You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Ndị ojiegbe awakpoola ụlọakwụkwọ ndịagha dị n’isi obodo mba Mali

    Ndị ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ ndịagha dị na Bamaka, isi obodo mba Mali n’ụbọchị Tuzde 17 Septemba 2024.

    Dịka ndị ọchịchị na mba ahụ si kwuo, ndị ojiegbe ahụ bụ ndị na-eyi ọha egwu.

    Ha kwuru na ụlọakwụkwọ ndịagha a wakporo dị nso n’akụkụ ọdọụgbọelu.

    Mali so na mba dị icheiche n’Afrịka na-ebuso ndị na-eyi ọha egwu agha kemgbe afọ iri gara aga mana ugbua amabeghị aha ndị ahụ wakporo ụlọakwụkwọ ndịagha.

    “N’isi ụtụtụ taa bụ Tuzde, otu ndị na-enyị ọha egwu dị icheiche chọrọ ịwakpo ụlọakwụkwọ ndịagha bụ nke so n’ọtụtụ ebe dị icheiche ndị omekome ahụ chọrọ ịwakpo”.

    “Enwebeghị onye e kwuru na ọ nwụrụ mana ndịagha abụọ gwara ụlọọrụ mgbasaozi AFP sị na ha merụrụ ahụ oge ahụ a wakporo ha”.

    Mịnịstrị na ahụ maka ndị agha na Mali gwara ọhanaeze ka he hara ịma jijiji ma sị ha gaa n’ihu na-ebi ndụ ha.

    Mana otu mba ụwa dị iche iche dịka UN gwara ndị ọrụ ha ka ha hie asaa n’anya ma ha na-aga ọtụtụ ebe na mba ahụ.

    N’ihe onyonyoo e tinyere na soshal midịa ka anwụrụ ọkụ na-arị elu n’ebe dị iche iche na mpaghara ahụ.

    Mana ka mpamkpa ahụ na-akpa, ndị alakụba chọrọ ịga mee ekpere lọghachiri azụ ebe e mechiri ọdọụgbọelụ Modibo Keita International Airport dị na Bamako.

    Cheta na ndịagha weere ọchịchị ma chụpụ ndị nkịtị n’ọkwa n’afọ 2021 ma boo ha ebubo na ha akwadoghị ndị na-eyị ọha egwu ịkpa mkpamkpa.

  2. Ụmụaka anọ anwụọla n’ime igwe njụoyi ‘freezer’ na Namibia

    Ndị uweojii Namibịa na-eme nnyocha ugbua gbasara ọnwụ ụmụaka anọ ndị na-egwuri egwu n’ime igwe njụoyi freezer na mpaghara Zambezi dị na mba ahụ.

    Ụmụaka ndị ahụ dị n’agbata afọ atọ na afọ isii bụ ndị a chọtara n’ime igwe njụoyi ahụ enweghị ihe nọ n’ime ya n’obodo Katima Mulilo n’ehihie Mọnde 16 Septemba 2024.

    Ndị uweojii kwenyere na ụmụaka ndị ahụ tọrọ ma kugbuo n’ime igwe njụoyi ahụ oge ha na-egwuri egwu mana nnyocha ka na-aga n’ihu.

    N’ime ụmụaka anọ ahụ, abụọ kugburu ma nwụọ n’ime igwe njụoyi ahụ ebe abụọ ndị nke ọzọ nwụrụ n’ụlọogwụ oge ha na-anara ọgwụgwọ.

    Ka o siladị, o dochabeghị anya ihe mere e ji hapụ igwe njụoyi ahụ enweghị ihe e ji ya eme n’ihu ụlọ ezinaụlọ ụmụaka ahụ.

  3. Ihe ndị ịmaghị maka Lazarus Muoka hibere ụlọụka 'Chosen'

    "I am a chosen" na-ewu ebe niile na soshal midia dịka akụkọ ihe iribaama meere mmadụ abụọ n'ụlọụka ahụ na-ewu ewu.

    N'ime ya ndị ahụ otu nwoke na otu nwaanyị kọrọ akụkọ etu Chineke si gbapụta ha n'aka odum nakwa n'aka ndị ntọ.

    Nke a mere ka ndị mmadụ malite ịkatọ ha na-ekwu na ọ bụghị eziokwu ebe ndị ọzọ ji ha eme akaje na soshal midia.

    Ọ bụ n'ihi ihe ndị ahụ kwuru n'onyonyo iri baama ha ka 'I am a chosen' bidoro iwu ewu.

