You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Mmadụ anọ anwụọla ebe 18 merụrụ ahụ oge a gbara egbe aghara aghara

    Opekatampe mmadụ anọ anwụọla dịka iri na asatọ (18) ndị ọzọ merụrụ ahụ oge a gbara egbe aghara aghara na Birmingham dị n’Alabama na mba Amerịka.

    Ndị uweojii Birmingham kwuru na a chọtara ozu ụmụnwoke abụọ na otu nwaanyị n’ebe ahụ a gbara egbe ebe nwoke nke atọ mechara nwụọ n’ụlọogwụ n’ihi mgbọ a gbara ya.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-eme nnyocha iji mara ma ndị ojiegbe ahụ ha jiiri ụkwụ garuo ebe ahụ ha gbagburu mmadụ ka ha ji ụgbọala gbafee.

    Ka o siladị, enwebeghị onye ọbụla a nwụchiri maka ihe ọdachi ahụ.

    Ụlọorụ Gun Violence Archive kwuru na kemgbe afọ a, a gbaala egbe aghara aghara ihe karịrị ugboro narị anọ (400) na mba Amerịka.

  2. Obaseki gara ụlọọrụ Inec n'ụzụ ụtụtụ taa n'etiti ebubo nrụrụaka

    Aka na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki wụchiri n'ụlọorụ ndị Inec n'uzụ ụtụtụ taa ihe dịka elekere atọ n'ụtụtụ.

    O dobeghi anya ihe mere o ji mee nke a mana otu ya bụ PDP na-eti mkpu nrụrụaka na ntuliaka ahụ e mere n'ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba.

    O nwebeghi ihe ngalaba Inec kwuru maka ihe ahụ mere mana Obaseki pụrụ ebe ahụ ihe dịka elekere ise nke ụtụtụ.

    N'aka nke ọzọ, onyeisioche otu APC bụ Ajibola Bashiru kwuru na ha ga-eme mkpọtụ maọbụrụ na Obaseki esighi n'ụlọorụ Inec pụọ.

    Ọ fọrọ obere ihe ka amalite mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ ahụ.

  3. Ntụliaka Edo: Ndị uweojii anwụchiela ndị ekperima, napụta ha ngwaọgụ

    Dịka a na-agba mbọ ibelata ọnọdụ tigbuo zọgbuo na ntụliaka Edo steeti, ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị ọrụ akpụobi ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi wepụtara n’ọbaozi X ya n’ụbọchị Satọdee 21 Septemba 2024 kwuru na mmadụ abụọ ahụ gụnyere Edwin Obanor gbara afọ iri anọ na atọ (43) na Audu Tajudeen gbara afọ iri anọ na otu (41).

    Ozi ahụ kwuru na Tajudeen bụ onye a na-enyo enyo ị bụ onye otu Peoples Democratic Party (PDP) nakwa onye si mpaghara Ugbogbo dị na Igara Akoko, Edo steeti.

    Adejobi kwuru na ha nwụchiri ndị ekperima ahụ site n’ozi dị mkpa ha nwetara na ụfọdụ mmadụ bu ngwaọgụ na-achọ ịkpalite ọnọdụ tigbuo zọgbuo na ntụliakaelu ụbọchị Satọde.

    N’ihi ya, ndị uweojii banyere n’ọrụ ozugbo ma nwụchie Obanor bụ onyendu ndị ojiegbe n’Oredo Ward 4 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itolu nke abalị nakwa Audu Tajudeen na mpaghara Igara Akoko, Edo.

    Oge e nyochara akpa ha, a chọtara egbe atọ n’aka Obanor ma chọtakwa otu egbe n’aka Tajudeen.

    Ozi ahụ gbakwunyere na ndị uweojii ejichiela ndị ekperima ahụ dịka a ga-ekpe ha ikpe ngwangwa nnyocha a na-eme ha kụurụ ọnụ.

  4. E gbuola otu nwaokorobịa n’Abia steeti n’ihi ekwentị

    E nwere ụjọ n’obodo Ụmụịkaa dị n’Ụmụojima, Okpuru ọchịchị Osisiọma Ngwa n’Abịa steeti n’ihi ọnwụ erughị eru nke otu nwaokorobịa.

