E nwere ụjọ n’obodo Ụmụịkaa dị n’Ụmụojima, Okpuru ọchịchị Osisiọma Ngwa
n’Abịa steeti n’ihi ọnwụ erughị eru nke otu nwaokorobịa.
A matara nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ dịka ThankGod Emmanuel gbara afọ iri
abụọ na isii (26), nwaafọ Abala Ibeme dị n’Okpuru ọchịchị Obingwa ma biri n’Osisiọma.
Ozi anyị nwetara kwuru na nsogbu bidoro oge Emmanuel nwụrụ anwụ hụrụ ekwentị
ya n’aka onye a na-ebo ebubo gburu ya bụ Chiemela Chimezie gbara afọ iri abụọ
na asatọ (28) ma gwa ya ka o nyeghachi ya ekwentị ya.
Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na mgbe Chimezie jụrụ inyeghachi Emmanuel ekwentị
ya, esemookwu dapụtara n’etiti ha ma dịka ha na-alụ ọgụ, Chimezie weere mma sụọ
Emmanuel n’obi nke mere ka ọbara gbagbuo ya.
Ọnọdụ ahụ mere ka ndị obodo Emmanuel bi n’Ụmụịkaa malite ọgbaaghara iji
megwara ọnwụ nwanne ha. Akụkọ kwuru na ha mụnyere ụlọ ezinaụlọ Chimezie ọkụ bụ
nke nwere ụfọdụ ụlọahịa na ya.
Ka o siladị, ndị ntorobịa nwụchiri Chimezie ma nyefee ya n’aka ndị
uweojii nke Osisiọma Police Divisional Headquarters.
Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya kwuru na Chimezie bụ
onye a ma ama maka omume ọjọọ dị iche iche nke mere na ndị obodo ahụ agbataghị ọsọ
enyemaaka oge amụnyere ụlọ ha ọkụ.
Oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Abịa steeti bụ
Maureen Chinaka n’ekwentị, ọ kọwara akụkọ ahụ dịka eziokwu.
Chinaka kwuru na ndị uweojii Osisiọma agaruola ebe ahụ njinji jiri, nwụchie
onye a na-ebo ebubo gburu mmadụ ma weghachite mma a sị o jiri sụgbuo Emmanuel.
O kpuhekwara na ebupụla ozu onye nwuru anwụ ma dọnye ya n’ọbaozu dịka ndị
uweojii malitere ime nnyocha gbasara ihe butere ọnwụ ya.