Ụlọikpe enyeela iwu ka ndị ọrụ FCTA gbara abụbụọrụ laghachi n’ọrụ
Ụlọikpe na-ahụ maka ọrụ dị n’Abuja enyeela ndị ọrụ nke Federal Capital Territory Administration (Fcta) iwu ka ha kwụsị ngagharịiwe ha na-eme ma laghachi n’ọrụ ha ruo mgbe a ga-anụ okwu ha.
Cheta na ndị ọrụ ahụ malitere ime ngagharịiwe kemgbe 19 Jenụwarị 2026, iji gosipụta mkpesa maka ọdịmma na-adịghị mma na ụgwọ ọnwa a na-akwụghị.
Ọkaikpe Emmanuel Subilim nyere mkpebi a mgbe minista na-ahụ maka isi obodo Abụja bụ Nyesom Wike, tinyere akwụkwọ ka ụlọikpe nye iwu ka ndị ọrụ FCTA na-agba abụbụọrụ laghachi n’ọrụ ha.
Ọkaikpe Subilim kwuru na ọ bụ ezie na ndị a na-ebo ebubo nwere ikike ịgba akwụkwọ n'ụlọọrụ mmepụta ihe, ọ bụghị ihe zuru oke.
O kwuru na ọ bụrụkwa na a na-agba abụbụọrụ n'ihi okwu dị n'ụlọikpe, na a ga-akwụsị abubụọrụ ahụ.
N’ihi nke a, ụlọikpe ahụ yigharịrị ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Maachị maka ikpe ahụ.