You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Ndị nchekwa DSS awakpoola ụlọọrụ anyị ma gbaa ya okirikiri - SERAP

    Ndị ọrụ nchekwa Nigerian Security Service (DSS) awakpoola ụlọọrụ ndị SERAP na-ahụ maka ikike dịịrị onye nakwa megide mpụ dị n’Abuja.

    N’ozu ụlọọrụ a wepụtara n’akara X, ha kwuru na ndị ọrụ nchekwa a gbara ụlọọrụ ha okirikiri n’ụzọ iwu na-akwadoghi ma kwuo na ha chọrọ ịhụ onyeisi ụlọọrụ ha.

    Dịka ọ dị ugbua o dobeghi anya ihe mere ndị ọrụ nchekwa DSS jiri wakpoo ụlọorụ SERAP.

    Nke a na-abịa n’ime awa ole ma ole ndị DSS nwuchiri onyeisi ndị Nigeria Labour Congress (NLC) bụ Joe Ajaero n’ọdọụgbọelu dị n’Abuja.

  2. Ọ bụghị eziokwu na ndịagha 200 gbara arụkwaghị n’ọrụ

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na akụkọ ahụ na-efegharị nke sị na ọtụtụ ndịagha gbara arụkwaghịm maka ebubo nrụrụaka bụ asị ọcha.

    Nke a na-abịa dịka kepu kepu kwuru na ndịagha ruru mmadụ 200 tinyere akwụkwọ ịgba arụkwaghịm n’ọrụ ma sị na ha chọrọ isonye ndịagha mba ọzọ.

    N’ozi ndịagha wepụtara, ha kwuru na “akụkọ a abụghị naanị asị kama na ọ bụkwa ụzọ ndị osochiegbu si chọro ịkụnye mkpụrụ ọjọọ ma metọọ ukwu ndịagha Naịjirịa.”

    Ozi a kwuru na “ịrụ ọrụ ndịagha bụ ihe onye nwere mmasị na ya, na onye ọbụla chọrọ ịpụ nwere ohere ime nke a site n’usoro iwu kwadoro”.

    Akụkọ kwuru na ndịagha a enwebeghi onye ruru n’ogogo ịla ezumike nka maọbụ tozuo n’afọ e ji akwụsị ọrụ mana ndịagha kwuru na nkwụsị n’ọrụ nwereike ịdapụta n’ihi ‘ịgba arụkwaghịm, nsogbu ahụike maọbụ ịga chụọ akaraka na ngalaba ọrụ ọzọ.”

    E nwere ọtụtụ ndị ọzo na-edebata aha ka ha sonye n’ọrụ ndịagha, “bụ nke gosiri na akụkọ a bụ akụkọ ụgha”, ka ndịagha kwuru.

  3. DSS anwụchiela onyeisi anyị bụ Joe Ajaero - NLC

    Ndị ọrụ Department of State Services (DSS) awichiela onyeisi otu Nigeria Labour Congress bụ Joe Ajaero.

    Akụkọ kwuru na a wuchiri Ajaero n’ọdụ ụgbọelu dị n’Abuja ka ọ na-aga ọgbakọ otu Trade Union Congress na-amalite na London taa, 9 Septemba, 2024.

    Onyeisi mgbasaozi NLC bụ Benson Upah kwuru na ụlọọrụ National Security Adviser bụ ebe e ji Joe Ajaero ugbua.

    Nke a na-abịa ka Joe Ajaero gara zara ọnụ ya n’isi ụlọọrụ ndị uweojii n’izu gara aga n’ebubo e boro ya maka ịkwado ndị na-eyi ọha egwu.

  4. Anyị amalitela inyocha mmiri nsọ na ncha ịrịbaama ụkọchukwu Jeremiah na-eresi ọha – NAFDAC

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) adọola aka na ntị maka ihe ụkọchukwu Jeremiah Fufeyin nke ụlọụka Christ Mercy Deliverance Ministries.

