You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Ụgbọala bọọsụ ụmụakwụkwọ egbuola mmadụ 11

    Otu ụgbọala bọọsụ ụmụakwụkwọ egbuola opekatampe mmadụ iri na otu gụnyere ụmụaka ise na mpaghara Shandong dị na Chaịna.

    Ụlọmgbasaozi dị na mba ahụ kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ tinyere otu onye ọnọdụ ya dị ezigbo njọ.

    Ọ dị ka ụgbọala ahụ jiiri ike kpọkaa ụmụakwụkwọ ahụ na ndị mụrụ ha oge ha kwụ n’ọnụụzọ ụlọakwụkwọ ahụ dị n’obodo Tai’an.

    Ụlọmgbasaozi ahụ kwuru na onye ọkwọụgbọala enweghị ike jikọtanwuo ya bụ ụgbọala tupu ihe mberede ahụ emee mana ndị uweojii anwụchiela ya ma malitekwa ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachi ahụ.

    O dobeghị anya ma ya bụ onye ọkwọụgbọala ọ kpachapụrụ anya mee ihe ọdachị ahụ.

    “Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na otu (11) anwụọla (tinyere ndị nne na nna isii na ụmụakwụkwọ ise),” ka ụlọmgbasaozi Chaịna kwupụtara.

    Mmadụ iri na abụọ ndị merụrụ ahụ na-enweta onwe ha ugbua.

    Ọnọdụ a dapụtara n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole ụmụakwụkwọ lọghachiri maka agụmaakwụkwọ nke afọ ọhụrụ.

  2. Pope Francis awụchiela n'Indonesia bụ mba kachasị nwee ndị okpukperechi Alakụba n'ụwa

    Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa bụ Pope Francis awụchiela n’isi obodo Jakarta nke mba Indonesia na njem bụ nke kachasị anya ma tee aka ọ ga-eme kamgbe ọ banyere n’ọkwa.

    Njem a Pope mere na mpaghara South East Asia ga-ewe ya ụbọchị iri na abụọ bụ nke kachasị taa aka ọ ga-ahapụ obi ọchịchị ya bụ Rome.

    Isisekpu ntị dị na njem a ya bụ na ka ọ kwalite mmekọrịta ndị okpukperechi Kraịst na nke ndị Alakụba.

    Mba Indonesia bụ mba kachasị nwee ndị okpukperechi Alakụba n’ụwa dịka pasentị 87% n’ọnụọgụgụ ndị mba ahụ bụ ndị Alakụba ebe Katọlik dị naanị pasentị atọ.

    A na-atụkwa anya na ọ ga-ezute Onyeisiala mba Jakarta na-achọ ịpụ apụ bụ Joko Widodo ma gaa njem nleta n’isiụlọ okpukperechi Alakụba dị na Jakarta.

    “Taa aga m amalite njem oziọma n’ọtụtụ mba ndị dị na mpaghara Asia nakwa akụkụ mmiri ‘Oceania’. Biko kpee ekpere ka njem a mịta mkpụrụ,” ka Pope Francis dere n’akara Twitter ya n'ụbọchị Mọnde.

    E kekpọola nchekwa na mba Indonesia dịka ọ dị ugbua maka ọbịbịa Pope Francis dịka ndị uweojii na ndịagha 9000 ka e tinyere n’ọrụ ichekwa obodo.

    Francis ga-abụ Pope nke atọ ga-abịa na mba Indonesia bụ mba kachasị nwee ndị okpukperechi Alakụba n’ụwa.

    Ọ wụchiri na Jakarta n’ihe dịka ọkara gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ (11:30am) n’oge mba ahụ nke bụ elekere ise nke isi ụtụtụ (05:30am) n’oge Naịjirịa.

    Pope Francis ga-ahazikwa ofufe n’etiti mmadụ ruru 70,000.

  3. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ!

    Unu abọọla chi eee!? Obi dị anyị maka etu unu si anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Biko nọsie ike maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa taa.

