Ndewoonụ o!
Igbo mụụ nze, mụọ ọzọ, ndewoonụ!
Taa mara anyị mma!
Soro anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa n'ụwa gbaa gburu gburu taa.
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2025.
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Igbo mụụ nze, mụọ ọzọ, ndewoonụ!
Taa mara anyị mma!
Soro anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa n'ụwa gbaa gburu gburu taa.

Ebe foto si, NigeriaArmy/x
Ndịagha Naịjirịa kwuru na ha gbochiri ndị Kọpa na-efe ala nna mmadụ iri asaa na anọ ịdabanye n’aka ndị ntọ maọbụ ndị na-enyi ọha egwu ọkachasị Boko Haram.
Ha mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi ha kesere n’akara soshal mịdịa ha ma kwuo na ihe ahụ mere n’okporoụzọ sitere na Buratai na-aga Kamuya na Borno Steeti.
Dika akwụkwọ ọzị ahụ si kwuo “ụgbọala ndị kọpa ahụ ji eme njem mebiri n’ihe dịka elekere itoolu n’ụbọchị Tuzde n’akụkụ ime ọhịa ebe ndị na-enyi ọha egwu ọkachasị Boko Haram na-akpa mkpamkpa”.

Ebe foto si, NigeriaArmy/x
Ha kwuru na ọ bụ ndị nche ogbe na mpaghara ahụ chọpụtara ihe na-eme ma kpọtụrụ ndịagha.
“Mgbe ndịagha ruru n’ebe ndị kọpa ahụ nọ ka ha chọpụtara na ha dị kọpa iri asaa na anọ. Ụmụnwoke iri atọ na isii na ụmụnwaanyị iri atọ na asatọ”.
Ha sị na ha kpọọrọ ndị kọpa ahụ niile kpọpụ ha ebe ahụ ma gbochie ndị ntọ maọbụ Boko Haram ịtọrọ ha.

Ebe foto si, AFP via getty images
Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola na “atụmatụ mwezuga onwe anaghị arụ ọrụ”.
Nke a ka o kwuru dịka ọ na-azaghachi onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump maka mkpebi o nwere izeghara ọgbakọ G20 ndị ndu ga-enwe na Johannesburg na ngwụcha Nọvemba.
Trump kwuru na o nweghị onye ọchịchị mba Amerịka ọbụla ga-aga ọgbakọ ahụ n’ihi okwu o kwuru sị na a na-akpagbu ndị ọcha na mba Saụt Afrịka.
Mana oge ọ na-ekwu okwu na mbaraezi ụlọomeiwu, Ramaphosa gwara mba Amerịka na ọ bụ ha ka ihe ga-efunahụ ma ọ bụrụ na ha abịaghị.
Dịka ụlọmgbasaozi AFP siri kwuo, Ramaphosa sịrị na mba Amerịka iwezuga onwe ha agaghị egbochi ọgbakọ ahụ ịga n’ihu.

Ebe foto si, EPA
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ebinyela aka n’akwụkwọ iwu ga-eme ka a gbape ngalaba gọọmenti dị icheiche a gbachiri maka ego adịghị.
Trump binyere aka n’iwu mmefu ego gọọmenti dịka ndị ụlọ omeiwu tụchara vootu nke kwadoro ya.
Trump kwuru na gọọmenti ya ga-amalite ọrụ n’uju n’agbanyeghị na ndị mmadụ ataala ahụhụ abalị iri anọ na atọ maka na a gbachiri gọọment.
Ọtụtụ ndị na-arụrụ gọọmenti ọrụ ka a kwụsịrị ọrụ kamgbe Ọktoba 2025, ebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ mana adịghị akwụ ha ụgwọ.
Ndị ọrụ gọọmenti mba Amerịka ruru otu nde na narị puku anọ ka nke a metụtara.

