Ndị ojiegbe gburu ọtụtụ mmadụ ka anụ ọhịa na Naịja steeti – Onye hụrụ ha
Ndị uweojii na Naịja steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe mwakporo ma gbuo igwe mmadụ n’obodo a na-akpọ Demo dị na mpaghara Kabe na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndịuweojii bụ Wasiu Abiodun sị na ihe ahụ mere n’ụbọchị Satọde n’ebe mgbede.
Ọ sị na ndị ojiegbe ahụ “zukwara ndị mmadụ ohi, zuru ngwaahịa ha nwere n’ime ahịa nakwa ihe ọbụla aka ha ruru".
Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ndị e gburu ruru mmadụ 30, ebe ha tọọrọ ọtụtụ mmadụ amabeghị ọnụ ọgụgụ ha.
Mana otu onye akaebe sị na ya hụrụ mgbe mkpamkpa a kpara kwuru na “ha na-abịa achụpụ ha n’ụlọ ma na-egbu mmadụ ka ọkụkọ”.
Ọ gara n’ihu jụọ ajụjụ sị “gọọmenti amakwa na anyị nọ nchancha?”
Onye ọzọ sị na “ndị ojiegbe ahụ na-ejide mmadụ, kechie ya anya, nwere eriri kee ya dịka ewu tupu ha egbujasịa onye ahụ ka anụ ewu maọbụ ọkụkọ”.
Ha sị na ọtụtụ ndị mmadụ ka e gburu n’ime ọhịa, na ndị obodo na-aga ebulata ozu ha ma kwuo na ugbua na ha enwetala ozu mmadụ iri anọ na abụọ e gburu egbu.