Mba Venezuela akatọọla egwu Trump yiri maka imechi ụzọ ụgbọelu n’ikuku mba ahụ
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Popu Leo XIV agaala mba Tọkị na njem mba ofesi nke mbụ ya
Ebe foto si, Anadolu via Getty Images
Nkọwa foto, Popu Leo XIV
Onyeisiala ụka
Katọlịk bụ Popu Leo XIV agaala mba Tọkị dịka njem mba ofesi nke mbụ ya kamgbe ọ banyechara
n’ọkwa.
Popu ga-esi
mba Tọkị ebe ọ ga-adọnyere ha ukwu maka ncheta okpukpere Kraịst, ma gaa na Lebanọn n'abalị ole ma ole mba Izrel tụchara ogbunigwe n’isi obodo ha bụ Beirut.
Mgbe Popu na-aga
n’Ankara ka ọ kwuru na “ụmụnwoke niile, ụmụnwaanyị nwereike ị bụ nwanne n’agbanyeghị
na ha esoghị n’otu okpukperechi”.
Ị ga na mba ndị
a niile bụbu ihe Popu Francis nwụrụ anwụ chọrọ ime n’oge garaaga, mana mgbe Popu
Leo banyere n’ọkwa na St. Peter’s Basilica ka o kwuru na ihe kacha mkpa n’ọchịchị
ya ga-abụ ịdị n’otu nakwa mmekọ n’etiti ndị nwere okpukperechi dị icheiche.
Ebe Popu Leo
na-aga na mba Tọkị bụ obodo a na-akpọ Iznik,
dị na obodo ochee Nicaea.
Mmadụ 55 anwụọla n’ụlọ gbara okụ na Hong Kong ebe a na-achọ ọtụtụ ndị ọzọ achọ
Ebe foto si, ge
Nkọwa foto, A ka na-achọ mmadụ rụrụ narị abụọ na iri asaa ndị furu efu.
Ihe ruru mmadụ iri ise na ise anwụọla na
oke ọkụ gbara na nnukwu ụlọ elụ ọha na Hong Kong.
A ka na-achọ mmadụ rụrụ narị abụọ na iri
asaa ndị furu efu.
Ọkụ a gbara ụlọ elu asaa n’ime ụlọ elụ asatọ
nke ụlọ ahụ gbara ọkụ na obodo Tai Po. Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ agbanyụọla ụlọ elụ
anọ n’ime ụlọ elụ asatọ a gbara ọkụ dịka a na-atụ anya na ha ga-agbanyụ ndị nke
fọrọ afọ.
Ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ etụ ọkụ a si malite dịka
anwụchiri ndị rụrụ ụlọ ahụ maka ebubo na ha ji ihe na-ere ọkụ were rụọ ụlọ ahụ.
Ebe foto si, Getty Images
Ebe foto si, Getty Images
Ndị be anyị, ụnụ abọọla chi?
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde, Nọvemba 26, 2025. Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mara anyị mma.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Udo dịrị ụnụ!
Onyeisiala Tinubu etinyela ọnọdụ gbata gbata na nchekwa Naịjirịa
Ebe foto si, Presidency/X
Onyeisiala Bola Tinubu etinyela ọnọdụ gbata gbata na nchekwa
obodo ma nye iwu ka e werekwuo ndị mmadụ n’ọrụ nchekwa.
Site na nkwupụta a, ndị uweojii ga-ewerekwu mmadụ puku iri
abụọ n’ọrụ (20,000) ka ọ bụrụzie mmadụ puku iri ise (50,000).
Onyeisiala nyekwara iwu ka ndị uweojii were ogige ebe ndị ji
otu afọ efe ala nna ya mere ogige ebe a ga-azụ ndị uweojii a ga-ewe n’ọrụ ọhụrụ.
