You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2026.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ejidela ndị gburu otu nwaanyị na ụmụaka ya isii na Kano steeti

    Ndị uweojii ekwuola na ha jidere mmadụ atọ so gbuo otu nwaanyị na ụmụaka ya isii na Kano steeti, mpaghara ugwu Naịjirịa.

    Mkpamkpa ahụ kpara n’ụbọchị Fraịde n’ebe a na-akpọ Dorayi Chiranchi Quarters dị na Kano steeti.

    A wakporo ezinaụlọ ahụ, gbuo nwaanyị na ụmụaka isii.

    Mana nna ezinaụlọ ahụ bụ Haruna Bashir gbara ọsọ.

    Ndị e gburu bụ Fatima Abubakar dị afọ 35 bụ nne ụmụaka ndị ahụ, nwa ya bụ Maimuna dị afọ 17, Aisha dị afọ 16, Bashir dị afọ 13, Abubakar dị afọ 10, Faruk dị afọ 7, na Abdussalam dị naanị otu afọ na ụma.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano steeti bụ Abdullahi Haruna Kiyawa kwuru na ha jidela mmadụ atọ a na-enyoenyo na aka ha dị na mkpamkpa ahụ.

    Ọ kọwara na ọ bụ n’ime ụtụtụ '12:10pm' na Januwarị 17, 2026 ka ndị uweojii nwetere ozi na a wakporo ụlọ Haruna Bashir.

    Mana Gọvanọ Kano steeti bụ Abba Kabir Yusuf kọtọrọ ihe mere dịka ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sunusi Bature Dawakin Tofa si kwuo n’ụbọchị Satọde.

    Ọ kwere nkwa na ndị mere ihe ahụ ga-enwete ntaramaahụhụ.

  2. A nwụchiela nwoke gburu otu nwatakịrị ma kpọ aha dibịa a ma ama n’Enugwu steeti dịka onye nkwado ya

    Ndị uweojii n’Anambra steeti ekwuola na otu nwoke ha nwụchiri maka ebubo igbu nwata nwaanyị dị afọ isii, kwuru na ọ bụ otu dịbịa a maama n’Enugwu steeti zigara ya.

    Cheta na a tọọrọ ma gbuo Ozioma Nwankwo dị afọ isii na Mee 10, 2025 n’okpuru ọchịchị Ikwo dị n’Ebonyi steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara, kwuo na ndị uweojii nwetere ozi nyeere ha aka ịnwụchi Friday Akonobi na Jenụwarị 17, 2026. Friday Akonobi dị afọ 28.

    Tochukwu Ikenga kwuru na oge ha na-eme nnyocha, Friday Akonobi kpọrọ aha Obieze Ezeani a na-akpọ ‘Edey Play’ bụ dịbịa a maama n’Enugwu steeti.

    O kwuru na Friday Akonobi na mmadụ anọ ndị ọzọ gbara ọsọ, kpọgara nwata nwaanyị ahụ dị afọ isii n’ụlọ dịbịa Obieze Ezeani, onye kwụrụ ha otu nde naịra (₦1,000,000.00) n’isi n’isi maka ịkpọta nwaanyị na-amaghị nwoke.

    Nchọpụta ndị uweojii mere kwuru na e gburu nwata nwaanyị ahụ ma jiri ya gwụọ ọgwụ ọtụmọkpọ.

    Tochukwu Ikenga kwuru na ndị uweojii na-agba mbọ inwụchi ndị niile aka ha dị n’ọnwụ nwatakịrị ahụ ma nye ha ntarama ahụhụ dịka iwu obodo si kwu.

  3. Ndị nnọchiteanya mba EU ga-enwe mkparịtaụka mbere dịka Trump kwuru maka ịmanye Tarịfu maka Greenland

    Ụfọdụ ndị nnọchiteanya mba EU ga-enwe mkparịtaụka mberede taa dịka Onyeisiala Donald Trump yiri egwu na na ọ ga-amanye tarịfu na mba ọbụla ha na Amerịka na-enwe mmekọ na-akwadoghị atụmatụ ya inwere Greenland.

    Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-ebuli ụtụisi na mbubata niile si mba Denmark, Nọọwe, Swiden, Frans, Jamini, UK, Nedaland na Fịnland.

