You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2026.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ụlọikpe enyeela iwu ka ndị ọrụ FCTA gbara abụbụọrụ laghachi n’ọrụ

    Ụlọikpe na-ahụ maka ọrụ dị n’Abuja enyeela ndị ọrụ nke Federal Capital Territory Administration (Fcta) iwu ka ha kwụsị ngagharịiwe ha na-eme ma laghachi n’ọrụ ha ruo mgbe a ga-anụ okwu ha.

    Cheta na ndị ọrụ ahụ malitere ime ngagharịiwe kemgbe 19 Jenụwarị 2026, iji gosipụta mkpesa maka ọdịmma na-adịghị mma na ụgwọ ọnwa a na-akwụghị.

    Ọkaikpe Emmanuel Subilim nyere mkpebi a mgbe minista na-ahụ maka isi obodo Abụja bụ Nyesom Wike, tinyere akwụkwọ ka ụlọikpe nye iwu ka ndị ọrụ FCTA na-agba abụbụọrụ laghachi n’ọrụ ha.

    Ọkaikpe Subilim kwuru na ọ bụ ezie na ndị a na-ebo ebubo nwere ikike ịgba akwụkwọ n'ụlọọrụ mmepụta ihe, ọ bụghị ihe zuru oke.

    O kwuru na ọ bụrụkwa na a na-agba abụbụọrụ n'ihi okwu dị n'ụlọikpe, na a ga-akwụsị abubụọrụ ahụ.

    N’ihi nke a, ụlọikpe ahụ yigharịrị ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Maachị maka ikpe ahụ.

  2. Mba Ịndịa na otu EU enweela nkwekọrịta azụmaahịa dị mkpa n’etiti ha

    Mba Ịndịa na otu jịkọtara mba dị iche iche na Yurop bụ European Union enweela nkwekọrịta azụmaahịa ga-ebelata etu tarịfu mba Amerịka manyere ha abụọ si emetụta ha.

    Ursula von der Leyen bụ Onyeisi European Union kọwara nke a dịka ‘nkwekọrịta azụmaahịa kachasị’ kwuru n'oge mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n’obodo Delhi, mana Praịm mịnịsta mba India bụ Narendra Modi kwuru na ọ bụ nke “gbara ọkpụrụkpu”.

    Ọ ga-ekwe ka azụmaahịa ngwa ahịa dịrị n'etiti mba Yuropu iri abụọ na asaa na mba kachasị nwee ọnụ ọgụgụ mmadụ n'ụwa, nke mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasentị iri abụọ na ise nke ngwaahịa mba ụwa na ahịa nke mmadụ ijeri abụọ.

    E kwuru na nkwekọrịta a ga-ebute nnukwu mbelata ụtụisi n'ọtụtụ ngwaahịa na ọrụ dị iche iche n'etiti mba Ịndịa na mba nọ n'otu Yurop, yana inwe mmekorita nchekwa.

  3. Igbo ndị ọma, ehihe ọma unu!

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 27 Jenụwarị 2026.

    Anyị na-asị ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa taa.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na onyonyoo.

    Udo dịrị gị!

  4. Ndị ojiegbe wakporo Eze ndị Ogoni, gbaa ya egbe - Onye hụrụ mgbe o mere

    Ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ awakpoola Eze kachasị n’alaeze Bangha dị n’okpuru ọchịchị Khana na Riva Steeti bụ Suanu T. Y. Baridam, ma gbaa ya egbe oge ọ gara ọrụ udo n’obodo Okwale.

    Ozi anyị nwetara kwuru na e mere Eze Baridam mwakpo ahụ na mgbede Sọnde 27 Jenụwarị, 2026.

    E jiri ọsọ bugaa eze ahụ ụlọọgwụ a na-akpọghị aha, bụ ebe ọ nọ ugbua na-anara ọgwụgwọ.

    Security agencies are yet to release official details on the incident as investigations continue.

    Ka ọ dị, ndị nchekwa ewepụtabeghị ozi gbasara mwakpo ahụ, dịka nnyocha na-aga n’ihu ugbua.

    Onye obodo Taaba ya na Eze Baridam soro mee njem ahụ, aha ya bụ Frank Nwiteh kọrọ na ha gara iji anya ha hụ ndozi esemokwu n’etiti ndị obodo Okwale na ụlọọrụ SIAT Nigeria Limited, maka na tupu nzukọ ahụ, ndị obodo mere ngagharịiwe gaa na nke Onyeisioche okpuru ọchịchị ha ma boo ebubo na ụlọọrụ SIAT batara n’obodo ha na-ebughị ụzọ binye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta.