Ebe foto si, Bayo Onanuga, Getty Images
Ụlọọrụ na-achịkọta usoro e si ekesa mmanụ na Naịjirịa bụ Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Authority (NMDPRA) ekwuola na ha anaghịzi atụle atụmatụ itinye ụtụisi 15% na mbubata ngwaahịa mmanụ agbịdi.
Nke a dị n’ozi Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze n’ụlọọrụ NMDPRA bụ George Ene-Ita wepụtara n’ụbọchị Tọzde 13 Nọvemba, 2025.
Ene-Ita dọkwara ọha mmadụ aka na ntị ka ha ghara iji ụjọ zụọ mmanụ ụgbọala n’ụbara.
Ọ bụ n’ụbọchị 29 Ọktoba, 2025 ka Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu kwadoro ụtụisi 15% maka mbubata mmanụ ụgbọala na diesel.
A tụrụ anya na atụmatụ ahụ ga-ebuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala e si mba ndị ọzọ tụbata na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị omeiwu Amerịka ewepụtala ozi ruru ihu akwụkwọ 20,000 nke si n'aka Jeffrey Epstein, onye nwụrụ n'afọ 2019 na mkpọrọ ebe a tụnyere ya maka ebubo imetọ ụmụaka bụ nke gụnyere ebe nwa amadị ahụ kpọrọ aha Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump.
N'ụbọchị Wenezde, ndị 'Democrats' wepụtara emalu atọ nke gụnyere ozi Epsten na enyi ya nwaanyị bụ Ghislaine Maxwel ziritara onwe ha.
Ha gbakwara n'anwụ, Ozi Epstein na onye na-ede akwụkwọ bụ Michael Wolff, bụ onye deerela ọtụtụ akwụkwọ banyere Trump.
O teghị aka nke a mere, ndị 'Republicans' were wepụtara akwụkwọ baara ụba n'okwu ahụ, sị na ndị Democrats' nọ na-ahọrọ ndị masịrị ha iji megide Trump.
Ihe imeelu abụ gara n'etiti Epstein na Maxwell kwuru
Imeelu nke mbụ ndị 'Democrats' gbara n'anwụ bụ is ozi Epstein na Maxwell derịtara onwe ha.
Epstein gwara Maxwell sị: "Achọrọ m ka ị mata na nkịta nke agbọbeghị bụ Trump. [Onye e metọrọ] na ya nọkọrọ ogologo oge n'ụlọ m."
Epstein gara n'ihu kwuo na 'a kpọbeghị aha ya(Trump) ma ọlị ọbụladị onyeisi ndị uweojii.
Maxwell sara ya sị: "Ana m echekwa maka ya."

Ebe foto si, Presidency Nigeria/X
Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Sịnetọ Remi Tinubu ekwuola na mgbe ọbụla ụmụnwoke na ụmụnwaanyị jịkọrọ aka ọnụ ma na-enye onwe ha nkwado na Naịjirịa ga-enweta ezi ọchịchị.
O kwuru na ọ bụ nkwado ahụ bụ ihe ga-enyere ngalaba gọọmenti dị icheiche aka ime nke ọma.
Remi Tinubu na-ekwu nke a n’oge ọ gbapere ebe a na-eme ihe ọmụmụ gbasara nwoke na nwaanyị a na-akpọ ‘Oluremi Tinubu Gender and Public Policy Studies Centre’ nke dị na ‘National Institute of Policy and Strategic Studies (NIPSS), Kuru, Jos.
N'okwu ya "ezigbo ọganiru ga-adị nakwa ezi ọchịchị mgbe ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-akwado onwe ha,hụta onwe ha dịka ndị na-adịghị azọ ihe azọ, ma hụta onwe ha dịka ndị kwesiri ịjịkọ aka ọnụ".

Ogige ụlọ akwụkwọ ahụike nke gọọmenti Abịa steeti chakere achake dịka ndị Item bi n’Aba, Abia steeti gbakọrọ ọnụ mee emume ncheta omenala ha.
Cheta na Item dị n’okpuru ọchịchị Bende mana ha mere emume ahụ n’Aba, Abia steeti.
Emume ahụ dutere ọtụtụ ndị si n’obodo dị icheiche n'Item ọnụ ọgụgụ ruru itoolu bịa dọnyere ha ukwu.
Obodo ndị Item ahụ gunyere Okoko Item, Amaokwe Item, Amaeke Item, Apuanu Item, Amaekpu Item, Akanu Item, Okagwo Item, Umuakpaeme Item na Okai Item.

