You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2026.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Rọshịa, Yukren na Amerịka ga-enwe mkparịtaụka n’Abu Dhabi

    Ndị nnọchiteanya Rọshịa, Yukren na mba Amerịka ga-enwe mkparịtaụka na United Arab Emirates n’ụbọchị Fraịde, dịka ndị ọrụ gọọmenti kwuru na ọ bụ nzukọ mbụ mba atọ ahụ ga-enwe kemgbe Moscow malitere mwakpo zuru oke ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ anọ gara aga.

    Kremlin ekwuola na ndị ọrụ gọọmenti Rọshịa ga-abịa mkparịtaụka ahụ mgbe e nwesịrị nzukọ n'etiti Onyeisiala Vladimir Putin na ndị nnọchiteanya mba Amerịka na Moscow.

    Rọshịa kọwara mkparịtaụka ndị ahụ dịka "ihe bara uru n'akụkụ niile", mana o kwuru na agaghị enwe ike iru nkwekọrịta udo ogologo oge ruo mgbe edoziri nsogbu okeala.

    N’ọgbakọ akụnaụba mba ụwa na Davos, Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky katọrọ ndị otu Yuropu maka enweghị ike "iji ndọrọ ndọrọ ọchịchị" mee ihe megide Rọshịa.

    Atụmatụ mba Amerịka maka ụlọọrụ mmepụta ihe Yukren na Donbas bụ maka iwepụ ndịagha na inwe mpaghara akụ na ụba nwere onwe ya iji nweta nkwa nchekwa maka Kyiv.

  2. Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 23 Jenụwarị, 2026.

    Biko, gaa n'ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ banyere ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị n’akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ anyị wepụtara na foto na vidio.

    Udo dịrị gị.

  3. Ndị uweojii Abia steeti ejidele nwoke ji akụrụngwa ụlọọrụ INEC n'azụ

    Ndị uweojji Abịa steeti anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Chukwuemeka Nwabilor maka iji akụrụngwa ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC ji edebanye aha ndị mmadụ chọrọ ịtụ vootu weere na- edebanye aha ndị mmadụ nke iwu na-akwadoghị.

    Akụkọ kwuru na Nwabilor ji akụrụngwa ndebanye aha nke ekwesịrị iji debanye aha ndị mmadụ nọ na mpaghara ugwu Isiala Ngwa weere na-eme ndebanye aha na ndịda Isiala Ngwa tupu aka akpara ya.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Abia steeti bụ Maureen Chinaka sị na ndị uweojii ma maka ihe mere ma kọwa na nwoke ahụ a na-enyo enyo kwetara na enyere ya puku naira iri ise iji mee ndebanye aha iwu na-akwadoghị

    Ka ọ dị ugbua nwoke ahụ nọ na-aka ndị uweojii na-ahụ maka nnyocha mpụ dịka ewetara akụrụngwa ahụ eji eme ndebanye aha.

    A aka na-eme nyocha ịmara ihe ndị gbasara nwoke ahụ ejidere na ndị ha na ya so eme mpụ a.

  4. Atiku:E mezibeghị ebe iwu ntuliaka na-eri mperi iji kwado maka 2027

    Atiku Abubakar bụbu Osote Onyeisiala Naịjirịa ma jiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'People Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023 ekwuola na otu ihe ga-echere ntuliaka n’afọ 2027 bụ ebe iwu na-eri mperi.

    Atiku si na ọ bụ ebe ahụ iwu ‘Electoral Act 2022’ na-eri mperi mere ọ dị mfe nrụrụaka na ntuliaka,

    Ọ dị ahụhụ onye e mejọrọ ị ga ụlọikpe ma kọwa etu e si megide ya, maọbụ nwete ikpe ziri ezi.

    N’okwu ya “e kwesiri idozi ihe a na-emeghgị nke ọma na ntuliaka afọ 2023, ma hara ị ji ya mee nke afọ 2027”.

    “Etu ihe dị ugbua, ọ dịka ndị omeiwu achọrọ igbochi mgbanwe a chọrọ itinye n’iwu ntuliaka”.

    Ọ kpọrọ ndị Sineti ka ha “mee ka e nwee ezi mgbanwe n’iwu ahụ” ma kwuo na “ọ bụrụ na ha achọghị mgbanwe ahụ nke a pụtara na ha kwadoro nrụrụaka na ntuliaka”.

    Kedụ mgbanwe a na-achọ itinye?

    Mgbanwe ndị ahụ a na-achọ itinye gunyere ime ka ọ ghara ịdị mfe mmadụ ime nrụrụaka na ntuliaka.