Ebe ndị uweojii a kwụsịrị ichekwa ndị gbapụtara ihe n’obodo
ga-alọghachị n’ọrụ ma nata obere ọzụzụ iji maara ihe ekwe na-akụ ma e ziga ha n’ebe
ndị e nwere nsogbu nchekwa.
Onyeisiala Tinubu nyekwara ndị nchekwa ngalaba DSS iwu ka ha
ziga ndị a kpọrọ ‘forest guards’ n’ime ọhịa dị iche iche na Naịjirịa ma kpochapụ
ndị ekperima na ndị ntọrị juru n’ọhịa.
Ọ ga-akwara n’ihu nye ha ikike iwere ndị mmadụ n’ọrụ nchekwa
DSS iji chekwaa ime ọhịa.
“Onweghi ebe ọbụla ga-abụ ebe nzuzo nye ndị otu ekwensu a
na-akpa ike na Naịjirịa.
Onyeisiala Tinubu kelere ndị ọrụ nchekwa na mbọ ha gbara ịzọpụta
ụfọdụ ndị n’ime ọtụtụ ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Kebbi, Kwara na Niger Steeti.
Ọ gwara ndị omeiwu ka ha bido ileba anya n’iwu Naịjirịa iji
mee ka steeti ndị chọrọ ihiwe ngalaba uweojii nke ha nwereike ime nke a na-egbughi
oge.
O kwuru ka ụlọụka na ụlọ okpukperechi alakụba gbaa mbọ nwete
enyemaka ndị uweojii na ndị nchekwa ndị ọzọ n’ichekwa ha n’oge ofufe ọkachasị n’ime
ime obodo.
Tinubu kwuru na ọchịchị ya hiwere mịnịstrị na-ahụ maka ụmụanụmanụ
iji gboo nsogbu dị n’etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo, ma gwaa ndị na-achị ehi
ka ha kwụsị ịchịgharị ehi ma wụsa ngwaagha ọbụla ha ji. O kwuru na ihe a
ga-agbaso ugbua bụ ihiwe ogige ebe a na-azụ ụmụanụmanụ a kpọrọ ‘ranching’.
O tiri ezinaụlọ ndị niile nwụrụ n’ihe mwakpo dị iche iche
merela nso nso a aka n’obi gụnyere ezinaụlọ ọchịagha Musa Uba ndị ekperima
gburu.
Ọ gara n’ihu yie egwu nye ndị ekperima ma kwuo ka ha
ejikwala gọọmenti ya eme egwuregwu maka na onye ọbụla aka ya dị na mwakpo ndị a
ga-ata ahụhụ ruuru ya.
N’ikpeazụ, Onyeisiala Tinubu gwara ụmụafọ Naịjirịa ka ha atụla
egwu maọbụ biri n’ụjọ kama ka onye ọbụla kwudosie ike, gbakọta aka ọnụ, mụrụ
anya ka azụ ma gbaa ama ihe ọjọọ ọbụla na-eme na gburu gburu ya.
Ọkụ gbara n'ụlọelu ogogo 31 na Hong Kong egbuola mmadụ 13
Ebe foto si, EPA
Ọkụ gbara n’ụlọelu ebe ndị mmadụ bi n’obodo Hong Kong egbuola
opekatampe mmadụ iri na atọ dịka ndị mgbanyụ ọkụ ruru mmadụ narị asaa na-agba
mbọ imenyụ ọkụ ahụ.
Ọkụ ahụ gbara n’ebe a kpọrọ Wang Fuk mgbe ọ malitere n’ihe dịka
nkeji ole ma ole ka ọ kụọ elekere atọ dịka gọọmenti mba Hong Kong si kwuo.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n’ọkụ si na mmadụ anọ gbagoo mmadụ iri na
atọ, ebe ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ merụrụ ahụ.
Ụlọọrụ mbanyụọkụ kwuru na otu n’ime ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ
onye ọrụ ha dịka onyeisi ha bụ Andy Yeung kwuru na ọ bụ ihe mwute na onye a nwụrụ
ka ọ na-arụ ọrụ ịzọpụta ndị mmadụ.
