Ndịagha Philippines aṅụọla iyi ibuso otu Daulah Islamiyah maka ịtụ ndị na-aka 'mass' ogbunigwe

Ebe foto si, Philippines Army /X
Ndịagha mba Philippines aṅụọla iyi ibuso otu agha nnupuisi Jihad bụ Daulah Islamiyah agha maka aka ha ịtị na ogbunigwe a tụrụ ndị na-aka Mass Ụbọchịụka.
Ndị bu egbe e chere na ha bụ otu Jihad a kpọrọ Daulah Islamiyah tụrụ ndị Katọlik gbakọrọ maka ofufe nro Ụbọchịụka, abalị atọ nke ọnwa Disemba, na mahadum 'Mindanaso State University' (MSU) dị na Marawi, nke gburu mmadu anọ,ebe mmadu 44 meruru ahu.
Onyeisiagha na mba ahụ bụ Romeo Brawner Jr. mere ka a mata nke a n' isiụlọọrụ ndịagha a kpọrọ '103rd Infantry Brigade' dị na Marawi ka ya na ndị ọzọ welitere ịsị n' ọrụ agha na Phillippines nwechara mkparịtaụka ebe ọ nọ gwa ha na Onyeisiala ha bu Ferdinand Marcos Jr enyela ha ikike ka ha banye ndị ọjịegbe ahu ọgu.
O gwa kwara ma ọnye ịsị ndị Uwe Ọjịị nakwa ndị ọzọ na mba ahu ka jikọọ aka ọnụ na ọge a.
N'okwu ya, Ọ sịrị, “Anyị ga-abanye ndị omekaome a ọgu. "
"Anyị ga-ejị ịhe nịle anyị nwere mee ka ihe dị ọtu a ghara ime ọzọ.”.
Na nsonso a, ndịagha mba ahụ na ndị otu Daulah Islamiyah kwatara nke riri isi ndị otu ahụ 11.





