Ụgbọala bọọsụ ụmụakwụkwọ egbuola mmadụ 11
Otu ụgbọala bọọsụ ụmụakwụkwọ egbuola opekatampe mmadụ iri na otu gụnyere ụmụaka ise na mpaghara Shandong dị na Chaịna.
Ụlọmgbasaozi dị na mba ahụ kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ tinyere otu onye ọnọdụ ya dị ezigbo njọ.
Ọ dị ka ụgbọala ahụ jiiri ike kpọkaa ụmụakwụkwọ ahụ na ndị mụrụ ha oge ha kwụ n’ọnụụzọ ụlọakwụkwọ ahụ dị n’obodo Tai’an.
Ụlọmgbasaozi ahụ kwuru na onye ọkwọụgbọala enweghị ike jikọtanwuo ya bụ ụgbọala tupu ihe mberede ahụ emee mana ndị uweojii anwụchiela ya ma malitekwa ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachi ahụ.
O dobeghị anya ma ya bụ onye ọkwọụgbọala ọ kpachapụrụ anya mee ihe ọdachị ahụ.
“Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na otu (11) anwụọla (tinyere ndị nne na nna isii na ụmụakwụkwọ ise),” ka ụlọmgbasaozi Chaịna kwupụtara.
Mmadụ iri na abụọ ndị merụrụ ahụ na-enweta onwe ha ugbua.
Ọnọdụ a dapụtara n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole ụmụakwụkwọ lọghachiri maka agụmaakwụkwọ nke afọ ọhụrụ.