    Akụkọ kwuru na tarịfu pasenti iri ahụ ga-amalite na Febụwarị 1, 2026 ma bụrụ nke e nwereike ibuli ruo pasentị 25.

    Praịm mịnịsta UK bụ Keir Starmer katọrọ tarịfu ọhụrụ a Onyeisiala Trump kwuru ebe Onyeisiala Emmanuel Macron mba Frans kwuru na ya anabataghị ya.

    Praịm mịnịsta mba Swiden bụ Ulf Kristersson kwuru na ndị ndu mba Yurop dị iche iche agaghị anabata atụmatụ tarịfu ahụ.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka chọrọ inwere Greenland iji hụ na e nwere ezi nchekwa n’Amerịka.

  4. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 18 Jenụwarị, 2026.

    Gaa n'ihu sonyere anyị maka na anyị ji akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile bịa taa.

    Sonyekwara akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Nnọọ.

  5. Naijiria eritala ọlanchara n'asọmpi Afcon dịka ha merịri Ijipt

    Ndị otu egwu bọọlu 'Super Eagles' emeriala ndị ogbo ha ndị Ijipt were rite ọla nchara n'asọmpi Iko Africa (Afcon) a sọrọ na Moroko ụbọchị Satode.

    Naijiria na Ijipt gbara onwe ha onye laba , onye laba tupu Naijiria nwere penarịtị nye Ijipt ọkpụ anọ a satara abụọ nwere nweta ọkwa nke atọ n'asọmpi ahụ.

  6. Emeka Christian:A nwụchiela ụmụafọ Naijirịa abụọ n'India maka itigbu ogbo ha n'esemokwu metụtara nwaanyị

    E gbuola otu nwa afọ Naijirịa a kpọrọ Emeka Christian na Pisoli dị na Pune na mba India n'ihi esemokwu metụtara ịzọ nwaanyị.

    Ndị uweojii mba India anwụchiela ụmụafọ abụọ; Chukwudi Okafor gbara afọ 31 na Samuel Eze gbara afọ 34, maka ebubo igbu Emeka Christian dịka esemokwu dapụtara n'etiti ha n'ọgbakọ abalị gara n'ụlọ otu nwaanyị bụkwa onye Naijiria n'India.

    Díka ndí uweojii siri kwuo, mmadụ atọ ahụ malitere ịdọrịta ụka metụtara nwaanyí ahụ nke a sị ya na otu mmadụ abụọ ahụ a nwụchiri na-ayí, site na ya ọ banye ọgụ.

    Mmadụ abụọ ahụ kụwara Christian ihe ma bute ihe siri ike luo ya, ọ daa, e buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọrọ nwụọ.

    Ngalaba na-ahụ maka maka ụmụafọ Naijiria nọ na mba ọzọ bụ 'Nigerians in Diaspora Commission (NiDCOM) ndị kwetara naya bụ akụkọ bụ ezie, kpọrọ oku ka ndị uweojii India nyocha ihe butere ihe mere ma nye nwaamadị ahụ lara mmụọ ikpenmkwụmọtọ.

    NIDCOM kwuru n'ozi ha wepụtara sị, "Ọ dị Nidcom nnukwu mwute n'ọnwụ erughị eru nke nwa afọ Naijiria na Pune bụ Emeka Christian nke ụmụnne ya bụ Chukwudi Okafor, 31, and Samuel Eze, kụgburu n'ihi esemokwu metụtara nwaanyị."

  7. Ndị uweojii ataala mmanwụ n'Anambara Steeti

    Ndí uweojii Anambara steeti agbaala n'anwụ onye ti mmanwụ ha nwụchiri na nsonso a maka ịkpa aghara n'emume e mere na Ọgbụ(Awgbu) Anambara steeti na nso nso a.

    Ifesinachi Ezeolu gbara afọ 28 bụ onye nọ n'ime mmanwụ kpara ike na mp,ụta mmanwụ mere na nsonso n'obodo Ọgbụ, ọdịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochuwku Ikenga si kwuo na ozi o wepụtara taa bụ Satọde.

    Na nsonso a , mmanwụ banyere ụfọdụ ndị mmadu ọgụ ma kụkasịa ihe na mmemme e mere n'Ọgbụ dị n'Okpuru Ọchịchị Ormba na nsonso a.