    Nwiteh kwuru na mgbe nzukọ ahụ gwụrụ, Eze Baridam banyere n’ụgbọala ya lawa, ebe ya onwe ya banyere n’ụgbọala ọzọ ma soro ya n’azụ.

    “Anyị nọ n’ụzọ na-ala tupu anyị anụ ụda egbe, nke mere ka ụgbọala niile kwụsị. Ndị ha na Eze so n’ime ụgbọala ya chọpụtara na mgbọ tụtara ya,” ka Nwiteh kọọrọ anyị.

    O kwuru na ha gbaziri okporoụzọ ọzọ pụta n’Afam tupu ha agawa Oyigbo dị na Port Harcourt maka inweta nlekọta ahụike.

    Ka o sina dị, Frank Nwiteh kwuru na ya amaghị gbasara ọnọdụ Eze Baridam, mana o kwere nkwa ime ka anyị mata ka ihe si kwụrụ ngwangwa o nwetere ozi rijuru afọ.

  5. Ndị ọrụ FCTA emeela ngagharịiwe n’Ụlọikpe Ndị Ọrụ

    Ndị ọrụ n’ụlọorụ isi obodo emeela ngaghịiwe n’Ụlọikpe Ndị Ọrụ dị n’Abụja, dịka abụbụọrụ ha gbara n’ihi okwu ndị metụtara ọrụ ha tụgharịrị ụkwụ egwu.

    Ngagharịiwe a ndị ọrụ Federal Capital Territory Administration (FCTA) mere n’ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị 2026 bụ nke nwere nkwado otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC).

    Ndị ọrụ FCTA ji epekele akwụkwọ ndị ha depụtara ihe dị iche iche mee ngagharịiwe ahụ, ma kpọọ oku ka e wezuga Nyesom Wike dịka Minista Isi Obodo.

    Ụfọdụ ihe ndị ha depụtara gụnyere; “Wike ga-alarịrị”, “Abụja abụghị Riva Steeti”, “Kwụọ ụgwọ mbuli n’ọkwa e jikọrọ anyị”, “O zuola bụ na o zuola” nakwa ihe ndị ọzọ.

    NLC wepụtara ozi ma kwado ngagharịiwe ahụ, dịka ha kọwara ya ka nke kwesịrị ekwesị, ma boo ndị nlekọta FCTA ebubo mmetọ ikike ndị ọrụ.

    Ụfọdụ ebubo ndị ahụ gụnyere mmetọ ụgwọọnwa, mkpagbu na ịda mba n’oke na ọrụ dịịrị ha.

  6. APC ahọpụtala ndị ga-eji aha patị ha zọọ ọkwa onyeisioche okpuru ọchịchị n’Ebonyi steeti

    Otu pati All Progressive Congress (APC) emeela ntuliaka praịmarị iji họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisioche na ntuliaka okpuru ọchịchị iri na atọ dị n’Ebonyi steeti.

    APC mere ntuliaka ahụ n’isi ụlọọrụ gọọmenti okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ ma kpọpụta ndị meriri.

    A kpọpụtara Chidiebere Alo dịka onye meriri n’Abakaliki ma bụrụ onye ga-eji aha APC zọọ ọkwa na ntuliaka okpuru ọchịchị ahụ a ga-eme n'ọnwa Julaị 2026.

    Chidiebere ji vootu iri asaa (70) merie ndị ọzọ si na wọọdụ iri na anọ ndị ọzọ so zọọ ọkwa ahụ n’okpuru ọchịchi Abakaliki, Ebonyi steeti.

    Jude Chikadibia Okpor bụbu kọmịshịọna mgbasaozi na steeti ahụ ma bụrụkwa onye nhazị ntuliaka APC zigara kpọpụtara Chidiebere Alo dịka onye meriri.

  7. Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa chọrọ iweghara ikpe Ozekhome maka ebubo mpụ na nrụrụaka

    Ọkaiwu ukwu nke Naịjirịa ekwuola na ọ chọrọ iweghara ikpe onye ọkaiwu a ma ama bụ Mike Ozekhome nke mere ka e yigharịrị ikpe ya.