Ebe foto si, Reuters
Nwamadị a a kpọrọ Ho Wai-ho nọ na-achọ inye aka gbanyụọ ọkụ ahụ mgbe o si n’elu daa e buru ya gawa n’ụlọọgwụ bụ ebe ọ nwụrụ site na mmerụ ahụ ọkụ ahụ.
N’ihi ọkụ a e mechiela okporoụzọ niile dị nso n’ebe ọkụ ahụ na-agba ma tuziere ndị ọkwọụgbọala aka ebe ha ga-esi na-eme njem.
Dịka ọ dị ugbua ọkụ ahụ ka na-agba n’ụlọ a dị na mpaghara Tai Po nke obodo Hong Kong.
A mabeghi kpọmkwem ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ, ọnụọgụgụ ndị merụrụ ahụ nakwa mmadụ ole ka fọrọ n’ime ụlọ ahụ.
Ihe karịrị mmadụ puku anọ (4600) bi n’ime ụlọ ahụ ebe ọnụụzọ o nwere ruru puku abụọ (2000), ogogo ụlọ ahụ dị iri atọ na out.
Gọvanọ Ebonyi Steeti amapụtala atụmatụ mkpata na mmefu ego N884bn
Ebe foto si, CPS Monday Uzor
Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi Steeti ewepụtala atụmatụ
mkpata na mmefu ego dị ijeri narị asatọ na iri asatọ na anọ maka afọ 2026.
O kwuru nke a oge o nyefere ndị ụlọomeiwu steeti ahụ akwụkwọ
atụmatụ ahụ ma kwuo na ọchịchị bụ ihe dịịrị onye ọbụla ma kpọọ oku maka nkwado ọhanaeze
iji hụ na Ebonyi steeti wetara mgbanwe ga-enyere ndị obodo aka.
Gọvanọ Nwifuru kwuru na ọchịchị dị njikere ịrụ maka maka ọdịmma
ndị Ebonyi steeti.
Gọvanọ Abia Steeti ekwuputala atụmatụ mkpata na mmefu ego dị N1.016trn
Ebe foto si, Abia State Government
Aka na-achị Abia Steeti bụ Alex Otti ekwuputala atụmatụ mkpata
na mmefu ego out tarị naịra na ụma maka afọ 2026.
O kwuru nke a n’ogige ụlọomeiwu steeti ma kọwaa atụmatụ ahụ
dịka nke ga-eweta ọganihu na mgbanwe na steeti.
Gọvanọ Otti kwuru na nke a gosiri nkwenye ọchịchị nwere
banyere iwulite ọnọdụ akụnaụba steeti ahụ.
N’atụmatụ a, agụmakwụwkọ ga-enweta ego dị ijeri narị abụọ na
atọ na ụma nke e kwuru na a ga-eji kwụọ ndị nkụzi 15,000 ụgwọ, rụọ ụlọalwụkwọ
praịmarị na sekọndrị 17, ụlọakwụkwọ kọleji nkanụzụ atọ nakwa ebe obibi ndị nkụzi
n’ụlọakwụkwọ 100.
A mapụtara ijeri naịra iri ise na abụọ na ụma maka mahadum Abia
State University, Ogbonnaya Onu Polytechnic na Arochukwu College of Education
ma rụọ ebe obibi ụmụakwụkwọ mahadum ma wulite ọnọdụ ogige ụlọakwụkwọ ndị a.
Ijeri naịra otu narị na iri anọ na itoolu bụ maka ụlọọgwụ
asaa, goo akụrụngwa maka ụlọọgwụ ABSUTH nakwa ụlọọgwụ 23 ndị ọzọ.
E kwuru na a ga-eji otu narị ijeri naịra na iri isii na
itoolu na ụma atọ bụ maka ịrụ okporoụzọ dị iche iche.