    Ikenga kwuru na nnwuchi Ezeolu so mkpesa dị iche iche metụtara ịkụ mmadụ ihe na iji ndị mmadụ egwu nke ndị uweojii nwetara.

    Ọ gara n'ihu dọọ ọha ndị Anambara aka na ntị sị, "Ndị uweojii Naijiria na-akwanyere omenala ugwu mana nke a abụghị ihe a ga-ezo n'okpuru ya na-emekpa ndị ọzọ ahụ maobụ emegide ikike dịịrị onye."

  8. Trump eyiela egwu ịmanye ụtụisi ọhụrụ na mba ndị na-akwadoghị mweghara Greenland

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump eyiela egwu ịmanye ụtụisi ọhụrụ na mba ndị na-akwadoghị atụmatụ ya iweghara Greenland.

    N’ọgbakọ e nwere na White House, Trump kwuru na ya “nwereike ịmanyere mba dị iche iche ụtụisi ma ọ bụrụ na ha akwadoghị ka ya weghara Greenland.”

    Greenland bụ mpaghara na-achị onwe ya, mana ha bụ ndị mba Denmark na-elekọta.

    Trump akpọghị aha mba ndị ụtụisi ọhụrụ a ga-emetụta, maọbụ ikike ọ ga-eji mejupụta ebumnobi ya.

    Ọtụtụ mba esorola Denmark na Greenland gbaa ụkwụ megide atụmatụ ahụ, ebe ọtụtụ ndị bi n’Amerịka gosiri na atụmatụ ahụ agbasaghị ha.

  9. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ., Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 17 Jenụwarị 2026.

    Biko, sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  10. Chaịna na Kanada enweela nkwekọrịta ibelata tarịfu dịka Onyeisiala Xi na Mark Carney nwere nzukọ

    Onyeisiala Xi Jinping na-achị mba Chaịna na Praịm mịnịsta Mark Carney mba Kanada ekwuola na ha ebeletela tarịfu dị n’etiti mba abụọ ahụ dịka ha nwere mkparịtaụka na Beijing.

    Chaịna na-atụanya ibeleta tarịfu na mmadụ canola si mba Kanada nke ga-amalite na Maachị ebe Kanada kwuru na ha ga-abeleta tarịfu n’ụgbọala latrik si Chaịna.

    Nkwekọrịta a na-abịa dịka mba abụọ ahụ na-enwe esemokwu banyere tarịfu kemgbe ọtụtụ afọ. Onyeisiala Xi toro nkwekọrịta a maka na Mark Carney bụ Prịam mịnịsta Kanada mbụ na-eme njem Chaịna kemgbe afọ iri gara aga.

    Mark Carney na-agba mbọ ịchọpụta ụzọ azụmahịa ọhụrụ mba Kanada ga-esi na-azụụ ahịa kemgbe mmekọ azụmahịa ha na mba Amerịka kpụrụ afọ n’ala site na tarịfu ọhụrụ ọchịchị Onyeisiala Trump manyere.

  11. A mara onye bụbu onyeisiala mba Saụt Korea ikpe maka iji ike eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi n'ọgụ megide iwu agha.

    A mara onye bụbu onyeisiala mba Saụt Koria, Yoon Suk Yeol, ikpe maka iji ike eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi, igbochi ikpe ziri ezi na ịgha ụgha akwụkwọ gbasara n'ọgụ megide iwu agha na 2024.

    Ndị ọkaiwu chọrọ ka a tụọ ya mkpọrọ afọ iri maka ebubo ndị a, mana a ga-ama ya ikpe ma e mesịa.

    Nke a bụ nke mbụ n'ime ikpe anọ metụtara iwu agha ya dị egwu. Ọ bụ ezie na ọ dị mkpụmkpụ, mkpebi a tinyere mba ahụ n'ọgbaaghara, kpalitere ngagharịiwe ka ndị omeiwu gbapụrụ ma gbaaga n'ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu mba ahụ iji gbanwee mkpebi Yoon.

    Mkpebi nke ụbọchị Fraịde na-enye ihe akaebe gbasara otu ikpe ndị ọzọ nke Yoon ga-esi gaa. Ebubo ndị a na-ebo ya sitere na iji ike eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi ruo na mmebi iwu mkpọsa.

