Mba Venezuela akatọọla egwu Trump yiri maka imechi ụzọ ụgbọelu n’ikuku mba ahụ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. E jidela mmadụ isii maka ebubo izu ụmụntakịrị, zọpụta nwa dị afọ atọ ha zugara Legọs

    Komishịọna ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Ikioye Orutugu

    Ebe foto si, Ikioye Orutugu

    Nkọwa foto, Ikioye Orutugu

    Ndị uweojii n’Anambra steeti ejidela mmadụ isii maka ebubo izu ụmụntakịrị ma zọpụ out nwa nwoke dị afọ atọ ha tọọrọ ma duga ya na Legọs steeti.

    N’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Ikenga Tochukwu zigara ndị ntaakụkọ ka o kwuru na ndị ahụ a na-ebo ebubo ahụ na-atọrọ ụmụaka ma na-akpa mkpamkpa n’Anambra, Enugu na Legọs steeti.

    Ọ kọwara na iko ndị omekome ahụ juru mgbe ezinaụlọ nwa ha nwoke na-efuefu dere akwụkwọ degara ndị uweojii ma kọwaa etu nwoke aha ya bụ Samuel Ibe si tọrọ nwa ha gbalaga.

    Ha kwuru na a hapụrụ nwatakịrị ahụ n’aka Samuel bụ onye Umusiome dị na Nkpor Uno ka ọ leta ya anya mana Samuel kpọọrọ nwa ahụ gbalaga.

    Mana mgbe ndị uweojii jidere Samuel ka o kwuputere ndị otu ya gunyere nne ya aha ya bụ Agatha Ejeweh ( dị afọ 35), nwanne ya nwoke (dị afọ 15) bụ Ejeweh Chigozie Chidera.

    Ndị uweojii site na nnyocha ha mere jidekwara nwaanyị aha ya bụ Angela Eze (dị afọ 30) nakwa Juliet Onah bụ ndị nyereaka duga nwa ahụ Legọs.

    Etu ahụ ka e si jide nwoke ọzọ aha ya bụ China Cosmas ma zọpụta nwata nwoke ahụ.

    Komishịọna ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Ikioye Orutugu ekwuola na ha enfela nwatakịrị ahụ n’aka ezinaụlọ ya ma kwuo na ahụ dị ya mma.

    Ikioye Orutugu dọrọ ndị omekome aka na ntị ma kwuo na Anambra abụghị ebe ndị omekome ga-eji mere ọnọdụ.

  2. Ụmụ Igbo anyị ekele unu

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde, Nọvemba 10, 2025.

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  3. Ndị isi ọrụ BBC abụọ agbaala arụkwaghịm

    Tim Davie

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Tim Davie

    Ndị isi ọrụ BBC mmadụ abụọ bụ Tim Davie na Deborah Turness agbaala arụkwaghịm.

    Ha abụọ rituru n’oche ha dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump katọchara akụkọ onyonyo e mere banyere Panorama.

    A na-akatọ akụkọ onyonyo Panorama ahụ maka etu esi nwere ihe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru tinye n'ime ya.

    A na-ekwu na okwu Trump ahụ e tinyere n'akụkọ ahụ duhere ndị kiri ya ụzọ.

    Ọkwa Tim Davie n’ụlọọrụ BBC tupu ọ gbaarụkwaghịm bụ nke ndị bekee na-akpọ ‘Director General’ ebe Deborah Turness bụ ‘CEO’.

  4. Ajọ oke ifufe a kpọrọ 'super typhoon' adaala na mba Filipin

    Ọtụtụ ezinụlọ dị na Remedios T Romualdez, n'agwaetiti Mindanao, so na ndị a kpọpụrụ ebe ha bi tupu ajọ ifufe ahụ abịa.

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ezinụlọ dị na Remedios T Romualdez, n'agwaetiti Mindanao, so na ndị a kpọpụrụ ebe ha bi tupu ajọ ifufe ahụ abịa.

    Oke ifufe nke na-efe na mpaghara agwaetiti kachasị ukwuu na mba Filipin amụbaala dịka ọ bụrụ oke ifufe dị oke njọ, ebe otu mpaghara na-enwe "ọnọdụ ndị na-eyi ndụ egwu".

    Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ihuigwe nke Pagasa si kwuo, Typhoon Fung Wong ga-eme ka ifufe na-efegharị ruo kilomita 185 kwa elekere (155mph) na mmiri ozuzo n'ọtụtụ ebe na Sọnde.

    Mpaghara Bicol nke ọwụwa anyanwụ bụ akụkụ mbụ Filipin nke oke ifufe ahụ metụtara ozugbo n'ụtụtụ Sọnde, a na-atụkwa anya na ọ ga-emetụta Luzon, ebe ndị mmadụ kacha biri na mba ahụ n'abalị Sọnde.

    Typhoon Fung Wong - nke a maara n'ogbe ahụ dịka Uwan - bịara ụbọchị ole na ole ka oke ifufe mbụ ahụ bụ ‘Typhoon Kalmaegi,’ hapụrụ ụzọ mbibi ma gbuo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ narị abụọ.

  5. Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 9 Nọvemba 2025.

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  6. Mmadụ isii anwụọla dịka Rọshịa tụrụ ogbunigwe n’ebe obibi ndị mmadụ na Yukren

    Mmadụ isii anwụọla dịka Rọshịa tụrụ ogbunigwe n’ebe obibi ndị mmadụ na Yukren

    Ebe foto si, Reuters

    Opekatampe mmadụ isii anwụọla dịka Rọshịa tụrụ ọtụtụ ogbunigwe, ma jirikwa droonu mee mwakpo n’ebe obibi ndị mmadụ nakwa n’akụrụngwa na-enye ọkụ na mba Yukren.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ n’ime abalị ka mba Rọshịa mere Yukren mwakpo ọjọọ ahụ.

    Ogbunigwe dara n’ụlọ obibi ndị mmadụ n’obodo Dnipro gburu mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ iri na abụọ ndị ọzọ ahụ, ebe mmadụ atọ nwụrụ na Zaporizhzhia.

    N’ime ihe niile, ogbunigwe tụtara ogbe iri abụọ na ise na mba Yukren, tinyere isi obodo mba ahụ bụ Kyiv.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ mpaghara mba ahụ enweghị ọkụ latrik dịka okpomọkụ na-emekpa ụmụ mmadụ ahụ.

    Praịm Minista Yukren bụ Yulia Svyrydenko kwupụtara n’ọbaozi Telegram na e bibiri akụrụngwa ndị gbara ọkpụrụkpụ na-enye ọkụ na mpaghara Poltava, Kharkiv nakwa Kyiv.

    Ka o sina dị, o kwuru na ha na-agbasi mbọ ike iweghachi ọkụ na mpaghara ndị ahụ.

    Na mba Rọshịa, mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa kwuru na ndịagha ha kụkpọrọ droonu mba Yukren iri asaa na itoolu n’ime abalị.

  7. Gọvanọ Otti ebuliela ụgwọ a na-akwụ ndị ‘corper’ n’Abịa steeti

    Gọvanọ Otti ebuliela ụgwọ a na-akwụ ndị ‘corper’ n’Abịa steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti ebuliela obere ụgwọ a na-akwụ ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha na steeti ahụ.

    Otti buliri ụgwọ ndị kọpa ka ọ bụrụzie puku naịra iri ise karịa puku naịra anọ a na-akwụ ha n’oge ochie.

    Ozi ruru anyị aka kwuru na ndị kọpa niile na-efe ala nna ha n’Abịa steeti ga na-anata puku naịra iri abụọ kwa ọnwa ebe ndị nke na-akụzị n’ụlọakwụkwọ gọọmenti steeti ahụ ka a ga-agbakwunyere puku naịra iri.

    Ozi ahụ gakwara n’ihu kwuo na a ga-agbakwunyere ndị kọpa na-arụ ọrụ ahụike puku naịra iri atọ na nke ha.

    Ihe a bụ oge mbụ a na-agbakwunyere ndị ntoroọbịa na-efe ala nna ha n’Abịa steeti ego gbara ọkpụrụkpụ kemgbe afọ iri abụọ na asaa.