    Otu mgbanwe a chọrọ itinye bụ ime ka ọ bụrụ mgbe a tụchara vootu, gụọ ya ka a na-edebanye ndekọ ya n’akụrụngwa ‘eletrọnịk’ ma mee ka ihe a tụrụ bụrụ ihe na-egosi na websait ndị INEC a na-akpọ “IReV”.

    Cheta, n’afọ 2023, IReV nọkatara kwụsị ịrụ ọrụ, ahụghị ọtụtụ ndekọ n’ime ya, ebe ọtụtụ ndekọ a gụtara n’ebe a tụrụ vootu na nke a na-ahụ n’IReV abụghị out ihe.

    Ọ bụ ọnọdụ dị etuo ka atụmatụ mgbazị iwu ntuliaka ahụ Atiku Abubakar na-ekwu maka ya na ihe ndị ọzọ.

  5. Ndị uweojii akpụpụla mmadụ 11 n’ụlọikpe n’ihi ebubo igbu Somtochukwu Maduagwu

    A kpụpụla mmadụ iri na otu a na-enyo enyo na ọ bụ ha gburu onye ntaakụkọ ụlọmgbasaozi Arise News bụ Somtochukwu Maduagwu n’ụlọikpe.

    N’ụbọchị Wenezde 21 Jenụwarị 2026 ka ndị uweojii kpụpụrụ mmadụ iri na otu ahụ n’ụlọikpe maka ebubo ịwakpo Somtochukwu na onye nche aha ya bụ Barnabas Danlami n’ụlọ ha bụ Unique Apartments dị na Katampe Extension, n’ime Mabushi District n’Abuja.

    Ọ bụ n’ihu Ọkaikpe Mohammed Idris nke Ụlọikpe Ukwu Isi Obodo dị na Jabi ka a kpụpụrụ ha n’ihi ebubo itoolu gbakwasara ụkwụ n’ịkpa nkata mpụ, iji egbe ezu ohi na igbu mmadụ.

    Mana ka ọ dị, mmadụ iri na otu ahụ gọrọ agụgọ ma kwuo na aka ha dị ọcha n’ebubo itoolu niile ahụ.

    Mmadụ iri na otu ahụ gụnyere; Shamsu Hassan, Sani Sirajo, Hassan Isah, ⁠Abubakar Alkamu, Abdulsalam Saleh, Suleiman Badamasi, Zaharadeen Mohammed, Musa Umar (aka “Small”), Mashkur Jamil, Suleiman Sani na ⁠Abubakar Usman.

    Ka o sina dị, e yigharịrị ikpe ahụ ruo n’ụbọchị 9, 10 na 12 nke ọnwa Febụwarị maka nnụrụ ikpe, dịka e nyere iwu ka e jichie ndị ahụ a na-enyo enyo n’ụlọmkpọrọ dị na Kuje.

  6. Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ iru ndị furu efu maka mbụze oke mmiri ozuzo kpatara na Niu Ziland

    Ọtụtụ mmadụ efuola mgbe mbụze mere n'ogige ntụrụndụ dị n’Ugwu Maunganui nke New Zealand, ebe ndị njem nlegharị anya na-agakarị.

    Ndị ọrụ nnapụta ekwuola na enweghị ihe ịrịba ama nke ndụ n'ebe a - Minista na-ahụ maka Njikwa Mberede bụ Mark Mitchell ekwenyela na "opekatampe otu nwa agbọghọ nta" so na ndị a na-amaghị maka ha.

    Ndị ọrụ gọọmenti Niu Ziland kwuru na ọrụ nchọta ga-aga n'ihu n’abalị niile.

    E kwuru na mbụze ọzọ mere na Papamoa dị nso nke merụrụ otu onye ahụ nke ukwuu, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ ka na-efu efu.

    Ọzọ, mpaghara Bay of Plenty dị na North Island nke New Zealand ahụla oke mmiri ozuzo na ifufe n'ime ụbọchị ole na ole gara aga, nke butere nnukwu nsogbu ọkụ eletrik na idemmiri zuru ebe niile.

    A na-atụ anya na Praịm Minista Chris Luxon ga-aga njem nleta ebe ọdachi metụtara na mba ahụ echi.

  7. Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 22 Jenụwarị, 2026.

    Biko, gaa n'ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ banyere ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị n’akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ anyị wepụtara na foto na vidio.

    Ndewo.

  8. Trump: Ihe anyị chọrọ iji ala Greenland mee

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwechirila n'okwu ya na nsonso a na-Amerịka ga-eweghara mba Greenland.