    Ebubo kachasị njọ bụ nnupụisi, nke ndị ọkaiwu chọrọ ka a tụọ ya mkpọrọ ọnwụ. A na-atụ anya na a ga-ekpe ikpe ahụ na Febụwarị.

  12. Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 16 Janụwarị 2026.

    Ekpere anyị bụ ka ihe ọma niile ị ga-etinye aka taa gaa nke ọma.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ndewo!

  13. Yurop ezigala ndịagha maka ịkwụsị Trump ịnapụ mba Demmak mpaghara Greenland

    Ndị ọchịchị mba dí iche iche na Yurop kwuru na ha ezipula ndịagha ole na ole na Nuuk bụ isi obodo Greenland n’aha nchekwa ha kpọrọ “reconnaissance”.

    Ndịagha Fransị, Jamịnị, Swịdịn, Fịnland, Nedaland nakwa UK.

    Nke a na-abía dịka Onyeisiala Donald Trump kwuru na mba Amerịka ga-enwere obodo ahụ mmiri gbara okirikiri a na-akpọ Greenland.

    Cheta na Greenland dị ka obodo nwere onwe ha n'ọtụtụ ihe dị iche iche, mana ha ka bụkwa obodo dị n'ime mba Demmak..

    Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron kwuru na a ga-ezipu ndịagha ọzọ tinyere ndị nke nọ ugbua na Greenland.

    Onye nnọchịtaanya a ma ama bụ Olivier Poivre d'Arvor kọwara ndịagha ahụ Yurop zipuru dịka ihe gosiri na dị ike.

    N'okwu ya “Nke a bụ nke mbụ a na-egosi mba Amerịka na NATO ka nọ”.

  14. Trump ekwuola na 'igbu mmadụ akwụsịla' n’Ịran mgbe ngagharịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ gafesịrị

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na "igbu mmadụ akwụsịla n'Ịran", mana ọ kagbubeghị atụmatụ mba Amerịka nwere iji agha megide mba ahụ maka iji ike wakpoo ndị na-eme ngagharịiwe megide gọọmenti.

    Dịka otu ndị na-ahụ maka ikike mmadụ si kwuo, ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị anọ anwụọla n'ihe ike ndị ọchịchị Ịran mere n'oge na-adịbeghị anya maka ngagharịiwe mere na mba ahụ.

    Cheta na mba Amerịka na mba UK na-ebelata ọnụọgụ ndị ọrụ nọ n'ọdọụgbọelu Al-Udeid dị na Katar, ebe ndị ọrụ gọọmenti gwara CBS, onye mmekọ BBC na mba Amerịka, na ịkpọghachi ụfọdụ ndị Amerịka bụ "ihe ịkpachara anya".

    N’aka nke ọzọ, e mechiri ụgbọelu mba Ịran maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụgbọelu niile ruo awa ise n'abalị, ọtụtụ ụgbọelu kwupụtara na ha ga-agbanwe ụzọ ụgbọelu gburugburu Ịran.

    Onye na-ekwuchitere gọọmenti kwuru na ụlọọrụ mba ofesi emechikwala ụlọọrụ nnọchiteanya Briten dị na Tehran nwa oge, nke ga-arụ ọrụ ya ugbu a n'ebe dị anya.

  15. Ụtụtụ ọma, ndị be anyị.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 15 Janụwarị 2026.

    Anyị na-asị ka Chukwu kere ụwa butere anyị niile akpa ngọzị n’ime ihe ọma niile anyị na-eme taa.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Udo dịrị gị!

  16. Etu ndị uweojii si jide mmọnwụ kpara mkpamkpa n'Awgbu, Anambra steeti

    Ndị uweojii n'Anambra steeti ejidela mmọnwụ ahụ gara ebe a na-eme emume ma meruo igwe mmadụ ahụ.

    Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti mere ka a mata nke a n'ozi o zitere BBC Igbo na Januwarị 14, 2026.

    N'okwu ya "mmọnwụ ahụ wakporo ndị mmadụ n'Awgbu nọzị n'ụlọọrụ anyị ugbua".

    "Anyị na-agwa ohanaeze ọkachasị ndị Anambra steeti na ndị uweojii n'Anambra steeti akpụrụla mmọnwụ ahụ".