    E mere ka ụlọikpe mara maka mweghara ahụ site n'aka Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa na Mọnde 26 Jenụwarị 2026, ka okwu ahụ pụtara n'ihu ọkaikpe Peter Kekemeke nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja.

    Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka mmebi iwu na mpụ bụ Icpc tinyere ebubo atọ n’akwụkwọ FCT/HC/CR/010/2026 megide Ozekhome maka ebubo iji akwụkwọ adịgboroja na-eme ihe n'okwu gbasara ihe onwunwe ya n’United Kingdom.

    Mgbe a kpọrọ ikpe ahụ, onye bụ Onyeisi Ikpe Ọha nke si n'ụlọọrụ ọkaiwu ukwu bụ Rotimi Oyedepo gwara ụlọikpe maka mkpebi ọkaiwu ukwu iji weghara ikpe ikpe ahụ.

    Dịka o si kwuo, a ga-ekpe ikpe ahụ site n'iji "ọkwa kachasị elu, ịdị uchu, nrubeisi na usoro iwu kwesịrị ekwesị".

    Ọkaikpe Kekemeke yigharịrị ikpe ahụ n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị maka ikpe onye a na-ebo ebubo ikpe.

  8. Nnamdi Kanu abụrụla ‘nwa afọ Georgia n'Amerịka' onye nnọchi anya ezi omume

    Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) abụrụla ‘nwa afọ mba Amerịka’ onye nnochiteanya ezi omume.

    Nke a na-eme n’agbanyeghị na gọọmenti Naịjirịa amachiela otu IPOB, tụọ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu mkpọrọ ma kwuo na IPOB bụ otu na-eyi ọha egwu.

    Mana steeti Georgia dị n’Amerịka nyere Nnamdi Kanu asambodo ‘nwa afọ mba Amerịka, onye nnọchiteanya ezi omume’ ma nabata ya dịka ‘nwa amaala pụrụiche’.

    Ụbọchị akwụkwọ ikike ahụ e nyere Nnamdi Kanu bụ na Jenuwarị 16, 2026 mana ọ bụ n’ụbọchị Fraịde, Januwarị 23, 2026 na Milledgeville, bụ isi obodo Georgia ka e nyere ya Kanu.

    Onye bụbu Onye nnọchịteanya Naịjirịa na mba Saụt Afrịka bụ Uche Ajulu-Okeke natara akwụkwọ ahụ n’aha Nnamdi Kanu.

    Ajulu-Okeke kọwara Nnamdi Kanu dịka “Onye na-azọ nwereonwe kachasị n’Afrịka ma bụrụ otu onye a ma ama n’ụwa a tụrụ mkpọro maka ihe o kwenyere na ya”.

    Mgbe a na-enyefe Nnamdi Kanu ikike ahụ ka Odeakwụkwọ steeti Georgia bụ Brad Raffensperger bụ onye nyefere ikike ahụ kpọrọ oku ka "onye ọbụla kwanyere ya ugwu na Georgia steeti niile nakwa mpaghara ụwa niile ọ gara, maọbụ ga biri”.

  9. Anyị na-enyocha ihe niile mere n'ọnwụ Alex Pretti – Onyeisiala Trump

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ekwuola na gọọmenti ya na-enyocha ihe niile mere n'ọnwụ Alex Pretti gbara afọ 37 akụkọ kwuru na ndị ọrụ ICE gbagburu na Minneapolis n'ụbọchị Satọde 24 Jenụwarị, 2026.

    Trump mere ka a mata na ya ga-ewepụ ndị ọrụ ICE na Minneapolis mana o kwughị ụbọchị ọ ga-eme nke a.

    Ka ọ dị ugbua, a na-eme ngagharịiwe na Minneapolis nakwa steeti dị iche iche n'Amerịka dịka Gọvanọ Minnesota bụ Tim Walz dọrọ aka na ntị ma kwuo na Amerịka nọ n'ajọ ọnọdụ n'ihi ajọ akparamaagwa ndị ọrụ ICE.

    Cheta na ndị ọrụ ICE gburu otu nwaanyị aha ya bụ Renee Good na Minnesota n’izuụka atọ gara aga

  10. Ụmụ Igbo anyị sị unu ụtụtụ ọma

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ekpere anyị n’isi gị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  11. Ikike i nwe egbe adịghị ma ị na-egbochi ọrụ nchekwa - Greg Bovino

    Greg Bovino bụ otu onyeisi ụlọọrụ nchekwa okeala mba Amerịka ekwuola na ndị ahu gbagburu nwoke a na-akpọ Alex Pretti ka na-arụ ọrụ ha mana a gbanwere ebe ha nọ ọrụ.