  8. A kagbuola ọtụtụ njem ụgbọelu n’ihi na gọọmenti Amerịka kwụsịrị ịrụ ọrụ

    Ụgbọelu United Airlines na-efepụ n'ọdọụgbọelu

    Ebe foto si, Reuters

    Akụkọ kwuru na a kagbuola njem ụgbọelu ruru 2,000 n’Amerịka n’ihi na gọọmenti Amerịka kwụsịrị ọrụ.

    Ndị ọchịchị kwuru na nkagbu a metụtara ọdọụgbọelu 40 n’Amerịka ma kwuo na ndị ọrụ ‘air traffic control’ anaghị abịa ọrụ maka na a naghị akwụ ha ụgwọ ọrụ ha.

    Ụlọọrụ Federal Aviation Administration (FAA) kwuru na ha bidoro site n’ịkagbu njem ụgbọelu pasenti 4 ma kwuo na o nwereike ịkagbu njem ụgbọelu pasenti 10 na ngwụcha izuụka a.

    FAA kwuru na nkagbu a ga-emetụta njem ụgbọelu 4,000 kwa ụbọchị.

    Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ụlọọrụ njem ụgbọelu na-ekwe ndị njem nkwa ịkwụghachi ha ego ha kwụrụ maka njem ha a kagburu.

  9. Ndị uweojii ebupụtala ozu mmadụ n’ogige ndị ntọrị dị n’Owerri West

    Ndị uweojii Imo steeti ebupụtala ozu mmadụ n’ogige ndị ntọrị dị n’Owerri West

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    Ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti kposara ogige ndị ntọrị dị n’Okuku nakwa Ndegwu dịcha n’okpuru ọchịchị Owerri West n’Imo steeti.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye wepụtara n’ụbọchị Fraịde 7 Nọvemba 2025.

    Dịka Okoye siri kwuo, nke a mere n’ụbọchị 5 Nọvemba 2025, site na njikọaka ngalaba ndị uweojii na-ebu agha megide ntọrọmmadụ na ndị nche obodo.

    Ozi ahụ kwuru na ndị uweojii bupụtara ozu mmadụ na-ere ure n’ogige ndị ntọrị dị n’ụlọ anụmanụ a gbahapụrụ agbahapụ n’okeọhịa dị n’Okuku na Agwa.

    Ndị uweojii amachiela mpaghara ahụ, ma bugaa ozu ahụ n’ọbaozu maka ime ya nnyocha miri emi.

    Okoye kwuru na ha ga-eziga ihe ndị e wepụtara n’ozu ahụ ebe a ga-eme nnyocha DNA iji mara ma ya na nke Ọkaiwu Jeffery Ucheagwu ọ ga-amakọ.

    Ọkaiwu Jeffery Ucheagwu bụ onye Ihembosi a tọọrọ n’ụbọchị 14 Ọktoba 2025, na mpaghara Sites and Services dị n’Umuguma n’okpuru ọchịchị Owerri West.

  10. Ndị uweojii anapụtala ụmụnne atọ ndị ntọrị tọọrọ n’Abịa steeti

    Ndị uweojii anapụtala ụmụnne atọ ndị ntọrị tọọrọ n’Abịa steeti

    Ebe foto si, Elijah Udo Young

    A chọtala ụmụnne atọ furu efu n’okpuru ọchịchị Isiala Ngwa South dị n’Abịa steeti, site na mbọ tara akpụ ndị nchekwa gbara.

    Ụmụaka ahụ gụnyere Beauty Oluebube Nwaobilor dị afọ asaa, Desire Nzubechi Nwaobilor dị afọ ise na Freedom Nwaobilor dị afọ abụọ

    Ndị uweojii kwuru na ha chọtara ma napụtakwa ụmụaka atọ ahụ, site na mbọ ha gbara na njikọaka ndị nche obodo na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ.

    Ha kwuru na a chọtara otu n’ime ụmụaka ahụ n’Ebonyi steeti, chọta nke ọzọ na Legọs steeti ma chọtakwa nke ikpeazụ n’Opobo dị na Riva steeti.

    Ndị uweojii kwuru na ha anwuchiela ndị a na-enyo enyo na aka ha dị na ntọrị ụmụaka ahụ, ma jichie ha.

    Ụmụaka atọ ahụ, aha ndị mụrụ ha bụ Maazị na Odoziakụ Paul Nwaobilor bụ ndị Umueze dị n’obodo Isiahaba kwụụrụ onwe ya.

    Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị atọ a na-amaghị ndị ha bụ tọọrọ ụmụaka ahụ oge ha na-alọta akwụkwọ.

  11. Nancy Pelosi dị afọ 85 ekwuola na ya agaghị azọ ọkwa ọchịchị ọzọ n’afọ 2027

    Nancy Pelosi

    Ebe foto si, Chip Somodevilla/Getty Images

    Nkọwa foto, Nancy Pelosi

    Nancy Pelosi bụ onye omeiwu na mba Amerịka dị afọ iri asatọ na ise ekwuola na ya agaghị azọ ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ ịlọghachịta n’ụlọ omeiwu n’afọ 2027.

    Pelosi bụ nwaanyị mbụ ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrat bụrụ Onyeisi ụlọomeiwu nta n’Amerịka ma bụrụkwa nwaanyị mbụ ji ọkwa onyisi ụlọomeiwu nta nọtere aka n’ọchịchị bido n’afọ 2003 ruo n’afọ 2023.

    N’okwu ya “anyị emeela ihe a ga-akọ ka akụkọ, anyị ewetela ọganihu”.

    "Bido ugbua gaa n’ihu, ihe m na-gwa mpaghara m hụrụ n’anya bụ San Francisco bụ na unu mara ike unu nwere”.

    Mgbe Pelosi dị afọ 47 n’afọ 1987 ka bụ nwaanyị nke mbụ nochitere anya mpaghara San Francisco n’ụlọomeiwu tupu ọ gbago n’ọkwa.

    N’afọ 2007 ka otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya tinyere n’ọkwa dịka onyeisi n’ụlọ omeiwu nta dịka nwaanyị nke mbụ. Ọ nọ n’oche ahụ ruo n’afọ 2011 tupu onye ọzọ abanye n’ọkwa ahụ. Mana n’afọ 2019 ka ọ laghachitere azụ ma chịa ruo n’afọ 2023.

  12. Trump chọrọ ka e wepụ mba Saụt Afrịka na G20

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump zutere Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa  n'ụlọọrụ Onyeisiala mba Amerịka na Washington, DC, na Mee 21, 2025

    Ebe foto si, JIM WATSON/AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Donald Trump na Cyril Ramaphosa

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya chọrọ ka mba Saụt Afrịka pụọ n’otu G20.

    Trump na-ebo mba Saụt Afrịka ebubo imegide agbụrụ ndị ọcha n'ime mba Saụt Afrịka.

    O ji maka ebubo ahụ ziga osote ya bụ JD Vance ka ọ gaa nọchịta anya ya n’ọgbakọ ndị G20 ga-eme na Johannesburg,Saụt Afrịka.

    G20 bụ otu jịkọrọ mba iri abụọ kacha nwee akụnụba n'ụwa.

    Onye na-ekwuchitere ọnụ gọọmenti mba Saụt Afrịka bụ Vincent Magwenya kwuru na ọgbakọ nke a ga-eme na mba ha ga-aga nke ọma.

    N’okwu Trump “Saụt Afrịka ekwesịghị iso na ‘Gs’ maka na ihe na-eme ebe ahụ dị njọ. Agaghịm aga ebe ahụ gaa nọchịtaanya mba anyị. Ekwesịghịm ịga ebe ahụ”.

    Mana Saụt Afrịka achọghị itinye ọnụ maọbụ saa Trump okwu banyere ebubo ndị ahụ.

  13. Oke ifufe mmiri Typhoon Kalmaegi akpaala ike na Vietnam

    Ndị ọrụ gbata gbata na-achọ ndị oke ifufe mmiri a metutara

    Ebe foto si, Getty Images

    Oke ifufe mmiri Typhoon Kalmaegi ka akụkọ kwuru na ọ kpara ike na Vietnam.

    Cheta na oke ifufe mmiri a wakporo ma gbuo mmadụ 114 ma bibie ọtụtụ ụlọ, ụgbọala na ihe ndị ọzọ na mba Filipins.

    Vietnam na-enwe oke nsogbu idemmiri na mmiri ozuzo ekwuola na ndịagha ruru 260,000 kwụrụ chịm maka ịzọpụta ndị mmadụ.