    Mana gịnị ka ị ma maka nwoke bụ ụkọchukwu hibere ụlọụka Chosen ahụ?

    Lee ihe anyị chọpụtara.

    • A mụrụ Lazarus Muoka n'obodo Mgbidi dị n'okpuruọchịchị Orsu dị n'Imo steeti.
    • Mgbe ọ gụchara ụlọakwụkwọ Pramarị na Sekọndrị o si ebe ahụ gbagoo Legọs n'afọ 1975.
    • Ọ mụrụ ọrụ n'aka mmadụ tupu ọ gbapee ọdọahịa nke ya ebe ọ na-ere akụrụngwa ụgbọala a kpọrọ 'Spare parts' na Bekee.
    • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Joy Muoka ma mụọ ụfọdụ ụmụaka.
    • Ọ bụ ebe ọ nọ azụ ahịa ka ọ lụrụ oku Chineke na-akpọ ya ma si n'ụlọụka ebe ọ nọ pụọ ma bido ụka nke ya n'ọnwa Disemba afọ 2002.
    • Aha ụka ahụ o bidoro bụ The Lord’s Choosen Charismatic Revival Ministries nke bụ 'Chosen' n'ịchafụ.
    • Njirimara ụlọụka ahụ bụ uwe na-acha edo edo. Muoka kọwara na nke a bụ ụzọ ha si gwa ụwa maka Chineke n'ụlọụka ha.
    • Ọ ogbara ala n'Amuwo Odofin ma hibe ụlọụka ya ebe ahụ n'afọ 2003.
    • Okwu njirimara ndị ụka ya bụ "ịkuzi okwu chukwu n'ụzọ dị ọcha nakwa etu Chineke si chọ ya".

    A katọọla ụlọụka Muoka bụ Chosen ọtụtụ oge ma na-ekwu na ọ na-arụpụta ihe ndị iribama a na-ahụ n'ụlọụka ya.

    O nwekwara mgbe otu nwaanyị rụpụtara ozi n'elu CD na-ere ya n'ahịa ebe ọ gbara akaebe na a na-arụpụta ihe iri baama mere n'ụlọụka ahụ.

    Ụlọakụ ahụ azaghachila ma kwuo na ihe ndị ahụ ndị mmadụ na-akọ megide ha enweghi isi maọbụ ebe ọ gbadoro aka.

  4. Etu ụlọelu ogogo asaa si daa ma gbuo mmadụ asatọ na Sierra Leone

    Ndị ọrụ gbatagbata National Disaster Management Agency (NDMA) na-aga n’ihu ịzọpụta ndị zọrọ ndụ oge ụlọ elu ogogo asaa dara na Freetown, isi obodo Sierra Leone.

    Ụlọọrụ NDMA kwuru na ụlọ ahụ dara na mpaghara Shell New Road gburu mmadụ asatọ ebe ha zọpụtara mmadụ isii ma kwuo na e nwere ọtụtụ ndị ka tọọrọ n’ụlọ ahụ.

    Otu onye obodo aha ya bụ Mohamed Camara kwuru na nwunye ya na ụmụ ya atọ nọ n’ụlọ ahụ oge ọ dara.

    Ka ọ dị ugbua, enweghị onye ma ihe mere ka ụlọ ahụ daa mana ozi onyeisi ụlọọrụ NDMA bụ Brima Sesay wepụtara kọwara na ụlọ ahụ bụ ebe obibi ma bụrụkwa ebe ọrụ.

    Brima Sesay dọrọ aka na nti ma katọọ etu ndị na-arụ ụlọ si enye ndị adigboroja na ndị na-etozughị etozu ọrụ ụlọ ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ ya ga-aga n’ihu ime nyocha iji chọpụta ma gbochie ọtụtụ ụlọ n’adaa na mba ahụ

    BBC chọpụtara na e ji akụrụngwa adigboroja arụ ụlọ na Sierra Leone.

  5. A nwụchiela ndị na-eme 'baby factory' ma na-agba mgbere ụmụaka n'Aba

    Ụlọorụ NSCDC anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Nnanna Michael dị afọ iri isii na anọ maka ịhibe ụlọ ebe a na-agba mgbere ụmụaka a mụrụ n'ime mkpuke.

    Ha kwuru na azọpụtara ụmụ nwaanyị abụọ bụ Doris Nelson na Ugochukwu Winner nke ka dị ime n'aka nwoke ahụ.

    Nwoke ahụ kwuputara na n'ezie na ọ na-elekọta ụmụ nwaanyị dị ime ma ree nwa ha ma mụọ nwa.