  4. Ndị otu NARD akwụsịla abụbọ ọrụ ha gbara maka onye otu ha a tọọrọ

    Otu jikọrọ ndị dọkịta na Naịjirịa bụ Nigerian Association of Resident Doctors (NARD) akwụsịla abụbọ ọrụ ha gabara na Naịjirịa gba gburugburu.

    Otu NARD malitere abụbụ ọrụ ahụ iji kpọọ oku ka a tọghapụ onye otu ha bụ Dọkịta Ganiyat Popoola nọ n’aka ndị ntọọ ihe ruru ọnwa asatọ.

    Dọkịta Ganiyat Popoola na-arụ ọrụ na ngalaba na-ahụ maka anya na ụlọọrụ National Eye Centre dị na Kaduna steeti,

    Ozi pụtara ihe n’ọgbakọ ndị isi otu NARD nwere mere ka a mata na ha ga-akwusị abụbọ ọrụ ahụ ma kwuo na ha ga ele anya mara ihe gọọmenti ga-eme banyere onye otu ha ahụ.

  5. PDP akpọọla Wike ka ọ bịa zara ọnụ ya maka imegide pati

    Otu pati Peoples Democratic Party (PDP) akpọọla mịnịsta na-ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ọgbakọ kọmiti na-ahụ maka ezi akpramagwa nke pati ahụ.

    Kọmiti ahụ bụ nke PDP hibere iji nyochaa ebubo e boro Wike na ọ na-eme ihe megidere iwu pati PDP.

    Osote odeakwụkwọ PDP bụ Ibrahim Abdulalahi gbara nke n’anwụ ma kwuo na otu kọmiti ahụ akpọọla Nyesom Wike ka ọ bịa zara onụ banyere okwu o kwuru banyere itinye ọgbagahra na pati PDP ọbụla tinyere ọnụ na-esemokwu dị n'etiti ya na Gọvanọ na-achị Rivers steeti bu Siminalayi Fubara.

    Ibrahim katọrọ okwu ahụ Wike kwuru ma kwuo na pati PDP akwadoghị ya.

  6. E nwereike ịma ndị haziri ngagharịiwe #EndBadGovernance ikpe ọnwụ

    Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla mmadụ iri n’ụlọikpe n’ihi ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru na ịkpa nkata ikpalị ndịagha oge e mere ngagharịiwe n’ọnwa gara aga.

    Mmadụ iri ahụ a kpụpụrụ n’ihu Ọkaikpe Emeka Nwite nke ụlọikpe ukwu etiti gụnyere Michael Adaramoye a maara nke ọma dịka Lenin, Adeyemi Abayomi, Suleiman Yakubu, Opaoluwa Simon, Angel Innocent, Buhari Lawal, Mosiu Sadiq, Bashir Bello, Nuradeen Khamis, na Abdulsalam Zubairu.

    Gọọmenti Naịjirịa kpọkwara nwaafọ Briten bụ Andrew Wynne a maara dịka Andrew Povich aha dịka onye ga-azara ọnụ ya n’ebubo ahụ.

    Ndị ọrụ nchekwa gbochiri ngagharịiwe ahụ dịka otu Amnesty International kwuru na e gburu opekatampe mmadụ iri na atọ (13) oge ahụ. Ndị ọrụ nchekwa ekwuola na ha ejighị ngwaọgụ busoo ndị ahụ mere ngagharịiwe agha.

    Mmadụ iri ahụ a kpụpụrụ n’ihu ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja ekwuola na aka ha dị ọcha mana Ọkaikpe Nwite nyere iwu ka ejichie ha n’ụlọnga Kuje ruo ụbọchị ọzọ a ga-elebara okwu ahụ anya bụ abalị 11 Septemba 2024 ewezuga nke nwaanyị a ga-etinye n’ụlọnga Suleja.