    Gọọmenti emecheila ọdọụgbọelu asaa na mba ahụ. Nke a metụtara ọtụtụ ndị na-eme njem ụgbọelu.

    Praịm mịnịsta Vietnam bụ Tran Hong Ha gwara ndị mba ahụ ka ha kpachara anya ma chekwaa onwe n’oke ikuke a.

    Ogige oke ifufe mmiri ahụ metụtara

    Ebe foto si, Getty Images

  14. Ndị uweojii Lọndọn amalitela ịchọ mmadụ abụọ a tọhapụrụ n’ụlọ mkpọrọ na-amaghị ama

    Foto mmadụ abụọ ahụ a tọhapụrụ n'ụlọmkpọrọ na-amaghị ama

    Ndị uweojii Lọndọn na-achọ mmadụ abụọ a tọhapụrụ n’ụlọmkpọrọ Wandsworth n’izuụka gara aga na-amaghị ama.

    Akụkọ kwuru na ndị uweojii tọhapụrụ Brahim Kaddour-Cherif si mba Ọljirịa a tụrụ mkpọrọ maka ebubo mmetọ ahụ na-amaghị ama na 29 Ọktoba 2025 ebe William Smith gbara afọ 35 a tụrụ mkpọrọ maka igwu chandum, bụ onye a tọhapụrụ na Nọvemba 3.

    E kwuru na Kaddour-Cherif nọrọ karịa ohere akwụkwọ njem visa e nyere ya.

    Ụlọọrụ Prison Officers’ Association gwara BBC na a na-atọhapụ ihe ruru mmadụ 22 n’ụlọmkpọrọ na-amaghị ama kwa ọnwa ọbụla ma kwuo na ụlọọrụ ọrụ na-ahụ maka ikpe na-ada mba n’ọrụ ha.

    Nke a na-abịa dịka a tọhapụrụ Hadush Kebatu ji obere ụgbọmmiri bata mba UK e boro ebubo imetọ ahụ n’ụlọmkpọrọ HMP Chelmsford dị n’Essex na-amaghị ama.

    A malitela ịcha odeakwụkwọ ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe bụ David Lammy ọkụ n’ihi na o kwere nkwa ichepụta atụmatụ ga-akwụsị ụdịrị ndị a.

  15. Ụtụtụ ọma ndị ma anyị ji eme ọnụ

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Tọzde, 2025 dịka anyị na-ewetara gị akụkọ si Naịjirịa nakwa mbaụwa niile.

    Sonyere anyị n'akara soshal midia anyị niile maka akụkọ foto na akụkọ onyonyo anyị ji bịa taa.

    Daalụ.

  16. Trump na Mamdani na-agba onwe ha egbe ọnụ

    Onyeyisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Meyọ New York city ọhụrụ bụ Zohran Mamdani

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Donald Trump na Zohran Mamdani

    Onye meriri ntuliaka Meyọ New York City bụ Zohran Mamdani na Onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump na-agba onwe ha egbe ọnụ.

    Dịka Trump gwara ndị na-atụ vootu ka ha hara ịtụnyere Mamdani maka na ọ bụ “kọmịnist” mana Mamdani kwuru na ya abụghị ihe a kpọrọ ya.

    Mgbe a na-achụ nta vootu ka Trump kwuru na ọ bụrụ na Mamdani merie na ya ga-akwụsị nkwado ọbụla gọọmenti etiti na-enye New York.

    Mana mgbe Mandani merichara ka Trump ji akara soshal mịdịa ya dee na “...o bidola”.

    N’oge Mamdani na-ekwu okwu ka o merichere ntuliaka ka ọ gwara Trump sị ya “gbalite ụda okwu ya”.

    Donald Trump kwukwara na ọ ga-abụ ajọ ihe ma otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrat banye n’ọchịhị mba ahụ.

    N’okwu ya “ọ ga-abụ ajọ ọnọdụ”.

    Trump gara n’ihu kwuo na ya ‘ga-etinye iwu ga-enyere mba Amerịka aka”.