N’emume ahụ, mmọnwụ ndị Item a maama dịka Udungwulu, Oboni, Ilu, Achumpi, na Ogbu Anyaosi bịar gosi nkwado.
Ndị gwara BBC Igbo okwu gunyere Patience Okwu, Sam Okorie na Clara Emenike kwuru na udiri emume ọdịnala ndị ahụ dị mma ma bụrụ ihe Igbo ji echeta ebe ha si.


Ebe foto si, Nigeria Police Force
Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ndị ọrụ Quick Intervention Team (QIT) na Rapid Response Squad (RRS) ha anwụchiela ndị omekome na ndị otu nzuzo iri atọ e kwuru na ha na-ezu ohi ma na-eme ọtụtụ mpụ dị iche iche n’Imo steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye kwuru na ihe ha wetere n’aka ndị omekome ahụ gụnyere ngwa agha dị iche iche, ụgbọala atọ na ọgbatumtum abụọ.
Okoye kwuru na ọ bụ na Nọvemba 2, 2025 ka ndị ọrụ RRSnwụchiri mmadụ abụọ n’okporoụzọ Owerri/Aba road. O kwuru na e nwetere egbe double-barrel nakwa mgbọ egbe.
Oge a gbara mmdụ abụọ ahụ aha bụ Uchechukwu Ahamefule dị afọ 25 na Miracle Eberechi dị afọ 28 si obodo Umuorji, Osisioma dị n’Abia Steeti ajụjụ ọnụ, ha kwuru na ha bụ ndị otu nzuzo. Ha kwuru na egbe ahụ e nwetere n’aka bụ nke ha ji echekwa onwe ha.
Okoye kwuru na a na-eme nnyocha iji chọpụta ma nwụchie ndị otu nzuzo ahụ niile.
Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma mere ka o doo anya na ndị ọrụ ya ga-agba mbọ iji iweta ezi nchekwa na steeti ahụ ma kpọọ oku ka ọhanaeze nye ndị uweojii nkwado n’ọrụ nchekwa ha na-arụ.

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe dị na Gabon atụọla nwunye na nwa nwoke onye bụbu onyeisiala a chụpụrụ n'ọchịchị bụ Ali Bongo mkpọrọ afọ iri abụọ mgbe e kpechara ha ikpe ụbọchị abụọ.
N'abalị Tuzde, ka ụlọikpe mara Sylvia Bongo na Noureddin Bongo ikpe maka imefu ego na nrụrụaka n’ikpe abalị abụọ e kpere mgbe ha anọghị n’ụlọikpe.
E nyere ha abụọ ntaramahụhụ ịkwụ ụgwọ ruru otu narị nde 100m CFA francs ($177,000; £135,000), ebe enyekwara nwa ya nwoke bụ Noureddin iwu ka ọ kwụọ ego ruru otu puku ijeri na narị ijeri abụọ (1.2tn) CFA francs ($2.1; £1.6bn) ọzọ maka mmebi ego nke steeti Gabon.
E boro ha ebubo iji ọnọdụ ahụike Onyeisiala Ali Bongo mee ihe mgbe ọ dara ọrịa strok n'afọ 2018 nke nyere ha ohere iji chịa Gabon maka uru nke onwe ha.
Ha gọnarịrị ebubo ndị ahụ tupu a malite ikpe ha ikpe.
Cheta na ndịagha chụpụrụ Ali Bongo n'ọchịchị n'ọnwa Ọgọst n’afọ 2023 nke Brice Oligui Nguema nọ n’isi ya, ọ bụkwa onye yipụrụ uwe agha ya kemgbe dịka a họpụtara ya dịka onyeisiala na mbido afọ a.