    N’ozi ụlọọrụ a wepụtara na Sọnde, onyeisi ha bụ Ọkammụta Mojisola Adeyeye kwuru na ụlọụka a ji aha ha ụlọọrụ ha (NAFDAC) na-eduhie ọtụtụ ndị mmadụ.

    O kwuru na o nweghi otu mkpụrụ n’ime ihe ndị Ụkọchukwu a na-ere nke nwere akara njirimaara si n’aka ụlọọrụ ha, nke bụ na o debanyeghi aha ihe ndị a.

    “Ụlọọrụ NAFDAC natara mkpesa banyere ọtụtụ ihe ndị Ụkọchukwu Jeremiah nke ụlọụka Christ Mercy Deliverance Ministries na-eresi ọhaneze nke gụnyere mmiri nsọ ịrịbaama na ncha ịrịbaama. Ụkọchukwu a kwuru na o ji ihe ndị a agwọ ụmụnwaanyị aga na soshal midia, na nwaanyị ahụ ga-amụta ejima ma ọ bụrụ ha saa ncha ya. Ọ gara n’ihu gwaa ndị na-eso ya na ncha ndị a nwere akara njirimaara si n’aka NAFDAC nke mere ọha jiri aga n’ọbaozi websaịt anyị ịchọpụta ma ọ bụ eziokwu.”

    O kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi ahụ, na malitere ime nyocha ma gaa n’ụlọụka ahụ iji chọpụta ma ọ bụ eziokwu na ha na-arụpụta mmiri nsọ na ncha nsọ mana ụlọụka ahụ gọrọ na aka ha adịghị na ngwa ndị a.

    Adeyeye kwuru na ha kpọrọ ụlọụka a ka ha bịa zara ọnụ n’ụlọọrụ ha dị n’Asaba, Delta Steeti mana rute ugbua na ụlọụka abịabeghi.

    O kwukwara na ha ga-aga n’ihu n’ime nyocha banyere nrụpụta mmiri nsọ na ncha nsọ si n’aka ụlọụka ma kwee nkwa na ụlọọrụ NAFDAC ga na-echekwa ndụ ndị Naịjirịa.

  5. Igbo ndị mụrụ nze mụọ ọzọ, unu abọọla chi?

    Anyị ji aka na i hiri na teta n'ụra nke ọma?

    Obi sara mbara ka anyị anabata gị n'ọgbakọ anyị bụ BBC News Igbo ma na-asị ka izuụka gaara gị nke ọma.

    Biko nọsie ike n'ọbaozi anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  6. Ọkụ agbaguola mmadụ 48 na Niger Steeti

    Ọkụ agbagbuola mmadụ 48 ‘obodo Dendo dị n’opkuruọchịchị Agaie dị na Niger steeti.

    Akụkọ kwuru na njiji ahụ jiri oge nnukwu ụgbọala tanka bu mmanụ ụgọala kụkpọrọ nnukwu ụgbọala bu ndị mmadụ na anụmanụ wuru ọkụ n’ụzọ si Lapai gawa Agaie.

    Ndị hụrụ ka ihe ahụ mere kwuru na ụgọala tanka ahụ nwuru ọkụ ma gbagbuo mmadụ 48.

    Ndị ọrụ gbatagbata bụ Niger State Emergency Management Agency (NSEMA) zigara ndị ọrụ ha ngwangwa ha nwetara ozi njiji ahụ iji zọpụta ndị ọkụ ahụ metụtara.

    Onyeisi ụlọọrụ NSEMA bụ Abdullahi Baba-Arah kwuru na ndị meruru ahụ na-enweta nleta ebe e bugara ozu ndị nwụrụ n’ọba ozu.

    Gọvanọ Niger steeti bụ Umaru Bago kasiri ezinaụlọ ndị ọkụ ahụ metụtara ma gwa ndị ọkwọ ụgbọala ka rube isi nye iwu okporoụzọ iji gbochie mberede nwereike ịta isi ndị mmadụ.

  7. APC ewezugala onwe ha na ntụliaka okpuruọchịchị n’Anambra Steeti

    Otu pati All Progressives Congress (APC) ewezugala onwe ha na ntụliaka okpuruọchịchị a ga-eme na Anambra Steeti ụbọchi Satọde 28 Septemba, 2024.