    A matara nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ dịka ThankGod Emmanuel gbara afọ iri abụọ na isii (26), nwaafọ Abala Ibeme dị n’Okpuru ọchịchị Obingwa ma biri n’Osisiọma.

    Ozi anyị nwetara kwuru na nsogbu bidoro oge Emmanuel nwụrụ anwụ hụrụ ekwentị ya n’aka onye a na-ebo ebubo gburu ya bụ Chiemela Chimezie gbara afọ iri abụọ na asatọ (28) ma gwa ya ka o nyeghachi ya ekwentị ya.

    Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na mgbe Chimezie jụrụ inyeghachi Emmanuel ekwentị ya, esemookwu dapụtara n’etiti ha ma dịka ha na-alụ ọgụ, Chimezie weere mma sụọ Emmanuel n’obi nke mere ka ọbara gbagbuo ya.

    Ọnọdụ ahụ mere ka ndị obodo Emmanuel bi n’Ụmụịkaa malite ọgbaaghara iji megwara ọnwụ nwanne ha. Akụkọ kwuru na ha mụnyere ụlọ ezinaụlọ Chimezie ọkụ bụ nke nwere ụfọdụ ụlọahịa na ya.

    Ka o siladị, ndị ntorobịa nwụchiri Chimezie ma nyefee ya n’aka ndị uweojii nke Osisiọma Police Divisional Headquarters.

    Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya kwuru na Chimezie bụ onye a ma ama maka omume ọjọọ dị iche iche nke mere na ndị obodo ahụ agbataghị ọsọ enyemaaka oge amụnyere ụlọ ha ọkụ.

    Oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka n’ekwentị, ọ kọwara akụkọ ahụ dịka eziokwu.

    Chinaka kwuru na ndị uweojii Osisiọma agaruola ebe ahụ njinji jiri, nwụchie onye a na-ebo ebubo gburu mmadụ ma weghachite mma a sị o jiri sụgbuo Emmanuel.

    O kpuhekwara na ebupụla ozu onye nwuru anwụ ma dọnye ya n’ọbaozu dịka ndị uweojii malitere ime nnyocha gbasara ihe butere ọnwụ ya.

  5. Ihe ndị uweojii kwuru banyere ọkụ gbara ọdọ mmanụ ụgbọala dị n’Enugwu Steeti

    Kọmishọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu ekwuola na eweghị onye nwụrụ maọbụ meruo ahụ ọkụ ahụ gbaara ọdọ mmanụ ụgbọala Pinnacle Filling Station dị na mpaghara Agbani road ụbọchị Frịade, 20 Septemba, 2024.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe wepụtara mere ka a mata na ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ gara ngwangwa ha nwetara ozi maka ọkụ ahụ.

    Ndukwe kwuru na nyocha mbụ e mere na-ekwu na ọ dịka ọ bụ mmanụ ụgbọala na-atụpụ n’ụgbọala na-agbara mmanụ ụgbọala kpalitere ọkụ ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na kọmishọna ndị uweojii enyela iwu ka ngalaba ndị uweojii CID mee nyocha zuruoke iji chọpụta ihe kpatara ọkụ ahụ.

  6. Akwụsịla m ndọrọndọrọ ọchịchị - Ali Bongo

    Onyeisiala Gabọn achụpụrụ n’ọchịchị bụ Ali Bongo ekwuola na ya ewezugala onwe ya na ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Bongo kwupụtara nke a dịka ọ gachara otu afọ ndịagha chụpụrụ ya dịka onyeisiala ma weghara ọchịchị n’ike.

    N’ozi leta o degaara ndị Gabọn, Bongo kwuru na ya “ewezugala onwe ya na ndọrọndọrọ ọchịchị” nke mba ahụ.

    Nwaamadị ahụ gbara afọ iri isii na ise (65) kpọkwara oku ka a tọhapụrụ ya nwunye ya na nwa ya nwoke ejichiri n’ihi ebube ime nrụrụaka.

    O doghị anya ma ya na ndịagha ji ọkwa ọchịchị enwere mkparịtaụka tupu ya ewepụta ozi ahụ maọbụ na o chere na ikweta na ya akwụsịla ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eme ka ezinaụlọ ya nwere onwe ha.