Ebe foto si, SOPA Images / LightRocket via Getty Images
Ndị ha na Praịm mịnịsta Keir Starmer na-enwe mmekọ ekwuola na ọ ga-egbochi ndị chọrọ iwepụ ya n’ọkwa dịka Praịm mịnịsta mba UK.
E nwere akụkọ na-ekwu na ndị ha na Keir Starmer na-enwe mmekọ chọpụtara na e nwere ndị na-agba ya mgba okpuru ọkachasị dịka a na-akwado ikwuputa bọjeti n’oge adịghị anya.
Ndị enyi Keir Starmer kwuru na ha nwere nkwenye na a na-akpa nkata iji wepụ ya dịka praịm mịnịsta ma kwuo na nke ga-eweta nsogbu n’ọchịchị.
Akụkọ kwuru na ndị a na-ekwu nwere ike ịnọchi Keir Starmer bụ odeakwụkwọ mịnịstrị ahụike bụ Wes Streeting na odeakwụkwọ Shabana Mahmood.
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde, Nọvemba 12, 2025.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Cheta sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Udo dịrị ụnụ!

Ebe foto si, WHO/X
Ụlọọrụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (Nafdac) agbaala ama banyere ọgwụ adigboroja ha chọpụtara na mba Ịndia.
Ụlọọrụ Nafdac kwuru na ha agwala ụlọọrụ WHO maka ọgwụ ndị ahụ gụnyere COLDRIF, Respifresh TR, na ReLife nke ọ bụ ụlọọrụ Sresan Pharmaceutical, Rednex Pharmaceuticals na Shape Pharma rụrụ ha.
Ha mere ka o doo anya na ọ bụ ụlọọrụ Central Standard Control Organization (CDSCO) mba Ịndia gbara ama na e ji Diethylene Glycol (DEG) rụọ ọgwụ ndị ahụ.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ WHO chọpụtara na ọtụtụ ụmụaka dara n;ọrịa ma nwụọ na mba Ịndia. Ụlọọrụ CDSCO kwuru na ụmụaka ahụ nwụrụ, ṅụrụ ọgwụ ndị ahụ.

Ebe foto si, Lere Olayinka/Facebook screengrab
Esemokwu dapụtara taa n’etiti Mịnịsta na-ahụ maka Abuja bụ Nyesom Wike na ndịagha Naịjirịa maka ala dị n’Abuja.
Akụkọ kwuru na ndịagha ahụ gbochiri Nyesom Wike na ndị ọrụ ya ịbata n’ala ahụ.
Ihe onyoyno na-efegharị na soshal midia gosiri oge Wike na-ajụ otu onye ndịagha maka akwụkwọ ikike ha ji nweta ala ahụ.
Onye agha ahụ kwụrụ n’ihu Wike dịka ọ na-asa ajụjụ niile Wike jụrụ ya.
Onye agha ahụ gara n’ihu gwa Wike na ha nwere akwụkwọ ikike niile ha kwesiri inwe maka ala ahụ, ma gaa n’ihu gwa ya na ọ bụ oga ha nyere ha iwu ka ha ghara ikwe ya bata n’ala ahụ.
Wike gwara ndị ntaakụkọ na ihe kpatara esemokwu ahụ bụ na ọ gwara ndị ọrụ ya ka ha gaa hụ akwụkwọ ikike ndịagha nwere maka ala ahụ.
O kwuru na ndịagha ahụ gbochiri ndị ọrụ ịrụ ọrụ ọ zigara ha.
Ọ bụ nke a mere ka Nyesom Wike wuchie n'ogige ahụ iji chọpụta ihe mere ndịagha ahụ ji ghara ikwe ka ndị ọrụ ya rụọ ọrụ ha.

Ebe foto si, PTI
Praịm Mịnịsta mba Ịndia bụ Narendra Modi ekwuola na a ga-anwụchi ndị niile aka ha dị n’ụgbọala ahụ wuuru ọkụ n’akụkụ Red Fort dị na Delhi isiobodo mba ahụ ma gbuo mmadụ asatọ ma nye ha ntaramahụhụ dịka iwu siri kwu.
Ka ọ dị ugbua, enweghị onye ma ihe kpatara ụgbọala ahụ ji wuru ọkụ.
Nke a na-abịa dịka mịnịsta ime ụlọ ụ Amit Shah kwuru na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara njinji ahụ ahụ.
N’aka nke ọzọ, onyeisiala mba Sri Lanka bụ Anura Kumara na Onyeisiala Mohamed Muizzi mba Maldive zigaara ndị mba Ịndia ọkachasị ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ ozi iti aka n’obi ma kpere ndị merụrụ ahụ ekpere mgbake.