    Ọnụ na-ekwuru APC na Anambra steeti bụ Valentine Iyke Oliobi gwara BBC Igbo na ha chọpụtara na usoro ụlọọrụ Anambra State Independent Electoral Commission (ANSIEC) si akwado ntụliaka ahụ bụ nke megidere iwu ntụliaka Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu kwuo na onyeisioche pati APC na steeti ahụ bụ Basil Ejidike enyela iwu ka pati APC wezuga onwe ha n’ihi na Gọvanọ Steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo na ụlọọrụ ANSIEC achọghị ime ntụliaka ahụ n’ụzọ kwụrụ ọtọ.

    Basil Ejidike kwuru na ụlọọrụ ANSIEC enyeghị ha ohere iji chụọ nta vootu, họpụta ndị ga-azọọrọ ha ọkwa nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ọ gwara ndị nkwado ha ka ha dị njikere n’ihi na otu APC ga-amalite ime nleta n’okpuruọchịchị iri abụọ na otu nke steeti ahụ dịka ha na-akwado ntụliaka Gọvanọ nke a ga-eme na steeti ahụ n’afọ 2025.

  8. SERAP enyela Onyeisiala Tinubu ụbọchị ka o butuo onụego mmanụ ụgbọala

    Otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) agwala Onyeisiala Bola Tinubu ka o were ikike ya dịka onyeisiala nye ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL) iwu ka ha butuo ọnụego mmanụ ụgbọala ha bugoro elu na ọ bụ ihe megidere iwu.

    N’ozi ha wepụtara n’ụbọchi Sọnde, osote onyeisi ụlọọrụ a bụ Kolawole Oluwadare gwara Tinubu ka o nye ọkaiwu ukwu Naịjirịa na ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ iwu ka ha nyochaa ụlọorụ NNPCL n’etu ha siri mefuo ọtụtụ ego dị $300m nakwa ụgwọ $8bn ha ji ndị na-ekesa mmanụ ụgbọala.

    Nke a na-abịa dịka ụlọorụ NNPC nọọrọ n'izuụka gara aga kwuo na ọnụego mmanụ ụgbọala ga-abụzi ihe karịrị narị naịra asatọ (N800) kwa otu lita.

  9. Ọkụ ọzọ agbaala n'ụlọakwụkwo dị na mba Kenya

    Ihe ruru ụmụakwụkwọ atọ emerụọla ahụ site n’ọgụ gbara n’ụlọ obibi ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị aha bụ Isiolo Girls High School dị na mpaghara Central Kenya.

    Ndị uweojii kwuru na ọkụ ahụ mebiri ụlọobibi ụmụakwụkwọ ahụ. Ka ọ dị ugbua a mabeghi ihe kpatara ọkụ a.

    Nke a na-abịa n’ime ụbọchị atọ ka ụmụakwụkwọ dị 21 nwụrụ site n’ọkụ gbara n’ụlọobibi ụmụakwụkwo ndị nwoke dị na mpaghara Nyeri, Nairobi.

    Ọkụ ọgbụgba n’ụlọobibi ụmụakwụkwọ abụrụla ihe na-emekaarị dịka ndị ọrụ gọọmentị na-ache na ọ bụ mmadụ na-amụnye ha.

    E nweela atụmatụ ka a kwụsị ụmụakwụkwọ ibi n’ụlọakwụkwọ iji belata ọkụ ọgbụgba ndị a.

  10. Anyị anabatala arụkwaghịm n’ọrụ Ngelale gbara ma sị ka ọ gaa nke ọma - Ụlọorụ Onyeisiala

    Ụlọọrụ Onyeisiala Naịjirịa nọọrọ n’ụbọchị Satọde kwuo na ha natara ozi si n’aka Ajuri Ngelale bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Bola Tinubu banyere arụkwaghịm n’ọrụ ọ gbara n’ihi ahụike.

    Ozi bụ nke e wepụtara n’akara soshal midia X nke ụlọọrụ a kwuru na ha nabatara ịgba arụkwaghịm n’ọrụ Ngelale gbara.