    Nnanna bụ onye rụburu ọrụ n'ebe a na-elekọta ụmụaka e nweghi nne kwuru na o reela nwa nke Doris Nelson mụụrụ ya n'ọnụ nde 1.1 ma kwee nne nwa ahụ nkwa na ọ ga-enye ya puku narị naira ise n'ime ego ahụ.

    Nyocha gosikwara na ọ bụ otu onye ụkọchukwu kpọnyere Nnanna Winner Ugochukwu ka o nweike rekwuo nwa nke ọ ga-amụpụta mana ụkọchukwu ahụ eriela mbọmbọ ọsọ dịka a ka na-achọ ya.

    NSCDA ekwuola na ha ga-enyefe ndị a n'aka ngalaba na-egbochi ma na-akwụsị mgbere mmadụ bụ NAPTIP n'ịchafụ ka ha nwee ike kpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ka iwu si nye.

    Ha dọrọ ndị nne na nna aka na ntị ha lebanye anya na nlekọta, nkuzi nakwa nchekwa ụmụ ha iji kwụsị ha ịdanye n'ụdịrị ọnọdụ a n'ọdịnihu.

  6. Mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n’Anambra steeti

    Egbuola ndị uweojii abụọ oge ndị ojiegbe wakporo ụlọorụ ha dị n’Anambra steeti.

    Dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga siri kọwaa, e mere mwakpo ahụ n’ụtụtụ Mọnde 16 Septemba 2024 n’ụlọorụ ndị uweojii dị n’Umunze, Okpuru ọchịchị Orumba South nke steeti ahụ.

    Ọ sịrị na ndị ekperima ahụ a na-enyo enyo ji ogbuniigwe wụchaa n’ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma na-agbakwa egbe aghara aghara nke mere ka ụfọdụ akụkụ ụlọorụ ha gbaa ọkụ.

    O kwuru na ndị uweojii abụọ gbara mbọ iguzogide ndị ojiegbe ahụ tụfuru ndụ ha dịka a dọnyere ozu ha ugbua n’ụlọ nchekwa ozu.

    Ka osiladị, Ikenga kwuru na ndị ọrụ nchekwa e jikọtara ọnụ gụnyere ndị uweojii, ndịagha, ndịagha mmiri, ndị Civil Defence na ndị ọzọ eweghachitela ogbuniigwe ndị agbaghị agba dịka ha nọ ugbua na-achọ ọhịa na ụzọ ịmata ndị kpara arụ ahụ.

  7. Anyị ga-ewepụta passport ọhụrụ anyị oge na-adịghị anya – Mali, Burkina Faso, Niger

    Mba atọ dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ndịagha na-achị ga-ewepụta akwụkwọ njirimara passport ọhụrụ oge na-adịghị anya.

    Mba Mali, Bọkịna Faso na Nijie ndịagha weghaara ọchịchị ha n’ike n’agbata afọ 2020 na 2023 kwuputara atụmatụ ha ịhapụ otu ECOWAS n’ọnwa Jenụwarị.

    Oge ha weghaara ọchịchị n’ike na mba ha dị iche iche, otu jikọtara mba ndị mejupụtara ọdịda anyanwụ Afrịka bụ ECOWAS nyere ha ntaramaahụhụ iji mee ka ha nyeghachi ọchịchị n’aka ndị nkịtị ngwangwa.

    Mana ugbua, mba atọ ahụ ehiwela otu mgbakọaka a kpọrọ Alliance of Sahel States ma jụ ịnabata oku ECOWAS na-akpọ.

    Oge ọ na-ekwu okwu n’ụlọmgbasaozi tivii n’abalị Sọnde, onyeagha na-achị mba Mali bụ Col Assimi Goïta kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ njirimara passport ọhụrụ oge na-adịghị anya iji chịkọta akwụkwọ njem ụmụafọ ha na mpaghara ahụ.

    Col Assimi Goïta, onye na-arụgodu ọrụ ka onyeisioche otu Alliance of Sahel States kwuru nke a n’ime otu mkpụrụ ụbọchị tupu mba ndị ahụ echeta otu afọ ha nwere mkpebi ihiwe otu nke ha.

    O kwukwara na ha na-eme atụmatụ ihiwe ụlọọrụ ga-akwalite mgbasaozi n’etiti mba atọ mejupụtara otu ahụ.

  8. Ndi uweojii egbuola mmadụ atọ wakporo ụlọọrụ ha n’Imo Steeti

    Ndị uweojii Imo steeti egbuola ndị omekome atọ so na ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii Njaba Division dị na mpaghara Umuaka nke steeti ahụ.