    Ọ gwara ụlọọrụ mgbasaozi CNN na a mabeghị onye ọrụ ha gbagburu Alex Pretti ugbua ma kwuo na Pretti nwụrụ anwụ ji egbe mgbe e gburu ya.

    Ọ sara okwu ndị na-ebo ebubo sị na mgbe a gbagburu Pretti na egbe ya adịghị ya n’aka kama na ọ na-enyere onye a kwaturu n’ala aka mgbe a gbagburu ya.

    N’ọsịsa Bovino nyere “anyị achọghị onye a na-enyonye inyereaka n’oge ndị ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ ha”.

    Ọ sị na “mgbanwe iwu nyere ụmụ amaala Amerịka ikike inwe egbe enyeghị ha ikike igbochi ọrụ ndị nchekwa” .

  12. Etu Naịjirịa si ahụta mkparịtaụka ha na Amerịka - Nuhu Ribadu

    Nuhu Ribadu bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nke Onyeisiala Naịjirịa ekwuola etu gọọmentị Naịjirịa si ahụta mkpaịtaụka ha na Amerịka na-enwe maka tigbuo zogbuo maọbụ mwakpo a na-awakpo ọtụtụ obodo.

    Nuhu Ribadu ji akara X soshal mịdịa ya mee ka a mara nke a dịka Amerịka na Naịjirịa nnwere nzụkọ mbụ n'Abuja.

    N’okwu ya “kamgbe ngwụcha afọ 2025, mmekọ mba Amerịka na Naịjirịa esila na mkparịtaụka banye n’imepụta ihe a na-ahụ anya, ihe bara uru, ma na-echekwa ndị nkịtị.

    Gọọmenti Onyeisiala Bola Tinubu na-eme ọkpụrụkpụ ihe banyere ngaraba nchekwa, ikpe nkwụmọtọ na ime ihe e kwesiri ime na ngalaba dị ciheiche.

    Naịjirịa nwere mmasị na mkparịtaụka, inwe mpụtara a ga-ama etu e si mepụta ya, ijịkọta ọnụ, ntụkwasị obi nakwa ichekwa onyeọbụla na obodo niile.

    Cheta na odeakwụkwọ na-ahụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Amerịka bụ Allison Hooker nochitere anya mba ha n'ọgbakọ ahụ nke a kpọrọ "US-Nigeria Joint Working Group" e mere n'Abuja na nsonso a.

    Hooker kwuru na ọgbakọ ahụ bụ ka a kpaa etu mba abụọ ahụ ga-esi arụkọ iji hụ na tigbuo-zogbuo megide ndị ụka Kraịstị kwụsịrị na Naịjirịa.

  13. Gọọmentị Anambra Steeti akagbuola ‘sit at home’ n’ ubọchị Mọnde ọbụla

    Gọọmenti Anambra Steeti ekwuola na ha akagbuola atụmatụ ịnọ n’ụlọ a na-eme n’ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    Nke a dị n’ozi kọmishọna mgbasaozi bụ Law Mefor depụtara n’akara Facebook ya ma kwuo na gọọmenti ga-amanye nke ahụ n’ike.

    O kwuru na tupu gọọmenti Anambra emee mkpebi ahụ na ọ dịghịrị ha mfe mana ọ bụ ihe dị mkpa na e mere site n’etu akụnaụba steeti ahụ si adakpọ site n’ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla kamgbe ọtụtụ afọ.

    Gọọmenti kwuru na ndị ọrụ bekee ọbụla jụrụ ịga ọrụ n’ụbọchị Mọnde ga-enwete naanị pasentị 20% n’ụgwọọnwa ya maọbụ ghara irite ụgwọọnwa kpam kpam.

    Ha gakwara n’ihu kwuo na ụlọahịa ọbụla jụrụ imepe ahịa n’ụbọchị Mọnde ga-anata ntaramahụhụ ha nke gụnyere ịgbachi ụlọahịa ahụ.

    Kamgbe ihe ruru afọ ise gara aga ka ndị otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People Biafra tinyere iwu ịnọ n’ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n’ihi onyendu ha bụ Nnamdi Kanu gọọmenti Naịjirịa nwuchiri.