    “Onyeisiala anabatala arụkwaghịm n’ọrụ ọ gbara ma nwee ọmaiko n’ọnọdụ a mere ka Ngelale nwee mkpebi a.”

    Ozi a gara n’ihu kwuo na Onyeisiala hụtara mgbọ ọ na-agba n’ọrụ ya ma kelee ya maka ọrụ ọ rụrụ n’ịkwalite Naịjirịa nakwa mbọ ọ gbara n’okwu mgbanwe ihu eluigwe (climate change).

    Ozi a kwukwara ka onye ọbụla kwanyere Ngelale na ezinaụlọ ya ugwu ruuru ha n’oge a.

    Cheta na Ngelale kwupụtara mkpebi ya ịgbatu n’ọkwa n’ụlọọrụ Onyeisiala dịka o kwuru na ọ bụ maka ezinaụlọ ya.

  11. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị na-anabata gị n'izuụka ọhụrụ ma na-asị ka ụbọchị taa maara gị na mma.

    Biko jisie ike na-anọnyere anyị n'ọgba BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  12. Gọvanọ Nwifuru na obodo abụọ amachiela ire ala obi n'Ebonyi steeti

    Ebonyi steeti bụ Francis Ogbonna Nwifuru na ndị isi obodo Amegu na Ebia Unughu dị na Abakiliki amachiela ire ala obi nnanna ha.

    Nke a bịara dịka ndị mmadụ na-ere ala obi ha aghara aghara n'obodo ndị ahụ na nso nso a nke butere enweghị nchekwa ala.

    Ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Amegu jikotara aka ọnụ were machie ire ala ha ma dọọ ndị na-azụ ala ahụ aka na ntị ha sepụ aka ná ya bụ ihe iji gbaghapụ nsogbu.

    Ndị isi ahụ kọwara na iwu a malitere dịka Gọvanọ Nwifuru kwuputara n'ọnụ ya ka akwụsị ya bụ orure ozugbo ozugbo maka ala obi ndị dị na mpaghara Izhi Nnodo dị na Amegu.

    Gọvanọ Nwifuru bụ onye bịara mmemme iri ji dị Izhi Nnodo n’Amegu nke afọ a nọkwa na ya bụ mmemme tinye iwu a machiri ire ala obi.

    O dobeghi anya ma obodo ndị ọzọ a ga-achọ ịnabata ụdiri iwu a n'akụkụ nke ha.

  13. Anyị amaghị ma ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ọ ga-ada maka na Dangote na-arụpụta ya n’ime Naịjirịa – NNPCL

    Ụlọọrụ gọọmenti etiti na-ahụ maka etu e si ere mmanụ ụgbọala na mmanụ agbịdị bụ Nigeria National Petroleum Company Limited (NNPC Ltd) ekwuola na ha amaghị ma ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ọ ga-ada maka na ụlọọrụ Dangote na-arụpụta ya n’ime Naịjirịa.

    NNPC Ltd kwuru nke a n'ozi onyeisi mgbasa ozi ha bụ Olufemi Soneye wepụtara n’akara X ha.

    Ha gọọrọ onwe ha n’ebubo e bọrọ ha ị bụ naanị ndị ga na-azụ mmanụ ụgbọọla niile a ga-arụpụta n'ụlọọrụ Dangote nwere resigharia ndị na-atụ mgbere.

    Soneye kọwara ebubo na NNPC Ltd na-enye Dangote nsogbu ma na-eme ka azụmahịa siere ha ike abụghị eziokwu.

    O mere ka o doo anya na 'Ọ bụ ọnọdụ azụmahịa mbaụwa na-eweputa usoro e ji ama ego ole a ga-ere mmanụ ụgbọala ma kwuo na ọ bụ ndị na-arụpụta mmanụ ụgbọala na ndị na-atụ mgbere ya nwereikike ire mmanụ ụgbọala ka ha si chọọ'.