    N'okwu ya n'ọgbakọ nkwado akụnaụba mbaụwa bụ 'World Economic Forum' nke e mere na Davos, Trump kwuru sị na "ọ chọrọ ka a kpaa etu Amerịka ga-ese nwere akpara Greenland."

    Ọ kọwara ya dịka "mweghara a ga-akpa akpa".

    "Ọ bụghị ihe a ga-eji ike mee. Mana site na i nweta ikike, ma nwere ya maka na ọ dị Amerịka mkpa."

    Trump gara n'ihu kwuo sị, "anyị chọrọ iweghara Greenland iji ya wuo ochendo ọlaedo (Golden Dome) a hụbeghị mbụ n'ụwa."

    Ọ dọrọ Praim Minista Canada bụ Mark Carney aka na ntị maka ihe o kwuburu ma sị na Amerika ga-eji Greenlad chekwaa Kanada.

    Carney dọnyere mba Greenland na Denmark ukwu sị na ha nwere ikike ịkwụụrụ onwe ha.

    "Anyị kwụnyesiri Greenland na Denmark ike ma kwado ikike ha ikwu etu ọdịnairu Greenland ga-adị."

  9. Gọọmentí Enugwu anapụtala ijeri N1.28 n'aka Sujimoto

    Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ha anapụtala ego dị otu ijeri naira na ụma iri abụọ na asaa(N1.27bn) n'aka Olasijibomi Ogundele, onye nwe ụlọrụ Sujimoto.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahụ maka nụrụaka bụ Economic and Finacial Crimes Commission(EFCC) mere nnyocha banyere etu ụlọọrụ ahụ si gbarịe ego e nyere ha iji rụọ ụlọakwụkwọ nwere kopụta akpọrọ 'Smart Green Schools' na steeti ahụ.

    Otu ijeri naira na ụma iri abụọ na asaa(N1.27bn) nke ndị ọrụ EFCC ngalaba nke Enugwu nyeghachiri taa bụ Wenezde so na ego Gọọmenti Enugwu kwụrụ ụlọọrụ mana ụlọọrụ ahụ arụghị ihe a kwụrụ ha ụgwọ rụọ.

  10. Ụlọikpe achụpụla Abure dịka onyeisioche 'Labour Party', nabata Usman

    Ụlọikpe ekwuola na ọ bụ Nenadi Usman bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party'ị ma chụpụ Julius Abure.

    Ọkaikpe Peter Lifu nke Úlọikpe Ukwu dị n’Abuja mere nke a ma wepụ ndị niile nwere ọkwa n’oge ọchịchị Julius Abure.

    Ụlọikpe gwara INEC ka ọ nabata Nenadi Usman dịka ndị ọchịchị nchere oge otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Lebọ patị.

    Ọkaikpe Peter Lifu gbadoro ụkwụ na mkpebi ikpe Úlọikpe Kachasị na Naịjirịa nke abalí anó nke ónwa Eprelụ, afọ 2025 nke kpebiri na sịnetọ Esther Nenadi Usman bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party'.

    Ọ gwara INEC na ọ bụ Nenadi bụ onyeisi nchere oge nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ruo na ha eme ọgbakọ wepụta ndị isi ha.

  11. Trump ga-ezute ndị isi mbaụwa n'ọgbako World Economic Forum a na-eme na Davos

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ezute ndị isi mba ụwa n'ọgbako World Econonmic Summit a na-eme na Davos dị na mba Switzaland.

    Akụkọ kwuru na a na-atụ anya na Onyeisiala Trump na ndịisi mbaụwa ga-enwe mkparịtaụka gbasara ‘Greenland’.

    Mgbe Onyeisiala Trump na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka, ha jụrụ ya etu o siri dị njikere ịga nweta ‘Greenland’, ọ zara, sị: “Ị ga-achọpụta”.

    Minista ụlọọrụ mmepụta ihe na ‘Greenland’ bụ Naaja Nathanielsen gwara BBC na ha aghọtaghị ihe mere Trump ji achọ inwere ha ma mee ka o doo anya na ha “achọghị ịbụ ndị Amerịka”.

    Cheta na Onyeisiala Trump yiri egwu na ọ ga-etinye tarifu pasenti iri na “mbubata niile nakwa ngwaahịa” si mba asatọ dị na Yuropu site na mmalite Febụwarị ma ọ bụrụ na ha gbochie atụmatụ ya iweghara mpaghara Greenland.

  12. Ndị be anyị ụnụ asaala chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 21 Jenụwarị, 2026.

    Gaa n'ihu sonyere anyị maka na anyị ji akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile bịa taa.

    Sonyekwara akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Daalụ.