    Cheta na ndịagha weghaara ọchịchị Gabọn n’ọnwa Ọgọst 2023 n’ime obere oge e kwupụtara Ali Bongo dịka onye nwetara mmeri na ntụliaka onyeisiala.

    Ọ nọchiri anya nna ya dịka onyeisiala Gabọn n’afọ 2009 bụ onye chịrị mba ahụ afọ iri anọ (40).

  7. Ma mmadụ ma ụgbọala agaghị agagharị n’ụbọchị Satọde maka ntụlịaka Gọmentị okpuruọchịchị n’Enugwu steeti

    Kọmịshịọna Uweoji n’Enugwu bụ Kanayo Uzuegbu ekwuola na ndị mmadụ nakwa ụgbọala ama ngagharị n’ụbọchị Satọde bụ abalị ịrị abụọ na otu, n’ọnwa Seputemba, afọ 2024 maka maka ntụlịaka ịghọpụta ndị ga-enwere ọkwa gọmentị okpuruọchịchị na steeti ahụ.

    Kanayo Uzuegbu mere ka amata nke n’akwụkwọ ọzị ọnụ n’ekwuru ndị uweoji bụ Daniel Ndukwu binyereaka n’ụbọchị Tọzde, abalị ịrị na itoolu nke ọnwa Sepụtemba.

    N’akwụkwọ ọzị ahụ, Kanayo Uzuegu kwuru na e ya enyela iwu ka e zipu ndị ọrụ nchekwa na-ahụ maka ntụlịaka bụ ndị ga-echekwa obodo ụbọchị ahụ.

    “Mmadụ na ụgbọala amangagharị ụbọchị ahụ bụ bido n’etiti abalị Frịde (12:00am) rụọ na elekere isii (6:pm) n’ụbọchị satọde ahụ.”

    O jị ohere ahụ nwere dọọ aka na ntị ka ezinaụlọ ọbụla hara ikwe ka e nwere ụmụ ha na-eme ọgbọaghara n’ụbọchị ntụlịaka ahụ ma kwuo na onye ọbụla e jidere na-eme ọgbaaghara ga-eji ire ya gụọ eze ya ọnụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “a machiri ndị ọrụ nchekwa na-eso ndị nwenitereisi n’obodo iso ha gaa n’ebe ha ga-ebinye aka tụọ vootu”.

    N’otu aka ahụ ka ọ dụrụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndụmọdụ ka ha kwanyere onwe ha ugwu n’ụbọchị ahụ.

  8. Ụgwọọnwa opekatampe 70,000 abazighị uru n’ihi oke ọnụ mmanụ ụgbọala – Otu NLC

    Otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na ụgwọọnwa opekatampe 70,000 enweghịzi uru ọ bara ugbua n’ihi oke ọnụ mmanụ ụgbọala.

    Akụkọ kwuru na ndị isi otu NLC mere ka a mata na ka ọ dị ugbua, oke ọnụ mmanụ ụgbọala emeela ka ụgwọọnwa opekatampe ha na gọọmenti etiti kwekọrịtara bụrụ ihe efu n’agbanyeghi na gọọmenti amalitebeghị ịkwụ ya.

    Onyeisi NLC bụ Joe Ajaero nọrọ n’ọgbakọ e mere na Legọs steeti, kwuo na gọọmenti ghogburu ha oge ọ nabatara ịkwụ ndị ọrụ ụgwọọnwa opeakatampe 70,000.

    Ajaero gara n’ihu gwa gọọmenti ka ha kwụsị oke agụụ, ụbịam na ihe isi ike na-echere ụmụafọ Naịjirịa aka mgba tupu ajọ ọnọdụ ha akawanye njọ.

  9. Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ọ ga-arụ dam ise iji gbochie ide mmiri sị Lagdo Dam

    Ụlọọrụ Nigeria Hydrological Services Agency (NIHSA) ekwuola na gọọmenti etiti Naịjirịa ga-arụ dam ise iji gbochie ide mmiri si na Lagdo Dam dị na mba Cameroon.

    Onyeisi ụlọọrụ NIHSA bụ Umar Mohammed kwuru kwuputara nke a ma dọọ ndị bi n’akụkụ ebe ide mmiri nwereike imetụta aka na nti ka ha kwapụ maka ide mmiri si Lagdo dam.