    Onye ọkaiwu na-ahụ maka ugwu nke mmadụ bụ Inibehe Effiong kwuru na a ga-ama ha ikpe ọnwụ ọ bụrụ na a chọpụta na aka ha adịghị ọcha.

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun boro ndị ahụ mere mkpesa ebubo ịkpa nkata ọjọọ nke ebumnobi ya bụ ibute ọgbaaghara na ịgba Naịjirịa mgba okpuru malite n’abalị mbụ nke ọnwa Julaị ruo n’abalị anọ nke ọnwa Ọgọst 2024.

    Dịka Egbetokun siri kwuo, omume ha megidere mpaghara iri itoli na ise (95) ma bụrụ nke ntaramaahụhụ ya dị na mpaghara iri itoli na asaa (97) nke iwu Naịjirịa.

  7. Israel amalitela abụbụọrụ n’ihi ụmụafọ mba ahụ e ji eji na Gaza

    Ọhanaeze amalitela abụbụọrụ n’Izrel oge ha mechara ngagharịiwe gbasara ihe ha kọwara dịka ịda mba gọọmenti ịnapụta ụmụafọ mba ahụ ndị otu Hamas ji n’agbụ.

    N’ụfọdụ akụkụ Izrel, ụlọorụ ndị ga-esonye n’abụbụọrụ ahụ gụnyere;

    -Ụlọazụmaahịa, ụlọakụ na ụfọdụ mịnịstrị gọọmenti.

    -Otu na-anọchite anya ndị ọrụ na ngalaba ndị nkịtị n’Izrel bụ Israel Business Forum.

    -Ụlọakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị nta ga-agbape ruo mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị na mba ahụ.

    -Ụlọọgwụ na ogige nlekọta ahụike agaghị arụ ọrụ n’uju.

    -Ụlọorụ njem agaghị arụ ọrụ dịka o siri kwesị n’ihi na ụlọọrụ njem ụgbọala atọ a ma ama na mba ahụ bụ Egged, Dan na Metropolin ga-esonye n’abụbụọrụ ahụ.

    Otu n’ime otu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’Izrel bụ Histadrut ekwupụtala abụbụọrụ ga-ewe otu mkpụrụ ụbọchị mana o dochabeghị anya etu ndị mmadụ ga-esi rubere ya isi.

    Kemgbe abụbụọrụ ahụ siri malite n’elekere asatọ nke ụtụtụ, ọ kụnyela ụkwụ n’ụfọdụ njem ụgbọelu n’ọdọụgbọelu a ma ama n’Izrel bụ Ben Gurion Airport.

    Ụnyaahụ, ọdọụgbọelu ahụ kwuru na ha ga-akwụsị ifepụ ndị mmadụ malite n’elekere asatọ ruo elekere iri nke mba ahụ mana ka osiladị ọbaozi ọdọụgbọelu ahụ kelere ndị ọbịa n’ụtụtụ a ma kwuo na ha ka nọ n’ọrụ.

    Nnyocha e mere chọpụtara na ụfọdụ njem ụgbọelu na-egbu oge ebe ndị nke ọzọ na-amalite oge ha kwesịrị.

    Mana dịka abụbụọrụ ahụ na-aga n’ihu, ụlọmgbasaozi Izrel na-ekwu na mba ahụ agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe ndị ọrụ iji nata ikikere ha ga-eji kwụsị ya.

    N’ụbọchị Sọnde, puku kwuru puku mmadụ mere ngagharịiwe n’Izrel oge ndịagha chọtara ozu mmadụ isii ndị Hamas ji eji n’ụbọchị Satọde.

  8. NNPC ekwuola ihe mere eji enwe ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa ugbua

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mbubata mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Nigeria National Petroleum Company (NNPCL) ekwetela na ọ n’ihi ụgwọ ụlọorụ ha ji ndị na-ekesa mmanụ ụgbọala mere ka e nwee ọtụtụ ahịri n’ọdọ mmanụ ụgbọala dị na Naịjirịa.