    Akụkọ kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ ahụ ka ha na ndị omekome ahụ kwatara mgbọ ebe ndị ọzọ bu ọya mgbọ egbe gbaa ọsọ.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti bụ Henry Okoye wepụtara kwuru na mwakpo ahụ mere ụbọchị Sọnde 15 Septemba 2024.

    Ozi ahụ mere ka a mata na ndị uweojii nwetara ngwa agha dị iche iche n’aka ndị omekome ahụ a na-atụ aka na ha bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) na nwanne ya Eastern Security Network (ESN).

    Ihe e nwetara n’aka ndị omekome ahụ gunyere egbe dị iche iche dịka AK-47, ụgọala Toyota Lexus 470, Mercedes GLK na ụgbọala Toyota Venza.

    Ka ọ dị ugbua, kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma enyela iwu ka e mee nyocha ma chọpụta ndị omekome ahụ ma wuchie ha ndị omekome ahụ gbara ọsọ.

  9. NNPCL ewepụtala ego ole e nwereike ire mmanụ ụgbọala si n’ụlọọrụ Dangote

    Ụlọọrụ NNPCL ekwuola ego ole e nwereike ire mmanụ ụgbọala ha zụtara n’aka ụlọọrụ Dangote.

    N’ozi onyeisi mgbasaozi NNPCL bụ Olufemi Soneye wepụtara n’akara soshal midia X nke ụlọọrụ ahụ, kwuru na dịka iwu Petroleum Industry Act (PIA) siri kwuo, ọ bụghị gọọmenti etiti na-ekwu ego ole a ga-ere mmanụ ụgbọala.

    Ozi ahụ kwuru na e nwereike ire otu lita mmanụ ụgbọala N950 na Legọs steeti, Sokoto N992, Oyo N960, Kano N999, Kaduna N999, Abuja N992, Rivers 980 ebe e nwereike ire ya N1,019 na Borno steeti.

    NNPCL kwuru na ha kwụrụ ụlọọrụ Dangote dọla oge ha zụrụ mmanụ ụgbọala ya ma mee ka a mara na ha ga-amalite iji naịra zụrụ mmanụ ụgbọala site n’ọnwa Ọktoba 2024.

  10. Gọvanọ Mbah enyela ndị ọrụ nchekwa abalị abụọ ịchọta ndị gburu onyeisi ahịa Ogbete

    Gọvanọ na-achị Enugwu steeti enyela ndị uweoji abalị abụọ ka a nwuchie ndị gbagburu Stephen Aniagu bụ onyeisi oche ahịa Ogbette.

    A gbagburu Stephen Aniagu bụ onyeisi oche otu jịkọrọ ndị na-azụ ahịa n’ahịa Ogbettte dị n’Enugwu steeti n’ụbọchị Satode, abali nke iri na anọ n’ọnwa Seputemba, 2024.

    N’okwu Gọvanọ Enugwu, Peter Mbah “Obi tiwara m maka akụkọ ndị ajọ mmadụ si gbagbuo onyeisi ndị OMMATA, Stephen Aniagu.

    Ihe a bụ nnukwu ihe funariri ndị Enugwu niile, nakwa ndị OMMATA”.

    “Ugbua enyela m ndị uweoji iwu ka ha jiri abalị abụọ wuchie ndị gbagburu Aniagu.

    Ndi omokome niile nọ n’Enugwu kwesiri imara na gọọmenti anyị were akụrụngwa nakwa ikike ijide ha ma kpee ha ikpe”.

    “Ndị kpara mkpamkpa a kwesiri imara na ha egbuola ụra; Gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa ama nzuike ruo na anyị awuchie ndị niile aka ha dị n’igbu nwa amadi a.”

    Mba gara n’ihe tie ezinaụlọ Stephen Aniagu aka n’obi. Mana, ndị uweoji n’Enugwu steeti weputara akwụkwọ ozi nke Danniel Ndukwe binyere aka bụ ebe ha nọ kọwapụta ebe a nọ gbagbue Stephen Aniagu nakwa ihe ndị ọzọ.

    “A gbagburu Stephen Aniagu bụ onyeisi oche Ogbete Main Market Traders Association (OMATA), Enugwu n’ebe Topland, ụzọ Amechi n’ihe dịka elekere 8:20 nke abalị”.

    “Anyị chọpụtara na ndị omokome ahụ bu ụgbọala Toyota Corolla were na-eso Stephen Aniagu n’ike-n’ike tupuu ha anochie ya ụzọ, were egbe gbagbuo ya ma buru ụgbọala ya gbaraga”.