  17. Mmadụ asaa anwụọla n’ụgbọelu ibu UPS kpọkara na Kentucky

    Cheta na Louisville dị na Kentucky na mba Amerịka, bụ ebe obibi nke UPS Worldport, ebe ụlọọrụ ahụ na-ebuga ngwongwo n’ụwa niile jiri mere isi

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Cheta na Louisville dị na Kentucky na mba Amerịka, bụ ebe obibi nke UPS Worldport, ebe ụlọọrụ ahụ na-ebuga ngwongwo n’ụwa niile jiri mere isi

    Gọvanọ Kentucky steeti ekwuola na opekatampe mmadụ asaa nwụrụ mgbe ụgbọelu ibu UPS kpọkara dịka ọ na-efepụ site n'ọdọ ụgbọelu dị na Louisville nke Kentucky n'abalị Tuzde.

    Andy Beshear kwuru na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ atọ nwereike iso n'ime ndị nwụrụ anwụ mgbe ụgbọelu ibu ahụ tiwara ka ọ na-apụ n'ọdọ ụgbọelu mba ụwa nke Louisville Muhammad Ali mgbe o jiri nkeji iri na ise gafee elekere ise nke oge obodo ahụ.

    Opekatampe mmadụ iri na otu ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ụgbọelu ahụ kpọkara, nke mere ka anwụrụ ọkụ ojii gbasaa n'eluigwe.

    Mana ndị ọrụ gọọmentị dọrọ aka na ntị na ndị mmadụ merụrụ ahụ nke ukwuu ma na-ekwu na ndị merenụ ahụ na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwekwara ike ịrị elu.

    A malitela ime nnyocha mbụ mana ndị ọrụ gọọmentị ekwuola na ọ dị ngwa ngwa ikwu ihe kpatara ihe mberede ahụ.

    Cheta na Louisville dị na Kentucky na mba Amerịka, bụ ebe obibi nke UPS Worldport, ebe ụlọọrụ ahụ na-ebuga ngwongwo n’ụwa niile jiri mere isi maka ọrụ ibu ụgbọelu na ebe kachasị ukwuu n'ụwa.

  18. Onye otu pati Democrat Zohran Mamdani emeriela ntuliaka onyeisi obodo New York

    Mamdani gbara afọ iri atọ na anọ bụrụ onye okpukperechi Alakụba nke mbụ na-ewere ọkwa onyeisi obodo New York

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mamdani gbara afọ iri atọ na anọ bụrụ onye okpukperechi Alakụba nke mbụ na-ewere ọkwa onyeisi obodo New York

    Zohran Mamdani emeriela ntuliaka onyeisi obodo New York dịka otu pati Democrat na-emeri ntuliaka mbụ kemgbe Donald Trump malitere ọchịchị nke ugboro abụọ ya dịka onyeisiala.

    Mamdani gbara afọ iri atọ na anọ bụrụ onye okpukperechi Alakụba nke mbụ na-ewere ọkwa onyeisi obodo nakwa onye kachasị bụrụ nwata ga-achị obodo kachasị ibu na mba Amerịka kemgbe afọ narị iri.

    "N'oge a nke ọchịchịrị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, New York ga-abụ ihe," Mamdani kwuru n'okwu mmeri ebe ọ kọwara ihe ndị ọ chọrọ ime ma gwa Trump okwu ozugbo.

    Cheta na Trump yiri egwu na ọ ga-ebelata ego gọọmentị etiti na-enye obodo New York City ma ọ bụrụ na Mamdani merie Andrew Cuomo nke pati Independent ya na onye otu Republican bụ Curtis Sliwa, ka o dere na soshal midịa: "Ya mere ọ na-amalite".

    Mamdani enwetala mmeri dị egwu, mana ihe ịma aka na-abịa ya n'ihu, dịka a ga-enyochakwa ihe ịga nke ọma ya - na ọdịda ya nke ọma, ka Anthony Zurcher dere.

    Ka ọ dị ugbu a, a na-atụ anya na ndị Democrats ga-emeri ntuliaka gọvanọ na Virginia na New Jersey.

    Ndị California na-atụ vootu iji gbanwee mpaghara ndị omeiwu nke steeti ahụ iji kwado ndị Democratic Party tupu ntuliaka n'afọ na-abịa.