Ebe foto si, Eric Lee/Bloomberg via Getty Images
Ụlọ omeiwu mba Amerịka akwadola iwu ga-eme ka gọọmenti ha bido ọrụ n’uju.
Iwu ahụ ga-eme ka a gbape ngalaba gọọmenti niile dị icheiche a gbachiri maka na ego gọọmenti ji arụ ọrụ adịghị.
N’oge ndị Sịneti tụrụ vootu banyere ya, sịnetọ iri isii kwadoro ya ebe sịnetọ iri anọ akwadoghị ya.
Ndị sịnetọ Demokrat asatọ sonyere ndị Sịnetọ Republịkan niile kwado iwu ahu.
Nke ga-eme ka gọọmenti ahụ nwete ego ha ji arụ ọrụ bido ugbua ruo ngwụsha ọnwa Jenụwarị 2026.
Nke a na-eme dịka ndị Sịịnetọ Demokrat na Repụblịkan nwere nkwekọrịta ga-eme ka ndị ọrụ niile gọọmenti kwụsịrị ọrụ lọghachịta n’ọrụ.
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde, Nọvemba 11, 2025.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Cheta sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Ya gazie!

Ebe foto si, ANI
Ndị uweojii mba Ịndia ekwuola na mmadụ asatọ nwụrụ oge ụgbọala nwuuru ọkụ n’akụkụ 'Red Fort Landmark' dị na mpaghara Delhi dị n'India.
E kwuru na ọtụtụ puku ndị njem nlegharịa anya na-abịa na 'Red Forth kwa ụbọchị.
Kọmishọna ndị uweojii kwuru na njinji ahụ jiri n’Elekere Isii nke mgbede oge ụgbọala ahụ kwụsịrị ma nwuru ọkụ.
Praịm Mịnịsta Narendra Modi ezigala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ ndị ihe ahụ metụtara ma kwuo na a na-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nwa nwaanyị Jacob Zuma bụbu onyeisiala mba Saụt Afrịka ekwuola na aka ya dị ọcha n’ebubo iyi ọha egwu e boro ya.
Duduzile Zuma-Sambudla kwuru nke a dịka a malitere ikpe ya n’ụlọikpe dị na Durban.
A na-ekpe ya ikpe maka ihe ụfọdụ o kwuru na soshal midia oge a na-eme ngagahrịiwe maka nwụchi a nwụchiri nna ya n’afọ anọ gara.
Ngagharịiwe ahụ nke metụtara ọtụtụ mpaghara Saụt Afrịka na Julaị 2021, bụ nke kpatara ọnwụ mmadụ 300 tinyekwara ọtụtụ ihe e mebiri.
E boro Zuma-Sambudla ebubo ịkpalite ọnọdụ enweghị udo nakwa iyi ọha egwu.
Ngagharịiwe ahụ bụ na Gaunteng na KwaZulu-Natal ka ọ kacha njọ dịka a nwụchiri Jacob Zuma maka inupu isi nye iwu ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka e boro oge ọ nọ n’ọchịchị

Ebe foto si, EPA
Ndị omeiwu Sịneti mba Amerịka enwela nkwekọrị ka gọọmenti mba ahụ bido ịrụ ọrụ n’uju.
Nke a ga-akwụsị mkpochi e kpochiri ngalaba gọọmenti mba ahụ dị icheiche dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị n’ụlọ omeiwu ha enwghị ike nwe nkwekọrịta banyere mmefu ego gọọmenti.
N'abalị garaaga ka ndị isi Sịneti n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Demokrat na Repụblika nwere nzụkọ ha ji nwe nkwekọrịta ga-eme ka gọọmenti bido ịrụ ọrụ n’uju.
Cheta na gọọmenti mba ahụ kwuru na ha enweghịzị ego ha ji arụ ọrụ n’Ọktoba 1, 2025 nke mere ha ji kwụsị ịrụ ọrụ na ngalaba dị icheiche.
A gbachiri ọtụtụ ngalaba mba gọọmenti dị icheiche ihe ruru abalị iri na anọ.