    “Ndị uweoji gara ebe a gbara Stephen Aniagu egbe buru ya gaa ụlọọgwụ ebe dọkịnta nọ kwuo na ọ nwụọla”.

    Mana Kọmịshịọna ndị uweoji n’Enugwu bụ Kanayo Uzuegbu enyela iwu ka a chọpụta ihe mere ma wuchie ndị kpara mkpamkpa ahụ.

  11. SERAP akpụpụla gọọmenti Tinubu n’ụlọikpe n’ihi ọnụahịa mmanụ ụgbọala

    Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project bụ SERAP n’ịchafụ Bekee agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe megide Onyeisiala Bola Tinubu ma na-ebo ebubo na gọọmenti ya kụrụ afọ n’ala ibudata ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    N’ozi ha wepụtara n’ụbọchị Sọnde 15 Septemba 2024, nnukwu onye ntụziaka SERAP bụ Kolawole Oluwadare kwuru na akwụkwọ ahụ ha gbara megide Tinubu bụ n’ihi ịda mba gọọmenti ya ime nnyocha gbasara ebubo nrụrụakaego a na-ebo ụlọorụ NNPCL.

    Ndị ọzọ a kpọrọ aha ga-azara ọnụ ha n’akwụkwọ ahụ bụ Mịnịsta ikpe ziri ezi bụ Lateef Fagbemi na ụlọorụ NNPCL.

    Dịka SERAP siri kwuo, ọ bụ n’ụbọchị Fraịde 13 Septemba 2024 ka ha wepụrụ akwụkwọ ahụ n’ụlọikpe iji chọọ ka e budata ọnụahịa mmanụ ụgbọala ka ọ bụrụ narị naịra isii (600) maka otu lita.

    Ha chọkwara ka ụlọikpe nye iwu nke ga-amanye Onyeisiala Tinubu inye ntụziaka ka Mịnịsta ikpe ziri ezi na ngalaba ụlọọrụ ndị na-ebu agha megide nrụrụakaego mee nnyocha gbasara ebubo nrụrụakaego na oke mmefuego a na-ebo NNPCL.

  12. Nwoke wakporo onyeisiala mba Comoros anwụọla n’ụlọnga

    Ndị ọchịchị ekwuola na nwoke ahụ a nwụchiri maka iji mma wakpoo onyeisiala Komoros n’ụbọchị Fraịde anwụọla n’ụlọnga.

    Onye Ọkaiwu na-ekwuchitere mba Komoros bụ Ali Mohamed Djounaid kwuru na oge a nwụchiri onye mwakpo ahụ, e tinyere ya n’ụlọnga dị iche iji mee ka isi jụọ ya oyi.

    Ọ sịrị na a hụrụ ozu nwaamadị ahụ ebe ọ tọgbọrọ n’ala n’ime ụlọnga n’ụbọchị Satọde 15 Septemba 2024.

    Djounaid gwara ndị ntaakụkọ sị “dọkịta kwupụtara ya dịka onye nwụrụ anwụ. A malitela ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọnwu ya.”

    Mịnịsta na-ahụ maka ikikere ọkụ na Komoros bụ Aboubacar Saïd Anli gwara ụlọmgbasaozi AFP na Onyeisiala Azali Assoumani gbara afọ iri isii na ise (65) “dị mma. O nweghị nsogbu ahụike ọbụla, ọ nọzighị n’ọnọdụ ọjọọ. A dụọla ya ebe ahụ a sụrụ ya mma.”

    A sụrụ Assoumani mma oge ọ gara mmemme akwamoozu otu onye ndu okpukperechi n’isi obodo Komoros bụ Moroni.

    Ndị jiri aha ha hụ ka o si mee gwara ụlọmgbasaozi AFP na ha hụrụ nwaokorobịa ahụ yi uwe mwụda n’ime ụlọ oge ndị mmadụ gara ịkwanyere onye nwụrụ anwụ ugwu ikpeazụ ya.

    Ha kwuru na o merụrụ onyeisiala ahụ n’aka oke ọ sụrụ ya mma tupu otu n’ime ndị na-eru uju akwụsị ya.

  13. Idemmiri achụpụla ọtụtụ mmadụ n’ụlọ na Europe

    Amalitela ọrụ gbatagbata na mpaghara ọwụwa anyanwụ na etiti Yurọp dịka e nwechara nnukwu mmiri ozuzo nke buliri ogogo osimiri ma bibie ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ.