    Ọ sị na mmọnwụ ahụ wakporo ndị mmadụ bụ na-enweghị ihe ha mere ya n'Awgbu dị n'okpuruọchịchị Orumba Nọt.

    "Ihe ahụ mmọnwụ ahụ mere kesara ebe niile ọkachasị na soshal mịdịa"

    Ikenga kwuru na "ihe mmọnwụ ahụ mere jọgburu onwe ya, ọ megidere iwu, ma bụrụ ihe anyị agaghị anabata nchancha".

    Ọ gara n'ihu kwuo "anyị jidere onye nọ n'ime mmọnwụ ahụ, ebe nnyocha ka na-aga n'ihu".

    O kwere nkwa na ndị niile aka ha dị na ihe mere ga-azara ọnụ ha dịka iwu si kwuo.

  17. A nwụchiela dọkịta abụọ maka ọnwụ ụmụaka ọhụrụ itoolu

    A nwụchiela ndị dọkịta abụọ dịka ụmụaka ọhụrụ itoolu nwụrụ n'otu ọnwa n’ụlọọgwu ebe a na-ana nwa dị na Siberia, mba Rọshịa.

    Ụmụaka ndị a nwụrụ n'oge e nwere ezumike afọ ọhụrụ, dịka ozi si n’aka ndị nnyọcha si kwuo.

    Ọnụ na-ekwuru kọmiti na-ahụ maka nnyocha nke mba Rọshịa bụ Svetlana Petrenko kwuru sị,“A mụrụ ụmụaka ndị a nile n’ụlọọgwụ’Novokuznetsk Maternity Hospital’ n’agba abalị mbụ na abalị 12 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026.”

    Ekwubeghị ihe gburu ụmụaka ndị a mana akụkọ ahụ akpalitela iwe ọha ndị Rọshịa

  18. Onyeisiala Trump adọọla aka na ntị banyere nnukwu nzaghachi ma ọ bụrụ na Ịran gbuo ndị ngagharịiwe

    Trump adọọla aka na ntị ma kwuo na Amerịka ga-azaghchi mba Ịran n'ụzọ siri ike ma ọ bụrụ na Iran gbuo ndị na-eme ngagharịiwe.

    Ịdọ aka na ntị a na-abịa dịka onye ezinaụlọ Erfan Soltani dị afọ iri abụọ na isii a nwụchiri n'izuụka gara aga, gwara BBC na a ga-egbu ya taa bụ Wenezde 14 Jenụwarị 2026.

    Awyer Shekhi bụ onye ọrụ ụlọọrụ ha-ahụ maka ichekwa ikike dịịrị ndị mmadụ, kwuru e nwere ọtụtụ ndị nọ n\ọnọdụ Soltani.

    Ndị na-ahụ maka ike dịịrị onye na Amerịka, kwuru na e gbuola ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị anọ mere ngagharịiwe megide gọọmenti Ịran.

    Mana Onyeisiala mba Amerịka bụ Trump na-atụle iziga ndị nchekwa iji zaghachi ihe a na-eme n'Ịran dịka okwupụtara mmanye tariffu iri abụọ na ise na mba ọbụla ha na Ịran na-azụkọ ahịa

    Minista na-ahụ maka mba ofesi n'Ịran bụ Abbas Araghchi, dọrọ aka na ntị ma kwuo na Iran ga-egbochi onwe ya nye ndị “ọjọọ si mba ofesi chọrọ itinye aka n'Ịran”

    Ka ọ dị ugbua, ịntanetị anaghị arụ ọrụ n'Ịran

  19. Mmadụ 22 anwụọla dịka kreen dara n'elu ụgbọoloko na mba Taịland

    Opekatampe ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla dịka kreen aka na arụ dara n’elu ụgbọoloko na-eme njem na mba Taịland.

    Dịka ndị ọrụ gọọmentị si kwuo, ụgbọoloko ahụ bu ndị njem ruru 195 si Bangkọk na-eme njem aga Taịland oge ajọ ọdachi ahụ dakwasịrị ha.

    Akụkọ kwuru na mmadụ 80 ndị ọzọ gụnyere otu nwatakịrị dị naanị otu afọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ahụ.

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọoloko, enyeela iwu ka a malite nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdachị a.

  20. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma unu

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde

    Ekpere anyị n’isi gị na-esonyere anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara gị na anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!