    Ozi ahụ mere ka a mata na NNPC Ltd enweghị oge ha chọrọ ka ọ bụrụ naanị ha na-azụrụ mmanụ ụgbọala ụlọọrụ Dangote ga na-arụpụta ma na-eresi ya ndị ga-eregharị ya.

    “NNPC Ltd ama mmebi ụlọọrụ o nwere akatamkpo ego dọla n’ime ya”, ka ozi ahụ kwuru.

  14. Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Naịjirịa bụ Ajuri Ngelale agbaala arụkwaghịm

    Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Naịjirịa bụ Ajuri Ngelale agbaala arụkwaghịm.

    N’ozi o wepụtara n’akara soshal midia Facebook, Ngelale kwuru na o nyere onye isi ndị ọrụ (Chief of Staff) nke onyeisiala bụ Femi Gbajabiamila akwụkwọ ozi arụkwaghịm ya ụbọchị Fraịde, 6 Septemba 2024.

    N’okwu ya ‘E mere nke a iji nwee ohere zuo ike maka ahụike m nakwa ihe na-echere ezinaụlọ m aka mgba’.

    Ajuri Ngelale gara n’ihu kwuo na ya agbara arụkwaghịm n’ọkwa niile o ji na gọọmenti nke gunyere onye nnọchiteanya onyeisiala n’ihe gbasara mgbanwe ihu igwe (Climate Change) nakwa onyeisioche kọmiti na-ahụ maka mmezi gburugburu na ebe obibi (Environmental Improvement).

    O kwuru na ya na ezinaụlọ nwere nrụrịtaụka banyere ọnọdụ ahụike ha na-enwe n’ụlọ ha.

    Ozi arụkwaghịm Ngelale na-abịa dịka onye bụbu onyeisi National Intelligence Agency (NIA) bụ Ahmad Rufai gbara arụkwaghịm n’izuụka abụọ gara aga.

  15. Mba Algeria na-eme ntụliaka onyeisiala taa

    Ndị mba Aljeria na-eme ntụliaka onyeisiala mba ahụ taa bụ 7 Septemba, 2024.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Abdelmadjid Tebboune na-azọ ọkwa onyeisiala nke ugburo abụọ ya na ntụliaka a. Ọ bụ onye ọtụtụ ndị mba Aljeria hụrụ n’anya ma bụrụ onye nwere olileanya ituru ugo na ntụliaka ahụ.

    Ndị ha na Abdelmadjid Tebboune na-azọ ọkwa ahụ gunyere Abdelaali Hassani na Youcef Aouchiche nke pati Socialist.

    Ihe ruru mmadụ nde iri abụọ na anọ ga-ebinye aka na ntụliaka nke taa.

    Ndị nkọwa kwuru na achụmnta vootu ndị na-azọ ọkwa onyeisiala mba Aljeria gbadoro ụkwụ n’ihe gbasara ndị ntorobia bụ ndị ruru ụkara mba ahụ. Ha kwere ha nkwa ime ka e nwee ezi obibi ndụ nakwa ihe ndị ọzọ e ji e nyere ndụ aka.

  16. Mba Kenya amalitela iru uju abalị atọ dịka ọkụ gbagburu ụmụakwụkwọ 17

    Mba Kenya amalitela iru uju abalị atọ dịka ụmụakwụkwọ 17 nwụrụ n'ime ọkụ gbara ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Academy dị na mpaghara Nyeri county n'abalị Tọzde 5, Septemba, 2024.

    Osote onyeisiala mba Kenya bụ Rigathi Gachagua kwuru na ndị ọrụ gbata gbata na-achọ mmadụ 70 achọ, ma kpọ oku ka nne na nna bịara kpọrọ ụmụaka ha mee ka ndị ọrụ mara.

    Ihe anyị chọpụtara n’ọkụ ahụ gbarabguru ụmụakwụkwọ 17 na Kenya

    Onyeisiala William Ruto enyela iwu ka e bido nyocha ihe kpatara ọkụ ahụ.

    Ọkụ ahụ gbariri ụmụakwụkwọ ahụ nke mere na a apụghị ịmata ha.

