Mba Venezuela akatọọla egwu Trump yiri maka imechi ụzọ ụgbọelu n’ikuku mba ahụ
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 5 Nọvemba 2025.
Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ
ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere
WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na
foto.
Ya gazie!
Ọ bụ nnyocha ka anyị chọrọ inyocha akwụkwọ njem Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan - Ụlọọrụ Nigeria Immigration Service
Ebe foto si, Natasha Akpoti-Uduaghan/Instagram
Ụlọọrụ Nigerian Immigration Service (NIS) ekwuola nke bụ eziokwu banyere akụkọ kwuru na ha gbochiri Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan ime njem n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe Airport Abuja dịka ọ chọrọ ime njem mba ofesi.
Cheta na Sinetọ Natasha wepụtara ihe onyonyo n'akara soshal midia ya ebe ọ nọ na-ekwu na ndị ọrụ Immigration nọ n'ọdọụgbọelu ahụ machiri akwụkwọ njem passpọt ya ma gbochie ya ime njem.
Iji chọpụta nke bụ eziokwu, anyị kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Immigration bụ Akinsola Akinlabi onye gwara anyị na ọbụghị eziokwu na ha machiri akwụkwọ njem Sinetọ Natasha maọbụ gbochie ya ime njem mba ofesi.
N'okwu ya "Ihe mere n'ọdọụgbọelu ahụ bụ nnyocha ka ndị ọrụ anyị na-enyocha akwụkwọ njem Sinetọ Natasha iji chọpụta na o nwere ikike ime njem mba ofesi".
O mere ka o doo anya na ụdịrị nnyocha bụ ihe ha na-enyocha ndị na-eme njem mba ofesi ọkachashị ndị nwere ikpe n'ụlọikpe.
Nkọwa foto, E kwuru na ejidebeghị onye ọ bụla maka ogbugbu a
Ndị uweojii ekwuola na ha na -achụ ndị a na-enyo enyo na ha
bụ ndị ojiegbe gburu mmadụ abụọ n'obodo Oriuzor dị n’okpuru ọchịchị Ezza-North
nke Ebonyi steeti.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Joshua
Ukandu si kwuo n’ụbọchị Mọnde 3 Nọvemba n’isi obodo Abakaliki, ajọ ihe a mere n’abalị
mbụ nke ọnwa Nọvemba.
O kwukwara na a gbagburu Ifeanyi Ogele, onye na-akpụ isi, n'ụlọ
ahịa ya ebe e gburu Obumneme Nweke, onye na-akwụ ụgbọala keke na peepe, nke a
maara dịka "Keke" n'ebe na-adịghị anya site n'ụlọ ahịa onye na-akpụ
isi.
Ukandu kwuru na ndị uweojii amalitela ime nnyocha gbasara
ihe kpatara ogbugbu ndị ahụ, na-agbakwụnye na a ga-ejide ndị nọ n'azụ mpụ ahụ.
"Ugbu a, ejidebeghị onye ọ bụla mana ndị ọrụ
anyị na-achụ ndị ahụ," ka Ukandu kọwara.
Trump akwadola Cuomo dịka onyeisi obodo New York City ma yie egwu ibelata ego enyemaka ma Mamdani merie
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Trump akwadola Cuomo dịka onyeisi obodo New York City
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akwadola Andrew Cuomo
n'ọkwa onyeisi obodo New York City, na-agba ndị ga-atụ vootu na ntuliaka ahụ
ume ka ha ghara ịhọpụta Zohran Mamdani bụkwa onye ọzọ na-azọ ọkwa ahụ.
"Ma ị hụrụ Andrew Cuomo n'anya maọbụ na ị hụghị ya
n'anya, ị nweghị nhọrọ ọ bụla. Ị ga-atụrụ ya vootu gị, ma nwee olileanya na ọ
ga-arụ ọrụ dị egwu," Trump dere n’akara Truth Social na mgbede Mọnde.
"O nwereike ime ya, Mamdani enweghị ike ime ya!"
N'ịzaghachi nkwado nke Trump n'abalị nke ntuliaka a na-ele
anya nke ọma, onye bụbu gọvanọ New York bụ Cuomo kwuru, sị: "Ọ naghị
akwado m. Ọ na-emegide Mamdani."
Onyeisiala ahụ kwuru na mbụ na ọ gaghị achọ izipu ego karịrị
nke gọọmentị etiti n'obodo ya bụ New York ma ọ bụrụ na a họpụta Mamdani.
Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 4 Nọvemba 2025.