    Mohammed kwuru na steeti ide mmiri ahụ si Cameroon nwereike imetụta gụnyere Adamawa, Taraba, Benue, Nasarawa, Kogi, Edo, Delta, Anambra, Bayelsa, Cross River na Rivers steeti.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ NIHSA degara ụlọọrụ onyeisiala akwụkwọ kọwara mkpa ọ dị ka gọọmenti hibe dam ise ahụ nakwa usoro a ga-eji gbochie ide mmiri na Naịjirịa.

    Akụkọ kwuru na ogige ebe a ga-ehibe dam ise ahụ ga-agbanwe ma gbakwunye na ogige osimiri Niger na Benue ga-amụbanye

    Cheta na mmiri ahụ si Lagdo dam bịara ụbọchị ole na ole e nwere ide mmiri si Alau dam kpara mkpamkpa na Borno steeti ma gbuo mmadụ 30.

  10. Abia steeti kachasị mee ọfụma na nsonaazụ ule NECO afọ 2024 - Ụlọọrụ NECO

    Ụlọọrụ National Examination Council, NECO ekwuola na Abịa steeti kacha mee ọfụma na nnsonazụ ule nke afọ 2024.

    NECO kwuru na ihe ruru pasentị 65 wetere akara kredịt ise nke gunyere mgbakọ na mwepụ (Maths) nakwa Asụsụ Bekee.

    Onyeisi ụlọọrụ NECO bụ Ọkammụta Dantana Wushishi mere ka a mata nke na mkparịtaụka ya na ndị ọrụ ntaakụkọ nwere na Niger steeti.

    Ọ kọwara ka steeti dị icheiche sị me n’ule ahụ. N'okwu ya, Abia steeti kacha ndị ọzọ mee ọfụma ma bụrụ ndị nke mbụ.

    O kwuru na ndị nwetara akara kredịt ise nke gụnyere mgbakọ na mwepụ (Maths) na Asụsụ Bekee n’Abia steeti ruru pasenti 83.40 ebe Kastina kacha gbaa ọnyụpa n'ule nke afọ maka na ọ bụ naanị pasent 2.42 ka ha nwetara.

    Abia steeti kachakwa na ndị nwetara akara kredịt ise ma e wepụ mgbakọ na mwepụ (Maths) nakwa Asụsụ Bekee.

    Ọkammụta Wushishi kwuru na “e weputara otu ụlọakwụkwọ a ga-akwụsị ime ule NECO na ya maka ime mpụ na ule abụọ kacha mkpa nakwa ule Sayensị.

  11. INEC amalitela ikesa akụrụngwa a ga-eji mee ntụliaka Gọvanọ n’Edo Steeti

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ebidola nkesa akụrụngwa a ga-eji mee ntụliaka ọkwa Gọvanọ n’okpuruọchịchị iri na asatọ (18) dị n’Edo steeti.

    Cheta na ntụliaka ahụ ga-akpọtụ ụbọchị Satọde 21, Septemba, 2024 iji họpụta onye da-achị steeti ahụ n’ime afọ anọ (4 years) na-abịa.

    Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Edo steeti gụnyere Olumide Akpata nke Labour Pati, Asue Ighodalo nke Peoples Democratic Party na Monday Okpebholo nke pati All Progressives Congress.

  12. Praịm mịnịsta Lebanon akpọọla oku ka otu UN gbochie ajọ agwaike Isreal

    Lebanon nọ n’ihe mgbu ka a tụrụ ogbunigwe ruru otu ouku na mba ahụ n’ime abalị abụọ nke gburu mmadụ 37.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Firass Abiad gwara BBC na ndị dọkịta na-arụ ọrụ kwa oge ọbụla na-eleta ndị ihe metụtara. Otu dọkịta na-ahụ maka anya kwuru na ọ bụ ụmụwoke ka ọ kachasị metụta.

    Firass Abiad kwuru na Lebanon kwesịrị ikwado maka ihe ike nwereike ime ha n’ọdịnihu.

    Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị otu Hezbolla ka otu Mossad nke mba Izrel na-ede na mwakpo ahụ.

    N’aka nke ọzọ, praịm mịnista mba Lebanon Najib Mikati, na-akpọku otu UN ka kwuo okwu maka ajọ agwa Izrel.