    Ndị ọrụ gbatagbata ndị ọzọ ruru puku abụọ (2,000) gbara mbọ ịnapụta ụmụakwụkwọ ndị zoro n’okpuru akwa ha mgbe ọkụ ahụ malitere.

    Ndị uweoji kwuru na e ji nyocha DNA iji chọpụta ozu ụmụakwụkwọ nwụrụ n’ọkụ ahụ.

    Ezinaụlọ ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na e nweghị onye na-agwa ha ihe na-eme ma kọwa nke a dịka ihe dị mmwute.

    Gọọmenti Kenya kwere nkwa na ha ga-akwado ezinaụlọ ụmụaka ọkụ ahụ metụtara.

    Ụmụakwụkwọ 150 nọ n’ogige ụmụnwoke ụlọakwụkwọ ahụ oge ọkụ ahụ malitere.

    Ọtụtụ ezịnaụlọ ụmụakwụkwọ ahụ na-aga n'ihu ịchọ ụmụaka ha.

    Nke a abụghị oge mbụ ọkụ na-agba n’ụlọakwụkwọ na mba Kenya. N’ime afọ iri atọ (30 years), e nweela ihe mberede ọkụ n’ụlọakwụkwọ na mba ahụ.

    Nyocha BBC chọpụtara na ụlọakwụkwọ mba Kenya enweghị akụrụngwa e ji agbaṅụ ọkụ n’ogige ha.

  17. NBA akatọọla onye ọkaiwu Lucky Chinonso Emeh a gbagburu n’Abia Steeti

    Otu jịkọrọ ndị ọkaịwụ bụ Naịjirịa Bar Association (NBA) akatọọlọ ka e sị gbụọ onye otu ha bụ Lucky Chinonso Emeh n’Abia steeti.

    Oge ndị isi NBA n’Abia steetị nke onyeisi ha bụ Charles Nsobundu Onuchukwu gara n’ụọ onye otu ha e gburuegbu, ebe otu onye n’ezinaụlọ ya kọọrọ ndị NBA ihe maara maka ọnwụ nwanne ha.

    “N’ụbọchị Monde, Septemba 2, 2024 ka otu onye Chinoso mara kpọrọ ya n’ekwenti gwa ya bịa ebe dị agha n’ihe dịka elekere nke asatọ nke abalị mana okweteghị gaa ebe ahụ”.

    “Nwantịtị oge otu ụbọchị ahụ ka Lucky Chinonso Emeh gara iri nrị na-ebe ana ere nrị dị nso na-ebe obi, otu onye ahụ kpọkwara n’ekwenti, ọ gwa ya bịa ebe ọnọ eri nrị”.

    “Ọ bụ onye ahụ kpọrọ ya n’ekwenti na ndị otu ya bịara ebe ọ na eri nrị gbagbuo ya, gbaa ya egbe n’isi ugboro abụọ, napụ ya ekwenti ya ma gbaraga”.

    NBA katọrọ ihe mere ma kwuo na-etu e sị egbu ndị ọkaịwụ agharaaghara bụ ihe ịgba anya mmịrị ma kpokuo gọọmentị ka e jide ndị gbara mkpamkpa ahụ.

    “NBA ga-agba mbọ mara ihe mere ma mee ka e jide ndị kpara mkpamkpa ahụ.

  18. Naanị ndị ọrụ nwere akara NIN ga-azụ osikapa gọọmenti bere ego

    Gọọmenti etiti Naịjirịa ekwuola na ọ bụ naanị ndị ọrụ nwere aka National Identification Number (NIN), ma debanye aha na pọtalụ IPPIS ga-enwe ohere ịzụrụ osikapa gọọmenti chọrọ ire n’ọnụ ala.

    Mịnịsta na-ahụ ọrụ ugbo bụ Abubakar Kyari onye kwuru nke a mere ka a a mata na gọọmenti ewepụtala atụmatụ ire otu 50kg akpa osikapa puku iri anọ (40,000) iji belata agụụ na oke ọnụ ahịa ihe oriri. O kwuru na otu onye ga-enwe ohere ịzụrụ naanị otu akpa osikapa.