Ebe foto si, Abia State Government
Ụmụnwaanyị emeela ngaghari n’Anambra steeti maka imegbu ha na ụmụaka
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị emeela ngaghari n’Anambra steeti maka mmegbu ụmụnwaanyị na ụmụaka
Ọtụtụ ụmụnwanyị n’anọchite otu dị iche iche n’Anambra steeti
ejikọọla aka ọnụ tie mkpu n’oke olu maka mmegbu ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agabiga n’aka
ndị di ha maọbụ ndị nọ ha gburu gburu nke n’anapụ ha ikike diara mmadụ.
Ha kwuputara nkea n’Awka isi obodo Anambra Steeti iji malite
mmemme ụbọchị iri na isii akpọrọ “16 days of activism” n’ụwa niile.
Otu onye na ndị chikọbara ya bụ ihe bụ Zaram foundation rịọrọ
arirọ ka ndị mmadụ n’ekwupụta mmegbu ọbụla ha hụrụ na gburugburu ya iji chekwaa
ndụ ụmụnwaanyị na ụmụaka.
Ha mụnyere ọkụ kandụlụ n’ihu Odumegwu Ojukwu Teaching
hospital wee kpee ekpere maka nkpụrụ obi nwaanyi ọbụla maọbụ ụmụaka nwụrụ maọbụ
meruo nnukwu ahụ maka mmegbu.
Ọ bụ ụlọọrụ mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaaanyị na ụmụaka n’Anambra,
Zaram Foundation, CSO’s, NGO’s, MDA’s na
ndị na-ahụ maka ọnọdụ ụmụwaanyi na ụmụaka haziri.
Yukren ekwuola na ha enweela 'nghọta' banyere atụmatụ udo nke mba Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Yukren ekwuola na ha enweela 'nghọta' banyere atụmatụ udo nke mba Amerịka
Yukren ekwuola na ha na mba Amerịka enweela "nghọta zuru
oke" maka nkwekọrịta udo nke mba Amerịka bụ nke ebumnuche ya bụ ịkwụsị
agha na Rọshịa.
Nke a dabere na atụmatụ isi ihe iri abụọ na asatọ nke mba
Amerịka nyere Kyiv n'izu gara aga, nke ndị ọrụ Amerịka na Yukren rụkọrọ ọrụ na
ya n'oge mkparịtaụka izu ụka na Geneva.
N'ihe o dere na soshal midia, onyeisiala mba Amerịka bụ
Donald Trump kwuru na "a haziela atụmatụ mbụ ahụ nke ọma, tinyere ntinye
aka ọzọ n'akụkụ abụọ ahụ".
Onyeisiala Trump kwuru na o nyere onye nnọchiteanya pụrụ
iche ya bụ Steve Witkoff iwu ka ọ zute Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin na
Moscow n'izu na-abịa.
A na-atụ anya na odeakwụkwọ ndịagha nke mba Amerịka bụ Dan
Driscoll ga-ezute ndị isi mba Yukren n'izu a.
Ndị be anyị, ụnụ abọọla chi?
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde, Nọvemba 26, 2025.
Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mara anyị mma.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Udo dịrị ụnụ!
Yukren na Rọshịa na-awakpo onwe ha n'abalị ka Zelensky nabatara mgbanwe n'atụmatụ udo nke Amerịka
Ebe foto si, Anadolu via Getty Images
Nkọwa foto, Rọshịa wakporo Sloviansk na mpaghara Donetsk, merụọ mmadụ ise ahụ gụnyere ụmụaka abụọ,
Yukren na Rọshịa na-awakpo onwe ha n'abalị ka Zelensky
nabatara mgbanwe na atụmatụ udo nke Amerịka.
A kọrọ na opekatampe mmadụ abụọ nwụrụ dịka a wakporo isi
obodo Yukren bụ Kyiv n’abalị Tuzde 24 Nọvamba 2025.