  13. Spen ekwupụtala iru uju abalị atọ maka ndị ihe mberede ụgbọoloko metụtara

    Praịm Minista mba Spen bụ Pedro Sanchez ekwupụtala iru uju abalị atọ na mba ahụ iji kwanyere ndị ihe mberede ụgbọoloko gburu ihe ruru mmadụ iri anọ n’ụbọchị Sọnde ugwu.

    Sanchez kwekwara nkwa na ya ga-achọpụta ihe mere ụgbọoloko abụọ ahụ ji daa n'ebe ndịda Spen, dịka ndị na-azọpụta mmadụ na-aga n'ihu na-achọ ihe ndị mebiri emebi.

    Cheta na ihe karịrị mmadụ otu narị na iri abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ ka ụfọdụ akụkụ ụgbọoloko na-aga Madrid gbapụrụ ma gafere n'okporo ụzọ ndị ọzọ, wee daa n’okporo nke ụgbọoloko na-abịa na Adamuz n'abalị Sọnde.

    E kwuru na ọdachi a bụ nke kacha njọ mba ahụ hụtụrụla n'ime ihe karịrị afọ iri.

  14. Trump akatọla UK maka nkwekọrịta inyefe Chagos Island n’aka mba Mauritius

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akatọọla etu mba Briten si chọọ inyefe “Chagos Islands” n’aka mba Mauritius dịka “nnukwu amaghị ihe”.

    N’okwu ya “Ọ bụ maka na UK chọrọ inwere ebe e ji mere ọdọ ndịagha nyefe n’aka mba Mauritius bụ ihe mere Amerịka ji chọọ inwere Greenland”.

    Trump dere n’aka soshal mịdịa ya bụ Truth Social na “Ọ dị egwu na ndị ọnyị anyị na NATO, United Kingdom na-achọ ka ha nwere ala mmiri gbara okirikiri bụ Diego Garcia Island bụ ebe mba Amerịka jiri mere ọdọ ndịagha nyefe n’aka mba Mauritius na-enweghị ihe ọbụla kpatara ya".

    Mana Trump adịla na mbụ kwado nkwekọrịta United Kingdom na Mauritius nwere maka Diego Garcia Island.

    Mana ihe Trump na-ekwu ugbua gosiri na ọ gbanwere obi ya.

  15. FIFA, CAF akatọọla ọmụme ọjọọ ndị a hụtara n'asọmpị Afcon

    Otu na-achịkọta asompi bọọlụ na mba Afrịka bụ CAF akatọọla omume ojọọ ndị na-agba bọọlụ, ndị nkwado nakwa ndị nlekọta gosipụtara n'ịmaaka ikpeazụ nke asọmpi Iko Mba Afrịka n’etiti Senịgal na Moroko.

    E nwere ọtụtụ esemokwu n'ịmaaka nke Senegal meriri n'abalị 18 Jenụwarị 2026.

    “Anyi ga-enyocha onyonyoo e sere mgbe a na-agba bọọlụ iji chọpụta ihe kpatara ọtụtụ esemokwu ndị ahụ, ma nyefee ihe ndị anyị chọpụtara n'aka ụlọọrụ ọ dị n'aka maka inye ndị aka ha dị na ya ntaramahụhụ.

    Gianni Infantino bụ Onyeisioche otu na-achịkọta asọmpi bọọlụ na mbaụwa (FIFA) tinyere ọnụ ma katọọ ihe ndị mere mgbe a na-agba asọmpi Iko Mba Afrịka, ọkachasị atụmatụ ndị ọgba bọọlụ Senịgal ịpụ n'ama egwụregwụ.

    “Anyị anabataghị atụmatụ ndị ọgbaa bọọlụ Senịgal ịpụ etu ahụ, ma akparamaagwa ndị ọgbaabọọlụ Senịgal nakwa nke ndị na-akwado ha,” ka otu ahụ kwuru.

  16. Ụmụakwụkwọ 13 anwụọla mgbe bọs na gwongworo kụkọtara na mba Saụt Afrịka

    Ụmụakwụkwọ iri na atọ anwụọla na mba Saụt Afrịka mgbe obere bọs ha ji na-eme njem kụrụ gwongworo na ndịda obodo Johannesburg.

    Ndị ọrụ agụmakwụkwọ mpaghara ahụ kwuru na ihe mberede ahụ mere n'ụtụtụ Mọnde n'ihe dịka ọ kụrụ elekere asaa nke ụtụtụ na Vanderbijlpark.

    E kwuru na ụmụakwụkwọ iri na otu nwụrụ n'ebe ihe mberede ahụ mere, ebe mmadụ abụọ nwụrụ n'ihi mmerụ ahụ ha nwere. Mana ụmụakwụkwọ abụọ ndị ọzọ ka nọ n'ọnọdụ dị oke njọ.

