Mba Kenya amalitela iru uju abalị atọ dịka ụmụakwụkwọ 17 nwụrụ n'ime ọkụ gbara ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Academy dị na mpaghara Nyeri county n'abalị Tọzde 5, Septemba, 2024.
Osote onyeisiala mba Kenya bụ Rigathi Gachagua kwuru na ndị ọrụ gbata gbata
na-achọ mmadụ 70 achọ, ma kpọ oku ka nne na nna bịara kpọrọ ụmụaka ha mee ka
ndị ọrụ mara.
Ihe anyị chọpụtara n’ọkụ ahụ gbarabguru ụmụakwụkwọ 17 na Kenya
Onyeisiala William Ruto enyela iwu ka e bido nyocha ihe kpatara ọkụ ahụ.
Ọkụ ahụ gbariri ụmụakwụkwọ ahụ nke mere na a apụghị ịmata ha.
Ndị ọrụ gbatagbata ndị ọzọ ruru puku abụọ (2,000) gbara mbọ ịnapụta ụmụakwụkwọ ndị zoro n’okpuru akwa ha mgbe ọkụ ahụ malitere.
Ndị uweoji kwuru na e ji nyocha DNA iji chọpụta ozu ụmụakwụkwọ nwụrụ n’ọkụ ahụ.
Ezinaụlọ ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na e nweghị onye na-agwa ha ihe na-eme ma kọwa nke a dịka ihe dị mmwute.
Gọọmenti Kenya kwere nkwa na ha ga-akwado ezinaụlọ ụmụaka ọkụ ahụ metụtara.
Ụmụakwụkwọ 150 nọ n’ogige ụmụnwoke ụlọakwụkwọ ahụ oge ọkụ ahụ malitere.
Ọtụtụ ezịnaụlọ ụmụakwụkwọ ahụ na-aga n'ihu ịchọ ụmụaka ha.
Nke a abụghị oge mbụ ọkụ na-agba n’ụlọakwụkwọ na mba Kenya. N’ime afọ iri atọ (30 years), e nweela ihe mberede ọkụ n’ụlọakwụkwọ na mba ahụ.
Nyocha BBC chọpụtara na ụlọakwụkwọ mba Kenya enweghị akụrụngwa e ji agbaṅụ ọkụ n’ogige ha.