Anyị na-asị ka ọ dịrị onye ukwu na onye nta mma.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Ndewo!
Jamb agbatịala oge e ji anabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ na mahadum na Naịjirịa
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ndị nwoke na nwannyị nọ n'ime ụlọakwụkwọ n'amụ ihe
Ụlọọrụ Joint Admissions and Matriculation Board (Jamb)
ekwuola na ha agbatịala oge e ji anabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ na mahadum ndị e
nwere na Naịjirịa.
Ozi Jamb depụtara n’akara X ha
kwuru na ha nwere mkpebi ịgbatị oge nnabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ a site n’abalị iri
atọ na otu nke ọnwa Ọktoba 2025 ruo n’abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba 2025 iji nye ụlọakwụkwọ
ohere imezu ihe niile a chọrọ maka ịnabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ.
Ozi ahụ gara n’ihu kọwaa na ihe mere ha ji kpebie nke a bụ maka arịrịọ otu Association of Vice-Chancellors of
Nigerian Universities (AVCNU) na nkwado ọmụmụ ọhụrụ otu National Universities Commission (NUC) wepụtara.
Gọvanọ Soludo, Nicholas Ukachukwu na ndị ọzọ ebinyela aka na nkwekọrịta udo na ntuliaka Anambra Steeti
Ebe foto si, ABS Awka
Dịka ụbọchị
ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na-akpụdobe nso, ndị na-azọ ọkwa na
ntuliaka ahụ gụnyere Gọvanọ Charles Soludo nke pati APGA, Nicholas Ukachukwu
nke pati APC na ndị ọzọ nọrọ n'ụbọchị Mọnde 3 Nọvemba 2025, binye aka n'akwụkwọ
nkwekọrịta udo na ntuliaka ahụ.
Mmemme ahụ
nke e mere n'ogige International Convention Center, Awka isi obodo Anambra
Steeti, bụ otu National Peace Committee nke Bishọpụ Hassan Kukah nọ n'isi, bụ
nke a chikọbara iji hụ na ndị na-azọ ọkwa ahụ na pati dị iche iche rubere isi
nye iwu nakwa usoro e ji eme ntuliaka ahụ.
Bishọpụ
Kukah kwuru na nkwekọrịta udo a bụ nke ga-kwalite ọchịchị onyekwuouche ya ma kpọkuo
ụlọọrụ INEC ka hazie ntuliaka ahụ dịka iwu si kwuo.
Ebe foto si, ABS, Awka
Gọvanọ Charles Soludo ji ohere ahụ kwuo na ọ dị mkpa ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mara na ha niile bụ ụmụnne ma ghara ime ihe ga-eweta ọgbaaghara na ntuliaka.
Gọvanọ Soludo kwuru na o nwere ntụkwasị obi na ụlọọrụ INEC ga-ahazi ntuliaka dịka iwu sịrị kwuo.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun kwuru na ndị ọrụ ya kwụrụ chịm ịhụ ma weta ezi nchekwa na udo na ntuliaka ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-arụkọ ọrụ iji hụ na ntuliaka ahụ gara nke ọma.
Ebe foto si, ABS, Awka
Trump ekwuola na ya na-enwe obi abụọ n’Amerịka ga-ebuso Venezuela agha
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ọchịchị Onyeisiala Trump kwuru na mwakpo ndị a dị mkpa iji gbochie nkeasa ọgwụ ọjọọ na mba Amerịka.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mba Amerịka
agaghị alụso Venezuela agha, mana o kwuru na oge Nicolás Maduro dịka onyeisiala
mba ahụ na-abịa na njedebe.
Mgbe a jụrụ onyeisiala Trump ma mba Amerịka a ga-alụso
Venezuela agha, ọ gwara ụlọmgbasa ozi CBS, sị: "Enwere m obi abụọ. Echeghị
m otu ahụ. Mana ha na-emeso anyị ihe n'ụzọ na-adịghị mma."
Okwu ya na-abịa ka mba Amerịka na-aga n'ihu na-awakpo ụgbọmmiri
ndị a na-ekwu na ha na-ere ọgwụ ọjọọ na Karịbian.
Ọchịchị Onyeisiala Trump kwuru na mwakpo ndị a dị mkpa iji
gbochie nkeasa ọgwụ ọjọọ na mba Amerịka.
Trump ekwenyeghị na ihe Amerịka mere abụghị maka ịkwụsị ọgwụ
ọjọọ, kama ọ bụ maka ịchụpụ Maduro, onye bụbu onye na-agba Trump ụkwụ ogologo
oge, na-ekwu na ọ bụ maka "ọtụtụ ihe".