    Ifufe mmiri a kpọrọ Storm Boris kpara ike dị egwu na Romanịa dịka oke idemmiri gburu mmadụ anọ na mpaghara Gelati.

    Ụlọorụ na-ahụ maka ikikere ọkụ na Czech Rịpọblik bụ CEZ kwuru na oke idemmiri emeela ka ọtụtụ mmadụ kwapụ n’ụlọ ha ebe mmadụ puku iri ise na otu (51,000) nọ n’ọchịchịrị.

    Mba Poland akpọpụkwala ụfọdụ mmadụ na mpaghara Glucholazy, nke bụ obodo dị nso n’okeala Czech dịka egberemmiri nke otu osimiri tiwara.

    Onyeisiala mba Romanịa bụ Klaus Iohannis kwuru n’ụbọchị Satọde 14 Septemba 2024 sị “anyị na-agabiga nsogbu mgbanwe ihu eluigwe ọzọ, nke na-adịwanye njọ na mba Yurọp ma nweekwa mmetụta ọjọọ.”

    A na-ahụtazi oke mmiri ozuzo na Yurọp dịka ọ dị na mbaụwa niile n’ihi mgbanwe ọnọdụ ihu eluigwe.

  14. Ụgbọala NNPCL karịrị 100 awụchiela na 'Dangote refinery' maka iburu mmanụ ụgbọala

    Ihe ruru ụgbọala tanka 300 nke ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL) awụchiela n’ụlọọrụ Dangote a na-esipụta mmanụ ụgbọala dịka a ga-amalite ikesa mmanụ ụgbọala n’ụbọchị 15 Sepụtemba 2024.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Olufemi Soneye wepụtara nke a n’ọbaozi X ya n’ụbọchị Satọde.

    O kwuru na ụlọọrụ NNPC ezigala ụgbọala tanka karịrị 100 dịka ọtụtụ ndị ọzo ka nọ n’ụzọ na-abịa.

    N’otu aka ahụ ụlọọrụ NNPC wepụtekwara ozi a n’akara X ha ma kwuo na ọ bụ na njikere mmalite ikesa mmanụ ụgbọala site n’ụlọọrụ Dangote gawa n’ọdọmmanụ ha dị iche iche na Naịjirịa.

    Cheta na gọọmentị etiti nyere NNPC iwu ka ha malite iresi ụlọọrụ Dangote mmanụ agbidi n’akwụkwọ ego naịra ka ha nwee ike na-esipụta mmanụ dị iche iche bụ nke ha ga-erekwa na Naịjirịa.

    Nkwekọrịta ọzọ ha nwere bụ na Dangote ga na-eresi naanị ụlọorụ NNPC mmanụ ụgbọala ha sipụtara.

  15. Ndịagha Naịjirịa ekposaala ogige ndị ekperima ma zọpụta ụmụakwụkwọ a tọọrọ

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ekposaala ogige ndị na-eyi ndụ egwu dị n’ụfọdụ steeti na mpaghara Ugwu ma zọpụta ụmụakwụkwọ ndị ha tọọrọ.

    N’ozi ha wepụtara n’ụbọchị Satọde 14 Sepụtemba 2024, ha kwuru na ha kpachikwara ọtụtụ ngwa agha ndị na-eyi ndụ egwu ji akpa ike.

    Ha kwuru n’ụbọchị 13 Sepụtemba, ndịagha wakporo ogige ndị a dị n’obodo Chigbolu dị n’okpuruọchịchị Kachia nke Kaduna Steeti ma zọpụta ụmụakwụkwọ 13 gụnyere ụmụnwoke isii na ụmụnwaanyị asaa.

    Ha kpachiri ọtụtụ egbe AK47 na mgbọ ha tinyere ego dị N192,220.00, ọtụtụ ekwentị, igwe na-enye ọkụ sola.

    N’otu aka ahụ ndịagha nwuchikwara mmadụ abụọ na-enye ndị oyi ndụ egwu ngwaagha bụ Usman Waikili na Salisu Idris n’obodo Kagarko ma napụta ha ego ruru otu nde naịra na ụma, akara ekwentị atọ, ekwentị abụọ, akwụkwọ njirimaara atọ na kaadị ATM asatọ, igwe POS abụọ nakwa igwe ịntanetị abụọ.

    Na Steeti Niger, ndịagha kwuru na ha wakporo ogige ndị a, gbuo mmadụ atọ ma nwụchie mmadụ atọ, tinyere ọtụtụ ngwagha ha kpachiri.