    E nweela ọtụtụ kepu kepu kwuru na NNPCL ji ndị na-ekesa mmanụ ụgbọala ụgwọ ruru ijeri dọla isii ($6bn) bụ nke mere ka e nwee ụkọ mmanụ ụgbọala kamgbe mmalite afọ 2024.

    N’ọtụtu oge, ụlọọrụ NNPCL ekwuola na ọ bụ n’ihi nsogbu ime njem, idemmiri nakwa ihe ndị ọzọ na-egbochi ha ikesa mmanụ ụgbọala ka o kwesịrị.

    Mana ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Olufemi Soneye wepụtara sị na “nsogbu ego etinyela ụlọọrụ a n’ọnọdụ siri ike ma metụta etu ha nwereike iji ekesa mmanụ ụgbọala”.

    “Site n’iwu na-ahụ maka mmanụ ụgbọala, ụlọọrụ NNPCL na-agbasi mbọ ike n’ịrụ ọrụ ya bụ ikesa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

    “Anyị na ngalaba gọọmentị dị iche iche na-arụkọ ọrụ iji hụụ na e kesara mmanụ ụgbọala etu o kwesịrị.”

    Ụkọ mmanụ ụgbọala abụghị ihe mbụ na Naịjirịa kama ọ kazi njọ ugbua kamgbe afọ 2023 Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu wepụrụ ego a na-agbakwụnye na mbubata mmanụ ụgbọala na Naịjirịa nke a kpọrọ ‘subsidy’.

    Nke a mere ka ọnụego mmanụ ụgbọala jiri ihe ruru pasentị 300 rịa elu ma mee ka ọtụtụ ngwaahịa niile e ji ebi ndụ rịakwa elu n’otu aka ahụ.

  9. Daalụ ndị e ji eme ọnụ

    Anyị na-anabata gị n'izu ọhụrụ a na-asị ka ụbọchị taa maara unu na mma.

    Ngwa! Buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  10. Wike ekwela nkwa itinye nsogbu na steeti PDP ọbụla tinyere ọnụ na nsogbu ya na Gọv. Fubara

    Mịnịsta na-ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike, ekwela nkwa ibutere ndị gọvanọ PDP nsogbu na steeti ha ma ọ bụrụ na ha ewepụghị aka ha na nsogbu ya na gọvanọ Rivers steeti bụ Siminalayi Fubara na-enwe.

    Wike kwuru nke a n’ọgbakọ pati PDP nwere na Rivers steeti ụbọchị Satọde.

    Cheta na ozi ndị gọvanọ PDP wepụtara n’izuụka gara aga nke Gọvanọ Bauchi Steeti bụ Bala Mohammed gụpụtara ka ha mechara ọgbakọ, kwuru na ha na-akwado Gọvanọ Siminalayi Fubara.

    Mana na nzaghachi ya, Wike boro ndị gọvanọ PDP ebubo na ha chọrọ ịnapụ ya pati PDP.

    N’okwu ya, Wike kwere nkwa na ya aghaghị ekwe ka onye ọbụla napụ ya pati PDP na steeti ahụ.

    Wike gara n’ihu kwuo na ya ga-amụnye ọkụ na steeti gọvanọ PDP ọbụla tinyere aka na nsogbu ya na Gọvanọ Fubara na-enwe maọbụ chọọ ịnapụ ya pati PDP na River Steeti.

  11. Gọvanọ Ebonyi Steeti ekwuola ka a kwụọ ndị ọrụ ụgwọọnwa opekatampe 70,000

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru enyela iwu ka a kwụọ ndị ọrụ ateeti ahụ ụgwọọnwa opeketampe 70,000.

    Gọvanọ Nwifuru kwuru nke a na mmeme iri ji ọhụrụ Ojiji Izhi New Yam Festival nke afọ 2024 ma nye iwu ka ndị isi ngalaba gọọmeti ya wepụta atụmatụ etu a ga-esi kwụọ ndị ọrụ ụgwọ ahụ malite n’ọnwa Sepụtemba, 2024.