    Onye na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Mavela Masondo kwuru na onye ọkwọ ụgbọala obere bọs ahụ daranyere n'ụgbọala ahụ mgbe ọ nwara ịgafe ụgbọala abụọ.

  17. Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla ọkaiwu Mike Ozekhome n'ụlọikpe maka ebubo mpụ na nrụrụaka

    Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla ọkaiwu a ma ama bụ bụ Mike Ozekhome ụlọikpe maka ebubo gbadoro ụkwụ na mpụ na igosi ụlọikpe akwụkwọ adịgboroja na Lọndọn.

    Ụlọọrụ Iindependent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) kpụpụrụ Ọkaiwu Mike Ozekhome Ụlọikpe dị Ukwu dị n’Abuja maka ebubo ọnụ ọgụgụ dị atọ gunyere ịtụ asị banyere etu o si nweta ụlọ ya dị na 79 Randall Avenue Lọndọn

    Ụlọọrụ ICPC kwuru na Ọkaiwu Ozekhome kwuru na ọ bụ Shani Tali nyere ya ụlọ ahụ.

    Mana nchọpụta e mere gosiri na Ozekhome rụrụ akwụkwọ njirimara paspọt Naịjirịa adịgboroja nwere aha Shani Tali na akara A07535463 iji nwee kwado asị ahụ ọ tụrụ.

    Ụlọọrụ ICPC mere ka o doo anya na agwa dị etu a megidere iwu Naịjirịa.

    E kwubeghị mgbe ikpe ya ga-amalite.

    Mana ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ BBC News Igbo achọpụtabeghị nke bụ eziokwu n’ihi na Ọkaiwu Mike Ozekhome azaghị oku ekwentị anyị kpọrọ ya.

  18. Etu ndị uweojii si gbochie ndị ntọ, gbuo otu onye n’Enugwu steeti

    Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha gbochiri ndị ntọ chọrọ ịtọrọ mmadụ, gbuo otu onye n’ime ha ma napụta ha egbe ha ji.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe mere ka a mata nke a n’akwụkwọozi o wepụtara n'ụbọchị Jenụwarị 19, 2026.

    Dịka ozi ahụ si kwuo, ndị ntọ ahụ wakporo ma chọọ ịtọrọ ndị na eme njem na mpaghara Ngene-Ukwu dị n’ụzọ si Adani aga Nsụkka n'ụtụtụ Satọde Jenụwarị 18, 2026.

    Ndukwe kwuru na ndị uweojii wuchiri ebe ahụ ngwangwa ha nwetere ozi banyere nkata ndị omekome ahụ kpara. O mere ka o doo anya na ndị uweojii gburu otu onye omekome ahụ ma nweta egbe AK-47 oge ha na ndị ntọ ahụ kwatara mgbọ

    O kwuru na a malitela ime nnyocha iji nwụchie ndị omekome ndị ọzọ gbara ọsọ gbabanye n'im ọhịa.

  19. Mmadụ 39 anwụọla n’ihe mberede ụgbọoloko mere na mba Spen

    Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ 39 anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n’ihe mberede ụgbọoloko mere na mpaghara ndịda mba Spen.

    Ozi si n’aka ụlọọrụ Civil Guard mba Spen, kwuru na ihe mberede ahụ mere oge ụgbọoloko gbapụrụ n’okporo ya ma danye n’okporo ụgbọoloko ọzọ n’abịa ya n’ihu n’ụbọchị Sọnde 18 Jenụwarị, 2026 n’obodo Adamuz dị na mba ahụ.

    E kwuru na mmadụ 400 gụnyere ndị ọrụ nọ n’ụgbọoloko abụọ ahụ kpọkara onwe ha. Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ha nyere mmadụ 122 nleta ebe mmadụ 48 ndị ọzọ gụnyere ụmụaka ise ka nọ n’ụlọọgwụ.

    Mịnịsta na-ahụ maka njem na Spen bụ Óscar Puente, kwuru na ọnụọgụ ndị nwụrụ ka nwereike ịrị dịka a na-eme nnyocha.

    Puente kọwara ihe mberede ahụ dịka ajọ ọdachi ebe ndị ọrụ ụlọọrụ ụgbọoloko mba ahụ kwuru na ihe mberede a riri ha ọnụ.

  20. Ndị be anyị ụnụ asaala chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 19 Jenụwarị, 2026.

    Gaa n'ihu sonyere anyị maka na anyị ji akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile bịa taa.

    Sonyekwara akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Daalụ.