    Ndịagha gara n’ihu kwee nkwa na ha ga na-agba mbọ ibuso ndị a na-eyi ndụ egwu agha n’ụzọ pụrụiche.

  16. Etu e si kwaa ozu Rebecca Cheptegei, nwafọ Uganda ọyi ya nwoke gburu

    Ọtụtụ ndị na-eruju agbakọọla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Uganda bụ maka akwamozu Rebecca Cheptegei bụ nwada na-agba ọsọ Olimpiik, nke onye bụbu ọyị ya nwoke mụnyere ọkụ nke mechara gbuo ya.

    Dickson Ndiema wakporo nwada a ma mere mmanụ ụgbọala mụnye ya ọkụ n’ihu ụlọ ya dị na north-west Kenya, nke dị nso n’ebe ọ na-anata ọzụzụ.

    Ogbugbu nwada a dị afọ 38 tinyere ezinaụlọ n’ọnọdụ dị egwu nakwa mwute, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ na mbaụwa.

    Nke a gosiri ọtụtụ nwakpo a na-eme megide ụmụnwaanyị na mba Kenya nke metụtarala ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eme ihe egwuregwu.

    Ndị bịara n’ọgba ụlọakwụkwọ ebe a na-akwamozu Cheptegei gụnyere ndị egwuregwu ibe ya yicha uwe ojii e dere “sị mba na nwakpo megide ụmụnwaanyị”.

    Na mbido, e gosiri igbe ozu ya e ji ọkọlọtọ mba Uganda fụchie, ebe ndị ndu ọdịnala fere ofufe nro akwamozu ya.

    Ha nyere oge ka onye ọbụla dere jụụ ma kwụrụ ọtọ iji kwanyere ya ukwu ikpeazụ.

    Onye kanselọ kwuru na Cheptegei biri “ndụ dị mfe ma nwee nlekwasị anya n’ihe ọ na-eme” na o nyere ndị egwuregwu ibe ya ntuziaka. “Ọ bụ onye ọtụtụ ụmụaka na-elekwasị anya n’ihe egwuregwu,” ka otu onye kwuru.

    Ha tụkwara arọ ka a gụọ otu okporoụzọ nakwa ama egwuregwu aha ya.

    A ga-eli ya na mgbede Satọde a n’ụlọ nna dị nso n’ebe e mere emume akwamozu ya.

    Cheptegei nwụrụ n’ụlọọgwụ n’ime abalị anọ a mụnyechara ya ọkụ ahụ. Ndị dọkịta kwuru na ihe karịrị pasentị 80% ahụ ya rere ọkụ nke mere ka ọtụtụ akụrụngwa na-arụ ọrụ n’ahụ nwụọ.

    Ndiema, bụ onye ọkụ ahụ gbatakwara maka na ụfọdụ mmanụ ụgbọala ahụ metụrụ ya n’ahụ nwụrụ n’ụbọchị Mọnde.

    Ọ wakporo Cheptegei mụrụ ụmụ abụọ mgbe o si n’ụlọụka ya bụ ‘God’s Dwelling Ministry’ lọta

  17. Ndịagha egbuola onyendu ndị ojiegbe na Zamfara steeti

    Ndịagha Naịjirịa nọ n’ọrụ a kpọrọ ‘Hadarin Daji’ egbuola onyendu ndị ojiegbe a na-achọ achọ kemgbe bụ Halilu Sububu.

    E gburu onye ekperima ahụ oge ndịagha kweere ya ọnya n’ime obodo Kwaren Kirya dị n’Okpuru ọchịchị Maru nke Zamfara steeti.

    Halilu Sububu bụ nwaafọ Nijie Rịpọblik mana o jiri okeọhịa dị na Zamfara steeti mere ebe obibi dịka ọ na-esi ebe ahụ gbagaa Nijie Rịpọblik oge ọbụla o mechara arụ na Naịjirịa.

    Akụkọ kwuru na Sububu wuru ogige na mpaghara Bagega ma na-elekọta ogige ndị a na-egwupụta ọlaedo na mpaghara ahụ.

    N’ime afọ a ka ụlọorụ nchekwa Naịjirịa kwupụtara ya dịka onye a na-achọ achọ mana oge ndịagha Hadarin Daji buru agha n’ụbọchị Tọzde 12 Septemba 2024, ka ha gbagburu ya na ndị otu ya iri ise (50).

    Oge ọ na-ekele ndịagha buru agha ahụ, Onyeisi ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Gen christopher Musa kwuru na ndịagha Naịjirịa nwere ikikere ịgbagbu ndị ekperima niile na-akpa arụ na mpaghara ugwu Naịjirịa.