    Cheta na onyeisiala Bola Tinubu nọrọ ụbọchị Tọzde 18 Julaị binye aka ka a kwụọ ndị ọrụ Naịjirịa 70,000 dịka ụgwọọnwa opeketampe.

  12. Mba Isreal kwuru na ha ahụla ozu mmadụ isii ndị otu Hamas ji eji na Gaza

    Mba Isreal ekwuola na ndịagha ha ebutela ozu mmadụ isii bụ ndị otu Hamas ji eji na mpaghara ‘Gaza Strip’.

    N’ozi ndịagha Isreal Defence Forces (IDF) wepụtara na Satọde, ha kwuru na a hụrụ ozu ndị a n’ime ntọala dị na Rafah, mpaghara South Gaza.

    Ha kpọpụtara aha ndị a dịka Carmel Gat, Eden Yerushalmi, Hersh Goldberg-Polin, Alexander Lobanov, Almog Sarusi na Ori Danino.

    Ọnụ na-ekwuru ndiagha a sị na nyocha mbụ gosiri na “ndị otu oyi ndụ egwu Hamas gburu ndị a n’ike tupu anyị erute ebe ha nọ”.

    Otu onye ọkwa ya gbagoro elu na Hamas kwuru na ọ bụ Isreal gburu ndị a maka na ha jụrụ ịnabata atụmatụ ịkwụsịtụ ịkwa ha mgbọ.

    Praịm Minista Isreal bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Isreal agaghị akwụsị ịkwa ha mgbọ ruo mgbe a maara ndị a gburu ndị a ikpe ruuru ha.

    “Onye ọbụla gburu onye e ji eji – achọghị ka e nwee nkwekọrịta”, ka o kwuru.

    Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmentị na-agba mbọ ịzọpụta ndị ọzọ e ji eji.

    Otu na-anọchiteanya ndị e ji eji agwala Netanyahu ka ọ gbasaa ozi nye mba ha ma kwuo na ọ gbahapụrụ ndị a e ji eji.

    Ha kwuru na mmadụ isii a e egburu nọrọ n’aka ndị Hamas taa ahụhụ ma nọọ agụụ ihe ruru ọnwa 11 ruo ugbua ha bịara nwụọ.

    “Oge e gburu n’itinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta butere ọnwụ ha nakwa ọtụtụ ndị e ji eji,” ka ha kwuru.

    Ndị otu a kwuru na ha ga-eme ngagharịiwe na mba Isreal ma gwaa ndị Isreal ọzọ ka ha dọnyere ha ukwu n’ime ngagharịiwe na Jerusalem nakwa Tel Aviv.

  13. Onyeisiala Bola Tinubu awụchiela na mba China n’ụtụtụ Sọnde

    Ụgbọelu bu Bola Tinubu, Onyeisiala Naịjirịa efetuoala na Beijing bụ isiobodo mba China n’ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ (9:00am) ụbọchị Sọnde 1 Sepụtemba 2024.

    Onyeisiala Tinubu mere njem na mba a bụ ebe ọ ga-ezute Onyeisiala mba China bụ Xi Jinping ka kpaa nkata banyere etu a ga-esi hazigharịa mmekọrịta Naịjirịa na mba China.

    Nke a na-abịa dịka Xi Jinping kpọro Tinubu oku ka ọ bịa njem a.

    Ọ bụrụ na ha kpachaa nkata, a na-atụ anya na ha ga-ebinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta.

    Ihe ndị ọzo Onyeisiala Tinubu ga-eme na njem a gụnyere;

    • Izute ndị ndu azụmaahịa na ọtụtụ ndị ojiego achụntaego na mba China
    • Ịga njem nleta n’isiụlọọrụ Tekịnụzụ bụ ‘Huawei Technologies’
    • Ịga njem nleta n’isiụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọoloko na China bụ ‘China Rail and Construction Corporation’ dịka Naịjirịa na-akwado ịrụ okporo ụgbọoloko si Abuja gawa Ibadan.
    • N’otu aka ahụ Onyeisiala Tinubu ga-esonye na mmepe ọgbakọ China-Africa Cooperation n’ụbọchị Tọzde 5 Sepụtemba dịka ọ bụ onyeisi otu ECOWAS.