    Mịnịsta ahụ gara n’ihu kwusieike na ọ bụ naanị ndị ọrụ nwere akara NIN ga-erite uru nke.

    Gọọmenti wepụtara ihe oriri dị 42,000 tons nakwa akpa osikapa dị 30,000 ton iji nyere ụmụ Naịjirịa aka n'ihi agụụ na ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.

    Onye na-ahụ maka ịzụta ahịa na mịnịstri ahụ bụ Haruna Sule kwuru na ihe ga-eme ka mmadụ tozuo irita uru n’atụmatụ a, onye ahụ ga-enwe aka NIN, akara ekwenti ma debanye aha na ya na pọtalụ IPPIS.

  19. Ndị uweojii ejichiela onye a na-ebo ebubo na o gburu nwataakwụkwọ FUNAAB

    Ụlọorụ ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ha anwụchiela nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na atọ (23) aha ya bụ Ayomide Adeleye n’ihi ebubo igbu Christiana Idowu gbara afọ iri abụọ na otu (21) ma lie ozu ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin kwuru na ndịagha Naịjirịa nyefere nwaokoobịa ahụ a na-enyo enyo n’aka ndị uweojii maka ime nnyocha banyere okwu ahụ.

    Ọ sịrị na “ụlọorụ ndịagha 9 Brigade enyefeela Ayomide gbara afọ 23 n’aka ndị uweojii. Ha mere nke a n’abalị 5 Septemba 2024 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere abụọ nke ehihie. Nnyocha na-aga n’ihu.”

    Ndị uweojii nwụchiri ụfọdụ mmadụ maka nwataakwụkwọ a tọọrọ ma gbuo na Legọs steeti.

    Aha nwataakwụkwọ ahụ bụ Christiana Idowu gbara afọ iri abụọ na otu (21) ma bụrụ onye na-agụ akwụkwọ na mahadum Federal University of Agriculture Abeokuta (FUNAAB).

    Onye ahụ a na-enyo enyo ndị uweojii chọpụtara ka a na-ebo ebubo na ọ naara nne na nna Idowu Christiana narị puku naịra atọ na iri ise (350,000) dịka ego ntọhapụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin hundeyin gwara BBC na ndịagha Naịjirịa mere nnwuchi ahụ dịka ha ga-enyefe ya n’aka ndị uweojii oge na-adịghị anya maka ịkpọpụ ya ụlọikpe.

    Akụkọ tiwapụrụ n’ọnwa Ọgọst na Christiana na-efu efu ebe mbọ niile a gbarala iji chọta ya oge ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla.

    Christiana si okporoụzọ Yaba gawara Itaoluwa na-aga UNILAG n’ụbọchị ahụ o furu.

  20. Ọkụ agbagbuola ụmụakwụkwọ 17 na Kenya

    Ụmụakwụkwọ iri na asaa (17) nke ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Academy dị na mpaghara Nairobi isiobodo Kenya anwụọla ka ọkụ gbara ụlọakwụkwọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na enweghị onye mara ihe kpatara ọkụ ahụ gbara ụlọakwụkwọ ahụ n’abalị Tọzde 5 Septemba, 2024.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii mba Kenya bụ Resila Onyango kwuru na ọkụ ahụ gbariri ụmụakwụkwọ ahụ ma kwuo na e nwereike inwe ndị ọzọ nwụrụ n’ọkụ ahụ.

    Onyango mere ka a mata na ụmụakwụkwọ meruru ahụ n'ọkụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata nleta.

    Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto kọwara mwute ya n'ihe mberede ahụ ma nye iwu ka e mee nyocha iji chọpụta ihe kpatara ọkụ ahụ ma chọpụta onye maọbụ ndị ọbụla aka dị n’ọkụ ahụ ma wuchie ha.

    Ka ọdị ugbua, e zigala ndị ọrụ nyocha n’ụlọakwụkwọ ahụ iji chọpụta aha na afọ ole ụmụakwụkwọ ahụ nwụrụ dị.

    BBC chọpụtara na ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Academy nwere ụmụakwụkwọ ruru narị asatọ (800).