Ihe dịka mmadụ 20 anwụọla n'ihi ala ọmajijiji mere n’Afganistan
Ebe foto si, Afghan Red Crescent/X
Nkọwa foto, Ihe dịka mmadụ 20 anwụọla n'ihi ala ọmajijiji mere n’Afganistan
Ndị ọchịchị obodo ekwuola na ihe dịka mmadụ iri abụọ anwụọla
mgbe ala ọmajijiji mere na mpaghara ugwu Afghanistan, dịka a na-atụkwa anya na ọnụọgụgụ
ndị nwụrụ anwụ ga-arị elu ka ọrụ nnapụta na-aga n'ihu.
Ndị ọrụ obodo gwara BBC na ọtụtụ narị mmadụ emerụọla ahụ.
E kwuru na ala ọmajijiji ahụ mere n'akụkụ Mazar-e-Sharif,
otu n'ime obodo kachasị ukwuu n’Afghanistan, ebe ihe dịka mmadụ puku narị ise bi,
n'isi ụtụtụ Mọnde, n'ihe dịka elekere mbụ nke ụtụtụ.
Dịka ụlọọrụ Geological Survey nke mba Amerịka si kwuo, o
nwere oke ruru 6.3 na omimi nke 28km (mile 17), a makwara ya n'ọkwa na-egosi na
o nwereike ịbụ na "ndị nwụrụ anwụ dị ukwuu".
Ụtụtụ ọma, ụmụ Igbo
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 3 Nọvemba 2025.
Ka izu ọhụrụ a mara anyị niile mma.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Daalụ!
NDLEA ejidela otiegwu a maama, chọpụta ebe a na-arụ ọgwụike
Ebe foto si, NDLEA
Nkọwa foto, Godspower George Oshenrumwen
Ụlọọrụ na-ebuagha megide ịrụ na ire ọgwụ adịgboroja na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency ekwuola na ha jidere onye na-etiegwu a maama ma chọpụta ebe a na-arụ ọgwụike.
NDLEA bụ ndị mere ka a mara nke a n’akwụkwọ ozi ha zigara ndị ntaakụkọ kwuru na ihe ahụ mere n’ụlọ obibi mmadụ dị n’Ajao Estate, Isolo, Legọs.
Ha kwuru na ha wetere akụrụngwa e ji arụpụta ọgwụike ‘colorado’ a na-akpọ ‘colos’ n’ụlọ ahụ.
Ha sị na ha jidekwara Stephen Kelechi Imoh dị afọ iri atọ bụ onye nwe ebe a na-arụpụ ọgwụike ahụ .
Mana otiegwu a maama bụ Godspower George Oshenrumwen a na-akpọ ‘steady boy’ ka NDLEA sị na ha jidere maka ọgwụike e tinyere n’ime ngwaahịa si New Yok, mba Amerịka bata Naịjirịa.
NDLEA jidere Godspower maka na ọ bụ ya gara nara ihe ndị ahụ niile mgbe ọ batara Naịjirịa.
Onyeisiala Trump eyiela egwu agha na Naịjirịa maka 'igbu ndị Kraịst'
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Trump eyiela egwu agha na Naịjirịa maka 'igbu ndị Kraịst'
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump yiri egwu izite ndịagha
Amerịka na Naịjirịa ma ọ bụrụ na gọọmenti Naịjirịa akwụsịghị ihe ọ kpọrọ ogbugbu
ndị ‘Alakụba’ na-egbu ‘Ndị Kraịst’.
Trump kwuru n’akara Truth Social na Satọde abalị mbu nke ọnwa
Nọvemba na Amerịka "nwereike ịbanye na mba ahụ na-eme ihere ugbua, 'egbe
na-agba ọkụ,' iji kpochapụ ndị omekome Alakụba kpamkpam bụ ndị na-eme ihe ike
ndị a jọgburu onwe ha."
Ọ gara n’ihu kwuo na ya ga-enye Ngalaba Agha mba Amerịka iwu
ka ha kwadebe maka ihe nwereike ime.
“Ọ bụrụ na anyị wakpoo, ọ ga-adị ngwa ngwa, dị njọ, ma dịkwa
ụtọ, dịka ndị omekome na-eyi ọha egwu si wakpo Ndị Kraịst anyị hụrụ n'anya!”
Ọ dọrọ gọọmenti Naịjirịa
aka na ntị ma gwakwa ha ka ha mee ngwa ngwa.