    N’ihi ụjọ banyere mmanye ịnọ n’ụlọ ahụ ndị mmadụ jụrụ imepe ụlọahịa, ụlọakwụkwọ nakwa ịgagharị n’ụbọchị Mọnde ọbụla.

    Gọọmenti kwuru na ọtụtụ akụnaụba ndị mmadụ alaa n’iyi maka ọnọdụ ịnọ n’ụlọ ahụ, nke a mere ha jiri tinye iwu ka a kwụsị ya kpam kpam.

  14. E kwuola aha nwoke ahụ ndị ọrụ ICE gbagburu na Minneapolis mba Amerịka

    E kwuola aha nwoke ahụ ndị ọrụ nchekwa gbagburu na Minneapolis mba Amerịka

    Akụkọ kwuru na nwoke ahụ ndị ọrụ ICE gbagburu na Minneapolis mba Amerịka bụ Alex Pretti gbara afọ 37. Nnyocha e mere chọpụtara na nwaamdị ahụ bụ nwaafọ mba Amerịka na-arụ ọrụ dịka nọọsụ.

    Nne na nna ya kọwara ya dịka onye nwere ezigbo ọmịịko nye mmadụ ibe ya.

    Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ ICE gbagburu otu nwaanyị aha ya bụ Renee Good na Minnesota n’izuụka atọ gara aga.

    E nwere akụkọ dị iche iche banyere ihe kpatara ọnwụ Pretti.

    Odeakwụkwọ ụlọọrụ Homeland Security bụ Kristi Noem kwuru na ndị ọrụ ICE gbara Pretti egbe maka n o rubeghị isi nye ndị ọrụ ICE mana Gọvanọ Tim Walz na-achị Minnesota kọwara okwu ya dịka okwu ụgha nke na-enweghị eziokwu ọbụla.

    Ọtụtụ ndị na-eme ngagharịiwe gbakọrọ ebe ahụ a gbagburu Pretti ma na-akpọku aha ya.

    N’aka nke ọzọ Onyeisiala Donald Trump boro Gọvanọ Walz ebubo ma kwuo na ọ bụ ya na-akpali ndị ngagharịiwe ahụ.

  15. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 25 Jenụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Orie.

    Gaa n'ihu sonyere anyị maka na anyị ji akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile bịa taa.

    Sonyekwara akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Daalụ.

  16. ICE agbagbuola otu nwoke n'Amerịka

    Ndị ọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ na Amerịka a kpọrọ 'ICE' n'ịchafụ agbagbuola otu nwoke gbara afọ 37 na Minnerpolis dị na Minnesota dị n'Amerịka n'ehihie taa bụ Satode.

    Nwoke ahụ bụ onye e kwuru bụ nwa afọ Amerịka tozuru etozi bụ onye ọcha.

    Ọnụ na-ekwuru ngalaba nchekwa n'ụlọ bụ Tricia McLaughlin sna ndị ọrụ na-elekọta okeabla gara ịnwụchi otu onye embịarambịara ekwesịghị ịnọ n'Amerịka oge otu onye ji egbe pụtara .

    McLaughlin kwuru sị, "Ndị ọrụ "ICE" gbalịrị ịnata nwoke ahụ egbe oji mana nwoke ahụ jụrụ inye ha egbe ya,"The officers attempted to disarm the suspect but the armed suspect violently resisted.

    "N'ihi ịtụ egwu ndụ ya na ndị ogbo ya , ọgbara egbe iji zọrọ onwe ha. Ndị dọkịta bịara ileta onye ahụ mana ha kwuru na ọ nwụrụ ebe ahụ."

    McLaughlin gara n'ihu kwuo na onye ahụ bu mgbọ egbe ma kwuo kwa na nd i mmadụ malitere mewe ngagharịiwe nke gbochiri ọrụ ndị ọrụ gọọmentị."

    Nke a b u nke abụọ ICE na-agbagbu mmadụ n'ọnwa Jenụwarị, afọ 2026.

  17. Ihe Amerịka gwara Naijiria maka mmadụ karịrị 170 a tọọrọ na Kaduna

    Gọọmentị Amerịka agwala Gọọmentị Naijiria ka ha gbalịsie ike ịhụ na tigbuo-zogbuo megide ndị ụka Kraịstị kwụsịrị.

    Nke a na-abịa dịka a tọọrọ ihe karịrị mmadụ 170 na n'ụlọụka atọ na Kaduna Steeti Ụbọchịụka.