N’aka nke ọzọ, Yukren mekwara mwakpo na Rọshịa, ebe ndị ọrụ
gọọmenti kwuru na e gburu mmadụ atọ.
Mwakpo a si n’ikuku kachasị ọhụrụ bịara mgbe ọtụtụ ụbọchị
nke mkparịtaụka siri ike gbasara atụmatụ nke mba Amerịka kwadoro maka ịkwụsị
agha ahụ, bụ nke mbụ dọtara nkatọ ndị isi Kyiv na ndị Yurop.
Cheta na Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky kwuru na atụmatụ
ahụ nwere "ọtụtụ ihe kwesịrị ekwesị" mgbe mkparịtaụka gasịrị.
A na-akwado inwe mkparịtaụka ndị ọzọ n'ụbọchị ndị na-abịa dịka
a na-atụ anya Praịm minister mba UK bụ Keir Starmer ga-ahazi nzukọ n’ịntanetị nke
ndị enyi Yukren ma emechaa.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde, Nọvemba 25, 2025.
Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mara anyị mma.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Ndewo!
Jimmy Cliff, otiegwu rege a ma ama n'ụwa anwụọla ka ọ gbachara afọ 81
Ebe foto si, Getty Images
Onye otiegwu rege a ma ama n'ụwa bụ Jimmy Cliff anwụọla ka ọ gbachara afọ 81Egwu e ji mara ya gụnyere " Reggae Night", "Wonderful World" nakwa "Beautiful People", Nwunye ya bụ Latifa Chambers bụ onye mara ọkwa ọnwụ ya n'ozi o wepụtara n'ọbaozi Instagram.Ozi ahụ sịrị "ọ bụ na nnukwu obi mwute ka m ji ekwupụta na di m bụ Jimmy Cliff agafeela n'akụkụ nke ọzọ site n'ihe ọdịdọ nke so orịa nimonia."
"Jimmy, ọdịnaobi m, zuru ike n'udo. Aga m emezu ihe i kwuru."
Atiku awụbaala otu ADC
Ebe foto si, Atiku Abubakar/X
Onye bụbụ Osote Onyeisiala Naijiria bụ Atiku Abubakar awụnyela ụkwụ n'otu pati ADC.
Atiku bụ onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 gbara ama n'ụbọchị Monde n'akara ọbaozi ya bụ X kwuru sị, "O doola anya-" ma tinye foto ebe o ji akwụkwọ njirimara nke pati ADC.
Cheta na kepukepu na-efegharị kemgbe kwuru na Atiku na ndị ọzọ nwere agba na ndọrọndọrọ ọchịchị bara otu pati ADC.
Mana o nweghị onye n'ime ha kwụpụtara hohaa na ha edenyela aha na pati ahụ.
Gọọmenti Imo
steeti ekwuola na ha nwetara ozi na ụlọọrụ Enugu Electricity Distribution
Company (EEDC) na-eme atụmatụ ikopu eriri ọkụ ndị Imo steeti ma tinye ha n’ọchịchịrị.
N’ozi Kọmịshọna
mgbasaozi Imo steeti bụ Declan Emelumba wepụtara, o boro ebubo na EEDC kpara
nkata ime nke a iji kụsasịa mbọ gọọmenti steeti ahụ na-agba ịrọpụtara ndị Imo ọkụ
latrik na-anaghị anyụ anyụ.
Emelumba kwuru na
o doola gọọmenti anya kemgbe na ndị isi EEDC chọrọ ka naanị ha gaa n’ihu na-ahụ
maka nkesa ọkụ latrik n’Imo steeti, bụ nke na-anaghị anọte aka na nke dị ezigbo
ọnụ.
O kwuru na
ebumnobi EEDC itinye ndị Imo n’ọchịchịrị bụ “ịtụgharị ma kwuo na ọ bụ n’ihi akụrụngwa
ndị ụlọọrụ latrik gọọmenti Imo steeti nyere nkwado bụ Orashi Electricity
Company na-etinye mere e ji nwee ọchịchịrị.”