Nke a na-abịa ka ọ gachara otu ụbọchị ka Onyeisiala Amerịka
kpọpụtara Naịjirịa dịka "Mba nchegbu pụrụ iche" maka ogbugbu Ndị Kraịst,
na-akọwa ọnọdụ ahụ dịka "ogbugbu mmadụ."
Cheta na Gọọmenti Naịjirịa katọrọ ebubo Onyeisiala mba Amerịka ma
kwuo na ọ bughị etu ọnọdụ siri dị na Naịjirịa.
Mbuze ala mere na Kenya egbuola mmadụ 21 mgbe mmiriozuzo siri ike gachara
Ebe foto si, Kenyan Government
Nkọwa foto, Mmiri ozuzo buru ibu emeela ka apịtị jupụta na ọdịda anyanwụ Kenya
Gọọmentị Kenya ekwuola na mmadụ iri abụọ na otu anwụọla mgbe
mbuze ala mere n'akụkụ ọdịda anyanwụ nke mba ahụ mgbe mmiriozuzo siri ike gafechara.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’obodo bụ Kipchumba Murkomen
kwuru na ebufeela ozu ndị ahụ n'ọdọụgbọelu dị nso mgbe mbuze ala mere na
Marakwet East n'abalị Fraịde.
O kwuru n’akara X na ihe karịrị mmadụ iri atọ ka amaghị ebe
ha nọ mgbe ezinụlọ ha kọrọ na ha furu efu, ebe e bugara mmadụ iri abụọ na ise
nwere nnukwu mmerụ ahụ n'ụgbọelu iji nweta nlekọta ahụike ọzọ.
Ndị otu Red Cross nke Kenya, nke na-enyere aka ịhazi ọrụ
nnapụta, kwuru na e nwebeghị ike ịga ebe ndị ihe mberede ahụ kacha metụta n’ihi
n'okporoụzọ apịtị juru na idemmiri.
Mmadụ itoolu emerụọla ahụ nke ukwuu mgbe a mara ha mma n'ụgbọoloko Doncaster-London
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nkọwa foto, E kwuru na jideela mmadụ abụọ mgbe ụgbọoloko ahụ kwụsịrị n'ọdọ ụgbọoloko Huntingdon
Mmadụ iri nọ n’ụlọọgwụ ebe a na-ekwu na mmadụ itoolu emerụọla
ahụ nke ukwuu mgbe e jiri mma wakpoo ha n'ime ụgbọoloko nke Doncaster-London
King Cross n’ụbọchị Satọde.
E kwuru na jideela mmadụ abụọ mgbe ụgbọoloko ahụ kwụsịrị n'ọdọ
ụgbọoloko Huntingdon n'oge na-adịghị anya, ebe ọtụtụ ndị uweojii gbagara iji
nyereaka.
Ndị uweojii njem nke Briten kwuru na ndị ọrụ na-egbochi iyi ọha
egwu na-akwado ime nnyocha maka mwakpo ahụ dịka ha "na-arụ ọrụ iji chọpụta
ọnọdụ na mkpali zuru oke".
Onye hụrụ ihe merenụ gwara ụlọmgbasa ozi BBC na ha hụrụ otu
nwoke nwere aka ọbara na-agbapụ n'ụgbọala na-eti mkpu "ha nwere mma"
- onye akaebe ọzọ kwuru na ndị uweojii kpara otu nwoke aka n'elu ikpo okwu.
Mana Praịm Minista Keir Starmer kwuru na "ihe ahụ merenụ
dị egwu" ma bụrụ "ihe na-echegbu onwe ya nke ukwuu" ma ọ na-agba
ndị mmadụ ume ka ha sonyere ndụmọdụ nke ndị ọchịchị obodo.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma ụnụ
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba 2025.
Anyị na-asị ka Chineke zaa ekpere anyị niile taa.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Udo dịrị gị!
Gọọmenti Naịjirịa azaghachila ebubo Trump boro na a na-egbu ndị okpukperechi Kraịst na Naịjirịa
Ebe foto si, Nigerian Presidency/ Andrew Harnik/Getty Images
Nkọwa foto, Na nzaghachi gọọmenti Naịjirịa mere site n’aka minista na-ahụ maka mba ofesi bụ Yusuf Tuggar, Naịjirịa kwuru na nkwupụta Trump abughị etu ihe dị na obodo.
Gọọmenti Naịjirịa akatọọla ebubo Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump boro na a na-egbu ndị okpukperechi Kraịst
na Naịjirịa.
