojii, ma tuọ ogbunigwe ahụ bụ nke gbagburu ndị uweojii abụọ ahụ, ndị ọrụ nchekwa dị icheiche amalitela nyocha iji chọpụta ndị omekome ahụ".

    Ikenga kọwara ọdachị dịka ihe obi mgbawa ma kwuo na ụgbọala gbara ọkụ oge ihe ahụ mere.

    Tochukwu gara n’ihu kwuo na ndị uweojii na-arịọ ọhanaeze maọbụ onye ọbụla nwere ihe ozi banyere ndị kpara mkpamkpa ahụ ka ha kpọtụrụ ndị uweojii n'akara ekwenti ndịa 07039194332 maọbụ 08039334002.

  18. Ụlọọrụ Police Service Commission ahọpụtala kọmishọna ndị uweojii ọhụrụ na steeti anọ

    Onyeisioche Ụlọọrụ PSC Hashimu Argungu

    Ebe foto si, Police Service Commission/S

    Nkọwa foto, Njirimara ụlọrụ PSC na Onyeisioche Ụlọọrụ PSC Hashimu Argungu

    Ụlọọrụ Police Service Commission (PSC) akwadola nziga kọmishọna ndị uweojii na steeti anọ iji nweta ezi nchekwa na steeti ndị ahụ.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ PSC bụ Ikechukwu Ani kwuru na e zigala Abanwonda Olufemi dịka kọmishọna ndị uweojii Delta steeti. Ọ gara n’ihu kwuo na e zigala Peter Ukachi dịka kọmishọna ndị uweojii Krọss Riva steeti ebe Mustapha Mohammed Bala bụ kọmishọna ndị uweojii Rivas steeti.

    Ozi ahụ kwuru na Gyogon Augustine Grimah bụzi kọmishọna ndị uweojii Kaduna steeti.

    Akwụkwọ ozi ahụ nhọpụta ha nke onyeisioche ụlọọrụ PSC bụ bụ Hashimu Argungu binyereaka na ya, eruola n’aka onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ka ọ bụrụ iwu.

  19. Ọrịa Marburg virus egbuola mmadụ 11 na Rwanda dịka a na-atule ọgwụ mgbochi ya

    Ihe nlele ọbara maka nyocha ọrịa Marburg virus

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe nlele ọbara maka nyocha ọrịa Marburg virus

    Mba Rwanda na-akwado imalite ịgba ọgwụ mgbochi ndị ọrụ nyocha na-akwado imepụta iji gbochie nfesa ọrịa Marburg virus na mba ahụ.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Sabin Nsanzimana kwuru na ọgwụ mgbochi a ga-enyereaka chekwaa ndị mmadụ bi na mpaghara ebe ọrịa ahụ kacha metụta. Ka ọ dị ugbua, enweghbeghị ọgwụ mgbochi ọbụla nwegoro nkwado maka ọrịa Marburg virus, mana ndị ọrụ nyocha na-aga n’ihu imepụta ya.

    Nkwuputa a bụ nke ga-enye ohere ka a malite ịgba ọgwụ mgbochi nke ngalaba ethics kọmịti ụlọọrụ World Health Organization (WHO) kwadoro nke a ka na-atule.

    Nchọpụta BBC mere gosịrịr na mmadụ 11 anwụọla site n’ọrịa Marburg ebe mmadụ 36 ka e nwetara ozi na bu ọrịa ahụ.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike kwuru na mbọ niile ha na-agba iji gbochie nfesa ọrịa Marburg virus bụ nke na-amịta mkpụrụ ọma. Ha kwuru na ha agwaala mba gbara ha ogige ka ha kee nkwọcha iji hụ n’ọrịa ahụ abataghị na mba ha.

    Cheta na otu African Union (AU) na World Health Organization (WHO) ezigala ọtụtụ ndị dọkịta ahụike na mba Rwanda iji gbochie nfesa ọrịa Marburg virs na mba ahụ.

  20. Netanyahu akatọọla ogbugbu ndịagha Izrel 8 e gburu na Lebanon

    Praịm mịnịsta mba Izrel Benjamin Netanyahu

    Ebe foto si, Benjamin Netanyahu/X

    Nkọwa foto, Praịm mịnịsta mba Izrel Benjamin Netanyahu

    Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu akpọọla oku ka mba Izrel niile jikọọ onwe ha ọnụ ma dịrị n’otu.

    Netanyahu kwuru nke a n’akara soshal mịdịa X ya dịka o zigara ezinaulo ndịagha Izrel mmadụ asatọ e gburu na Lebanon ozi iti aka n'obi ụbọchị Wenezde 2 Ọktoba, 2024..

    Ọ gara n’ihu kwuo na agha ahụ dị n'etiti mba Izrel na Iran bụ nke siri ike maka na mba Iran chọrọ ikpochapụ mba Izrel, mana ọ bụrụ na Izrel jikọọ aka ọnụ, ha ga enweta mmeri.

    Iran anaghị achọ ịbụsọ onye obula agha – Onyeisiala, Massoud Pezeshkian

    Onyeisiala mba Iran Massoud Pezeshkian

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Iran Massoud Pezeshkian

    Onyeisiala mba Iran bụ Massoud Pezeshkian kwuru na ha achọghị ịbụsọ onye ọbụla agha mana ọ bụ ndị Izrel na-amanye ha aka n’anya.

    Massoud Pezeshkian kwuru nke na Doha, Qatar oge ọ na agwa ndị ntaakụkọ okwu.

    Massoud kwuru na “Iran ga-atụ Izrel nnukwu ogbunigwe ma ọ bụrụ na Izrel tụọ Iran ọzọ”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Iran na-achọ ka a kwụsị agha na ọgbaaghara dị na mpaghara ahụ.

    Akwadọghịm ịtụ ogbunigwe na ‘Nuclear site’ ndị Iran – Joe Biden

    Onyeisiala mba Amerịka, Joe Biden

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka, Joe Biden

    Onyeisiala mba Amerịka, Joe Biden ekwuola na ya akwadọghị ogbunigwe mba Izrel tụrụ n'ogige ebe Iran na-arụpụta ngwa agha ‘Nuclear’.

    Joe Biden kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ka Iran tụrụ Izrel nnukwu ogbunigwe.

    Biden kwukwara na ya na ndị Izrel na-akpa nkata maka ihe ọzọ ha ga-eme maka ogbunigwe ndị Iran tụrụ ha.

    Ọ gara n'ihu kwuo na otu G7 na ndị ọzọ ga-ejiko aka ọnụ ma nwee nkwekọrịta gbasara ihe mba Izrel kwesịrị ime n'ọdịnihu