    Okwu ya na-abịa dịka otu UN Security Council na-akwado ime ọgbakọ ụbọchị Fraịde 20 Septemba, 2024.

    A na-atụanya onye ndu Hezbollah bụ Hassan Nasrallah ga-agwa ndị obodo ya okwu taa, Tọzde, Septemba 19, 2024.

  13. Ndị ọrụ nchekwa gbawara egbe oge EFCC gara Ịwuchi Yahaya Bello n'Abuja

    A nụrụ ụda egbe n’ogige ụlọ ọchichị gọọmenti Kogi Steeti dị n’Abuja oge ndị ọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) gara iwuchi aka chịburu steeti ahụ bụ Yahaya Bello.

    Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa nọ n’ogige ụlọ ọchịchị ahụ ekweghị ndị ọrụ EFCC banye n’ụlọ ahụ nke mere ka ha bido gbawa egbe.

    Nke a bụ ugboro abụọ aka na-achị Kogi steeti bụ Usman Ododo na-egbochi ndị ọrụ EFCC iwuchi Yahaya Bello.

    Enweela ihe mgbagojuanya banyere okwu Yahaya Bello na ụlọọrụ EFCC.

    Cheta na ọnwa Eprel 2024, EFCC kwuru na ha chọrọ iwuchi Yahaya Bello maka ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra iri asatọ na ụma abụọ. (80.2 billion naira).

    Okwu ahụ dị n’ụlọikpe ugbua mana Yahaya Bello agabeghi ụlọikpe da-zara ọnụ ya.

  14. Anyị ka na-achọ Yahaya Bello achọ - Ụlọọrụ EFCC

    Onyeisi mgbasaozi ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) bụ Dele Oyewale ekwuola na Yahaya Bello bụbu Gọvanọ Kogi steeti, anọghị n’ụlọọrụ ha ma kwusie ike na ụlọọrụ EFCC nwere akwụkwọ iwu mwuchi (arrest warrant) ụlọikpe nyere ka ha wuchi Yahaya Bello ebe ọbụla ha hụrụ ya.

    Dele Oyewale mere ka a mata nke a n'ozi o wepụtara n'akara X ụlọọrụ EFCC.

    Ụlọọrụ EFCC boro ebubo Yahaya Bello ebụbo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra iri asatọ na ụma abụọ. (80.2 billion naira) ma kwuo na ụlọọrụ ha ka na-achọ Yahaya Bello achọ.

    Cheta na e nwere ozi pụtara ta bụ 18 Septemba, 2024 nk3 kwuru na Yahaya Bello gara zaa oku ndị ụlọọrụ EFCC kpọrọ kemgbe.

  15. Kọmishọna ndị uweojii ọhụrụ awụchiela n’Abia na Ebonyi Steeti

    Danladi Isa awuchiela dịka kọmishọna ọhụrụ ndị uweojii n’Abia steeti. Ọ nọchiri Kenechukwu Onwuemelia onye bụbu kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ.

    Danladi Isa si obodo Oganenigu dị n’okpuruọchịchị Dekina dị na Kogi steeti banyere ọrụ ndị uweojii n’afọ 1992 ma bụrụ onye nwetagoro ọzụzụ dị icheiche n’ihe gbasara nchekwa.

    Tupu ọ bụrụ kọmishọna ndị uweojii n’Abia steeti, Danladi arụọla ọrụ n’ụlọọrụ ndị uweojii dị na Legọs, Bauchi, Gombe nakwa Abuja.

    N’okwu nnabata ya, Isa kwere nkwa ịrụ ọrụ iji hụ na e nwere ezi nchekwa ndụ ma buo agha megide ndị omekome n’Abia steeti.

    N’aka nke ọzọ, Anthonia Uche-Anya enwerela oche dịka kọmịshịọna ndị uweojii ọhụrụ n’Ebonyi steeti.

    Kọmishọna ọhụrụ ahụ si Imo steeti bụ Kọmịshịọna nke iri abụọ na asaa (27) nke Ebonyi steet ebe onye ọ nochiri anya ya bụ Augustina Ogbodo.

    Anthonia Uche-Anya arụọla ọrụ na ngalaba nyocha nke isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abuja.