  18. Onyeisiala Comoros enwetala mmerụahụ oge a sụchara ya mma

    Onyeisiala Komoros bụ Azali Assoumani enwetala mmerụahụ oge e jichara mma wakpoo ya.

    Oge ọ na-ekwupụta nke a, ọnụ na-ekwuchitere gọọmenti Komoros bụ Fatima Ahamada sịrị “ekele dịrị Chukwu na ndụ ya anọghị n’ọnọdụ ọjọọ.”

    A sụrụ Assoumani mma oge ọ gara mmemme akwamoozu otu onye ndu okpukperechi n’isi mba Komoros bụ Moroni.

    Fatima Ahamada gwara ụlọmgbasaozi Reuters na Assoumani nwetara obere mmerụahụ ma laghachikwa n’ụlọ ya kemgbe.

    Ọ gbakwunyere na anwụchiela onye ahụ sụrụ onyeisiala mma dịka amatachabeghị ihe mere o jiri mee nke ahụ.

    E kwupụtabeghị aha nwaamadị ahụ sụrụ onyeisiala Komoros mma mana ọtụtụ akụkọ na-ekwu na ọ bụ onyeagha.

    Ndị jiri aha ha hụ ka o si mee gwara ụlọmgbasaozi AFP na ha hụrụ nwaokorobịa ahụ yi uwe mwụda n’ime ụlọ oge ndị mmadụ gara ịkwanyere onye nwụrụ anwụ ugwu ikpeazụ ya.

    Ha kwuru na o merụrụ onyeisiala ahụ n’aka oke ọ sụrụ ya mma tupu otu n’ime ndị na-eru uju akwụsị ya.

  19. Oke idemmiri akpaala mkpamkpa na Myanmar, gbuo ihe karịrị mmadụ 33

    E nweela nnukwu idemmiri na Myanmar dịka oke ifufe mmiri Typhoon Yagi kpachara mkpamkpa na mba ahụ.

    Ndị ọchịchị kwuru na ihe karịrị mmadụ narị puku abụọ na iri atọ (230,000) abụrụla ndị gbara ọsọ ndụ ugbua.

    Ndị ji anya ike weghara ọchịchị mba ahụ na-arịọ enyemaaka mba ndị ọzọ iji gboo nsogbu sitere na mmetụta ọnọdụ ọjọọ ahụ.

    Onye ji ọkwa ọchịchị Myanmar bụ Gen Min Aung Hlaing na ndị ọchịchị Burma agaala ebe ndị ahụ e nwere nsogbu oke idemmiri ma hụkwa ka ọrụ nnapụta si aga.

    Ụlọmgbasaozi mba ahụ kwuru na isi obodo Myanmar bụ Naypydaw so na mpaghara ọnọdụ ahụ metụtara.

    Ndịagha mba ahụ kwuru na ya bụ idemmiri egbuola opekatampe mmadụ iri atọ na atọ (33) mana ka osiladị, ụlọmgbasaozi mba ahụ bụ New Light of Myanmar kwuru na ehiwela ogige ndị gbara ọsọ ndụ ga-adị nwa obere oge iji nyere ndị ọnọdụ ahụ metụtara aka.

    Ozi sitere n’aka ụlọmgbasaozi Radio Free Asia na-arụtụ aka na ọnụọgụ ndị nwụrụ site n’ihe ọdachi ahụ dị nnukwu dịka ha kwuru na opekatampe mmadụ otu narị na iri isii (160) nwụrụ site n’oke idemmiri na mbụzeala.

    Ka ọ dị ugbua, oke ifufe mmiri Typhoon Yagi akpọtụọla na Vietnam, Hainan dị na Chaịna nakwa Philippines.

  20. WHO enyela nkwado maka ọgwụ mgbochi ọrịa mpox

    Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) enyela nkwado maka ọgwụ mgbochi ọrịa monkeypox.

    Nkwupụta a na-abịa dịka e bugara ọgwụ mgbochi MVA-BN na mba Congo ebe ọrịa ahụ kachasị metụta ndị mmadụ.

    E nwere ihe ruru mmadụ puku iri abụọ (22,000) butere ọrịa ahụ na mba Congo ebe mmadụ dị narị asaa na iri na isii (716) anwụọla site n’ọrịa ahụ.

    Ozi WHO wepụtara n’akara soshal midia X kwuru na nkwado a ga-enyere aka ibu agha megide nfesa ọrịa mpox n’Afrịka na gbochie ya ịlaghachita ọzọ.