Ma na nzaghachi,
EEDC kwuru na ebubo ahụ gọọmenti Imo steeti boro ha bụ okpookpo asị ma bụrụkwa
nke na-enweghị ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ.
N’ozi Onyeisi
ngalaba mgbasaozi n’ụlọọrụ EEDC bụ Emeka Ezeh wepụtara, ọ gwara ndị Imo ka ha
leghara ozi ahụ gọọmenti wepụtara anya n’ihi na ụlọọrụ ha enweghị ụdị atụmatụ dị
etu ahụ.
EEDC katọrọ gọọmenti
Imo steeti maka ifesa akụkọ ụgha, dịka ha boro ebubo na nke ahụ bụ iji wepụ
uche ndị mmadụ n’ihe na-eme ma kpuchie omume ọjọọ ha na-emeso EEDC.
Cheta na akụkọ
fesara n’izuụka gara aga na ndị uweojii wakporo ụlọọrụ latrik dị n’Egbu n’ụbọchị
Satọde ma were egbe manye ndị ọrụ ka ha gbanyụọ ọkụ latrik ndị Imo steeti.
E kwuru na ọnọdụ ahụ mere ka ndị ọrụ na ngalaba ọkụ
latrik bụ National Union of
Electricity Employees (NUEE) gbaa abụbụọrụ.
Gọọmenti Bauchi Steeti enyeela iwu ka emechie ụlọakwụkwọ ọhanaeze
na nkeonwe niile dị na steeti ahụ ozugbo, gụnyere ụlọakwụkwọ praịmarị, sekọndrị,
na mahadum nke steeti ahụ nwee, tinyekwara ụlọakwụkwọ gọọmentị etiti nwee.
Dịka ụlọmgbasa ozi mpaghara siri kwuo, e kwupụtara ntuziaka
a n'akwụkwọ ozi nke onye na-ahụ maka ozi na mịnịstri nke Agụmakwụkwọ bụ
Jalaludeen Usman, wepụtara.
"Ntuziaka a, n'agbanyeghị na o siri ike, bụ mkpebi gọọmentị
Bauchi Steeti mere na zaghachi nsogbu nchekwa dị ukwuu metụtara nchekwa ụmụakwụkwọ,
ndị nkuzi, na ụlọakwụkwọ niile dị n'ofe steeti ahụ," ka nkwupụta ahụ
kwuru.
Gọọmenti kwekwara nkwa ichekwa ụmụakwụkwọ ma gbaa ọhanaeze
ume ka ha nọrọ jụụ, na-amụ anya, ma na-arụkọ ọrụ site n'ikwupụta ihe ọ bụla a
na-enyo enyo.
Ka ọ dị ugbua, Bauchi esonyela na steeti ndị mechiri ụlọakwụkwọ
n'ihi ọnọdụ nchekwa adịghị mma na ntọrọ ụmụakwụkwọ n'oge na-adịbeghị anya n'ụfọdụ mpaghara Naịjirịa.
Amerịka na Yukren ekwuola na mkparịtaụka udo ha nwere na Geneva bara uru nke ukwuu
Ebe foto si, AP
Nkọwa foto, Chetakwa na ndị isi Yurop katọrọ atụmatụ isi ihe iri abụọ na asatọ ahụ mgbe ọ pụtara n'izu gara aga, na-ekwu na ọ dị oke mma nye Rọshịa.
Mba Amerịka na Yukren ekwuola na mkparịtaụka udo ha nwere na
Geneva bara uru nke ukwuu dịka ha gara n’ihu kwe nkwaịnọgide na-arụ ọrụ
'siri ike' maka inwete udo.
Cheta na ndị nnọchiteanya si na mba abụọ ahụ zukọrọ na
Switzerland iji nwee mkparịta maka atụmatụ udo nke isi iri abụọ na asatọ - na-ekwu
na enwere "ọganihu bara uru n'ịhazi ọnọdụ na ịchọpụta usoro ndị ọzọ doro
anya."