Ozi nzaghachi gọọmenti
Naịjirịa wepụtara nke minista na-ahụ maka mba ofesi bụ Yusuf Tuggar binyere aka, kwuru na ebubo ahụ Onyeisiala Trump boro abughị etu ọnọdụ siri dị na Naịjirịa..
N'okwu ya “Anyị dị
njikere ibuso ndị otu ọbụla na-eyi ọha egwu nke na-akpata nkewapụ obodo na
mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka nakwa ‘sahel’ agha.
Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmenti
Onyeisiala Tinubu dị njikere ma kwụsie ike ịkwalite udo nakwa ezi mmekọ n'etiti Naịjirịa na mba ndị ọzọ iji mee ka ọchịchị onyekwuouche kwụrụ chịm.
Cheta n’ụbọchị Fraịde 31 Ọktoba 2025, Onyeisiala Trump kwuru na gọọmenti ya agaghị ewepụ anya maọbụ gba nkịtị ka a
na-egbu ndị okpukpere Kraịst na Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ.
Ndị uweojii Enugu Steeti anwụchiela ndị a na-eyo eyo maka ọnwụ ụmụnne abụọ n'obodo Umuchigbo-Nike
Ebe foto si, Enugu state police command
Nkọwa foto, Nnyocha mbụ ndị uweojji mere gosiri na nsogbu a bidoro nyere esemokwu onye ga-abụ onye ndu na obodo ahụ nke malitere kemgbe ogologo oge.
Kọmishọna ndị uweojji n’Enugu steeti bụ Mamman Bitrus Giwa enyela iwu ka a malite nnyocha ogbugbu e gburu umunne abụọ ma mebie ọtụtụ ụlọ, ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ n'obodo Umuchigbo-Nike dị n'opkuru ọchị Enugwu East nke steeti ahụ.
Kọmishọna Giwa nyere iwu a dịka ya na ndị otu ya bịara nlere anya n'obodo ahụ e gburu ụmụnne abụọ ma kpọọ ọtụtụ ụlọ na ụgbọala ọkụ
Nnyocha mbụ ndị uweojji mere chọpụtara na ọ bụ esemokwu onye ga-abụ onye ndu obodo kpalitere nsogbu a.
Ka ọ dị ugbua, a nwụchiele mmadụ iri abụọ na asaa ndị a na-eyo eyo na-aka ha dị n'ọnwụ mmadụ abụọ ahụ.
Ndị uweojii mere ka o doo anya na ha na-achọ ụfọdụ ndị ọzọ e kwuru na ha gbara ọsọ achọ.
Ebe foto si, Enugu state police command
Nkọwa foto, Anwụchiele mmadụ iri abụọ na asaa ndị a na-enyo enyo na-aka ha dị n’ime ihe mere dịka a ka na-achụ ndị ọzọ gbara ọsọ.
Ebe foto si, Enugu state police command
Nkọwa foto, Kọmishọna ndị uweojji n’Enugu steeti Mamman Bitrus Giwa na ndị otu ya bịara nleta anya ebe mkpa mkpa kpara
Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Tanzania bụ Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ.
Jacob Mwambegele bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Tanzania kwuru na Onyeisiala Hassan nke patị Chama Cha Mapinduzi (CCM) nwetara ọnụọgụgụ vootu ruru pasentị iri itolu na asatọ n’ime nde vootu iri atọ na abụọ niile a tụrụ n’ụbọchị Wenzede.
Mmadụ abụọ na-agba gọọmenti ụkwụ iweghara ọchịchị bụ Tundu Lissu onye nke a nwụchiri maka ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru nakwa Luhaga Mpina nke patị ACT-Wazalendo e wepụrụ maka ịda iwu esoghị zọọ ọkwa ahụ.
Ndị okwu ntuliaka doro anya si ebe dị iche iche, kwuru na a haziri ntuliaka ahụ n’ụzọ na-edoghị anya ma kwuo na ọgba aghara juru ebe niile nke mere ka ọtụtụ narị mmadụ nwụọ ma merụọ ahụ.
Onyeisiala Samia Hassan banyere n'ọkwa ọchịchị n'afọ 2021 dịka nwannyị mbụ ga-eji ọkwa onyeisiala mba Tanzania. Ọ bụbu osote Onyeisiala John Magufuli nwụrụ n'afọ 2021.
Ndị be anyị, ụnụ asaala chị?
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde nke mbu na ọnwa Nọvemba 2025.
Ka ọnwa ọhụrụ a nakwa ụbọchị ta mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.