    Uche-Anya kwere nkwa ịkwalite ịwụ Naịjirịa ma chekwa ndụ na akụnụba ụmụ ama ala Ebonyi steeti.

    Ọ gwara ndị niile ọnụ na-eru n’okwu ka ha nyere aka mee ka obodo dị mma ma kwuo na ya na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n’Ebonyi steeti ga-arụkọ ọrụ iji mee ka ọrụ nchekwa mịta ezi mkpụrụ na steeti ahụ.

  16. Gọọmenti etiti adọọla steeti 11 aka na nti maka ide mmiri si Lagdo Dam dị na Cameroon

    Gọọmenti etiti Naịjirịa adọọla aka na nti na enwereike inwe ide mmiri site na mmepe Lagdo Dam dị na mba Cameroon.

    Onyeisi ụlọọrụ Nigeria Hydrological Service Agency (NIHSA) BỤ Umar Mohammed kwuru nke a n’ozi o wepụtara.

    Ozi ahụ kwuru na enweghi ihe egwu ọbụla maka na ide mmiri ahụ agaghị enwe nnukwu mmetụta nye Naịjirịa.

    Mohammed gara n’ihu kwuo ka Anambra, Adamawa, Taraba, Kogi, Nasarawa, Benue, Bayelsa, Delta, Rivers na Edo steeti kwadobe iji gbochie mmetụta ide mmiri ahụ.

    Dịka ozi si n’aka ụlọọrụ Emergency Management Agency siri kwu, e nwere nnukwu ide mmiri na Naịjirịa oge e mepere Lagdo Dam n’afọ 2022. Mmepe ahụ butere ihe mgbu nye ọtụtụ ezinaụlọ na Naịjirịa ma gbuo mmadụ 603, meruo mmadụ 2,400 ahụ ma chụpụ ihe ruru otu nd mmadụ n’ụlọ ha.

    Ide mmiri ahụ mere n’afọ 2022, mebiri ụlọ 82,035 ma mebie ubi ọrụ ruru 332,327 hectas.

    N’ọnwa Ọktoba afọ 2023, ụlọomeiwu sịneti Naịjirịa kpọrọ oku ka gọọmenti etiti rụọ Dasin Hausa Dam iji gbochie mmetụta nwereike isi na mmepe Lagdo Dam.

  17. Onye ka INEC maara dịka onyeisioche Labour Pati?

    E nwela ihe mgbagojuanya banyere onyeisioche otu Labour Pati n’ime onwa ole na ole gara aga.

    Dịka ntụliaka ọkwa Gọvanọ n’Edo steeti ga-akpọtụ ụbọchị Satọde 21 Septemba, odoghị anya onye INEC maara dịka onyeisioche otu pati ahụ.

    Cheta na n’oge gara aga, e nwere ọgbaaghara dị n’etiti Julius Abure na ndị otu Labour Pati.

    Otu pati ahụ nọrọ ụbọchị Wenezde 4 Septemba, 2024 hibe otu kọmiti nlekọta nke mmadụ 29 nọ n’ime ya ọrụ ha bụ ịhazigharị pati ahụ ma nweta udo.

    Kọmiti ahụ ha hibere bụ Esther Nenadi Usman nọ n’isi ya ebe Sịnetọ Darlington Nwokocha bụ osote ya.

    Ka BBC Igbo kpọtụrụ ụlọọrụ INEC, ha gwara anyị na ha agaghị ekwu ihe ọbụla ugbua maka onyeisi otu Labour pati.

    Mana nnyocha BBC Igbo mere na webụsaịti ụlọọrụ INEC ụbọchị Wenezde 18 Septemba 2024, gosiri Julius Abure dịka onyeisioche Labour Pati, Umar Farouk Ibrahim dịka odeakwụkwọ, Oluchi Operah dịka onye na-ahụ maka ụtụ, Hadiza Kishimi dịka odeakwụkwọ ihe gbasara ego ebe aha ọkaiwu Akingbade Oyelekan nọ dịka onye ndụmọdụ n’ihe gbasara iwu nke Labour Pati.

    Mana mgbe BBC Igbo gara na websaịtị ndị Labour Pati, anyị hụrụ na

  18. Yahaya Bello azala oku ụlọọrụ EFCC kpọrọ ya

    Onye bụbu Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello emechala nyefee onwe ya ma zaa oku ụlọọrụ EFCC kpọrọ kemgbe.