Chetakwa na ndị isi Yurop katọrọ atụmatụ isi ihe iri abụọ na asatọ ahụ
mgbe ọ pụtara n'izu gara aga, na-ekwu na ọ dị oke mma nye Rọshịa.
Akụkọ obi ọchịchị mba Amerịka bụ White House banyere mkparịtaụka
Geneva na-ekwu na ndị Yukren "kwere na edemede a na-egosi ọdịmma mba ha."
Yukren na-etinye aka n’usoro a n'ihi na o nweghị ike ịkwụsị
nkwado Amerịka, ka onye nta akụkọ anyị bụ Sarah Rainsford dere na Geneva.
Ka ọ dị ugbu a, mwakpo ndị Rọshịa na-awakpo Yukren ka na-aga
n'ihu, ebe opekatampe mmadụ anọ nwụrụ site na mwakpo ụgbọelu duronu na Kharkiv
n’ụbọchị Sọnde.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde, Nọvemba 24, 2025.
Ka izu ọhụrụ a mịtara onye ukwu na onye nta mkpụrụ ọma.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Ya gazie!
Onyeisiala Bola Tinubu enyela iwu ka e nwepụ ndị uweojii na-echekwa ndị nwere ọnụ n’obodo
Ebe foto si, Bayo Onanuga / X
Nkọwa foto, Bola Ahmed Tinubu na Kayode Adeolu Egbetokun
Onyeisiala
Naịjirịa bụ Bola Tinubu enyela iwu ka ndị ụweojii nwepụ ndị ọrụ ha niile e
zigara ka ha na-echekwa ndị dị mkpa na Naịjirịa.
Bayo Onanuga
bụ Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa mere ka a mata nke a n’akara
X soshal mịdịa ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na Tinubu nyere
iwu ahụ mgbe ya na ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche nwere mkparịta ụka n'Abuja.
Tinubu kwuru
na ugbua “ndị dị mkpa n’obodo chọrọ ka e nye ha nchekwa ga-aga tinye akwụkwọ n’ụlọọrụ
Nigeria Security and Civil Defence Corps”.
Ọ sị na otụtụ
obodo enweghị ndị uweojii zuruoke nke so na-ebute ajọ ọnọdụ nchekwa na
mpaghara dị icheiche.
A zọpụtala ụmụakwụkwọ ụka Katọlịk 51, tọghapụ mmadụ 38 a tọrọ n'ụlọụka dị n'Eruku Kwara steeti - Tinubu
Ebe foto si, President Bola Tinubu / X
Nkọwa foto, Bola Almed Tinubu
Onyeisiala
Naịjirịa bụ Bola Almed Tinubu ekwuola na a tọghapụla ndị ahụ ndị ntọ tọrọ mgbe
ha nọ n’ụlọụka n’Eruku Kwara steeti ọnụ ọgụgụ ha ruru mmadụ iri atọ na itoolu.
Onyeisiala Tinubu ji
akara X soshal mịdịa ya depụta nke a ma gbakwụnye na e nwetala ụmụakwụkwọ
iri ise na otu so na ndị a tọrọ n’ụlọakwụkwọ ụka Katọlịk dị na Niger steeti.
Tinubu bụ
onye chetere etu ya si hara ịga ọgbakọ G20 a na-eme na mba Saụt Afrịka kwuru na
ọ bụ “ka ya nweike ihazi ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa”.
Ka m mee ka
o doo anya “agaghị m ezuike, ụmụ Naịjirịa niile, steeti ọbụla nwereikike ịnweta
ezi nchekwa. Anyị ga na-echekwa obodo a nakwa ụmụ amaala anyị”.
O ji ohere ahụ kwe nkwa na anya ya dị n’ihe
gbasara nchekwa obodo niile na mpaghara niile na Naịjirịa.