  19. Nwata dị afọ 14 akpụpụla ndị mụrụ ya n’ụlọikpe maka na ha si London kpọlaa ya Ghana

    Aha onyonyo, Ụlọikpe ekpebiela na nwata kpụpụrụ ndị mụrụ ya n’ụlọikpe maka ịkpọla ya Afrịka ga-anọgide.

    Ụlọikpe ekpebiela na nwata nwoke mba Briten dị afọ iri na anọ, kpụpụrụ nne na nna ya n’ụlọikpe maka iziga ya ụlọakwụkwọ obibi dị n’Afrịka ga-anọgide n’ụlọakwụkwọ ahụ ruo na ngwụcha ogogo GCSE.

    Nwata nwoke ahụ a na-agaghị akpọ aha ya maka ihe dị n’iwu, bụ onye nne na nna ya kpọgara mba Gana n’ọnwa Maachị 2024, oge ha gwachara ya na ọ na-aga ileta nwanne ha na-ejighị ahụ.

    Akwụkwọ ikpe kwuru na nke bụ eziokwu bụ na ndị mụrụ nwata ahụ chọrọ ka ọ kwagaa Gana n’ihi mmetụta gbasara omume ya na Lọndọn, nke gụnyere agaghị akwụkwọ, inwe ọtụtụ ego ọ na-apụghị ịkọwa nakwa ibugharị mma.

    Mana nwata ahụ kwuru na ya anọghị n’otu ọjọọ, tinyekwara na ya anaghị ebugharị ngwaọgụ.

    Algerian lawyers, witnesses and media reporters are seen in front of the court during the trial of the Algeria's biggest financial scandal since independence.

    Ebe foto si, Getty

    Ọkaikpe nke otu Ụlọikpe Ukwu kpebiri n’ụbọchị Mọnde na nwata ahụ ga-aga n’ihu nọrọ na mba Gana ma dị njikere ịlaghachi Lọndọn ma ọ bụrụ na ọ gafee ogogo GCSE.

    Dịka nwata ahụ kwuchara na obi adịghị ya mma ịnọ na Gana, tinyere na ọ na-agụ ya agụụ ịlaghachi Lọndọn, o nwetara Ọkaiwu ma kpụpụ nne na nna ya n’Ụlọikpe Ukwu dị na Lọndọn n’ọnwa Febụwarị.

  20. Ihe karịrị mmadụ 60 anwụọla ka ajọ ifufe ‘Typhoon Kalmaegi’ na-akpa ike na mba Filipin

    Ajọ ifufe ahụ butere oke idemmiri n’obodo niile dị na mpaghara agwaetiti Cebu

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ajọ ifufe ahụ butere oke idemmiri n’obodo niile dị na mpaghara agwaetiti Cebu

    Ndị ọchịchị kwuru na ihe dịka mmadụ iri isii na isii anwụọla ebe ọtụtụ narị puku mmadụ gbapụrụ n'ụlọ ha ka otu n'ime ajọ ifufe kacha sie ike n'afọ a wakporo mpaghara etiti mba Filipin.

    Ajọ ifufe ‘Typhoon Kalmaegi’ akpalitela oke idemmiri n’obodo niile dị na mpaghara agwaetiti Cebu nke ndị mmadụ kacha biri na ya, bụrụkwa ebe mmadụ iri anọ na itoolu n'ime ndị nwụrụ anwụ nọ. Otu onye ọrụ nchekwa obodo kwuru na mkparịtaụka redio na Wenezde.

    Ihe onyonyoo na-egosi ndị mmadụ ka ha na-ezo n'elu ụlọ, ebe idemmiri na-ebupụ ụgbọala na akpa mbupu n'okporo ama.

    Ndị nwụrụ anwụ gụnyere mmadụ isii nọ n'ụgbọelu helikọpta ndịagha nke dara n'agwaetiti Mindanao, ndịda Cebu, mgbe e wepụtara ya iji nyereaka na ọrụ enyemaka.

    Cheta na opekatampe oke ifufe iri abụọ na-eme na mba Filipin kwa afọ.

    Nke kachasị ọhụrụ na-abịa naanị otu ọnwa mgbe oke ifufe gburu ihe karịrị mmadụ iri na abụọ ma mebie akụrụngwa na ihe ubi na mba ahụ.