    Ozi onyeisi ngalaba mgbasaozi Yahaya Bello bụ Ohiare Michael wepụtara ụbọchị Wenezde 18 Septemba, 2024, kwuru n Bello zara oku ahụ ka ya na ezinaụlọ, ndị enyi ya na ndị ndụmọdụ ya nwere ezi nkwekọrịta.

    Cheta na ụlọọrụ EFCC nọrọ n’ọnwa Eprel kwupụta na ha na-achọ Yahaya Bello achọ maka o kweghị ịza oku ha kpọrọ ya ma gbaa ọsọ ka ha chọrọ iwuchi ya.

    EFCC boro Bello ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra iri asatọ na ụma abụọ. (80.2 billion naira).

    Ozi ahụ kwuru na ha na-atụ anya na ụlọọrụ EFCC ga-eso usoro iwu kwadoro n’okwu ha na Yahaya Bello.

  19. E duola Law Mefor n’iyi ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n’Anambra Steeti

    Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti eduola Mazị Law Mefor n’iyi ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ.

    Gọvanọ Soludo kwuru na ọ họpụtara Law Mefor dịka kọmishọna maka na ọ bụ onye mara ihe ekwe na-akụ gbasara ọrụ mgbasaozi na mmekọrịta ọhanaeze.

    N’okwu nnabata ya n’ọkwa ahụ, Mazị Mefor kelere Gọvanọ Soludo maka ntụkwasịobi o nwere ebe ọ nọ ma kwe nkwa ịrụ ọrụ iji hụ na e nwere ezi mgbasaozi na mgbekọrịta n’etiti gọọmenti na ndị obodo.

  20. Ahụrụ m nwunye m n’anya: Ihe nwoke na-enye nwunye ya ọgwụike ka ndị ọzọ dinaa ya kwuru

    Dominique Pelicot dị afọ 71 e boro ebubo na ọ na-enye nwunye ya ọgwụike ma na-ekiri ka ndị ọzọ sị ama ya elu n’ike kwetere na ya mere ihe ndị ahụ.

    Pelicot kwetere nke a n’ulọikpe ma kọwa na ihe ahụ mere ugborougboro n’afọ iri. “A na m ama nwanyị elu n’ike dịka ndị a m na ya nọ n’ụlọikpe a ugbua” Pelicot kwuru.

    O kwuru na nwunye ekwesighị ịta ụdịrị ahụhụ ahụ ọ tara n’aka ya. Ọ gwara ụlọikpe na “Obi dị m anụrị ebe ọnọ”.

    Ka ọ na-ekwu maka ndị ọzọ ruru 50 e bokwara ebubo ịma nwunye ya elu n’ike ọ sị “ha niile ma, ha ama nsị na ha amaghị”.

    Naanị mmadụ iri na ise n’ime mmadụ ịrị ise kwetere na ha mara nwunye Pelicot elu n’ike, ebe ndị ọzọ na-ekwu na naanị ihe mere bụ ịkwa iko.

    Ọ gwara ụlọikpe na “ahụrụ m ya n’anya. Isi na-akwasa m ebe ọ nọ nke ukwu ma hụ ya n’anya. Enweghị oge m kpọrọ ya asị”

    “N’afọ iri ise; ahụrụ m ya n’anya afọ ịrị anọ mana afọ ịrị nke ọzọ ka m amaghịzị ihe mere”.

    Otu onye n’ime ndị ọkaikpe Gisele bụ Stéphane Babonneau gbara ya ajuju ọnụ, jụọ ya ihe mere na ọkwụsịghị itinye inye nwunye ya ọgwụike na agbanyịghị na ọ bidoro na-enwe nsugbu ahụike.

    “Achọrọ m ịkwụsị, mana ajọ agwa ahụ abanyere m n’ahụ, mana m ka na-enwe mmụọ ime ya” “A kara ma akwụsị, ma ọ bụ hara ime ya nchancha”.

    E bokwara Pelicot ebubo inye nwa ya nwanyị bụ Caroline ọgwụike ma metọ ya. Mana ọ gọrọ agụgụ sị na ọbụghị eziokwu.