    Ndị so ya mee njem a gụnyere; Gọvanọ Legos Babajide Sanwo-Olu, nke Kaduna Uba Sani; Minista na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi, Minista akụnaụba bụ Wale Edun nakwa ndị ọzọ.

  14. Nwada Chidimma Adetshina eturula ugo dịka ‘Miss Universe’ nke Naịjirịa afọ 2024

    Nwada Chidimma Adetshina emeriela n’ịma aka ndị kachasị mma a kpọro ‘Miss Universe’ nke Naịjirịa afọ 2024.

    Chidimma bụ onye zọrọ ọkwa n’aha ‘Miss Taraba’ meriri mmadụ iri abụọ na anọ ndị ọzọ so zọọ ọkwa a n’emume ikpeazụ mere na Legọs.

    O kwesịburu iso zọọ ọkwa ‘Miss Universe’ nke South Africa mana ọtụtụ ndị mba Saụt Afrịka katọrọ nwada a nke mere o jiri kwụsị.

    Njem nwada a butere ọtụtụ esemokwu na ịkọ ọnụ n’etiti ndị nkwado ya na Naịjirịa nakwa mba Saụt Afrịka ọkachasị na soshal midia.

    Ihe butere esemokwu niile a bụ na nwada a nwere agbụrụ na Naịjirịa nakwa Saụt Afrịka nke mere ọtụtụ ndị Saụt Afrịka jiri katọọ ya mgbe ọ na-achọ ịzọ ọkwa ahụ na mba ha.

    Dịka ọ dị ugbua, nwada Chidimma ga-anọchite anya Naịjirịa n’emume ‘Miss Universe’ nke mbaụwa a ga-eme na mba Mexico n’ọnwa Nọvemba.

    “Obi juru m afọ. Okpu a abụghị naanị maka ịma mma kama ọ bụ maka ime ihe ziri ezi, ịdịnotu,” ka o kwuru mgbe e yinyechara ya okpu.

    Minista na-ahụ maka omenala na Naịjirịa bụ Hannatu Musawa so na ndị nyere Chidimma okoko nturuugo dịka onye meriri.

    O kwekwara nkwa ịkwado onye meriri ka Naịjirịa nwee ike turu ugo na mbaụwa.

    Gịnị bụ ‘Miss Universe’?

    Ọ bụ emume ịhọpụta ụmụagbọghọ ndị maara mma n’ụwa a na-emekaarị kwa afọ ọbụla.

    Ihe e ji eme ya bụ iji gosi nkwado nye ụmụagbọghọ n’ụwa bụ ndị si na mpaghara ezinaụlọ, omenala nakwa okpukperechu dị iche iche.

    Emume a na-enye ụmụnwaanyị ikike ịkọwa akụkọ banyere ha, igosi akaraka ha ma gbasoo atụmatụ na-emetụ ha n’obi.

    Onye ọbụla meriri na-arụ ọrụ dịka onye nnọchiteanya na mbaụwa na na-arụkwa ọrụ enyemaka dị iche iche na mbaụwa.

  15. Igbo ndị mụrụ nze mụọ ọzọ!

    Unu abọọla chi?

    Obi sara mbara ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2024.

    Anyị na-asị ka ọnwa a mụtara gị ihe ọma na ndụ gị, azụmaahịa, ezinaụlọ nakwa n'ihe niile ị na-eme n'ọnwa a.

    Biko gbalịa na-anọnyere anyị kwa ụbọchị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ala Igbo, na Naịjirịa nakwa mbaụwa gbaa gburugburu.

    Daalụ!