    Odeakwụkwọ na-ahụ maka ndọrọndọrọ Ọchịchị bụ Allison Hooker bụ onye kwuru nke a dịka otu Amerịka na Naijiria bụ nke e hiwere ọhụrụ maka okwu nchekwa a kpọrọ "US-Nigeria Joint Working Group," nwere nzukọ mbụ ha,m n'Abuja na nsonso a.

    Hooker kwuru na ọgbakọ ahụ bụ ka a kpaa otu mba abụọ ahụ ga-esi arụọ iji hụ na tigbuo-zogbuo megide ndị ụka Kraịstị kwụsịrị., na =-enyochara mwakpoo nile ma kpụpụ ndị ikpe marar ụlọikpe iji belata ogbugbu, agbamọsọndụ nakwa ndị ụka Kraịstị a na-atọrọ.

    Ndị bịara ọgbakọ ahụ gụnyere onye ndụmọdụ nchekwa Naijiria bụ Nuhu Ribadu, onyeisi ndịuweojii Naijiria bụ Kayode Egbetokun nakwa Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris.

  18. Mba New Zealand ekwuola ka a kwụsị ịchọ mmadụ isii na-efu efu n’ihi mbụze

    A kwụsịla mbọ a na-agba ịchọta mmadụ isii na-efu efu oge mbụze mechara na mba New Zealand n’ụbọchị Tọzde.

    Ndị uweojii mba ahụ kwuru na mbọ ndị ha na-agba ugbua bụzi iji bupụta ozu mmadụ ndị ahụ.

    “Ọ dị mwute na anyị apụghị ịkpọpụta ha na ndụ ma kpọlaara ha ezinaụlọ ha,” ka onye uweojii bụ Tim Anderson kwuru, ma gbakwunye na ha na-achọ ịmalite ịchọpụta ndị mmadụ isii ahụ bụ.

    Mmadụ abụọ na-eto eto so n’ime ndị ahụ a ka na-achọ achọ, dịka nke kachasị obere dị afọ iri na ise (15).

    “Ndị ọrụ nnapụta hụrụ ozu mmadụ n’okpuru ureghure nakwa mkpọmkpọ na mgbede Fraịde,” ka Anderson kwuru, dịka e nwechara mbụze n’ogige ọgbakọ dị na Mount Maunganui.

  19. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 24 Jenụwarị 2026.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  20. Ụlọikpe kachasị elu akagbuola ikpe Hamza Al-Mustapha maka ọnwụ Kudirat Abiola

    Ụlọikpe kachasị elu na Naịjirịa akagbuola ikpe a na-ekpe Hamza Al-Mustapha onye bụbu onyeisi ndị nchekwa n'oge ọchịchị Ọchịagha Sani Abacha maka ebubo igbu Kudirat Abiola.

    Mgbe e bidoro ikpegharị ikpe ahụ nke ụlọikpe nyere iwu kemgbe afọ 2014 ka e mepegharịa ya, Legọs steeti kpụpụrụ ya n’ụlọikpe, e tinyeghị akwụkwọ usoro iji amalite ikpe ọbụla maọbụ kpọta ọkaiwu ga-anọchite anya ha n’ụlọikpe.

    Onye ọkaiwu Al-Mustapha bụ Paul Daudu gwara ọkaikpe na Legọs steeti emebeghị ihe ọbụla iji kwado iwu ụlọikpe nyere kemgbe afọ 2014 nke bụ ka a malitegharịa ikpe ahụ ọzọ ma rịọ ka akagbuo ikpe ahụ n’ihi na akparamaagwa gọọmenti Legọs steeti na-egosi na ha ahapụla ikpe ahụ.

    Ọkaikpe Uwano Aba-Aji jụrụ onye nke nabatara arịrịọ ahụ kọwara na kemgbe afọ 2014 bụ ogologo oge Legọs steeti kwesịrị iji tinye akwụkwọ mkpesa ha.

    Cheta na Kudirat bụ nwunye onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama bụ MKO Abiola onye nke ụfọdụ mmadụ kwuru na ọ bụ ya meriri ntuliaka onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Juun n'afọ 1993 nke onye bụbu onyeisiala Ibrahim Babangida kagburu.

    Chetakwa na e gburu Kudirat na Legọs oge e nwere nnukwu nsogbu nke dapụtara mgbe akagburu ntuliaka ahụ.